Iwepụ Nghọtahie Ndị E Nwere Banyere Ndịàmà Jehova
KA HA nọ n’ọrụ nkwusa ụlọ n’ụlọ ha, mmadụ abụọ n’ime Ndịàmà Jehova zutere otu nwoke gwara ha na ya enweghị mmasị. Ndịàmà ahụ ji nwayọọ pụọ, ma ka ha na-agbada n’akụkụ okporo ụzọ, ha chọpụtara na nwoke ahụ na-eso ha. “Kwụsịnụ, biko!” ka nwoke ahụ kpọkuru ha. “Achọrọ m ịrịọ mgbaghara. Amaghị m ihe ọ bụla banyere Ndịàmà, ekwenyekwara m na a gwawo ọtụtụ ndị ihe na-ezighị ezi banyere unu.”
Mgbe ahụ nwoke ahụ kọwara onwe ya dị ka Renan Dominguez, onye isi oche usoro ihe omume nke òtù Rotary Club nke Ndịda San Francisco, California. Ọ rịọrọ ma otu Onyeàmà ọ̀ ga-abịa n’ụlọ nzukọ òtù ahụ ma kwuo okwu banyere nkweta na ọrụ Ndịàmà Jehova. E dokwara isiokwu ndị a ga-atụle. Onyeàmà ahụ ga-eji 30 minit kwuo okwu, mgbe ahụ nye ohere ná nzukọ ahụ maka ịza ajụjụ ndị na-ege ntị ga-ajụ. A gwara Ernest Garrett, bụ́ Onyeàmà eri ọtụtụ afọ n’ógbè San Francisco, ka ọ gwa òtù Rotary Club ahụ okwu n’August 17, 1995, ọ kọkwara ihe na-esonụ:
“Echere m echiche, ekpekwara m ekpere banyere ihe m pụrụ ịgwa ndị so n’òtù Rotary Club ahụ, bụ́ ndị ndú obodo na ndị isi achụmnta ego, dị ka ndị ọrụ ụlọ akụ̀, ndị ọkàikpe, na ndị dọkịta. Emere m obere nnyocha ma chọpụta na nzube e bipụtara ebipụta nke òtù Rotary Club bụ ime ka ógbè kwụsie ike. Ya mere ekwupụtara m ihe ọmụma dị na peji nke 23 nke broshuọ bụ́ Jehovah’s Witnesses in the Twentieth Century, nke isiokwu ya bụ ‘Abamuru Dị Irè nke Ozi Ọma Nye Ógbè Gị.’”a
“Akọwara m na Ndịàmà Jehova na-akpa ike n’akụkụ a. Kwa ụbọchị n’izu, Ndịàmà Jehova na-apụ na-akụ aka n’ọnụ ụzọ dị iche iche n’ógbè ha. Ọchịchọ ha bụ ime ka ndị agbata obi ha nwee ezinụlọ siri ike—njikọ ezinụlọ siri ike na-arụpụtakwa ógbè siri ike. Ka Ndịàmà Jehova na-enwe mmetụta n’ahụ ndị mmadụ n’otu n’otu na ezinụlọ dị iche iche ịgbaso ụkpụrụ ndị Kraịst, otú ahụ ka isi ike, omume rụrụ arụ, na mpụ ga-ebelata n’ógbè. Ihe ọmụma a masịrị ndị òtù ahụ nke ukwuu n’ihi na o kwekọrọ ná nzube nke òtù Rotary Club.”
“Gịnị Mere Unu Na-adịghị Etinye Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị?”
“Mgbe e nyere ohere ná nzukọ ahụ maka ajụjụ, otu n’ime ajụjụ ndị mbụ bụ: ‘Gịnị mere unu na-adịghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na na gọọmenti?’ Nwa amadị jụrụ ajụjụ a gbakwụnyere mgbe ahụ, sị: ‘Dị ka ị maara, Akwụkwọ Ọma ahụ na-asị: “Nyeghachinụ Siza ihe nke Siza.”’ Agwara m ya na anyị kwenyezuru n’okwu ahụ, na-akwadokwa ya n’ụzọ zuru ezu. Arụtụrụ m aka na ọ dịbeghị mgbe ihe ka ọtụtụ ná ndị m nụworo ka ha hotara akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ hotara ọkara ya nke ọzọ, bụ́ nke na-asị: ‘Nyeghachinụ Chineke ihe nke Chineke.’ (Matiu 22:21) Ya mere, mgbe ahụ, anyị aghaghị ikwubi na ọ bụghị ihe nile bụ nke Siza. E nwere ihe ụfọdụ ndị bụ nke Chineke. Okwu nke ịchọpụta ihe bụ nke Siza na ihe bụ nke Chineke na-eche anyị ihu.
