Isi nke 3
Ònye Bụ Ezi Chineke Ahụ?
1. N’ihi gịnị ka ọtụtụ ji ekwenye n’okwu mmeghe nke Bible?
MGBE i lere anya n’eluigwe gbachapụrụ agbachapụ n’abalị, ọ̀ bụ na ọ dịghị ebu gị isi ịhụ ọtụtụ kpakpando? Olee otú i si akọwa ịdị adị ha? Gịnịkwa banyere ihe ndị dị ndụ n’elu ụwa—okooko ọhịa ndị tụrụ àgwà dị iche iche, nnụnụ na ọmarịcha ukwe ha, anụ whale dị ike ndị na-amali n’ime oké osimiri? Ndepụta ahụ enweghị ọgwụgwụ. Ihe a dum apụghị ịnọkatawo dịrị. Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị ji ekwenye n’okwu mmeghe nke Bible: “Na mbụ Chineke kere eluigwe na ụwa”!—Jenesis 1:1.
2. Gịnị ka Bible na-ekwu banyere Chineke, gịnịkwa ka ọ na-agba anyị ume ime?
2 Ihe a kpọrọ mmadụ ekwekọrịtaghị ma ọlị n’okwu banyere Chineke. Ụfọdụ na-eche na Chineke bụ ikike na-abụghị onye. Ọtụtụ nde mmadụ na-efe ndị nna nna ha nwụrụ anwụ, na-ekwere na Chineke anọtụghị nso n’ebe a pụrụ ijekwuru ya. Ma Bible na-ekpughe na ezi Chineke ahụ bụ onye n’ezie nke na-egosi mmasị na-ekpo ọkụ n’ebe anyị nọ n’otu n’otu. Ọ bụ ya mere o ji na-agba anyị ume ‘ịchọ Chineke,’ na-asị: “Ọ nọghị n’ebe dị anya n’ahụ onye ọ bụla n’ime anyị.”—Ọrụ 17:27.
3. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe na-ekweghị omume ise onyinyo Chineke?
3 Gịnị ka Chineke dị ka ya? Ole na ole n’ime ndị ohu ya ahụwo ọhụụ banyere ịdị adị ya dị ebube. N’ime ndị a o nyewo ihe atụ onwe ya dị ka onye na-anọdụ n’ocheeze, mgbukepụ ìhè nke na-atụ ụjọ na-esitekwa n’ebe ọ nọ. Otú ọ dị, ndị hụrụ ọhụụ ndị dị otú ahụ adịghị mgbe ha nyere nkọwa nke otu ihu doro anya. (Daniel 7:9, 10; Mkpughe 4:2, 3) Ọ bụ n’ihi na “Chineke bụ Mmụọ”; o nweghị anụ ahụ nkịtị. (Jọn 4:24) N’ezie, ọ pụghị ikwe mee ise onyinyo nkịtị ziri ezi nke Onye Okike anyị, n’ihi na “ọ dịghị onye ọ bụla hụworo Chineke mgbe ọ bụla.” (Jọn 1:18; Ọpụpụ 33:20) Ma, Bible na-akụziri anyị ihe dị ukwuu banyere Chineke.
EZI CHINEKE AHỤ NWERE AHA
4. Olee ùtú aha ụfọdụ nwere ihe ha pụtara bụ́ ndị e ji mee ihe maka Chineke n’ime Bible?
4 N’ime Bible, e ji okwu ndị dị ka “Chineke Nke pụrụ ime ihe nile,” “Onye kachasị ihe nile elu,” “Onye Okike Ukwu,” “Onye Ozizi Kasị Ukwu,” “Eze Onyenwe anyị,” na “Eze nke mgbe nile,” kọwaa ezi Chineke ahụ. (Jenesis 17:1; Abụ Ọma 50:14; Eklisiastis 12:1, NW; Aịsaịa 30:20, NW; Ọrụ 4:24, NW; 1 Timoti 1:17) Ịtụgharị uche n’ùtú aha ndị dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka ito eto n’ihe ọmụma nke Chineke.
5. Gịnị bụ aha Chineke, ugbo olekwa ka ọ pụtara n’Akwụkwọ Nsọ Hibru?
5 Ma, Chineke nwere aha pụrụ iche nke pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 7,000 ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nanị—ọtụtụ ugbo karịa nke ọ bụla n’ùtú aha ya nile. Ihe dị ka 1,900 afọ gara aga, ndị Juu ji nkwenkwe na-enweghị isi kwụsị ịkpọ aha Chineke ahụ. E tinyeghị ụdaume na Hibru e ji dee Bible. N’ihi ya, o nweghị ụzọ a ga-esi jide n’aka banyere otú Mosis, Devid, ma ọ bụ ndị ọzọ n’oge ochie si kpọọ mkpụrụ okwu anọ ahụ bụ́ (יהוה) mejupụtara aha Chineke. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-enye echiche na a pụrụ ịkpọwo aha Chineke “Yawe,” ma ha apụghị iji ya n’aka. A nọwo na-eji ụzọ Igbo e si akpọpụta ya bụ́ “Jehova” na-eme ihe ruo ọtụtụ afọ, a na-anakwerekwa ụdị ya n’ọtụtụ asụsụ nke ukwuu taa.—Lee Ọpụpụ 6:3 na Aịsaịa 26:4 na King James Version.
IHE MERE I KWESỊRỊ IJI JIRI AHA CHINEKE NA-EME IHE
6. Abụ Ọma 83:18 na-ekwu gịnị banyere Jehova, n’ihi gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji na-eji aha ya eme ihe?
6 Aha pụrụ iche nke Chineke, bụ́ Jehova, na-edo ya iche n’ebe chi ọzọ nile nọ. Ọ bụ ya mere aha ahụ ji pụta ọtụtụ ugboro otú a n’ime Bible, karịsịa n’ihe odide Hibru ya. Ọtụtụ ndị nsụgharị na-ahapụ iji aha Chineke ahụ eme ihe, ma Abụ Ọma 83:18 na-ekwu n’ụzọ doro anya, sị: “Gị onwe gị, Onye aha gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” Ya mere o kwesịrị ekwesị nye anyị iji aha aka Chineke na-eme ihe mgbe anyị na-ekwu banyere ya.
7. Gịnị ka ihe aha ahụ bụ́ Jehova pụtara na-akụziri anyị banyere Chineke?
7 Aha ahụ bụ́ Jehova bụ ụdị nke ngwaa Hibru pụtara “ịghọ.” Ya mere, aha Chineke pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Jehova Chineke si otú a kọwaa onwe ya dị ka Onye Nzube Ukwu. Ọ na-eme mgbe nile ka nzube ya ghọọ ihe dị adị. Nanị ezi Chineke ahụ pụrụ ịza aha a n’ụzọ kwesịrị ekwesị, n’ihi na ụmụ mmadụ apụghị mgbe ọ bụla ijide n’aka na atụmatụ ha ga-enwe isi. (Jemes 4:13, 14) Nanị Jehova pụrụ ịsị: “Otú a ka okwu m dị nke na-esi n’ọnụ m pụta. . . . [Ọ ga-aga] nke ọma n’ihe M zigara ya.”—Aịsaịa 55:11.
8. Olee nzube Jehova mara ọkwa ya site n’ọnụ Mosis?
8 Ndị nna ochie ndị Hibru bụ́ Abraham, Aịsak, na Jekọb ‘kpọkuru aha Jehova’ n’otu n’otu, ma ha amaghị ihe dum aha Chineke ahụ pụtara. (Jenesis 21:33; 26:25; 32:9; Ọpụpụ 6:3) Mgbe Jehova mesịrị kpughee nzube ya ịgbapụta ụmụ ha, bụ́ ndị Israel, site n’ohu n’Ijipt ma nye ha “ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,” nke a pụrụ iyiwo ihe na-apụghị ime eme. (Ọpụpụ 3:17) Ka o sina dị, Chineke mesiri okwu ike banyere ịdị mkpa ruo mgbe ebighị ebi nke aha ya site n’ịgwa onye amụma ya bụ́ Mosis, sị: “Otú a ka ị ga-asị ụmụ Israel, Jehova, bụ́ Chineke nke nna unu hà, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aịsak, na Chineke nke Jekọb, O zitewo m n’ebe unu nọ: nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, nke a bụkwa ihe ncheta m ruo ọgbọ nile.”—Ọpụpụ 3:15.
9. Olee otú Fero si lee Jehova anya?
9 Mosis gwara Fero, bụ́ eze Ijipt, ka o kwe ka ndị Israel gaa fee Jehova n’ọzara. Ma Fero, onye a na-ele ya onwe ya anya dị ka chi nakwa onye na-efe chi ndị ọzọ nke Ijipt, zara: “Ònye bụ Jehova, na m ga-ege ntị n’olu Ya izipụ Israel? amaghị m Jehova, ọzọkwa, m gaghị ezipụ Israel.”—Ọpụpụ 5:1, 2.
10. N’Ijipt oge ochie, gịnị ka Jehova mere iji mezuo nzube ya metụta ndị Israel?
10 Mgbe ahụ Jehova gara n’ihu n’ihu ime ihe iji mezuo nzube ya, na-eme ihe kwekọrọ n’ihe aha ya pụtara. O wetara ihe otiti iri n’ahụ ndị Ijipt oge ochie. Ihe otiti nke ikpeazụ gburu ụmụ mbụ nile nke Ijipt, tinyere ọkpara Fero ahụ dị mpako. Mgbe ahụ ndị Ijipt nụrụ ọkụ n’obi ka ndị Israel laa. Otú ọ dị, ike Jehova metụrụ ụfọdụ ndị Ijipt n’ahụ nke ukwuu nke na ha sonyeere ndị Israel n’ịhapụ Ijipt.—Ọpụpụ 12:35-38.
11. Olee ọrụ ebube Jehova rụrụ n’Osimiri Uhie, gịnịkwa ka a manyere ndị iro ya ikweta?
11 Fero gbara isi akwara na ìgwè ndị agha ya, na-eji ọtụtụ narị ụgbọ agha ịnyịnya na-adọkpụ, buliri ije ịkpụtaghachi ndị ohu ya. Ka ndị Ijipt na-eru nso, Chineke ji ọrụ ebube kewaa Osimiri Uhie ka ndị Israel wee gabiga n’ala akọrọ. Mgbe ndị na-achụ ha banyere n’ala osimiri ahụ, Jehova ‘wezụgara wheel nke ụgbọ ala ha, mee ka ọ dị ha arọ ime ka ha na-aga.’ Ndị agha Ijipt tiri mkpu, sị: “Ka anyị gbapụ n’ihu Israel; n’ihi na Jehova na-eburu ha agha megide ndị Ijipt.” Ma oge agabigala nnọọ. Nnukwute mgbidi ndị ahụ nke mmiri dakpọrọ ma “kpuchie ụgbọ ala nile, na ndị ịnyịnya, bụ́ usuu ndị agha nile nke Fero.” (Ọpụpụ 14:22-25, 28) Jehova si otú a meere onwe ya aha ukwu, e chezọbeghịkwa ihe omume ahụ ruo taa.—Joshua 2:9-11.
12, 13. (a) Olee ihe aha Chineke pụtara nye anyị taa? (b) Gịnị dị ndị mmadụ mkpa ịmụta ngwa ngwa, n’ihi gịnịkwa?
12 Aha Chineke mewooro onwe ya nwere oké ihe ọ pụtara nye anyị taa. Aha ya, Jehova, na-eguzo dị ka ihe mmesi obi ike na ọ ga-eme ka ihe nile o zubeworo ghọọ ihe dị adị. Nke ahụ na-agụnye imezu nzube mbụ ya nke ụwa anyị ịghọ paradaịs. (Jenesis 1:28; 2:8) Iji mezuo nke ahụ, Chineke ga-ekpochapụ ndị nile na-eguzogide ọkaaka ya taa, n’ihi na o kwuwo, sị: “Ha ewee mara na Mụ onwe m bụ Jehova.” (Ezikiel 38:23) Mgbe ahụ Chineke ga-emezu nkwa ya ịgbapụta ndị na-efe ya ofufe baa n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume.—2 Pita 3:13.
13 Ndị nile chọrọ ihu ọma Chineke aghaghị ịmụta ịkpọku aha ya n’okwukwe. Bible na-ekwe nkwa, sị: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya.” (Ndị Rom 10:13) Ee, aha ahụ bụ́ Jehova nwere oké ihe ọ pụtara. Ịkpọku Jehova dị ka Chineke gị na Onye Mgbapụta gị pụrụ iduba gị n’obi ụtọ na-enweghị ọgwụgwụ.
