ISI NKE 27
Ònye Bụ Chi Gị?
OLEE ihe mere ajụjụ bụ́, Ònye bụ Chi gị? ji bụrụ ajụjụ dị mkpa?— Ọ bụ n’ihi na ndị mmadụ na-efe ọtụtụ chi. (1 Ndị Kọrint 8:5) Mgbe Jehova nyere Pọl onyeozi ikike ịgwọ otu nwoke na-agatụbeghị ije, ndị mmadụ tiri mkpu, sị: “Ndị bụ́ chi adịrịwo ka ụmụ mmadụ, ha agbadakwutewokwa anyị!” Ndị ahụ chọrọ ife Pọl na enyi ya bụ́ Banabas ofufe. Ha kpọrọ Pọl Hamis, kpọọkwa Banabas Zus, ndị bụcha aha chi ụgha.
Ma Pọl na Banabas ekweghị ka ndị ahụ fee ha ofufe. Ha mabara n’etiti ìgwè mmadụ ahụ kwuo, sị: ‘Sinụ n’ihe efu ndị a chigharịkwuru Chineke ahụ dị ndụ.’ (Ọrụ 14:8-15) Ònye bụ “Chineke ahụ dị ndụ,” onye kere ihe nile?— Ọ bụ Jehova, “Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” Jizọs kpọrọ Jehova “nanị ezi Chineke ahụ.” Ya mere, nanị ònye ka e kwesịrị ife ofufe?— Ọ bụ nanị Jehova!—Abụ Ọma 83:18; Jọn 17:3; Mkpughe 4:11.
Gịnị mere Pọl na Banabas na-ejighị kwe ka ndị mmadụ kpọọrọ ha isiala?
Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ na-efe chi ndị ọzọ kama ife “nanị ezi Chineke ahụ” ofufe. Ha na-efekarị ihe ndị ha ji osisi, okwute ma ọ bụ ọla mee. (Ọpụpụ 32:4-7; Levitikọs 26:1; Aịsaịa 44:14-17) Mgbe ụfọdụ, a na-akwanyere ọbụna ndị nwoke na ndị nwanyị ghọrọ ndị a ma ama ùgwù dị ka a ga-asị na ha bụ chi. Ò kwesịrị ekwesị inye ha otuto?—
Mgbe Sọl ghọsịrị Pọl onyeozi, o dere, sị: ‘Chi nke usoro ihe a emewo ka uche nke ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì.’ (2 Ndị Kọrint 4:4) Ònye bụ chi a?— Ee, ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu! Setan enwewo ike ime ka ndị mmadụ na-efe ọtụtụ ndị nakwa ọtụtụ ihe ofufe.
Mgbe Setan gbalịrị ime ka Jizọs kpọọrọ ya isiala ma fee ya ofufe, gịnị ka Jizọs gwara Setan?— “Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa nanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.” (Matiu 4:10) Ya mere, Jizọs mere ka o doo anya na ọ bụ nanị Jehova ka e kwesịrị ife ofufe. Ka anyị gụọ ihe banyere ụmụ okorobịa ụfọdụ ndị maara nke a. Aha ha bụ Shedrak, Mishak, na Abednego.
Ndị Hibru a na-eto eto si ná mba Chineke bụ́ Izrel, a dọkwaara ha n’agha gaa Babilọn. N’ebe ahụ, otu eze aha ya bụ Nebukadneza wuru otu agadaga ihe oyiyi ọlaedo. Otu ụbọchị, o nyere iwu na mgbe a kụwara egwú, na mmadụ nile kwesịrị ịkpọ isiala nye ihe oyiyi ahụ. Ọ dọrọ aka ná ntị, sị: ‘A ga-atụba onye ọ bụla nke na-akpọghị isiala ma fee ofufe, n’ime oké ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu.’ Olee ihe ị gaara eme?—
Olee ihe mere ndị ikom a na-agaghị eji kpọọ isiala nye ihe oyiyi ahụ?
Shedrak, Mishak, na Abednego na-adị na-eme ihe nile eze nyere n’iwu. Ma ha jụrụ ime nke a. Ị̀ ma ihe kpatara ya?— Ọ bụ n’ihi na iwu Chineke sịrị: ‘Ị gaghị enwe chi ọzọ ma e wezụga m. Emerela onwe gị ihe oyiyi ọ bụla a pịrị apị ma kpọọ isiala nye ya.’ (Ọpụpụ 20:3-5) Ya mere, Shedrak, Mishak, na Abednego rubere isi n’iwu Jehova kama irube isi n’iwu ahụ eze nyere.
Eze ahụ were ezigbo iwe, ya mere o nyere iwu ka a kpụta ndị Hibru atọ ahụ na-eto eto n’ihu ya ozugbo. Ọ jụrụ ha, sị: ‘Ọ̀ bụ eziokwu na unu adịghị efe chi m ofufe? M ga-enye unu ohere ọzọ. Ugbu a, mgbe unu nụrụ ụda egwú, daanụ n’ala, kpọọ isiala nye onyinyo ahụ m mere. Ọ bụrụ na unu emeghị ya, a ga-atụba unu n’ime oké ọkụ ahụ na-enwu ajọ onwunwu. Oleekwa chi ahụ nke ga-anapụta unu n’aka m?’
Gịnị ka ụmụ okorobịa ahụ ga-eme ugbu a? A sị na ọ bụ gị, gịnị ka ị gaara eme?— Ha sịrị eze ahụ: ‘Chineke anyị, Onye anyị na-efe ofufe nwere ikike ịnapụta anyị. Ma ọ bụrụgodị na ọ napụtaghị anyị, anyị agaghị efe chi gị dị iche iche ofufe. Anyị agaghị akpọ isiala nye onyinyo ọlaedo i mere.’
Iwe juru eze ahụ obi. O nyere iwu, sị: ‘Meenụ ka ọkụ ahụ dị ọkụ okpukpu asaa karịa otú ọ na-adị!’ O nyeziri ndị ikom ya dị ike iwu ka ha kee Shedrak, Mishak, na Abednego agbụ ma tụba ha n’ime ọkụ ahụ! Ọkụ ahụ dị ọkụ nke ukwuu nke na ire ọkụ ahụ gburu ndị ikom na-ejere eze ozi! Olee banyere ndị Hibru atọ ahụ?
Shedrak, Mishak, na Abednego dara kpọmkwem n’etiti ọkụ ahụ. Ma ha biliri! Ọ dịghị ihe mere ha. Agbụ e kere ha tọghepụrụ. Olee otú nke a ga-esi kwe omume?— Eze ahụ lebara anya n’ime ọkụ ahụ, ihe ọ hụrụ mekwara ka ụjọ bịa ya. Ọ jụrụ, sị: ‘Ọ́ bụghị ndị ikom atọ ka anyị tụbara n’ime ọkụ ahụ?’ Ndị ohu ya zara ya, sị: ‘Ọ bụ ya, eze.’
Olee otú Jehova si zọpụta ndị ohu ya n’ọkụ a na-enwu ajọ onwunwu?
Mgbe ahụ, eze sịrị: ‘Lee! Ana m ahụ mmadụ anọ ka ha na-agagharị n’ime ebe ahụ, ọkụ anaghịkwa ere onye ọ bụla n’ime ha.’ Ị̀ ma onye bụ́ onye nke anọ ahụ?— Ọ bụ mmụọ ozi Jehova. O chebere ndị Hibru atọ ahụ ka ọkụ ghara ire ha.
Mgbe ọ hụrụ nke a, eze bịara n’ọnụ ụzọ nke ebe ahụ ọkụ ahụ dị tie, sị: ‘Shedrak, Mishak, na Abednego, unu ndị ohu nke Chineke nke kachasị ihe nile elu, pụtanụ, bịa’! Mgbe ha pụtara, onye ọ bụla hụrụ na ọkụ ereghị ha. Ọbụna ísìsì ọkụ adịghị ha n’ahụ́. Mgbe ahụ eze ahụ kwuru, sị: ‘Onye a gọziri agọzi ka Chineke nke Shedrak, Mishak, na Abednego bụ, onye zitere mmụọ ozi ya ịzọpụta ndị ohu ya n’ihi na ha jụrụ ife chi ọ bụla ọzọ ma ọ bụghị Chineke ha.’—Daniel, isi 3.
Olee ihe ndị mmadụ na-akwanyere ùgwù taa dị ka arụsị?
Anyị pụrụ ịmụta ihe n’ihe mere laa azụ n’oge ahụ. Ọbụna taa, ndị mmadụ na-eme ihe oyiyi, ma ọ bụ arụsị, maka ife ya ofufe. Akwụkwọ e ji eme nnyocha bụ́ The Encyclopedia Americana na-ekwu, sị: “Ọkọlọtọ dị nsọ, dịkwa ka obe dị nsọ.” A pụrụ iji osisi, okwute, ọla ma ọ bụ ákwà mee ihe oyiyi. Ndị na-eso ụzọ Jizọs nke oge mbụ jụrụ ịkpọ isiala nye eze ukwu nke Rom, bụ́ ihe ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Daniel P. Mannix sịrị na a pụrụ iji tụnyere “ịjụ ikele ọkọlọtọ ma ọ bụ ikwughachi okwu ịṅụ iyi ikwesị ntụkwasị obi.”
Ya mere, ì chere na ọ dị ihe o mere nye Chineke ma è ji ákwà, osisi, nkume, ma ọ bụ ọla mee ihe oyiyi okpukpe?— Ọ̀ ga-abụ ihe kwesịrị ekwesị ka ohu Jehova fee ihe oyiyi dị otú ahụ ofufe?— Shedrak, Mishak, na Abednego jụrụ ime otú ahụ, Jehova nwekwara obi ụtọ n’ebe ha nọ. Olee otú ị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya ha?—
Ndị na-ejere Jehova ozi apụghị ife onye ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ofufe. Gụọ ihe e kwuru banyere nke a na Joshua 24:14, 15, 19-22; Aịsaịa 42:8; 1 Jọn 5:21; nakwa ná Mkpughe 19:10.