“M gosiri ya na mgbe a jụrụ Jisọs ajụjụ bụ́ ‘Ò ziri ezi n’iwu ịtụ ụtụ nye Siza, ma ọ bụ na o zighị ezi?’ ọ zaghị site n’ịsị ee ma ọ bụ ee e. Ọ sịrị: ‘Gosinụ m ego nke ụtụ,’ otu shilling ndị Rom. Ọ jụrụ, sị: ‘Ònye nwe onyinyo a na ihe a e dekwasịrị ya?’ Ha sịrị: ‘Siza nwe.’ Mgbe ahụ ọ sịrị: ‘Ya mere, nyeghachinụ Siza ihe nke Siza.’ (Matiu 22:17-20) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, kwụọ siza ụtụ isi n’ihi na anyị na-erite uru ije ozi ụfọdụ site n’aka Siza, n’ụzọ kwesịkwara ekwesị anyị na-akwụ ụtụ isi maka ndị a. Akọwara m na Ndịàmà Jehova na-akwụ ụtụ isi ha, n’adịghịkwa aghọrị gọọmenti n’ihe bụ nke ya n’ezie.
“Mgbe ahụ ekwuru m na Ndịàmà Jehova ekwenyeghị na ha ji Siza ụgwọ ndụ ha. Ha kwenyere na ha ji ụgwọ inye Chineke ofufe ha, n’ụzọ zikwara ezi ha na-akwụghachi ya nke a. Ya mere mgbe anyị weere nguzo nke a, anyị ebughị n’obi ịkparị Siza. Anyị na-erube isi n’iwu nile nke Siza, ma mgbe e nwere mmegiderịta, anyị na-eji nkwanye ùgwù na-ahọrọ irubere Chineke isi dị ka onye na-achị isi karịa mmadụ. Nwoke nke jụworo ajụjụ a kwuziri n’ihu ìgwè ahụ dum, sị: ‘Apụghị m ịgbagha nke ahụ!’
“Anyị zakwara ọtụtụ ajụjụ banyere ọrụ nkwusa anyị. Ọtụtụ n’ime ndị òtù ahụ bịakwutere anyị mgbe nzukọ ahụ gasịrị ma kwee anyị n’aka, wee sị na ha kwenyeere anyị n’ụzọ zuru ezu—na ezinụlọ bụ ntọala nke ógbè siri ike. Mgbe ahụ anyị nyere onye ọ bụla so n’òtù ahụ broshuọ bụ́ Jehovah’s Witnesses in the Twentieth Century.
“Mgbe nzukọ a gasịrị, onye isi oche usoro ihe omume ahụ, bụ́ Maazị Dominguez, kpọrọ m na fon ma jụọ ma m̀ ga-abịa n’ọfịs ya, n’ihi na ya nwere ajụjụ ndị ọzọ ịjụ banyere nkweta anyị. Anyị nwere mkparịta ụka dị mma n’ọtụtụ akụkụ akwụkwọ nsọ. Karịsịa, ọ chọrọ ka m kọwaa nguzo anyị n’ihe banyere ọbara. O kwuru na ya onwe ya agaghị anara mmịnye ọbara, ihe ọmụma m nyere ya site na broshuọ bụ́ How Can Blood Save Your Life? metụkwara ya n’ahụ nke na o kwuru ka m bịaghachi ma gwa ndị so n’òtù ahụ okwu banyere nguzo anyị n’ihe banyere ọbara. Akpọrọ m Onyeàmà ọzọ, bụ́ Don Dahl, ka o sonyere m n’ihe omume a. Ọ na-aga n’ụlọ ọgwụ iji soro ndị dọkịta kwurịta okwu ahụ mgbe e nwere Ndịàmà na-aga ịwa ahụ. Anyị jikọrọ aka kọwaa otú anyị si esoro ndị dọkịta na ndị nlekọta ụlọ ọgwụ arụkọ ọrụ iji kọwaa nguzo anyị nke Akwụkwọ Nsọ kwadoro na inye ihe ndị e ji eme ihe n’ụzọ na-aga nke ọma n’ọnọdụ mmịnye ọbara.”—Levitikọs 17:10-12; Ọrụ 15:19-21, 28, 29.
‘Ị̀ Na-ekwu na Ị Ga-ahapụ Nwa Gị Nwoke Ka Ọ Nwụọ?’
“Mgbe nzukọ ahụ gasịrị otu nwa amadị bịakwutere m ma jụọ m iche, sị: ‘Ị̀ na-ekwu na ị ga-ahapụ nwa gị nwoke ka ọ nwụọ ma ọ bụrụ na ọ dabara n’ihe ọghọm, e wee bubata ya n’ọnụ ụlọ ọnọdụ mberede mgbe ọbara na-agbasi ya ike?’ Emesiri m ya obi ike na enwere m otu nchegbu ahụ o nwere, n’ihi na m nwere nwa nwoke nke nwụnahụrụ m n’ụgbọelu ahụ gbawara na Lockerbie, Scotland, na 1988. N’ịza ajụjụ ya, ebu m ụzọ gwa ya na agaghị m achọ ka nwa m nwoke nwụọ.
“Anyị abụghị ndị na-emegide ndị dọkịta, ndị na-emegide ọgwụ, ma ọ bụ ndị na-emegide ụlọ ọgwụ. Anyị abụghị ndị ji okwukwe na-agwọ ọrịa. Ije ozi ndị ọkà n’ahụ ike dị anyị mkpa. Anyị atụkwasịwo obi na Chineke, anyị nwekwara obi ike na ntụziaka ya n’okwu a banyere ọbara bụ maka ọdịmma anyị na-adịte anya. A na-akọwa Chineke na Bible dị ka ‘Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.’ (Aịsaịa 48:17) O nyewo Ọkpara ya ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Jisọs sịrị: ‘Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na Mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ: ọzọ, onye ọ bụla nke na-adị ndụ, nke na-ekwerekwa na Mụ, ọ gaghị anwụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi. Ì kwere nke a?’—Jọn 11:25, 26.
“Nanị ihe anyị na-ekwu ka ndị dọkịta ghọta bụ na nguzo anyị bụ okwu metụtara akọ na uche, nakwa na a pụghị ịgbanwe ya agbanwe. Anyị apụghị ịgbanwe okwu a agbanwe dị nnọọ ka anyị na-apụghị ịgbanwe iwu Chineke banyere ịkwa iko onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Anyị apụghị isoro Chineke baa ná mkparịta ụka ma kwuo, sị, ‘Chineke, è nwere ọnọdụ ọ bụla m pụrụ ịkwa iko?’ Mgbe ahụ agwara m nwoke a, sị: “Ị jụrụ ma m̀ ga-ahapụ nwa m nwoke ka ọ nwụọ site n’ịjụ mmịnye ọbara. Ewekwala iwe, aga m achọ ịjụ gị ma ị̀ ga-ahapụ nwa gị nwoke ka ọ nwụọ n’ozi agha nke mba ọ bụla?’ Ọ zara ozugbo na n’enweghị obi abụọ, sị, ‘Ee! N’ihi na nke ahụ bụ ibu ọrụ ya!’ Ekwuru m, sị: ‘Ị ga-ahapụ nwa gị nwoke ka ọ nwụọ n’ihi na ọ bụ ụzọ i kweere na ya. Nye m otu ihe ùgwù ahụ n’ebe nwa m nwoke nọ.’
“Otu ihe na-akpali mmasị nke sochiri ihe a nile bụ na onye isi oche usoro ihe omume ahụ, bụ́ Maazị Dominguez, kpọrọ mụ na nwunye m òkù isonyere ya na nwunye ya ná nri abalị. Ọ dị ya ka a gwawo nwunye ya ihe na-ezighị ezi, na o nwekwara echiche na-ezighị ezi banyere Ndịàmà Jehova. Ihe o chere bụ eziokwu. A gwawo ya ihe na-ezighị ezi. Anyị kporiri ndụ n’uhuruchi ahụ, nwunye ya jụkwara ọtụtụ ajụjụ banyere anyị na ọrụ anyị, bụ́ ndị o nyere anyị ohere ịza n’ụzọ zuru ezu. N’ụbọchị na-esonụ ọ kpọrọ na fon wee kwuo na nwunye ya nwere nnọọ obi ụtọ izute mụ na nwunye m, na o chekwara na anyị bụ nnọọ ezi ndị mmadụ.
“Anọgidewo m na-aga eleta Maazị Dominguez ugboro ugboro, ọ na-egosikwa ezi mmasị na Bible. Ọ gwara m, sị: ‘Agaghị m ala azụ n’ịgba gị ume ka ị kpọtụrụ ndị isi oche usoro ihe omume nke òtù Rotary Club nile e nwere n’ógbè Greater San Francisco Bay ma kwuo ka ị gwa ha okwu yiri nke ị gwara ndị òtù anyị. Ị pụrụ iji aha m mee ihe dị ka onye izo aka, mgbe a kpọtụkwaara m, m ga-enwe obi ụtọ ikwu okwu ịja mma kasị elu banyere gị ka e wee kpọọ gị dị ka ọkà okwu si esi bịa.’
“Òtù Rotary zuru mba nile. Ọ̀ pụrụ ikwe omume na òtù ndị ọzọ nọ na United States na n’ụwa nile ga-enye ohere ka Ndịàmà Jehova gwa ha okwu?”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1989.
[Foto dị na peeji nke 20]
Maazị Renan Dominguez, n’aka ekpe, na Nwanna Ernest Garrett