ÀGWÀ DỊ ICHE ICHE NKE EZI CHINEKE AHỤ
14. Àgwà bụ́ isi dịgasị aṅaa nke Chineke ka Bible na-eme ka ha pụta ìhè?
14 Ịmụ banyere mgbapụta Israel site n’Ijipt na-eme ka àgwà anọ bụ́ isi ndị Chineke nwere ná nhazi zuru okè pụta ìhè. Mmeso o mesoro Fero kpughere ike ya dị ebube. (Ọpụpụ 9:16) Ụzọ magburu onwe ya Chineke si hụ maka ọnọdụ ahụ dị mgbagwoju anya gosiri amamihe ya na-enweghị atụ. (Ndị Rom 11:33) O kpughere ikpe ziri ezi ya n’inye ndị ji ịgba isi akwara na-eguzogide ma na-emegbu ndị ya ahụhụ. (Deuterọnọmi 32:4) Otu àgwà pụtakarịsịrị ìhè nke Chineke bụ ịhụnanya. Jehova gosipụtara ịhụnanya dị ịrịba ama site n’imezu nkwa ya banyere ụmụ Abraham. (Deuterọnọmi 7:8) O gosikwara ịhụnanya site n’ikwere ka ụfọdụ ndị Ijipt gbahapụ chi ụgha ha dị iche iche ma rite uru nke ukwuu site n’iwere nguzo ha maka nanị ezi Chineke ahụ.
15, 16. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Chineke siworo gosi ịhụnanya?
15 Ka ị na-agụ Bible, ị ga-arịba ama na ịhụnanya bụ àgwà bụ isi nke Chineke, ọ na-egosipụtakwa ya n’ọtụtụ ụzọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ n’ihi ịhụnanya ka o ji ghọọ Onye Okike ma buru ụzọ soro ndị mmụọ e kere eke kerịta ọṅụ nke ndụ. Ọtụtụ narị nde ndị mmụọ ozi ahụ hụrụ Chineke n’anya, na-etokwa ya. (Job 38:4, 7; Daniel 7:10) Chineke gosikwara ịhụnanya n’ike ụwa na ịkwadebe ya maka ịdị adị mmadụ n’obi ụtọ.—Jenesis 1:1, 26-28; Abụ Ọma 115:16.
16 Anyị na-erite uru site n’ịhụnanya Chineke n’ọtụtụ ụzọ a na-apụghị ịgụta ọnụ. Otu bụ na Chineke ejiwo ịhụnanya mee ahụ anyị n’ụzọ magburu onwe ya nke na anyị pụrụ ịnụ ụtọ ndụ. (Abụ Ọma 139:14) A na-egosi ịhụnanya ya ebe ọ “na-enyekwa . . . mmiri ozuzo na oge mkpụrụ site n’eluigwe, na-emeju obi [anyị] n’ihe ọzụzụ na ọṅụ.” (Ọrụ 14:17) Ọbụna na Chineke “na-eme ka anyanwụ Ya na-awakwasị ajọ mmadụ na ezi mmadụ, Ọ na-emekwa ka mmiri zokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Matiu 5:45) Ịhụnanya na-akpalikwa Onye Okike anyị inyere anyị aka inweta ihe ọmụma Chineke na ijere ya ozi n’obi ụtọ dị ka ndị na-efe ya ofufe. N’ezie, “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ma e nwere ihe karịrị nke ahụ n’ụdị onye ọ bụ.
“CHINEKE NKE NWERE OBI EBERE, ONYE NA-EME AMARA”
17. Gịnị ka anyị na-amụta banyere Chineke n’Ọpụpụ 34:6, 7?
17 Mgbe ndị Israel gafesịrị Osimiri Uhie ahụ, ọ ka dịkwa ha mkpa ịmara Chineke nke ọma karị. Mosis hụtara mkpa nke a wee kpee ekpere, sị: “Ma ugbu a, biko, ọ bụrụ na ahụtawo m amara n’ihu Gị, biko, mee m ka m mara ụzọ Gị nile, m ga-amarakwa Gị, ka m wee hụta amara n’ihu Gị.” (Ọpụpụ 33:13) Mosis matara Chineke nke ọma karị mgbe ọ nụrụ nkwupụta Chineke n’onwe ya: “Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu; Onye na-edebere [ọtụtụ puku] ebere, Onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie: ma ọ dịghị ụzọ ọ bụla Ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị.” (Ọpụpụ 34:6, 7) Chineke na-eji ezi ikpe ahazi ịhụnanya ya, ọ bụghị ichebe ndị na-ama ụma eme mmehie pụọ n’ihe ndị sitere n’omume ọjọọ ha.
18. Olee otú Jehova siworo ghọọ onye ebere?
18 Dị ka Mosis mụtara, Jehova na-eme ebere. Onye dị ebere na-enwe ọmịiko n’ahụ ndị na-ata ahụhụ ma na-anwa iwetara ha ahụ efe. N’ihi ya Chineke egosiwo ihe a kpọrọ mmadụ ọmịiko site n’ime ndokwa maka ahụ efe na-adịgide adịgide pụọ n’ahụhụ, ọrịa, na ọnwụ. (Mkpughe 21:3-5) Ndị na-efe Chineke pụrụ inweta ọdachi n’ihi ọnọdụ ndị dị n’ụwa ọjọọ a, ma ọ bụ ha pụrụ ime ihe n’ụzọ amamihe na-adịghị ya wee zute nsogbu. Ma ọ bụrụ na ha ejiri ịdị obi umeala chigharịkwuru Jehova maka enyemaka, ọ ga-akasi ha obi ma nyere ha aka. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ na-eji ebere na-egosi nchebara echiche dị nro maka ndị na-efe ya ofufe.—Abụ Ọma 86:15; 1 Pita 5:6, 7.
19. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Chineke dị amara?
19 Ọtụtụ ndị nọ n’isi na-emeso ndị ọzọ n’aka ike. N’ụzọ dị iche, lee ka Jehova si dị amara n’ebe ndị ohu ya dị obi umeala nọ! Ọ bụ ezie na ọ bụ onye isi kasị elu n’eluigwe na ụwa, ọ na-egosipụta obi ọma dị ịrịba ama n’ozuzu ya nye ihe nile a kpọrọ mmadụ. (Abụ Ọma 8:3, 4; Luk 6:35) Jehova dịkwa amara nye ndị mmadụ n’otu n’otu, na-azaghachi arịrịọ ha maka ihu ọma. (Ọpụpụ 22:26, 27; Luk 18:13, 14) Otú ọ dị, iwu ejighị Chineke igosi onye ọ bụla ihu ọma ma ọ bụ ebere. (Ọpụpụ 33:19) Ya mere, ọ dị anyị mkpa igosipụta obi ekele miri emi maka ebere na amara Chineke.—Abụ Ọma 145:1, 8.
EWEGHỊ IWE ỌSỌ ỌSỌ, ELEGHỊ MMADỤ ANYA N’IHU, NA EZI OMUME
20. Gịnị na-egosi na Jehova adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ọ dịghịkwa ele mmadụ anya n’ihu?
20 Jehova adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ. Ma, nke ahụ apụtaghị na ọ dịghị akpa ike, n’ihi na o mere otú ahụ n’ibibi Fero na-agba isi akwara na ìgwè ndị agha ya n’Osimiri Uhie. Jehova adịghịkwa ele mmadụ anya n’ihu. N’ihi ya, ndị ya nwere ihu ọma ya, bụ́ ndị Israel, mesịrị ghara inwe ihu ọma ya n’ihi omume ọjọọ ha nọgidere na-eme. Chineke na-anakwere ndị sitere ná mba nile dị ka ndị na-efe ya, kama ọ bụ nanị ndị kwekọrọ n’ụzọ ezi omume ya nile.—Ọrụ 10:34, 35.
21. (a) Gịnị ka Mkpughe 15:2-4 na-akụziri anyị banyere Chineke? (b) Gịnị ga-eme ka ọ kara anyị mfe ime ihe Chineke kwuru na o ziri ezi?
