Ọrịa Na-efe Efe na Narị Afọ nke 20
ỌNWỤ Ojii nke Europe narị afọ nke 14 edugaghị n’ọgwụgwụ ụwa, dị ka ọtụtụ nọ na-ebu n’amụma. Ma gịnị banyere oge anyị? Ntiwapụ ọrịa dị iche iche nke oge anyị hà na-atụ aro na anyị na-ebi n’ihe Bible kpọrọ “mgbe ikpeazụ”?—2 Timoti 3:1.
‘Mbanụ,’ ka ị pụrụ iche. Ọganihu nkà ọgwụ na sayensị emewo ihe ka ukwuu iji nyere anyị aka ịghọta na ịlụso ọrịa ọgụ ugbu a karịa oge ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme mmadụ. Ndị ọkà mmụta sayensị ọgwụ ewepụtawo ọtụtụ ụdị ọgwụ nje na ọgwụ mgbochi ọrịa—ngwá agha ndị dị ike megide ọrịa na nje ndị na-akpata ha. Ọganihu ná nlekọta ụlọ ọgwụ nakwa n’ime ka mmiri dị mma ọṅụṅụ, idebe ihe ọcha, na ịkwadebe ihe oriri enyewokwa aka n’ọgụ a na-alụso ọrịa na-efe efe.
Iri afọ ole na ole gara aga, ọtụtụ chere na mgba ahụ fọrọ nke nta ka o bie. E kpochapụwo kịtịkpa, e lekwasịkwara ọrịa ndị ọzọ anya maka mkpochapụ. Ọgwụ bịanyụrụ nrịanrịa ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ n’ụzọ dị irè. Ndị ọkachamara ahụ ike ji nchekwube tụọ anya ọdịnihu. A ga-emeri ọrịa na-efe efe; mmeri ga-esochi mmeri. Sayensị ọgwụ na ahụ ike ga-emeri.
Ma o merighị. Taa ọrịa na-efe efe ka nọgidere bụrụ ihe kasị akpata ọnwụ n’ụwa, na-egbu ihe karịrị nde mmadụ 50 na 1996 nanị. A na-eji nchegbu na-arị elu maka ọdịnihu edochi anya nchekwube nke oge gara aga. The World Health Report 1996, nke Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) wepụtara, na-adọ aka ná ntị, sị: “Ihe ka ukwuu n’ọganihu e nwere n’iri afọ ndị na-adịbeghị anya banyere ime ka ahụ ike mmadụ ka mma nọ n’ihe ize ndụ ugbu a. Anyị nọ n’ụsọ ọgba aghara zuru ụwa ọnụ n’ọrịa na-efe efe. Ọ dịghị mba na-anọghị n’ihe ize ndụ.”
Ọrịa Ndị Ochie Na-egbu Egbu Karị
Otu ihe na-akpata nchegbu bụ na ọrịa ndị a maara nke ọma, ndị e cheburu na e meriri, na-alọghachi n’ụdị na-egbu egbu karị ma sikwuo ike ịgwọta. Otu ihe atụ bụ ụkwara nta, ọrịa e werebuuru dị ka nke fọrọ nke nta ka e belata ya ná mba ndị mepere emepe. Ma ụkwara nta apụghị n’anya; ugbu a ọ na-egbu ihe dị ka nde mmadụ atọ kwa afọ. Ọ bụrụ na e meziwanyeghị usoro mbelata ya, a na-atụ anya ihe dị ka nde mmadụ 90 ibute ọrịa ahụ n’afọ ndị 1990. Ụkwara nta nke na-adịghị anabata ọgwụ na-agbasa n’ọtụtụ mba.
Ihe atụ ọzọ nke ọrịa na-apụtaghachi bụ ịba. N’afọ 40 gara aga ndị dọkịta nwere olileanya ikpochapụ ịba ngwa ngwa. Taa ọrịa ahụ na-egbu ihe dị ka nde mmadụ abụọ kwa afọ. Ịba zuru ebe nile, ma ọ bụ ọ na-adị mgbe nile, n’ihe karịrị mba 90 ma na-eyi 40 pasent nke ndị bi n’ụwa egwu. Anwụnta ndị na-ebu nje ịba aghọwo nke na-eguzogide ọgwụ ahụhụ, nje ndị ahụ n’onwe ha aghọwo nke na-eguzogide ọgwụ nke na ndị dọkịta na-atụ egwu na n’oge na-adịghị anya agaghị enwe ike ịgwọta ụdị ịba ụfọdụ.
Ọrịa na Ịda Ogbenye
Ọrịa ndị ọzọ na-egbu n’akwụsịghị akwụsị n’agbanyeghị ịdị adị nke ngwá agha ndị dị irè iji lụsoo ha ọgụ. Dị ka ihe atụ, tụlee ọrịa spinal meningitis. E nwere ọgwụ mgbochi ọrịa iji gbochie ọrịa meningitis na ọgwụ iji gwọọ ya. Otu ntiwapụ kpara ike ná mba Africa ndị dị na ndịda Sahara ná mmalite 1996. Ikekwe ị nụchaghị banyere ya; ma, o gburu ihe karịrị ndị mmadụ 15,000—karịsịa ndị ogbenye, karịsịa ụmụaka.
Ọrịa ndị na-emetụta usoro iku ume, gụnyere oyi ịba n’ahụ, na-egbu nde mmadụ anọ kwa afọ, ihe ka ukwuu n’ime ha bụ ụmụaka. Arụbara na-egbu otu nde ụmụaka kwa afọ, ụkwara tịkọ tịkọ na-egbukwa 355,000 ọzọ. A pụkwara igbochi ọtụtụ n’ime ọnwụ ndị a site n’ọgwụ mgbochi ọrịa ndị na-adịghị oké ọnụ.
Ihe dị ka puku ụmụaka asatọ na-anwụ kwa ụbọchị n’ihi ụkọ mmiri n’ime ahụ n’ihi afọ ọsịsa. A pụrụ igbochi ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọnwụ ndị a nile site n’idebe ihe ọcha ma ọ bụ mmiri ọṅụṅụ dị ọcha ma ọ bụ site n’inye mmiri a na-etinyeghachi n’ahụ site n’ọnụ.
Ihe ka ukwuu n’ọnwụ ndị a na-eme ná mba ndị na-emepe emepe, ebe ịda ogbenye jupụtara. Ihe dị ka nde mmadụ 800—akụkụ butụrụ ibu nke ndị bi n’ụwa—enweghị ike inweta nlekọta ahụ ike. The World Health Report 1995 kwuru, sị: “Ihe kasị egbu mmadụ n’ụwa na ihe kasị akpata ahụ esighị ike na nhụjuanya gbaa ụwa gburugburu bụ nke e depụtara n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ná ngwụsị nke Usoro Nkọwa Ọrịa nke Mba Nile. E nyere ya akara bụ́ Z59.5—oké ịda ogbenye.”
Ọrịa Ndị A Matara Ọhụrụ
Ma ọrịa ndị ọzọ pụtara ọhụrụ, a chọpụtara ha nanị n’oge na-adịbeghị anya. Òtù WHO kwuru n’oge na-adịbeghị anya, sị: “N’afọ 20 gara aga, ọ dịkarịa ala ọrịa 30 ndị ọhụrụ apụtawo iyi ahụ ike nke ọtụtụ narị nde ndị mmadụ egwu. Nye ọtụtụ n’ime ọrịa ndị a e nweghị ọgwụgwọ, ngwọta ma ọ bụ ọgwụ mgbochi ọrịa, ohere nke igbochi ma ọ bụ ịchịkwa ha dịkwa nta.”
Dị ka ihe atụ, tụlee nje HIV na ọrịa AIDS. Ndị a na-amaghị nanị n’ihe dị ka afọ 15 gara aga, ugbu a ha na-eti ndị mmadụ ihe otiti na kọntinent nile. Ugbu a, ihe dị ka nde 20 ndị toruworo ogo mmadụ bu nje HIV, ihe karịkwara nde 4.5 ebutewo ọrịa AIDS. Dị ka Human Development Report 1996 si kwuo, ọrịa AIDS bụ ugbu a ihe bụ isi na-akpata ọnwụ nye ndị toruworo ogo mmadụ na-erubeghị afọ 45 na Europe na n’Ebe Ugwu America. Gburugburu ụwa, ihe dị ka mmadụ 6,000 na-ebute ya kwa ụbọchị—otu onye kwa sekọnd 15 ọ bụla. Atụmatụ ndị e mere na-atụ aro na ọnụ ọgụgụ ndị bu ọrịa AIDS ga-anọgide na-arị oké elu. Ka ọ na-erule afọ 2010, a na-atụ anya na afọ ndụ ná mba Africa na Esia ndị ọrịa AIDS kasị emetụta ga-adalata ruo afọ 25, dị ka otu ụlọ ọrụ United States si kwuo.
Ọrịa AIDS ọ̀ bụ ọrịa pụrụ iche, na-enweghị oyiri, ka ntiwapụ nke ọrịa ndị ọzọ ọ̀ pụrụ ịpụta iji kpalite mbibi yiri ya ma ọ bụ ọbụna nke ka njọ? Òtù WHO na-aza, sị: “Obi abụọ adịghị ya na ọrịa ndị a na-amatabeghị ma nwee ikike ịbụ ọrịa AIDS nke echi ka zoro ezo.”
Ihe Ndị Na-akwalite Nje
N’ihi gịnị ka ndị ọkachamara ahụ ike ji enwe nchegbu banyere ntiwapụ ọrịa n’ọdịnihu? Otu ihe bụ mmụba nke obodo ukwu dị iche iche. Otu narị afọ gara aga, nanị ihe dị ka 15 pasent nke ụba mmadụ bi n’ụwa bi n’obodo ukwu. Otú ọ dị, amụma ndị e buru maka ọdịnihu na-eme atụmatụ na ka ọ na-erule afọ 2010, ihe karịrị ọkara nke ndị mmadụ nọ n’ụwa ga-ebi n’ógbè ndị mepere emepe, karịsịa ná nnukwu obodo ukwu nke mba ndị na-emepechabeghị emepe.
Ihe ndị na-ebu nje na-eme nke ọma n’ógbè ndị mmadụ bijupụtara. Ọ bụrụ na obodo ukwu nwere ụlọ dị mma nakwa usoro ibupụ mmiri ruru unyi na mmiri ọṅụṅụ zuru ezu na nlekọta ahụ ike dị mma, a na-ebelata ihe ize ndụ nke ntiwapụ ọrịa. Ma obodo ukwu ndị kasị na-amụba ngwa ngwa bụ nke mba ndị dara ogbenye. Obodo ukwu ụfọdụ nwere nanị otu ụlọ mposi maka mmadụ 750 ọ bụla ma ọ bụ karịa. Ọtụtụ ógbè ndị mepere emepe enweghịkwa ụlọ dị mma na mmiri ọṅụṅụ na-adịghị ize ndụ nakwa ụlọ ọgwụ. Ebe ọtụtụ narị puku mmadụ bikọtara ọnụ n’ọnọdụ ndị ruru unyi, ohere nke ibufe ọrịa na-amụba nke ukwuu.
Nke a ọ̀ na-apụta na a kpaara ntiwapụ ọrịa n’ọdịnihu ókè ná nnukwu obodo ukwu ndị mmadụ bijupụtara, nke ndị dara ogbenye? Akwụkwọ bụ́ Archives of Internal Medicine na-aza, sị: “Anyị aghaghị ịghọta n’eziokwu na ógbè oké ịda ogbenye, enweghị olileanya n’ụzọ akụ̀ na ụba, na ihe ndị ha na-akpata na-ewepụta ọnọdụ ndị kasị mma maka ibufe ọrịa na ịkarị nkà na ụzụ nke ihe fọdụrụnụ n’ihe a kpọrọ mmadụ.”
Ọ dịghị mfe ịkpara ọrịa ókè n’otu ógbè. Ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ buru ibu na-akwagharị. Kwa ụbọchị ihe dị ka otu nde mmadụ na-agafe ókèala mba. Kwa izu otu nde na-eme njem ná mba ndị bara ọgaranya na ndị dara ogbenye. Ka ndị mmadụ na-akwagharị, nje ndị na-egbu egbu na-eso ha. The Journal of the American Medical Association na-ekwu, sị: “A ghaghị iwere ntiwapụ nke ọrịa n’ebe ọ bụla dị ka ihe iyi egwu nye ọtụtụ mba, karịsịakwa ndị ahụ bụ ebe bụ isi mba ndị ọzọ na-ejekarị.”
N’ihi ya, n’agbanyeghị ọganihu ọgwụ na ahụ ike nke narị afọ nke 20, ọrịa na-efe efe anọgidewo na-akpata ọnwụ nke ọtụtụ ndị mmadụ, ọtụtụ na-atụkwa egwu na nke ka njọ ka ga-abịa. Ma gịnị ka Bible na-ekwu banyere ọdịnihu?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 18]
Ọrịa na-efe efe ka nọgidere bụrụ ihe kasị akpata ọnwụ n’ụwa, na-egbu ihe karịrị nde mmadụ 50 na 1996 nanị
[Igbe dị na peeji nke 20]
Nguzogide nke Ọgwụ Nje
Ọtụtụ ọrịa ndị na-efe efe na-esiwanye ike ịgwọta n’ihi na ha aghọwo ihe na-eguzogide ọgwụ nje. Nke a bụ ihe na-emenụ: Mgbe nje bacteria banyere mmadụ n’ahụ, ha na-anọgide na-amụba, na-enyefe nje ndị ha kepụtara njimara mkpụrụ ndụ ihe nketa ha. Ná mmepụta nke nje bacteria ọhụrụ ọ bụla, e nwere ohere nke mgbanwe—ntakịrị mmehie ihe ihe ná mmepụta nke ọhụrụ ga-enye nje bacteria ọhụrụ ahụ njimara ọhụrụ. Ohere e nwere na otu nje bacteria ga-agbanwe n’ụzọ nke ga-eme ka o nwee ike iguzogide ọgwụ nje dị oké nta. Ma nje bacteria na-amụba n’ijeri n’ijeri, mgbe ụfọdụ na-amụpụta ọgbọ nje atọ n’otu hour. N’ụzọ dị otú a, ihe a na-atụghị anya ya na-eme—site n’oge ruo n’oge, a na-enwe nje bacteria nke o siri ike iji ọgwụ nje gbuo.
Ya mere mgbe onye bu ọrịa ṅụrụ ọgwụ nje, a na-egbuchapụ nje bacteria na-enweghị ike iguzogide, ikekwe ahụ na-adịtụ onye ahụ mma. Otú ọ dị, nje bacteria na-eguzogide ihe na-adịgide ndụ. Ma ugbu a ha na nje ibe ha adịkwaghị azọ ihe ndị na-edozi ahụ na ókèala. Ha nweere onwe ha ịmụba n’enweghị ihe mgbochi. Ebe otu nje bacteria pụrụ ịmụba ruo ihe karịrị nde nje bacteria 16 n’otu ụbọchị, ọ dịghị adị anya tupu onye ahụ arịawa ahụ ọzọ. Otú ọ dị, ugbu a, o bu ụdị nje bacteria na-eguzogide ọgwụ kwesịrị igbu ya. Ndị ọzọ pụrụ ibute nje bacteria ndị a, n’oge na-adịghịkwa anya ọ na-agbanwe ọzọ ịghọ ihe mgbochi nye ọgwụ nje ndị ọzọ.
Otu uche akwụkwọ akụkọ dị n’akwụkwọ bụ́ Archives of Internal Medicine na-ekwu, sị: “Mmụba dị ngwa nke nguzogide nje bacteria, virus, fungi, na parasite na-eguzogide usoro ọgwụgwọ anyị na-eme ka mmadụ na-eche ọ bụghị ma, kama mgbe a ga-emeri anyị n’agha a nke mmadụ megide nje.”—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.
[Igbe dị na peeji nke 21]
Ọrịa Na-efe Efe Ọhụrụ Ụfọdụ Eri 1976
Afọ
A Chọpụtara Ya Aha Ọrịa Ebe O Buru Ụzọ
Pụta Ma Ọ Bụ
A Chọpụtara Ya
1976 Legionnaires’ disease United States
1976 Cryptosporidiosis United States
1976 Ahụ ọkụ ọbara ọgbụgba Ebola Zaire
1977 Nje Hantaan virus Korea
1980 Ịba ọcha n’anya D (Delta) Itali
1980 Nje T-cell lymphotropic
virus 1 nke mmadụ Japan
1981 Ọrịa AIDS United States
1982 E. coli O157:H7 United States
1986 Bovine spongiform
encephalopathy* United Kingdom
1988 Salmonella enteritidis PT4 United Kingdom
1989 Ịba ọcha n’anya C United States
1991 Ahụ ọkụ ọbara ọgbụgba
nke Venezuela Venezuela
1992 Vibrio cholerae O139 India
1994 Ahụ ọkụ ọbara ọgbụgba
nke Brazil Brazil
1994 Morbillivirus mmadụ na ịnyịnya Australia
*Anụmanụ nanị.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ebe e si nweta ya: WHO
[Igbe dị na peeji nke 22]
Ọrịa Ndị Ochie Alọghachi
Ụkwara nta: A na-atụ anya na ụkwara nta ga-egbu ihe karịrị nde mmadụ 30 n’ime iri afọ a. N’ihi ọgwụgwọ na-adịghị irè nke ọrịa a n’oge gara aga, ụkwara nta na-eguzogide ọgwụ bụ ihe iyi egwu zuru ụwa ọnụ ugbu a. Ugbu a ụdị ụfọdụ adịghị ihe ọgwụ ndị bibichaburu nje bacteria ahụ na mbụ na-eme ha.
Ịba: Ọrịa a na-eti ihe ruru nde mmadụ 500 ihe otiti kwa afọ, na-egbu nde 2. Enweghị ma ọ bụ iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi egbochiwo mbelata ya. N’ihi ya, nje ịba aghọwo ihe na-eguzogide ọgwụ ndị na-egbubu ha. Nguzogide nke anwụnta nye ọgwụ e ji egbu ụmụ ahụhụ na-eme ka nsogbu ahụ na-esi ike.
Ọgbụgbọ na ọnyụnyụ: Ọgbụgbọ na ọnyụnyụ na-egbu mmadụ 120,000 kwa afọ, karịsịa n’Africa, ebe ntiwapụ ọrịa gbasaworo karị ma na-eme mgbe nile karị. Ihe a na-amaghị ná Ndịda America ruo ọtụtụ iri afọ, ọgbụgbọ na ọnyụnyụ dakwasịrị Peru na 1991, eri mgbe ahụ ọ gbasawokwa na kọntinent ahụ dum.
Ọrịa dengue: Nje virus a anwụnta na-ekesa na-eti ihe e mere atụmatụ ịbụ nde mmadụ 20 ihe otiti kwa afọ. Na 1995 ntiwapụ ọrịa dengue kasị njọ e nwere na Latin America na na Caribbean n’afọ 15 dakwasịrị ma ọ dịkarịa ala mba 14 n’ebe ahụ. Ntiwapụ ọrịa dengue na-arị elu n’ihi obodo ukwu na-amụba amụba, mgbasa nke anwụnta ndị na-ebu ọrịa dengue, na nkwagharị n’ìgwè nke ndị mmadụ bu ya.
Ọrịa diphtheria: Usoro ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa n’ìgwè nke malitere n’afọ 50 gara aga mere ka ọrịa a dị oké ụkọ ná mba ndị mepere emepe. Otú ọ dị, eri 1990, ntiwapụ ọrịa diphtheria akpawo ike ná mba 15 dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe na ebe bụbu Soviet Union. Ihe ruru 1 onye n’ime mmadụ 4 ndị butere ọrịa ahụ nwụrụ. N’ọkara mbụ nke 1995, a kọrọ banyere ihe dị ka 25,000 na-arịa ya.
Ihe otiti bubonic: Na 1995, Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) natara akụkọ banyere 1,400 nke ndị na-arịa ihe otiti mmadụ ma ọ dịkarịa ala. Na United States na ebe ndị ọzọ, ọrịa ahụ agbasawo ruo ógbè ndị na-enwebughị ihe otiti ruo ọtụtụ iri afọ.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ebe e si nweta ya: WHO
[Foto dị na peeji nke 19]
N’agbanyeghị ọganihu ná nlekọta ahụ ike, sayensị ọgwụ na ahụ ike enwebeghị ike ịkwụsị mgbasa nke ọrịa na-efe efe
[Ebe E Si Nweta Foto]
Foto WHO nke J. Abcede sere
[Foto dị na peeji nke 21]
Ọrịa na-agbasa ngwa ngwa mgbe ndị mmadụ bikọtara ọnụ n’ọnọdụ ndị ruru unyi
[Foto dị na peeji nke 22]
Ihe dị ka nde mmadụ 800 ná mba ndị na-emepe emepe enweghị ike inweta nlekọta ahụ ike