Ọpụpụ
34 Jehova wee gwa Mosis, sị: “Wapụtara onwe gị mbadamba nkume abụọ ndị dị ka ndị mbụ ahụ.+ M ga-edekwa okwu ndị dị ná mbadamba nkume ndị mbụ ahụ+ ị kụriri+ ná mbadamba nkume ndị a. 2 Jikere maka ụtụtụ, n’ihi na n’ụtụtụ, ị ga-agbago n’Ugwu Saịnaị kwụrụ n’ihu m n’ebe ahụ, n’elu ugwu ahụ.+ 3 Ma e nweghị onye ga-eso gị gbagoo. Ka a ghara ịhụ onye ọ bụla ọzọ n’ebe ọ bụla n’ugwu ahụ. Ka a gharadị inwe ìgwè atụrụ ma ọ bụ ìgwè ehi ga-ata ahịhịa n’ihu ugwu ahụ.”+
4 Mosis wee wapụta mbadamba nkume abụọ ndị dị ka ndị mbụ ahụ ma bilie n’isi ụtụtụ gbagoo n’Ugwu Saịnaị, otú Jehova nyere ya n’iwu. O bu mbadamba nkume abụọ ahụ n’aka ya. 5 Jehova gbadatara+ n’ígwé ojii ma kwụrụ n’ebe Mosis kwụ wee kọsaa aha Jehova.*+ 6 Jehova nọ na-agafe n’ihu ya ma na-ekwu, sị: “Jehova, Jehova, Chineke nwere ọmịiko*+ ma na-eme ebere,+ onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ onye ịhụnanya ya*+ na eziokwu ya+ dị ukwuu, 7 onye na-egosi puku kwuru puku ọgbọ na ọ hụrụ ha n’anya,*+ onye na-agbaghara ajọ omume na mmebi iwu na mmehie.+ Ma e nweghị ihe ga-eme ka ọ hapụ ịta onye ikpe mara ahụhụ,+ kama ọ na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ nakwa ọgbọ nke atọ na ọgbọ nke anọ ahụhụ n’ihi mmehie ndị nna ha mere.”+
8 Mosis mere ọsọ ọsọ hulata kpọọ isiala. 9 O wee sị: “Biko, Jehova, ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, Jehova, soro anyị gaa ma nọnyere anyị+ n’agbanyeghị na anyị bụ ndị isi ike,*+ gbagharakwa ajọ omume anyị na mmehie anyị+ ma were anyị ka ndị gị.” 10 Jehova wee sị: “Lee, mụ na unu na-agba ndụ: N’ihu ndị gị niile ka m ga-arụ ọrụ ndị dị ebube a na-arụtụbeghị n’ụwa niile ma ọ bụ na mba niile.+ Ndị niile unu na ha bi ga-ahụkwa ọrụ m, n’ihi na ọ bụ ihe dị ịtụnanya ka m ga-emere unu.+
11 “Gee ntị nke ọma n’iwu m na-enye gị taa.+ M na-achụpụrụ unu ndị Amọraịt, ndị Kenan, ndị Het, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus.+ 12 Kpachara anya ka gị na ndị bi n’ala ahụ ị na-aga ghara ịgba ndụ,+ ma ọ́ bụghị ya, ọ ga-abụrụ unu ọnyà.+ 13 Ma unu ga-akwatusị ebe ịchụàjà ha. Unu ga-akụrisị ogidi arụsị ha. Unu ga-egbutusịkwa ogwe osisi arụsị* ha.+ 14 Akpọrọla chi ọzọ isiala,+ n’ihi na ihe e ji mara Jehova bụ* na ọ chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe.* N’eziokwu, ọ bụ Chineke onye chọrọ ka a na-efe naanị ya.+ 15 Kpachara anya ka gị na ndị bi n’ala ahụ ghara ịgba ndụ, n’ihi na mgbe ha ga-akpa àgwà ka ndị akwụna na-efe chi ha ma na-achụrụ chi ha àjà,+ ha ga-akpọ gị, ị ga-erikwa ihe ha ji chụọ àjà.+ 16 Ị ga-alụtakwara ụmụ gị ndị nwoke ụmụ ha ndị nwaanyị,+ ụmụ ha ndị nwaanyị ga-akpakwa àgwà ka ndị akwụna fee chi ha ma mee ka ụmụ gị ndị nwoke kpaa àgwà ka ndị akwụna gaa fewe chi ha.+
18 “Ị ga na-eme Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko.+ Ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko otú m nyere gị n’iwu. Mee ya ụbọchị asaa n’oge a kara aka n’ọnwa Ebib,*+ n’ihi na ọ bụ n’ọnwa Ebib ka i si n’Ijipt pụta.
19 “Ọ bụ m nwe nwoke ọ bụla e bụ ụzọ mụọ+ nakwa anụmanụ ọ bụla bụ́ oké anụ ụlọ gị bu ụzọ mụọ,* ma ọ̀ bụ nke ehi mụrụ ma ọ̀ bụ nke atụrụ mụrụ.+ 20 Ị ga-eji atụrụ gbara jakị ọ bụla e bu ụzọ mụọ. Ma ọ bụrụ na ị gbaraghị ya, ị ga-akụji ya olu. Ị ga-agbara nwa nwoke ọ bụla i bu ụzọ mụọ n’ụmụ gị ndị nwoke.+ E nweghị onye ga-agba aka bịa n’ihu m.
21 “Ị ga-arụ ọrụ ụbọchị isii, ma n’ụbọchị nke asaa, ị ga-ezu ike.*+ Ị ga-ezu ike, ma n’oge a na-akọ ihe ma n’oge a na-ewe ihe ubi.
22 “Ị ga-eji ọka wit mbụ kara aka ị ghọtara n’ubi mee Ememme Izu. Ị ga-emekwa Ememme Ịchịkọbata Ihe* ná ngwụcha afọ.+
23 “Ugboro atọ n’afọ, ụmụ nwoke unu niile ga-abịa n’ihu ezi Onyenwe unu, bụ́ Jehova, Chineke Izrel.+ 24 N’ihi na m ga-achụpụrụ gị mba ndị ahụ,+ m ga-emekwa ka ala gị saa mbara. E nweghịkwa onye ga-achọ iwere ala gị mgbe ị na-aga n’ihu Jehova* bụ́ Chineke gị ugboro atọ n’afọ.
25 “Mgbe i ji anụ na-achụrụ m àjà, achụkọtala ọbara ya na ihe ọ bụla e tinyere ihe na-eko achịcha.+ E kwesịghị idosa anụ e ji chụọ àjà Ememme Ngabiga ruo ụtụtụ.+
26 “Mkpụrụ kacha mma ná mkpụrụ mbụ kara aka ala gị mepụtara ka ị ga-eweta n’ụlọ Jehova bụ́ Chineke gị.+
“Esila nwa ewu n’ime mmiri ara nne ya.”+
27 Jehova gwakwara Mosis, sị: “Ị ga-ede okwu ndị a ede,+ n’ihi na mụ na gị na ndị Izrel ga-agbakwasị ụkwụ n’ihe ndị a m kwuru gbaa ndụ.”+ 28 Ya na Jehova nọgidere n’ebe ahụ ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị. O righị nri ọ bụla, ọ ṅụghịkwa mmiri ọ bụla.+ O dekwara ihe ndị e kwuru n’ọgbụgba ndụ a, bụ́ Iwu Iri ahụ,* ná mbadamba nkume ndị ahụ.+
29 Mosis sizi n’Ugwu Saịnaị gbadata, o bukwa mbadamba nkume abụọ e dere Ihe Àmà ahụ n’aka ya.+ Mgbe Mosis si n’ugwu ahụ gbadata, ọ maghị na ihu ya na-enwu ka ìhè maka na ya na Chineke kwurịtara okwu. 30 Mgbe Erọn na ndị Izrel niile hụrụ Mosis, ha chọpụtara na ihu ya na-enwu ka ìhè, ụjọ ekweghịkwa ha gaa ya nso.+
31 Ma Mosis kpọrọ ha, Erọn na ndị niile so ná ndị isi nzukọ ahụ wee bịakwute ya, Mosis agwa ha okwu. 32 Mgbe e mechara, ndị Izrel niile bịara ya nso. O wee gwa ha ihe niile Jehova nyere ya n’iwu n’Ugwu Saịnaị.+ 33 Mgbe ọ bụla Mosis gwachara ha okwu, ọ na-eji ákwà kpuchie ihu ya.+ 34 Ma mgbe ọ bụla Mosis gara n’ihu Jehova ka ya na ya kwurịta okwu, ọ na-ewepụ ákwà ahụ ruo mgbe ọ pụtara.+ Ọ na-apụtazi gwa ndị Izrel ihe ndị e nyere ya n’iwu.+ 35 Ndị Izrel na-ahụ na ihu Mosis na-enwu ka ìhè. Mosis na-ewere ákwà ahụ kpuchighachi ihu ya ruo mgbe ọ gara ka ya na Chineke* kwuo okwu.+