21 Akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe na-eme ka ịdị mkpa nke ịmụ banyere “ezi omume” nile nke Chineke pụta ìhè. Ọ na-agwa anyị na ndị e kere eke n’eluigwe na-abụ abụ, sị: “Ọrụ Gị nile dị ukwuu dịkwa ebube, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile; ụzọ Gị nile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, Gị Eze nke mba nile. Ònye na-agaghị atụ egwu, Onyenwe anyị, tookwa aha Gị? n’ihi na nanị Gị dị ọcha n’obi; n’ihi na mba nile ga-abịa kpọọkwa isiala n’ihu Gị; n’ihi na e mere ka ezi omume Gị nile pụta ìhè.” (Mkpughe 15:2-4) Anyị na-egosipụta egwu dị mma maka Jehova, ma ọ bụ nsọpụrụ ofufe maka ya, site n’ikwekọ n’ihe o kwuru na o ziri ezi. A na-eme ka nke a ka mfe site n’ichetara onwe anyị amamihe na ịhụnanya Chineke. Ihe nile o nyere n’iwu bụ maka ọdịmma anyị.—Aịsaịa 48:17, 18.
“JEHOVA, BỤ́ CHINEKE ANYỊ, JEHOVA BỤ OTU”
22. N’ihi gịnị ka ndị na-anakwere Bible na-ejighị efe Atọ n’Ime Otu ofufe?
22 Ndị Ijipt oge ochie fere ọtụtụ chi, ma Jehova bụ “Chineke ekworo.” (Ọpụpụ 20:5) Mosis chetaara ndị Israel na “Jehova, bụ́ Chineke anyị, Jehova bụ otu.” (Deuterọnọmi 6:4, ọ bụ anyị dere okwu n’ụdị dị iche.) Jisọs Kraịst kwughachiri okwu ndị ahụ. (Mak 12:28, 29) Ya mere, ndị nakweere Bible dị ka Okwu Chineke adịghị efe Atọ n’Ime Otu nke ndị ma ọ bụ chi atọ n’ime otu mejupụtara. N’ezie, okwu ahụ bụ́ “Atọ n’Ime Otu” adịtụdịghị n’ime Bible. Ezi Chineke ahụ bụ otu Onye, dị iche n’ebe Jisọs Kraịst nọ. (Jọn 14:28; 1 Ndị Kọrint 15:28) Mmụọ nsọ Chineke abụghị onye. Ọ bụ ike ọrụ Jehova, nke Onye ahụ Pụrụ Ime Ihe Nile na-eji emezu nzube ya nile.—Jenesis 1:2; Ọrụ 2:1-4, 32, 33; 2 Pita 1:20, 21.
23. (a) Olee otú ịhụnanya gị maka Chineke ga-esi too eto? (b) Gịnị ka Jisọs kwuru banyere ịhụ Chineke n’anya, gịnịkwa dị anyị mkpa ịmụta banyere Kraịst?
23 Mgbe ị tụlere otú Jehova dịruru n’ebube, ị́ dịghị ekwe na o ruru eru ịnara ofufe gị? Ka ị na-amụ Okwu ya, bụ́ Bible, ị ga-amatakwu ya, mụtakwa ihe ọ chọrọ n’aka gị maka ọdịmma na obi ụtọ ebighị ebi gị. (Matiu 5:3, 6) Tinyere nke ahụ, ịhụnanya gị maka Chineke ga-eto eto. Nke ahụ kwesịrị ekwesị, n’ihi na Jisọs sịrị: “Ị ga-ahụkwa Onyenwe anyị, bụ́ Chineke gị, n’anya, site n’obi gị dum, sitekwa ná mkpụrụ obi gị dum, sitekwa n’uche gị dum, sitekwa n’ike gị dum.” (Mak 12:30) O doro anya na Jisọs nwere ịhụnanya dị otú ahụ maka Chineke. Ma gịnị ka Bible na-ekpughe banyere Jisọs Kraịst? Gịnị bụ òkè ya ná nzube Jehova?
NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ
Gịnị bụ aha Chineke, ugbo olekwa ka e ji ya mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Hibru?
N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji na-eji aha Chineke eme ihe?
Olee àgwà Jehova Chineke ndị na-amasị gị karịsịa?
[Foto dị na peeji nke 29]
Ruo ókè hà aṅaa ka ị maruru Onye Okike nke ihe nile?