Iso Ógbè Ndị Mmụọ Enwe Mmekọrịta
N’ETITI otu obodo Ọdịda Anyanwụ Africa ka e nwere otu ụlọ elu nwere otu okpukpu, nke e tere ágbá ọcha na nke akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ. N’ọnụ ụlọ nnabata, odeakwụkwọ abụọ ji ígwè typewriter arụ ọrụ. Ọtụtụ mmadụ nọ ọdụ n’oche, na-echere ịhụ babaláwo, bụ́ onye na-ajụ ndị mmụọ ase.
N’azụ oche ide ihe dị n’ọfịs dị n’akụkụ ya, n’akụkụ ígwè nzipụ ozi bụ́ fax, ka babaláwo n’onwe ya nọ ọdụ. N’ịbụ onye gbara dimkpa, nke nwere isi awọ́, o yi uwe mwụda ọcha dị ogologo—dị oké ọnụ ahịa, nke a kpara ihe n’elu ya. “Nna m bụ onye na-ajụ ndị mmụọ ase,” ka o kwuru. “A mụnyere m n’ime ọdịnala ahụ. Etolitere m n’ime ya. Mgbe m na-erule afọ ise, mgbe nna m na-aga ịjụ ndị mmụọ ase, ana m eso ya aga. Ekiriri m otú o si eme ya, agbasokwara m ya ruo mgbe ọ ghọrọ akụkụ dị mkpa nke ndụ m.”
Babaláwo chere aka ya ná nnukwu bọọdụ ngosipụta e ji osisi mee, ebe e depụtara usoro dị mgbagwoju anya nke ịjụ ndị mmụọ ase nke ndị ya jiworo mee ihe eri ọtụtụ ọgbọ. Na-adabere n’ịwụ mkpụrụ akị 16 n’ala, ọ bụ usoro nke gbasaworo n’ebe nile n’Ọdịda Anyanwụ Africa na ebe ndị ọzọ. “Ndị mmadụ na-eji ụdị nsogbu ọ bụla abịakwute m,” ka o kwuru. “Nsogbu metụtara ndị inyom, enweghị ike ịmụ nwa, enweghị ọrụ, isi mgbaka, ahụ ike, na ihe ndị ọzọ. Na-adabere n’ihe si n’ịjụ ndị mmụọ ase pụta, a na-arịọ ndị nna ochie ma ọ bụ ìgwè ndị nọ n’eluigwe [chi dị iche iche] arịrịọ. N’agbanyeghị ihe ọnọdụ ahụ bụ, a ghaghị inwe àjà a ga-achụ.”
Ihe omume okpukpe ọdịnala, tinyere ịjụ ndị mmụọ ase, gbanyere mkpọrọgwụ n’ógbè ahụ, ma otú ahụ ka ọ dịkwa chọọchị Krisendọm. N’ebe na-adịghị anya n’ọfịs babaláwo ahụ, e nwere ụlọ ndị e tere ágbá ọcha, bụ́ ndị e dekwasịrị ihe n’ihu ha: King Solomon II Church, Cherubim and Seraphim, Celestial Church of Christ, Christ Apostolic Church, Christ Trumpeters Church. Chọọchị ndị a na-adịkọ ọnụ, mgbe ụfọdụkwa na-anakwere ihe omume dị iche iche nke okpukpe ọdịnala. Babaláwo ahụ kwuru, si: “N’oge na-adịbeghị anya mụ na bishọp kwurịtara okwu. Ọ bịara ebe a. Mgbe anyị kwurịtasịrị okwu ruo 30 minit, o kwuru na ya chọrọ ka anyị mee atụmatụ ihe dịtụ ka ntụlerịta echiche ebe ndị Kraịst na ndị okpukpe ọdịnala pụrụ ịnọrọ ọdụ iji gbanwerịta echiche ma wezụga nghọtahie.”
Ọnụ Ụzọ Ndị Gara n’Ụwa Ndị Mmụọ
Nghọtahie ndị dị otú ahụ na-agụnyekarị ịmata ndị bi n’ógbè ndị mmụọ. N’ebe nile n’Africa n’ebe ndịda Sahara, e nwere nkwenkwe zuru ebe nile na e nwere ìgwè abụọ ndị bi n’ụwa ndị mmụọ. Ihe mejupụtara ìgwè nke mbụ bụ chi dị iche iche, ndị na-abụtụbeghị mmadụ. Ihe mejupụtara ìgwè nke abụọ bụ ndị nna ochie, ma ọ bụ mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ, ndị ibu ọrụ ha bụ ịhụ na nlanarị na ọganihu nke ezinụlọ ha n’elu ala bụ ihe e ji n’aka. E kwetara na ma chi dị iche iche ma ndị nna ochie nwere ikike inyere ndị nọ n’ụwa aka ma ọ bụ imerụ ha ahụ. N’ihi ya, a ghaghị igosi ha abụọ nkwanye ùgwù na nsọpụrụ kwesịrị ekwesị.
A na-ahụ nkwenkwe ndị yiri nke ahụ n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa. Site n’ụzọ dịgasị iche iche, ndị mmadụ n’ebe nile na-agakwuru ikike karịrị nke mmadụ, na-achọ ihe ọmụma banyere ọdịnihu na enyemaka na nduzi ná nsogbu ndị a na-enwe kwa ụbọchị ná ndụ. Ò kwere omume n’ezie inweta enyemaka site n’ógbè ndị mmụọ? Jisọs Kraịst, bụ́ onye biworo n’ebe ahụ, gosiri na o kwere omume. O kwuru, sị: “Rịọnụ, a ga-enyekwa unu; chọọnụ, unu ga-achọtakwa; kụọnụ, a ga-emeghekwara unu.” (Matiu 7:7) Ma iji nweta enyemaka ahụ, anyị aghaghị ịrịọ onye kwesịrị ekwesị, chọọ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, kụọkwa n’ọnụ ụzọ nke kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na anyị akụọ n’ọnụ ụzọ nke na-ekwesịghị ekwesị, onye ga-emerụ anyị ahụ, ọ bụghị imere anyị ihe ọma, pụrụ imeghe ya.
Ya mere, ọ dị mkpa ịmata ndị bi n’ógbè ndị mmụọ na ndị na-ebighị. Ọ dịkwa anyị mkpa ịmata ọdịiche dị n’etiti ndị ga-enyere anyị aka na ndị ga-emerụ anyị ahụ. N’ikpeazụ, ọ dị anyị mkpa ịmata ihe anyị na-aghaghị ime iji nweta enyemaka site n’aka ndị nọ n’ọnọdụ inye ya. Isiokwu ndị na-esonụ ga-enyocha okwu ndị a.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 23]
Foto dị na peji nke 3-4: The Star, Johannesburg, S.A.