Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ol akụkụ 3 p. 8-11
  • Olee Ndị Bi n’Ógbè Ndị Bụ́ Mmụọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ndị Bi n’Ógbè Ndị Bụ́ Mmụọ?
  • Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova, Ezi Chineke Ahụ
  • Jizọs Kraịst, Eze nke Alaeze Chineke
  • Ndị Mmụọ Ozi, Ndị Ozi Chineke
  • Setan, Onye Iro Chineke
  • Ndị Mmụọ Ọjọọ
  • Olee Ndị Bi n’Ógbè Ndị Mmụọ?
    Teta!—1996
  • Enyi Anyị Kasị Mma Nọ n’Ógbè Ndị Mmụọ
    Teta!—1996
  • È Nwere Ike Ịhụ Ndị Bụ́ Mmụọ Anya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ndị Mmụọ E Kere Eke—Otú Ha Si Emetụta Anyị
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
ol akụkụ 3 p. 8-11

AKỤKỤ NKE 3

Olee Ndị Bi n’Ógbè Ndị Bụ́ Mmụọ?

1. Olee ụzọ e siworo jiri okpukpe oge ochie tụnyere okoso kpuru ihe n’ala

EJIRIWO nkwenkwe okpukpe ọdịnala nke ndị Africa tụnyere okoso kpuru ihu n’ala. Ọ bụ Chineke, bụ́ onye ike ya kasị n’etiti ndị bụ́ mmụọ, nọ n’elu elu ya, n’ebe pịrị ọnụ. Chi, ma ọ bụ mmụọ ndị dị ala karị ya, bụ́ ndị na-ejere Chineke ozi na-esote ya. Ndị nna ochie, bụ́ ndị na-echeta ezinụlọ ha n’elu ụwa ma na-eme ihe a hụrụ anya maka ọdịmma ha ana-esotekwa ha. N’ala ala ya, e nwere ikike mmụọ dị ala karị: ime anwansi, ịgba afa, na ịta amoosu.

2. Olee otú otu okwu a na-ekwu n’Africa si egosi na nkwenkwe ọdịnala na-emetụta okpukpe?

2 Nkwenkwe ọdịnala ndị a enwewo mmetụta dị ike n’okpukpe ndị ọzọ dị n’Africa. Otu okwu a na-ekwu n’Africa na-asị: “Ikwenyesi ike n’Okpukpe (Iso Ụzọ Kraịst ma ọ bụ Alakụba) egbochighị anyị ife chi dị iche iche nke ala anyị ofufe.”

3. Olee ebe anyị ga-esi mata ihe bụ́ eziokwu banyere ndị bi n’ógbè ndị bụ́ mmụọ?

3 Ruo n’ókè há aṅaa ka nkwenkwe okpukpe ọdịnala Africa bụ eziokwu? Bible na-agwa anyị ihe bụ́ eziokwu banyere ndị bi n’ógbè ndị bụ́ mmụọ.

Jehova, Ezi Chineke Ahụ

4. Na gịnị ka okpukpe ndị bụ́ isi n’Africa kwekọrịtara?

4 Okpukpe atọ bụ́ isi n’Africa kwetachara na Chineke dị nakwa na ọ bụ onye kasị elu. Bible na-akọwa ya dị ka “Chineke kachasị chi nile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile, Chineke ukwu ahụ, bụ́ dike, dịkwa egwu.” (Deuterọnọmi 10:17) Ndị Alakụba kwekwara na e nwere otu Chineke kasị elu. Banyere okpukpe ọdịnala nke ndị Africa, Prọfesọ Geoffrey Parrinder na-ekwu, sị: “Ihe ka ọtụtụ ná ndị Africa kwere na e nwere otu Chineke kasị elu, nna nke chi dị iche iche na ndị mmadụ, onye kere eluigwe na ụwa.”

Kpakpando juru na mbara igwe

5. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime aha e ji mara Chineke?

5 Ma, n’agbanyeghị na e kwenyere n’ebe nile na Chineke dị, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ amachaghị onye Chineke bụ nke ọma. Nzọụkwụ mbụ mmadụ na-ewere iji mata mmadụ bụ ịmata aha ya. N’ihe banyere aha Chineke, okpukpe dị iche iche nọ ná mgbagwoju anya. Na Krisendọm, a na-akpọkarị ya Chineke, bụ́ utu aha ya na okwu Bekee nke pụtara “Dike” bụ otu ihe. Nye ndị Alakụba, ọ bụ Allah. N’etiti ndị na-ekpe okpukpe ọdịnala, aha e ji mara Onye Kasị Elu dịgasị iche n’asụsụ dị iche iche. N’akwụkwọ ya bụ́ Concepts of God in Africa, John S. Mbiti depụtara ihe karịrị aha na utu aha 500 e nwere n’Africa maka Chineke. Dị ka ihe atụ, n’asụsụ Yoruba (Nigeria), a na-akpọ Chineke Olodumare; nye ndị Kikuyu (Kenya), ọ bụ Ngai; n’etiti ndị Zulu (South Africa), ọ bụ Unkulunkulu.

6, 7. Gịnị bụ aha Chineke, oleekwa otú anyị si mara?

6 Gịnị ka Chineke n’onwe ya na-ekwu banyere aha ya? Mgbe Chineke gwara Mozis ka o dupụta ndị Izrel n’Ijipt, Mozis jụrụ, sị: “Mgbe mụ onwe m na-abịakwute ụmụ Israel, sị ha, Chineke nke nna unu hà ezitewo m n’ebe unu nọ; mgbe ha ga-asịkwa m, Gịnị bụ aha Ya? ọ̀ bụ gịnị ka m ga-asị ha?”​—Ọpụpụ 3:13.

7 Chineke zara, sị: “Otú a ka ị ga-asị ụmụ Israel, Jehova, bụ́ Chineke nke nna unu hà . . . O zitewo m n’ebe unu nọ: nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, nke a bụkwa ihe ncheta m ruo ọgbọ nile.” (Ọpụpụ 3:15) Aha Chineke a pụtara ihe karịrị ugboro 7,000 n’ime Bible, ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị nsụgharị Bible ejiriwo utu aha bụ́ “Chineke” ma ọ bụ “Onyenwe anyị” dochie anya ya.

8. Olee otú Jehova dị, gịnịkwa ka anyị na-aghaghị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ihu ọma ya?

8 Olee otú Jehova dị n’ezie? Ọ bụ mmụọ, onye pụrụ ime ihe nile, onye dị ebube. Ọ bụ onye kasị elu, onye na-enweghị atụ, onye na-enweghị onye há ka ya. (Deuterọnọmi 6:4; Aịsaịa 44:6) Jehova gwara Mozis, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, bụ Chineke ekworo.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, iji nweta ihu ọma Jehova, anyị aghaghị ife nanị ya ofufe. Ọ chọghị ka anyị fee ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ.​—Ọpụpụ 20:​3-5.

Jizọs Kraịst, Eze nke Alaeze Chineke

9. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Jizọs na Jehova ahaghị?

9 Taa e nwere oké mgbagwoju anya banyere onye Jizọs bụ. Ọtụtụ ndị nọ na Krisendọm kwenyere na Jizọs so n’Atọ n’Ime Otu “Dị Nsọ.” Ma Bible adịghị akụzi na Chineke dị atọ ma bụrụ otu onye. Ọ dịghịkwa akụzi na Jizọs na Jehova hà nhata. Jizọs n’onwe ya sịrị: “Nna m ka m ukwuu.”​—Jọn 14:28.

10. Olee ebe Jizọs nọ tupu ya abịa n’ụwa?

10 Bible na-akụzi na tupu Jizọs ebie n’elu ụwa dị ka mmadụ, o biri n’eluigwe dị ka mmụọ e kere eke bụ́ dike. Otú a Jehova si kee Adam na Iv n’ụwa, otú ahụkwa ka O kere ndị bụ́ mmụọ n’eluigwe. Jizọs bụ onye mbụ bụ́ mmụọ Jehova kere.​—Jọn 17:5; Ndị Kọlọsi 1:15.

11. Olee otú e si bịa mụọ Jizọs dị ka mmadụ?

11 Ihe dị ka afọ 2,000 gara aga, Jehova wefere ndụ nke mmụọ a e kere eke n’akpa nwa nke otu nwanyị na-amaghị nwoke aha ya bụ Meri. Mmụọ ozi bụ́ Gebriel gwara ya, sị: “Ị ga-atụrụ ime n’akpa nwa gị ma mụọ nwa nwoke, ị ga-akpọkwa aha ya Jizọs. Ọ ga-achịkwa dị ka eze . . . , alaeze ya agaghịkwa enwe ọgwụgwụ.”​—Luk 1:​31, 33.a

12. Olee otu ihe mere Jizọs ji bịa n’ụwa?

12 Ya mere a mụrụ Jizọs amụ, ya etoruo dimkpa, kụziekwara ndị mmadụ banyere uche na nzube Jehova. Ọ gwara onye gọvanọ Rom, sị: “Ọ bụ n’ihi nke a ka e jiworo mụọ m, ọ bụkwa n’ihi nke a ka m jiworo bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) Site n’ịtụle ihe Jizọs kụziri, anyị pụrụ ịmata ihe bụ́ eziokwu banyere uche na nzube Chineke. Anyị pụrụ ịmụta otú e si enweta ihu ọma Chineke.

13. Gịnị bụ ihe nke abụọ mere Jizọs ji bịa n’ụwa?

13 Ihe nke abụọ mere Jizọs ji bịa n’ụwa bụ iji nye ndụ ya dị ka mmadụ ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ. (Matiu 20:28) O mere nke a ka anyị wee nwee ike inwere onwe anyị pụọ ná mmehie anyị ketara site n’aka nna nna anyị bụ́ Adam. Nke a, n’aka nke ya, ga-eme ka o kwe anyị omume ịdị ndụ ebighị ebi. Jọn onyeozi dere, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”​—Jọn 3:16.

14. (a) Gịnị mere Jizọs mgbe ọ nwụsịrị dị ka mmadụ? (b) Gịnị bụ ọkwá Jizọs n’eluigwe ugbu a?

14 Mgbe Jizọs nwụsịrị dị ka mmadụ, a kpọlitere ya n’ọnwụ gaa n’eluigwe, bụ́ ebe ọ maliteghachiri ịdị ndụ dị ka mmụọ dị ike e kere eke. (Ọrụ 2:​32, 33) Ka oge na-aga, Jehova nyere ya “ọchịchị, na ebube, na alaeze, ka ndị nile dị iche iche na mba nile na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche wee fee Ya.” (Daniel 7:​13, 14) E mewo ka Jizọs ghọọ Eze dị ike; ọ bụ Eze nke ọchịchị eluigwe nke Jehova. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-egosi ike ya n’ụwa nile.

Ndị Mmụọ Ozi, Ndị Ozi Chineke

15. Olee mgbe, ọ bụkwa n’ebee, ka e kere ndị mmụọ ozi?

15 Ọ bụghị nanị Jehova na Jizọs bi n’ógbè ndị bụ́ mmụọ. Jehova kere ndị mmụọ ndị ọzọ, bụ́ ndị mmụọ ozi. Gebriel, bụ́ onye gwara Meri okwu, bụ otu n’ime ha. Ndị mmụọ ozi ahụ amaliteghị ndụ ha dị ka ndị mmadụ n’elu ụwa. E kere ha n’eluigwe ogologo oge tupu e kee ndị mmadụ n’elu ụwa. (Job 38:​4-7) E nwere ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi.​—Daniel 7:10.

Ebe otu mmụọ ozi na-ekweghị ka Jọn onyeozi kpọọrọ ya isiala

Ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi jụrụ ịnara ofufe

16. Gịnị mere ndị mmadụ na-ekwesighị iji fee ndị mmụọ ozi ofufe?

16 Ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi achọghị ka anyị fee ha ofufe. Ugboro abụọ, mgbe Jọn onyeozi nwara ife ndị mmụọ ozi ofufe, ha baara ya mba, na-asị: “Kpachara anya! Emela ya! . . . Kpọọ isiala nye Chineke.”​—Mkpughe 19:10; 22:​8, 9.

17. Gịnị na-egosi na ndị mmụọ ozi nwere ike ichebe ndị ohu Chineke, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji bụrụ ihe na-akasi obi?

17 Ndị mmụọ ozi adịkwaghị apụta ka ndị Chineke nọ n’ụwa hụ ha anya, dị ka ha mere mgbe ha napụtara ndịozi Jizọs n’ụlọ mkpọrọ. (Ọrụ 5:​18, 19) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na anyị efee Jehova n’ụzọ kwekọrọ n’Okwu ya, bụ́ Bible, anyị ga-ejide n’aka na ìgwè ndị mmụọ ozi Chineke dị ike a na-adịghị ahụ anya, ga-echebe anyị. Bible na-asị: “Mmụọ ozi nke Jehova na-ama ụlọikwuu ya gburugburu ndị na-atụ egwu Ya, o wee dọpụta ha.” (Abụ Ọma 34:7; 91:11) N’ihi gịnị ka nke a kwesịrị iji kasie anyị obi? N’ihi na e nwere ndị iro dị ize ndụ n’ógbè ndị bụ́ mmụọ, bụ́ ndị chọrọ ịla anyị n’iyi!

Setan, Onye Iro Chineke

18. (a) N’ihi gịnị ka otu mmụọ ozi ji nupụrụ Chineke isi? (b) Olee aha ndị e nyere mmụọ nnupụisi a?

18 Ọ bụghị ndị mmụọ ozi nile nke Chineke nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke. Ụfọdụ nupụụrụ ya isi. Ha mere onwe ha ndị iro Chineke na ndị iro nke ndị nọ n’elu ụwa. Olee otú nke a si mee? Ndị mmụọ ozi nile e kere eke bụ́ ndị Jehova kere bụ ndị ezi omume, bụrụkwa ndị ọma. Otú ọ dị, otu n’ime ụmụ ndị a bụ́ ndị mmụọ zuru okè chọrọ ka ndị mmadụ fee ya ofufe, o mezukwara ọchịchọ ọjọọ a. E nyere mmụọ ahụ e kere eke aha bụ́ Setan, nke pụtara “Onye Nguzogide [Chineke].” A na-akpọkwa ya Ekwensu, nke pụtara “Onye Nkwutọ,” ebe ọ na-agha ajọ ụgha banyere Jehova.

19. Gịnị mere Setan ji taa Job ahụhụ, oleekwa otú o si mee ya?

19 Setan na-arụgide ndị mmadụ ka ha sonyere ya n’inupụrụ Chineke isi. Tụlee ihe o mere ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job. Job bụ ezigbo aka ji akụ̀. O nwere atụrụ dị 7,000, kamel dị 3,000, 1,000 ehi na oké ehi, tinyere nne ịnyịnya ibu dị 500. O nwekwara ụmụ iri na ọtụtụ ndị ohu. Setan bu ụzọ gbuo ụmụ anụ Job na ndị ohu ya. Ọzọ, o mere ka “oké ifufe” kwatuo otu ụlọ, wee gbuo ụmụ Job nile. Mgbe nke ahụ gasịrị, Setan ji ‘ihe ofifi ọjọọ sitere n’ọbụ ụkwụ ya ruo opu n’isi ya’ wee mekpaa Job ahụ́.​—Job 1:​3-19; 2:7.

20. (a) Olee otú e si kwụghachi Job ụgwọ maka ikwesị ntụkwasị obi ya? (b) Ọ bụ ezie na Job kwesịrị ntụkwasị obi nye Chineke, gịnị ka Setan meworo ọtụtụ ndị ọzọ?

20 N’agbanyeghị ajọ ọnwụnwa a, Job nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke. N’ihi ya, Jehova gwọrọ ya ma “tụkwasị n’ihe nile Job nwere okpukpu abụọ.” (Job 42:10) Setan emebilighị ikwesị ntụkwasị obi Job, ma o nwewo ike ime ka ọtụtụ ndị si n’ebe Chineke nọ pụọ. Bible na-asị: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.”​—1 Jọn 5:19.

21. (a) Olee otú Setan si gosipụta ọchịchọ o nwere ka e fee ya ofufe? (b) Gịnị mere Jizọs ji jụ ife Setan ofufe?

21 Setan chọrọ ka anyị fee ya ofufe. E mere ka nke a doo anya n’ọnwụnwa ọ nwara Jizọs ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga. Bible na-akọ, sị: “Ekwensu kpọọrọ [Jizọs] gaa n’ugwu dị oké elu, ma gosi ya alaeze nile nke ụwa na ebube ha, wee sị ya: ‘Ihe ndị a nile ka m ga-enye gị ma ọ bụrụ na ị daa n’ala kpọọ isiala nye m.’” Jizọs jụrụ ajụ, na-asị: “Pụọ, Setan! N’ihi na e dere, sị, ‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa nanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.” (Matiu 4:​8-10) Jizọs maara iwu Jehova nke ọma, o meghịkwa ihe Setan chọrọ.

Ndị Mmụọ Ọjọọ

22. Olee ihe ndị mmụọ ọjọọ meworo ndị mmadụ?

22 Ndị mmụọ ozi ndị ọzọ sonyeere Setan n’inupụrụ Chineke isi. Ndị mmụọ ozi ọjọọ ndị a bụ ndị iro nke ndị mmadụ bi n’ụwa. Afọ tara ha mmiri, ha nwekwara obi ọjọọ. N’oge ndị gara aga, ha mere ka ụfọdụ ndị daa ogbi ma kpuo ìsì. (Matiu 9:​32, 33; 12:22) Ha mere ka ndị ọzọ daa ọrịa ma ọ bụ mee ka ha na-eme ara ara. (Matiu 17:​15, 18; Mak 5:​2-5) Ọbụna ha mekpọrọ ụmụntakịrị ọnụ.​—Luk 9:42.

23. (a) Gịnị ka ndị mmụọ ọjọọ na-achọ n’aka ndị mmadụ? (b) Gịnị ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ghọgbuworo ndị mmadụ ịdị na-eme?

23 Dị ka Setan, ndị ajọ mmụọ a chọrọ ka e fee ha ofufe. Kama ịjụ ofufe ụmụ mmadụ​—n’igosi na ha ghọtara na ọ bụ nanị Jehova ka e kwesịrị ife ofufe​—ọ na-agụsi ha agụụ ike, ha na-achọ ya, ha na-akwalitekwa ya. Site n’aghụghọ, ụgha, na ụjọ, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya emewo ka ndị mmadụ na-efe ha ofufe. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị amaghị na ha na-efe Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ofufe. Ọ ga-eju ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ anya ịmata na okpukpe ha na-enye Setan otuto. Ma, Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Ihe ndị mba ọzọ na-achụ n’àjà, ha na-achụ ha nye ndị mmụọ ọjọọ, ọ bụghịkwa nye Chineke.”​—1 Ndị Kọrint 10:20.

24. Gịnị bụ otu atụmatụ Setan ji na-eduhie ndị mmadụ?

24 Otu ụzọ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya siworo duhie ndị mmadụ ife ha ofufe bụ site n’ịgbasa echiche na-ezighị ezi banyere ndị nwụworo anwụ. Ka anyị lee ihe Bible na-akụzi banyere nke a.

a Akwụkwọ bụ́ Koran na-ezo aka n’ọmụmụ a mụrụ Jizọs n’ụzọ ọrụ ebube na Surah 19 (Meri). Ọ na-asị: “Anyị zigaara [Meri] mmụọ Anyị n’ọdịdị nwoke nke tojuru etoju. Mgbe ọ [Meri] hụkwara ya, ọ sịrị: ‘Ka Onye Ebere chebe m pụọ n’aka gị! Ọ bụrụ na ị na-atụ egwu Onyenwe anyị, hapụ m gawara onwe gị.’ ‘Abụ m onye ozi nke Onyenwe gị,’ ka ọ zaghachiri, ‘abịawokwa m inye gị nwa nwoke dị nsọ.’ ‘Olee otú m ga-esi mụọ nwa,’ ka ọ zaghachiri, ‘ebe m bụ nwanyị na-amaghị nwoke, nke nwoke ọ bụla na-akpatụbeghị aka?’ ‘Nke ahụ bụ uche Onyenwe gị,’ ka ọ zaghachiri. ‘Nke ahụ abụghịrị Ya ihe siri ike. “Ọ ga-abụrụ ihe a kpọrọ mmadụ ihe àmà,” ka Onyenwe anyị na-ekwu, “bụrụkwa ngọzi sitere n’Aka Anyị. Nke a bụ ihe Anyị kwubiworo.”’”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya