“Ọrịa Ehi Ara Na-awị”
Ntiwapụ “ọrịa ehi ara na-awị” tiwapụrụ na Britain agbawo otu eziokwu dịteworo anya banyere ịkpa anụmanụ n’anwụ. A gbanwewo ụmụ anụmanụ dị iche iche site n’ịbụ ndị na-ata ahịhịa gaa n’ịbụ ndị na-eri anụ site n’ịbụ ndị e ji akụkụ dị iche iche nke anụmanụ ndị ọzọ na-azụ. Ọbara kpọrọ nkụ, ọkpụkpụ e gwepịara egwepịa, na ihe oriri, ma ọ bụ nri e tinyere anụ, na-agụnye ngịrị afọ e gwere egwe, ọkpụkpụ azụ, ụbụrụ, na akụkụ ahụ ndị ọzọ na-adị n’ime ahụ, dị ka anyịnyá, asha ukwu, na akụrụ, ka a na-eji eme ihe mgbe mgbe ná mgbalị a na-eme iji chekwaa ihe ndị e nwere, mụbaa uru, ma mee ka anụmanụ too ngwa ngwa. Ka nwa ehi ahụ dị mma na-erule ọnwa isii, e jiriwo ihe dị ka kilogram 12 nke ihe oriri e ji ụfọ akụkụ ahụ dị iche iche nke anụmanụ ndị ọzọ mee zụọ ya, ka Dr. Harash Narang, bụ́ otu n’ime ndị ọkachamara bu ụzọ dọọ aka ná ntị banyere ọrịa ahụ, na-ekwu. “O juru m anya,” ka o kwuru, n’ikwu banyere nleta o mere n’otu ụlọ a na-egbu anụ. “Anyị na-emegharị ehi n’ezie ka ha ghọọ ehi. Nye m, ọ bụ iri anụ ahụ.”
N’akụkụ na-adịghị oké njọ, otu onye ọrụ ugbo Britain nke nwere ugbo ebe a na-emepụta mmiri ara ehi achọpụtawo otu ụzọ isi jiri ehi ndị kaworo nká karị mee ihe, bụ́ ndị ọ na-apụghị ire iji nweta uru n’ihi mmenye ụjọ nke “ọrịa ehi ara na-awị.” Dị ka a kọrọ na magazin bụ́ Newsweek, ọ na-eji ha eme ihe dị ka bọọdụ e ji eme mkpọsa. Ọ na-amapawa mkpọsa ngwá ahịa n’ahụ ehi ya ndị na-ata ahịhịa n’akụkụ ụzọ awara awara na-ekwo ekwo ma na-anakọta ihe dị ka $40 maka otu ehi kwa izu. “Anyị aghaghị ịchọ ebe ndị ọhụrụ nke e ji akpata ego,” ka onye ọrụ ugbo ahụ kwuru. “O yiri ka ọ bụ ụzọ dị mma nye ha iji bụrụ ndị a hapụrụ.”