Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 28 p. 147-151
  • Ụzọ Isi Mata Onye A Ga-erubere Isi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Isi Mata Onye A Ga-erubere Isi
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ ‘Na-eji Obi Gị Niile Erube Isi’?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Ì Kwesịrị Ịtụ Ụtụ Isi?
    Teta!—2003
  • Ọ̀ Bụ Iwu Na Ị Ga-atụ Ụtụ Isi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Inyeghachi Siza Ihe nke Siza
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 28 p. 147-151

ISI NKE 28

Ụzọ Isi Mata Onye A Ga-erubere Isi

MGBE ụfọdụ, ọ na-esi ike ịmata onye anyị kwesịrị irubere isi. Nne gị ma ọ bụ nna gị pụrụ ịgwa gị ka i mee otu ihe. Ma onye nkụzi gị n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ onye uwe ojii pụrụ ịgwa gị ka i mee ihe dị iche na nke ahụ. Ọ bụrụ na nke ahụ emee, ònye n’ime ha ka ị ga-erubere isi?—

Ná mmalite akwụkwọ a, n’Isi nke 7, anyị gụrụ Ndị Efesọs 6:1-3 n’ime Bible. N’ebe ahụ, o kwuru na ụmụaka kwesịrị ịdị na-erubere ndị mụrụ ha isi. “Na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe metụtara Onyenwe anyị,” ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ na-ekwu. Ị̀ ma ihe bụ́ ụmụaka irubere ndị mụrụ ha isi “n’ihe metụtara Onyenwe anyị”?— Ọ pụtara na ụmụaka kwesịrị ịdị na-erubere ndị mụrụ ha isi mgbe ndị mụrụ ha na-akụziri ha irube isi n’iwu Chineke.

Ma ụfọdụ ndị toruworo ogo mmadụ ekweghị na Jehova. Ya mere, gịnị ma ọ bụrụ na otu n’ime ha ekwuo na ịghọ aghụghọ mgbe a na-ele ule n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ iwere ihe n’ụlọ ahịa n’akwụghị ụgwọ ya abụghị ihe ọjọọ? Mgbe ahụ, ọ̀ dị mma ka nwatakịrị na-aghọ aghụghọ ma ọ bụ na-ezu ohi?—

Cheta na n’otu oge, Eze Nebukadneza nyere iwu ka mmadụ nile kpọọ isiala nye ihe oyiyi ọlaedo o guzobere. Ma Shedrak, Mishak, na Abednego jụrụ ịkpọ isiala nye ya. Ị̀ ma ihe kpatara ya?— Ọ bụ n’ihi na Bible kwuru na ọ bụ nanị Jehova ka ndị mmadụ kwesịrị ife ofufe.—Ọpụpụ 20:3; Matiu 4:10.

[Foto dị na peeji nke 148]

Gịnị ka Pịta na-agwa Keifas?

Mgbe Jizọs nwụsịrị, a kpụụrụ ndịozi ya gaa n’ihu ndị Sanhedrin, bụ́ ụlọikpe okpukpe kasịnụ nke ndị Juu. Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Keifas kwuru, sị: “Anyị [nyesiri] unu iwu ike ka unu kwụsị ịnọgide na-ezi ihe na-adabere n’aha [Jizọs], n’agbanyeghịkwa nke ahụ, lee! unu emejupụtawo Jeruselem n’ozizi unu.” Gịnị mere ndịozi ahụ na-ejighị rubere Sanhedrin isi?— Pita, n’ikwuchitere ndịozi ahụ nile ọnụ ha, zara Keifas, sị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:27-29.

N’oge ahụ, ndị ndú okpukpe ndị Juu nwere ike buru ibu. Otú ọ dị, ọ bụ ndị Rom na-achị mba ha. A na-akpọ onyeisi ọchịchị ahụ Siza. Ọ bụ ezie na ndị Juu achọghị ka Siza na-achị ha, ọchịchị Rom meere ndị ahụ ọtụtụ ihe ọma. Taakwa, ndị ọchịchị na-emekwara ndị ha na-achị ihe ọma. Ị̀ ma ụfọdụ n’ime ihe ndị a?—

Ndị ọchịchị na-arụ ụzọ maka ime njem, na-akwụkwa ndị uwe ojii na ndị ọrụ mmenyụ ọkụ ụgwọ ka ha na-echebe anyị. Ha pụkwara ime ndokwa agụmakwụkwọ maka ndị na-eto eto, meekwara ndị agadi ndokwa maka nlekọta ahụ́ ike. Ọ na-efu ndị ọchịchị ego ime ihe ndị a. Ị̀ ma ebe ndị ọchịchị si enweta ego?— Ọ bụ site n’aka ndị mmadụ. A na-akpọ ego ndị mmadụ na-akwụ ndị ọchịchị ụtụ isi.

Mgbe Onye Ozizi Ukwu ahụ biri n’ụwa, ọtụtụ ndị Juu achọghị ịdị na-atụ ụtụ isi nye ndị ọchịchị Rom. Ya mere, otu ụbọchị, ndị nchụàjà goro ụfọdụ ndị ka ha jụọ Jizọs ajụjụ iji mee ka ọ banye ná nsogbu. Ajụjụ ahụ bụ, ‘Ànyị kwesịrị ịdị na-atụ ụtụ isi nye Siza ka ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị?’ Nke a bụ ajụjụ aghụghọ. Ọ bụrụ na Jizọs asị ha, ‘Ee, unu aghaghị ịdị na-atụ ụtụ isi,’ ọtụtụ ndị Juu agaghị enwe mmasị n’ihe o kwuru. Ma Jizọs apụghị ịsị ha, ‘Ee e, unu ekwesịghị ịdị na-atụ ụtụ isi.’ Ikwu otú ahụ agaghị adị mma.

Ya mere, gịnị ka Jizọs mere? Ọ sịrị ha: “Gosinụ m otu mkpụrụ ego.” Mgbe ha wetaara ya otu mkpụrụ ego, Jizọs jụrụ ha, sị: ‘Onyinyo ònye na aha ònye dị na ya?’ Ndị ahụ sịrị: “Nke Siza.” Jizọs sịrị: “Ya mere, hụnụ na unu kwụghachiri Siza ihe nke Siza, ma kwụghachinụ Chineke ihe nke Chineke.”—Luk 20:19-26.

[Foto dị na peeji nke 149]

Olee otú Jizọs si zaa ajụjụ aghụghọ ahụ ndị ikom a jụrụ ya?

Ọ dịghị onye ọ bụla hụrụ ihe dị njọ n’ihe ọ zara. Ọ bụrụ na Siza na-emere ndị mmadụ ihe dị iche iche, o kwesịrị nnọọ ekwesị iji ego Siza mepụtara kwụọ ya ụgwọ ihe ndị a. N’ụzọ dị otú a, Jizọs gosiri na o ziri ezi ịdị na-atụ ụtụ isi nye ndị ọchịchị maka ihe ndị ha na-emere anyị.

Ugbu a, i torubeghị ogo ịtụ ụtụ isi. Ma ọ dị ihe i kwesịrị inye ndị ọchịchị. Ị̀ ma ihe ọ bụ?— Ọ bụ irube isi n’iwu ndị ọchịchị nyere. Bible na-ekwu, sị: ‘Na-eruberenụ ikike ndị ka elu isi.’ Ikike ndị a bụ ndị nwere ike ọchịchị. Ya mere, ọ bụ Chineke kwuru na anyị kwesịrị ịdị na-erube isi n’iwu ndị ọchịchị nyere.—Ndị Rom 13:1, 2.

A pụrụ inye iwu ka a ghara ịtụsasị akwụkwọ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ n’okporo ámá. Ì kwesịrị irube isi n’iwu ahụ?— Ee, Chineke chọrọ ka i rube isi na ya. Ì kwesịkwara irubere ndị uwe ojii isi?— Ndị ọchịchị na-akwụ ndị uwe ojii ụgwọ ka ha na-echebe ndị mmadụ. Irubere ha isi na irubere ndị ọchịchị isi bụ otu ihe ahụ.

Ya mere, ọ bụrụ na ị chọrọ ịgafe okporo ámá, onye uwe ojii wee sị gị “Chere!” gịnị ka i kwesịrị ime?— Ọ bụrụ na ndị ọzọ akpọchie ntị gbafere, ì kwesịrị ịgbafere?— I kwesịrị ichere, ọ bụrụgodị na ọ bụ nanị gị bụ onye nọ na-echere. Chineke gwara gị ka ị na-erube isi.

A pụrụ inwe nsogbu n’ógbè unu, onye uwe ojii nwekwara ike ịsị: “Unu agala n’okporo ámá. Unu apụla èzí.” Ma i nwere ike ịnụ ka ndị mmadụ na-eti mkpu, i nwekwara ike ịdị na-eche ihe na-emenụ. Ì kwesịrị ịpụ n’èzí ịga lee ihe na-emenụ?— Nke a ọ̀ ga-abụ irubere “ikike ndị ka elu” isi?—

N’ọtụtụ ebe, ndị ọchịchị na-ewukwa ụlọ akwụkwọ, na-akwụkwa ndị nkụzi ụgwọ. Ì chere na Chineke chọrọ ka ị na-erubere onye nkụzi isi?— Chee echiche banyere ya. Ndị ọchịchị na-akwụ onye nkụzi ụgwọ ka ọ na-akụzi ihe, otú ha na-akwụkwa onye uwe ojii ụgwọ ka ọ na-echebe ndị mmadụ. Ya mere, irubere ma onye uwe ojii ma onye nkụzi isi yiri irubere ndị ọchịchị isi.

[Foto dị na peeji nke 151]

Gịnị mere anyị kwesịrị iji rubere onye uwe ojii isi?

Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na onye nkụzi ekwuo na ị ghaghị ịkpọ isiala nye ihe oyiyi? Mgbe ahụ olee ihe ị ga-eme?— Ndị Hibru atọ ahụ akpọghị isiala nye ihe oyiyi ahụ, ọbụna mgbe Eze Nebukadneza gwara ha ka ha mee otú ahụ. Ì chetara ihe kpatara ya?— Ọ bụ n’ihi na ha achọghị inupụrụ Chineke isi.

Otu onye nke na-ede akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Will Durant dere ihe banyere Ndị Kraịst oge mbụ wee kwuo na ‘onye ha kasị erubere isi [ma ọ bụ, eguzosi ike n’ihe nye] abụghị Siza.’ Ee e, ọ bụ Jehova! Ya mere, cheta na Chineke kwesịrị ibute ụzọ ná ndụ anyị.

Anyị na-erubere ndị ọchịchị isi n’ihi na ọ bụ ihe Chineke chọrọ ka anyị mee. Ma ọ bụrụ na ha agwa anyị ka anyị mee ihe Chineke kwuru na anyị ekwesịghị ime, gịnị ka anyị kwesịrị ikwu?— Anyị kwesịrị ikwu ihe ahụ ndịozi gwara nnukwu onye nchụàjà, sị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.

A kụziri irubere iwu isi n’ime Bible. Gụọ ihe e dere na Matiu 5:41; Taịtọs 3:1; nakwa na 1 Pita 2:12-14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya