Ọrịa Na-efe Efe—Ọ̀ Bụ Ihe Ịrịba Ama nke Ọgwụgwụ?
ỌRỊA na-efe efe nke ụbọchị anyị hà na-atụ aro na ọgwụgwụ ụwa dị nso? Tupu anyị azaa ajụjụ ahụ, ka anyị tụlee ihe okwu ahụ bụ́ “ọgwụgwụ ụwa” pụtara.
Ọtụtụ mmadụ kwetara na ọgwụgwụ ụwa pụtara na Chineke ga-ebibi ụwa na ndụ nile dị n’ime ya. Otú ọ dị, Okwu Chineke na-asị na ọ bụ “ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ [ụwa].” (Aịsaịa 45:18) Nzube ya bụ iji ndị mmadụ nwere obi ụtọ, ndị ahụ siri ike, ndị nwere ọchịchọ siri ike ikwekọ n’ụkpụrụ ezi omume ya mejupụta mbara ụwa. Ya mere ọgwụgwụ ụwa apụtaghị ọgwụgwụ nke elu ala na ndị nile bi n’ime ya. Kama nke ahụ, ọ na-apụta ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a na ndị nọ n’ime ya bụ́ ndị jụrụ ime uche Chineke.
Pita onyeozi gosiri nke a, bụ́ onye dere, sị: “Ụwa [nke ụbọchị Noa lara] n’iyi, n’ihi na iju mmiri gbara ya.” Mgbe e bibiri ụwa n’oge Noa, ọ bụ ndị ajọ omume lara n’iyi. Elu ala dịgidere, otú ahụ ka ọ dịkwa Noa bụ́ onye ezi omume na ezinụlọ ya. Dị ka Pita gara n’ihu na-ekwu, Chineke ga-eme ihe ọzọ n’ọdịnihu iji weta “ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.”—2 Pita 3:6, 7.
Akụkụ ihe odide Bible ndị ọzọ na-akwado echiche a mgbe nile. Dị ka ihe atụ, Ilu 2:21, 22 na-ekwu, sị: “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.”—Leekwa Abụ Ọma 37:9-11.
Ọrịa Na-efe Efe na Ọgwụgwụ Ụwa
Ma olee mgbe nke a ga-eme? Anọ n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs jụrụ ya ajụjụ ahụ. Ha jụrụ, sị: “Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị, na nke ọgwụgwụ usoro ihe nke a [ma ọ bụ, dị ka ụfọdụ nsụgharị Bible na-ekwu, “ọgwụgwụ ụwa”]?” (NW) Jisọs zara, sị: “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: oké ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” (Matiu 24:3, 7, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) N’ihe ndekọ yiri nke ahụ na Luk 21:10, 11, Jisọs kwukwasịrị: “Ajọ ọrịa na-efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche; ihe dị egwu na ihe ịrịba ama ukwu ga-adịkwa site n’eluigwe.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)
Rịba ama na Jisọs ekwughị na nanị ọrịa na-efe efe ga-egosi na ọgwụgwụ ahụ dị nso. Kama nke ahụ, ọ kpọtụkwara agha ukwu, ala ọma jijiji, na ụnwụ nri. N’amụma ya sara mbara nke a na-achọta na Matiu 24 na 25, Mak 13, na Luk 21, Jisọs buru amụma ọtụtụ ihe ndị ọzọ gaje ime. Ha nile gaje imekọ ọnụ tupu Chineke emee ihe iji weta ajọ omume ná ngwụsị n’elu ala. Ihe àmà siri ike na anyị na-ebi ugbu a n’oge ahụ.
Paradaịs Gaje Ịbịa
Ọdịnihu agaghị eweta mgbuchapụ nke ihe a kpọrọ mmadụ, ma ọ bụ site n’ọrịa na-efe efe ma ọ bụ site n’aka Chineke. Jehova Chineke na-ekwe nkwa imegharị elu ala a ịghọ paradaịs. (Luk 23:43) Tinyere ihe ndị ọzọ, ọ ga-ewepụ ọrịa nke na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti.
A na-emesi anyị obi ike banyere nke a mgbe anyị na-atụle ozi nke Jisọs Kraịst, bụ́ onye gosipụtara àgwà nke Nna ya n’ụzọ zuru okè. N’ịbụ onye Nna ya nke eluigwe nyere ike, Jisọs gwọrọ ndị ngwụrọ, ndị ọrụsị, ndị ìsì, ma ọ bụ ndị ogbi. (Matiu 15:30, 31) Ọ gwọkwara ndị ekpenta. (Luk 17:12-14) Ọ gwọrọ otu nwanyị nwere oruru ọbara, nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, na nwoke nwere ọrịa ahụ mmiri. (Mak 3:3-5; 5:25-29; Luk 14:2-4) O weghachiri ahụ ike nke “ndị ọnwa na-eme ka anya ghara ịdị ha mma, na ndị akụkụ ahụ ha nwụrụ anwụ.” (Matiu 4:24) Ugboro atọ ọ kpọlitere ọbụna ndị nwụrụ anwụ!—Luk 7:11-15; 8:49-56; Jọn 11:38-44.
Ọgwụgwọ ọrụ ebube ndị a na-eme ka e jide nkwa Chineke n’aka na n’ọdịnihu nke ọ na-akwadebe, “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) Ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla ọzọ ọrịa na-efe efe ga-anapụ ndị mmadụ ahụ ike na ndụ. Lee aha ekele anyị pụrụ inwe na Onye Okike anyị na-ahụ n’anya nwere ma ikike ma ọchịchọ iwepụ ọrịa nile kpam kpam, ruo mgbe ebighị ebi!—Mkpughe 21:3, 4.
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Chineke nyere Jisọs ike ịgwọ ndị ọrịa
[Foto dị na peeji nke 24]
Na Paradaịs elu ala na-abịanụ, Jehova ga-ewepụ ọrịa nile