Levitikọs
17 Jehova wee gwa Mosis, sị: 2 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị nwoke nakwa ndị Izrel niile okwu, sị ha, ‘Ihe a bụ ihe Jehova nyere n’iwu:
3 “‘“Ọ bụrụ na onye Izrel ọ bụla anọrọ n’ebe unu mara ụlọikwuu gbuo oké ehi ma ọ bụ ebule ma ọ bụ ewu ma ọ bụkwanụ nọrọ n’ebe ọzọ na-abụghị n’ebe unu mara ụlọikwuu gbuo ya, 4 kama iweta ya n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute ma jiri ya chụọrọ Jehova àjà n’ihu ụlọikwuu Jehova, ikpe ọbara mara onye ahụ. O gburu anụmanụ otú iwu na-akwadoghị.* A ga-egbukwa onye ahụ.* 5 Iwu a ga-eme ka ndị Izrel na-ewetaziri Jehova anụ ndị ha na-anọ n’èzí achụ n’àjà. Ha ga na-ewetara ha onye nchụàjà n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. Ha ga-eji ha na-achụrụ Jehova àjà udo.+ 6 Onye nchụàjà ga-efesa ọbara ha n’ebe ịchụàjà Jehova n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute ma suo abụba dị na ha ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ, ka o wee bụrụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.+ 7 Ha ekwesịghịzi ịna-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ yiri ewu* àjà,+ bụ́ ndị ha hapụrụ Chineke gaa fewe.*+ Ihe a bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe.”’
8 “Ị ga-agwa ha, sị, ‘E nweghị onye Izrel ọ bụla ma ọ bụ onye mbịarambịa ọ bụla binyeere unu nke kwesịrị ịnọ n’ebe ọ bụla sọrọ ya chụọ àjà a na-esu ọkụ ma ọ bụ àjà ọzọ. 9 Kama o kwesịrị iweta ya n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute ka o jiri ya chụọrọ Jehova àjà. Onye ọ bula na-emeghị otú a, a ga-egbu ya.*+
10 “‘Ọ bụrụ na onye Izrel ọ bụla ma ọ bụ onye mbịarambịa ọ bụla nke binyeere unu erie ụdị ọbara ọ bụla,+ m ga-ajụ onye* ahụ na-eri ọbara, m ga-egbukwa ya.* 11 N’ihi na ndụ* anụ ahụ́ dị n’ọbara ya.+ Enyekwala m ya unu ka unu jiri ya na-ekpuchiri onwe* unu mmehie,+ maka na ọ bụ ọbara na-ekpuchi mmehie+ n’ihi na ndụ* dị na ya. 12 Ọ bụ ya mere m ji gwa ndị Izrel, sị: “Ya enwela onye* n’ime unu ga-eri ọbara. Ya enwekwala onye mbịarambịa binyeere unu+ ga-eri ọbara.”+
13 “‘Ọ bụrụ na onye Izrel ma ọ bụ onye mbịarambịa nke binyeere unu na-achụ nta wee nwụde anụ ọhịa ma ọ bụ nnụnụ a na-eri eri, ọ ga-egbu ya ma hapụ ya ka ọbara ya gbapụchaa.+ Ọ ga-ekpochikwa ọbara ya ájá. 14 N’ihi na ndụ* ụdị anụ ahụ́ ọ bụla bụ ọbara ya, n’ihi na ndụ* ya dị n’ọbara ya. Ọ bụ ya mere m ji gwa ndị Izrel, sị: “Unu erila ọbara nke ụdị anụ ahụ́ ọ bụla n’ihi na ndụ* ụdị anụ ahụ́ ọ bụla bụ ọbara ya. A ga-egbu onye ọ bụla na-eri ya.”+ 15 Ọ bụrụ na onye* ọ bụla erie anụ nwụrụ anwụ ma ọ bụ nke anụ ọhịa dọgburu,+ ma onye ahụ ọ̀ bụ nwa afọ ma ọ̀ bụ mbịarambịa, ọ ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ E mechaa, ọ ga-adị ọcha. 16 Ma ọ bụrụ na ọ sụghị ha, saakwa ahụ́, ọ ga-aza ajụjụ maka mmehie ya.’”+