Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 12/8 p. 24-27
  • Olee Ndị Bi n’Ógbè Ndị Mmụọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ndị Bi n’Ógbè Ndị Mmụọ?
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova, Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile
  • Ndị Mmụọ Ozi, Ndị Ozi Dị Ike nke Chineke
  • Setan na Ndị Mmụọ Ọjọọ, Ndị Iro Chineke na Mmadụ
  • Olee Ebe Ndị Nna Ochie Nọ?
  • Ịlaghachi n’Ájá
  • Olee Ndị Bi n’Ógbè Ndị Bụ́ Mmụọ?
    Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
  • Olee Ebe Ndị Nna Nna Anyị Hà Nọ?
    Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
  • Ndị Mmụọ Adịbeghị Ndụ n’Ụwa ma Nwụọ
    Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?
  • È Nwere Ike Ịhụ Ndị Bụ́ Mmụọ Anya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 12/8 p. 24-27

Olee Ndị Bi n’Ógbè Ndị Mmụọ?

ỤWA aghọwo otu “nnukwu ụlọ ahịa” nke nkwenkwe okpukpe na ụkpụrụ okwukwe. N’Africa nanị, e nwere ọtụtụ puku òtù okpukpe, nke ọ bụla na echiche nke ya banyere ihe na-eme n’ógbè ndị mmụọ. Ma iji nweta ihe ọmụma doro anya nke bụkwa eziokwu, ọ dị anyị mkpa ilegara Bible anya. Ọ na-akọwapụta ndị mmụọ—ma ndị ọma ma ndị ọjọọ—ndị bi n’ógbè ndị mmụọ. Ọ na-egosikwa onye anyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịrịọ maka enyemaka na nchebe.

Jehova, Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile

Okpukpe ọdịnala n’Africa na-akụzi na ọ bụ Chineke nke pụrụ ime ihe nile na-elekọta ndị nna ochie na chi dị iche iche. Akwụkwọ bụ́ African Mythology na-ekwu, sị: “E nweghị obi abụọ ọ bụla na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị Africa nile, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ha nile, kwere n’Onye Kasị Elu, bụ́ onye okike nke ihe nile.” Akwụkwọ bụ́ African Religion in African Scholarship na-ekwu, sị: “Ebe ọ bụ Chineke bụ onye na-achịkwa eluigwe na ala n’ụzọ a na-akparaghị ókè, chi ndị ọzọ nile na ike nile dị adị n’ihi Ya. O nwere ikike na ịbụisi a na-akparaghị ókè.”

Bible na-ekweta na e nwere Onye kasịnụ n’ógbè ndị mmụọ. Ọ na-akọwa ya dị ka “Chineke kachasị chi nile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile, Chineke ukwu ahụ, bụ́ dike, dịkwa egwu, Onye na-ahụghị mmadụ ihu ọma n’ikpe, Onye na-anaraghị ihe iri ngo.”—Deuterọnọmi 10:17.

N’ebe nile n’Africa e nwere ọtụtụ narị aha na utu aha e nyere onye ahụ e lere anya dị ka onye kasị elu. Ma, gịnị ka Okwu Chineke na-ekwu banyere aha Chineke ahụ? Ọbụ abụ dere, sị: “Gị onwe gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” (Abụ Ọma 83:18) Aha nsọ a pụtara ihe karịrị ugboro 7,000 n’ihe ndekọ Bible, ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị nsụgharị Bible ejiriwo utu aha ndị dị ka “Chineke” ma ọ bụ “Onyenwe anyị” dochie ya.

N’ihi na Jehova nwere ike kasịnụ, ọ pụrụ inyere anyị aka. Ọ na-akọwa onwe ya dị ka “Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu; Onye na-edebere [ọtụtụ puku] ebere, Onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie: ma ọ dịghị ụzọ ọ bụla Ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị.”—Ọpụpụ 34:6, 7; 1 Samuel 2:6, 7.

Ndị Mmụọ Ozi, Ndị Ozi Dị Ike nke Chineke

Ogologo oge tupu Jehova ekee mmadụ ma ọ bụ ọbụna ụwa n’onwe ya, o kere ndị mmụọ n’eluigwe. Bible na-ekwu na mgbe Chineke “tọrọ ntọala ụwa . . . , ụmụ Chineke [ndị mmụọ ozi] nile wee tisie mkpu ọṅụ ike.” (Job 38:4-7) E nwere ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi. Ohu Jehova bụ́ Daniel dere banyere ọhụụ nke ihe ndị dị n’eluigwe nke ọ hụrụ “[puku kwuru puku] ndị ozi na-ejere [Chineke] ozi, na [iri puku kwuru iri puku] na-eguzokwa ọtọ n’ihu Ya.”—Daniel 7:10.

Onye mbụ bụ́ mmụọ Jehova kere bụ onye e mesịrị mara dị ka Jisọs Kraịst. (Jọn 17:5; Ndị Kọlọsi 1:15) Tupu ya adị ndụ dị ka mmadụ n’ụwa, Jisọs dịrị ndụ n’eluigwe dị ka mmụọ e kere eke dị ike. Mgbe ọnwụ ya dị ka mmadụ gasịrị, a kpọlitere Jisọs n’ọnwụ gaa n’eluigwe, bụ́ ebe ọ maliteghachiri ịdị ndụ dị ka mmụọ e kere eke dị ike.—Ọrụ 2:32, 33.

Jisọs nwere ike dị ukwuu n’eluigwe. Na Jud 9, a kpọrọ Jisọs, bụ́ onye a makwaara dị ka Maịkael, “onye isi mmụọ ozi,” nke pụtara na ọ bụ mmụọ ozi bụ́ isi. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:16) O nwekwara ikike n’ebe ụwa dị. Jehova enyewo ya “ọchịchị, na ebube, na alaeze, ka ndị nile dị iche iche na mba nile na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche wee [jeere ya ozi, NW].” (Daniel 7:13, 14) N’agbanyeghị ikike ya dị ukwuu, Jisọs na-anọgide n’okpuru Nna ya, bụ́ Jehova.—1 Ndị Kọrint 11:3.

Ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi, ha na-ejekwara ndị ohu Chineke nọ n’elu ala ozi. Pọl onyeozi dere, sị: “Hà [ndị mmụọ ozi] nile abụghị ndị mmụọ na-efe ofufe, ndị e zipụtara ije ozi n’ihi ndị gaje iketa nzọpụta?” (Ndị Hibru 1:14) Nchegbu ha karịsịa bụ ka ndị mmadụ mụta eziokwu banyere Jehova. Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ otu “mmụọ ozi . . . ka ọ na-efe n’etiti eluigwe, na-enwe ozi ọma ebighị ebi izisara ndị na-anọdụ n’elu ụwa, bụ́ mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla; ọ na-ewerekwa oké olu sị, Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa Ya otuto.”—Mkpughe 14:6, 7.

Setan na Ndị Mmụọ Ọjọọ, Ndị Iro Chineke na Mmadụ

N’ụzọ dị mwute, ọ bụghị ndị mmụọ ozi nile kwesịworo ntụkwasị obi nye Chineke. Ụfọdụ nupụụrụ ya isi, na-aghọ ndị iro nke ma Chineke ma ihe a kpọrọ mmadụ. Onye nnupụisi bụ isi bụ Setan bụ́ Ekwensu.

Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị taa na-agọnarị na Setan dị, ọ dịghị onye na-agọnarị na ihe ọjọọ dị. Ikwere n’ihe ọjọọ ma ghara ikwere na e nwere ihe kpatara ya na-eduga ná “nsogbu a na-apụghị ịgbanahụ agbanahụ,” ka akwụkwọ bụ́ The Death of Satan na-ekwu. “Ọ na-adị anyị ka e nwere ihe ọdịbendị anyị na-adịkwaghị enye anyị ìgwè okwu iji kọwaa.”

N’ụzọ dị iche, Bible nwere ìgwè okwu ahụ, na-akọwapụtakwa n’ụzọ doro anya eziokwu banyere isi iyi nke ihe ọjọọ. Ọ na-akọwa na ndị mmụọ ozi Jehova kere bụcha ndị ezi omume, dịkwa mma; ọ dịghị ajọ mmụọ ozi ọ bụla o kere. (Deuterọnọmi 32:4; Abụ Ọma 5:4) Ma, e nyere ndị mmụọ ozi ahụ, dị ka ụmụ mmadụ, ikike ime nhọrọ n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ. Otu n’ime ụmụ ndị ikom ndị a bụ́ mmụọ zuru okè zụlitere ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị ịzọtara onwe ya ofufe nke dịịrị Jehova n’ụzọ ziri ezi. O si otú a nweta aha ahụ bụ́ Setan, nke pụtara “Onye Mmegide.” (Tụlee Jemes 1:14, 15.) Setan abụghị nanị onye aghụghọ, dị ka okpukpe ụfọdụ n’Africa na-akụzi; ọ bụghịkwa “onye nchebe” nke na-echebe ndị na-achụrụ ya àjà mgbe nile. Bible na-egosi ya ịbụ nnọọ ajọ onye, nke dịkwa obi ọjọọ.

Ndị mmụọ ozi ọzọ sonyere ná nnupụisi Setan megide Chineke. Ndị ajọ mmụọ ozi ndị a bụkwa ndị iro nke ụmụ mmadụ n’elu ala. Ha nwere nnọọ obi ọjọọ, dịkwa njọ. N’oge ndị gara aga, ha mere ka ụmụ mmadụ ụfọdụ bụrụ ndị ogbi na ndị ìsì. (Matiu 9:32, 33; 12:22) Ndị ọzọ, tinyere ụmụntakịrị, ka ha tiri ọrịa ma ọ bụ isi mgbaka. (Matiu 17:15, 18; Mak 5:2-5) N’ụzọ doro anya, ọ dịghị onye isi zuru okè nke ga-achọ ihe ọ bụla ga-ejikọ ya na Setan ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ ahụ.

Olee Ebe Ndị Nna Ochie Nọ?

Ọtụtụ nde ndị mmadụ n’Africa na ebe ndị ọzọ kwere na ọnwụ abụghị njedebe nke ndụ kama nanị mgbanwe, ngafe ná ndụ n’ógbè ndị mmụọ, ógbè nke ma chi dị iche iche ma ndị nna ochie. Ọkà mmụta bụ́ John Mbiti, bụ́ diọkà n’okpukpe Africa, na-ede banyere nkweta ná ndị nna ochie, bụ́ ndị ọ na-akpọ “ndị nwụrụ anwụ dị ndụ,” sị: “Ndị a bụ ‘ndị mmụọ’ nke ndị Africa kasị enwe nchegbu banyere ha . . . Ha maara, na-enwekwa mmasị n’ihe na-eme n’ezinụlọ [n’elu ụwa]. . . . Ha bụ ndị nduzi nke ihe ndị metụtara ezinụlọ, ọdịnala, ụkpụrụ omume na ihe omume. Mmehie ihe n’okwu ndị a bụ kpọmkwem mmehie ihe megide ndị nna ochie bụ́ ndị, n’ọkwá ahụ, na-eje ozi dị ka ndị uwe ojii a na-adịghị ahụ anya nke ezinụlọ na ógbè dị iche iche. N’ihi na ha ka bụ ‘ndị mmadụ’, ya mere, ndị nwụrụ anwụ dị ndụ bụ ìgwè ndị ngabita kasị mma n’agbata ụmụ mmadụ na Chineke: ha maara mkpa ụmụ mmadụ, ha na ụmụ mmadụ anọwo n’ebe a ‘n’oge na-adịbeghị anya,’ n’otu mgbe ahụkwa ha nwere ohere zuru ezu iji ụzọ e si agwa Chineke okwu eme ihe.”

Ma, gịnị ka Bible na-ekwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ? Ọ na-egosi na e nweghị ihe dị ka “ndị nwụrụ anwụ dị ndụ.” Ma ndị mmadụ adịghị ndụ, ya abụrụ na ha nwụrụ anwụ—ọ bụghị ha abụọ ma ọlị. Okwu Chineke na-akụzi na ndị nwụrụ anwụ enweghị ike ịnụ ihe, ịhụ ụzọ, ikwu okwu, ma ọ bụ iche echiche. Ndị nwụrụ anwụ anọghị n’ọnọdụ ilekọta ndị dị ndụ. Bible na-ekwu, sị: “Ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla . . . Ma ịhụnanya ha, ma ịkpọasị ha, ma ekworo ha, na mgbe dị anya gara aga ka ọ laworo n’iyi . . . Ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Sheol, NW; ili], ebe gị onwe gị n’ala.” (Eklisiastis 9:5, 6, 10) “[Mmadụ] wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.”—Abụ Ọma 146:4.

Ịlaghachi n’Ájá

Ọ bụrụ na nke a na-esiri gị ike ikweta, tụlee ihe mere nwoke mbụ, bụ́ Adam. Jehova kpụrụ Adam site ‘n’ájá sitere n’ala.’ (Jenesis 2:7) Mgbe Adam nupụụrụ iwu Jehova isi, ntaramahụhụ ya bụ ọnwụ. Chineke gwara ya, sị: “Ị ga-alata n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.”—Jenesis 3:19.

Tupu Jehova esi n’ájá kee Adam, Adam adịghị. Ya mere mgbe ọ ‘laghachiri n’ala,’ ọ ghọghachiri ihe na-enweghị ndụ, dị ka ájá. Ọ gafeghị n’ógbè ndị nna ochie bụ́ mmụọ. Ọ gaghị eluigwe ma ọ bụ hel. Mgbe ọ nwụrụ, nke ahụ bụ ọgwụgwụ ya.

Otu ihe ahụ ọ̀ na-eme ụmụ mmadụ ndị ọzọ mgbe ha nwụrụ? Ee, ọ na-eme. Bible na-ekwu, sị: “Ha nile [ma ụmụ mmadụ ma anụmanụ] na-ala n’otu ebe; ha nile siri n’ájá pụta, ha nile na-alaghachikwa n’ájá.” (Eklisiastis 3:20) Bible na-ekwe nkwa na Chineke ga-akpọte ndị nwụrụ anwụ gaa ná ndụ n’ụwa paradaịs, ma oge ahụ ka dị n’ihu. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) Ka ọ dị ugbu a, anyị ekwesịghị ịtụ ndị nwụrụ anwụ egwu ma ọ bụ ịchụrụ ha àjà, ebe ọ bụ na ha apụghị inyere anyị aka ma ọ bụ imerụ anyị ahụ.

Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya chọrọ iduhie ndị mmadụ banyere ọnọdụ ndị nna ochie ha nwụrụ anwụ, ya mere ha na-agbasa ụgha ahụ bụ na ndị mmadụ na-adị ndụ gaa n’ihu mgbe ha nwụsịrị. Otu ụzọ ha si eme nke a bụ site n’akụkọ ụgha dị iche iche. (1 Timoti 4:1) Ha na-ejikwa ọhụụ, nrọ, na ndị na-ajụta ndị mmụọ ihe na-eduhie ndị mmadụ iche na ha esorowo ndị nwụrụ anwụ kwurịta okwu. Ma ọ bụghị ndị nwụrụ anwụ ka a na-eso ekwurịta okwu. Kama nke ahụ, ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ, bụ́ ndị na-eme ka a ga-asị na ha bụ ndị nwụworo anwụ. Ọ bụ ya mere Jehova ji kagbuo n’ụzọ siri ike ndị na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ihe, ma ọ̀ bụ ihu na ihu ma ọ bụ site n’ụzọ ndị ọzọ, dị ka ịjụ ndị mmụọ ase.—Deuterọnọmi 18:10-12.

[Foto dị na peeji nke 26]

Site n’ọhụụ, nrọ, na ndị na-ajụta ndị mmụọ ihe, ndị mmụọ ọjọọ na-eduhie ma na-emenye ndị mmadụ egwu

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

Iji duhie ndị mmadụ, ndị mmụọ ọjọọ na-eme ka a ga-asị na ha bụ ndị nwụworo anwụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya