ISI NKE 26
Ihe Mere O Ji Esi Ike Ime Ihe Ọma
MGBE Sọl na-eme ihe ọjọọ, ònye nọ na-enwe obi ụtọ?— Ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu. Ma ndị ndú okpukpe ndị Juu na-enwekwa obi ụtọ. Mgbe Sọl mesịziri ghọọ onye na-ezo ụzọ Onye Ozizi Ukwu ahụ, a kpọọkwa ya Pọl, ndị ndú okpukpe ahụ malitere ịkpọ ya asị. Ya mere, ị̀ hụla ihe mere o ji esiri onye na-eso ụzọ Jizọs ike ime ihe ọma?—
Olee ahụhụ Pọl tara mgbe o mere ihe ọma?
N’otu oge, nnukwu onye nchụàjà aha ya bụ Ananaịas gwara ndị mmadụ ka ha tie Pọl ihe n’ihu. Ọbụna Ananaịas gbalịrị ime ka a tụba Pọl n’ụlọ mkpọrọ. Pọl tara ahụhụ nke ukwuu mgbe ọ ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs. Dị ka ihe atụ, ndị ajọ mmadụ tiri Pọl ihe ma chọọ iji nkume ndị buru ibu tụgbuo ya.—Ọrụ 23:1, 2; 2 Ndị Kọrint 11:24, 25.
Ọtụtụ ndị ga-agbalị ime ka anyị mee ihe ndị na-adịghị amasị Chineke. Ya mere ajụjụ bụ, Olee otú ị hụruru ihe ọma n’anya? Ị̀ hụrụ ya n’anya nke ukwuu nke na ị ga-eme ihe ọma ọ bụrụgodị na ndị ọzọ akpọ gị asị n’ihi ya? Ọ na-achọ obi ike iji mee otú ahụ, ọ́ bụghị ya?—
Ị pụrụ iche sị, ‘Gịnị mere ndị mmadụ ga-eji kpọọ anyị asị n’ihi na anyị na-eme ihe ọma? Ọ̀ bụ na ha ekwesịghị inwe obi ụtọ?’ Ị ga na-eche otú ahụ. Ọtụtụ mgbe, ndị mmadụ nwere mmasị n’ebe Jizọs nọ n’ihi ihe ọma ndị o mere. N’otu oge, ndị nile bi n’otu obodo gbakọtara n’ọnụ ụzọ ụlọ ebe ọ nọ. Ha bịara ebe ahụ n’ihi na Jizọs anọwo na-agwọ ndị ọrịa.—Mak 1:33.
Ma mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ adịghị enwe mmasị n’ihe Jizọs na-akụzi. Ọ bụ ezie na ọ kụziri ihe ziri ezi mgbe nile, ụfọdụ kpọrọ ya asị nke ukwuu n’ihi na o kwuru eziokwu. Nke a mere otu ụbọchị na Nazaret, bụ́ obodo Jizọs nọ tolite. Ọ gara n’ụlọ nzukọ, bụ́ ebe ndị Juu na-ezukọ maka ife Chineke.
N’ebe ahụ, Jizọs kwuru okwu magburu onwe ya site n’Akwụkwọ Nsọ. Ná mmalite, ndị mmadụ nwere mmasị na ya. Okwu ọma ndị o kwuru juru ha anya. O siiri ha ike ikweta na onye a bụ nwa okorobịa ahụ nọ n’obodo ha tolite.
Ma Jizọs kwuziri ihe ọzọ. O kwuru banyere oge mgbe Chineke meere ndị na-abụghị ndị Juu amara pụrụ iche. Mgbe Jizọs kwuru nke a, ndị nọ n’ụlọ nzukọ ahụ were iwe. Ị̀ ma ihe mere ha ji wee iwe?— Ha chere na ọ bụ nanị ha bụ ndị Chineke na-emere amara n’ụzọ pụrụ iche. Ha chere na ha ka ndị ọzọ mma. Ya mere, ha kpọrọ Jizọs asị n’ihi ihe o kwuru. Ị̀ ma ihe ha gbalịrị ime ya?—
Bible na-ekwu, sị: ‘Ha jidere Jizọs ma kpụrụ ya ọsọ ọsọ gaa n’azụ obodo ahụ. Ha duuru ya gaa n’ọnụ ọnụ otu ugwu, ha chọkwara isi n’elu ugwu ahụ kwapụ ya ka ọ daa nwụọ! Ma Jizọs gbanahụrụ ha.’—Luk 4:16-30.
Gịnị mere ndị a ji na-achọ igbu Jizọs?
Ọ bụrụ na ọ bụ gị ka e mere ihe ahụ, ị̀ ga-anwa anwa gaghachi ịga gwa ndị ahụ banyere Chineke?— Nke ahụ ga-achọ obi ike, ọ́ bụghị ya?— Otú ọ dị, ihe dị ka otu afọ mgbe nke ahụ gasịrị, Jizọs gaghachiri Nazaret. Bible na-ekwu, sị: “Ọ malitere izi ha ihe n’ụlọ nzukọ ha.” Jizọs ejighị n’ihi ụjọ maka ụmụ mmadụ ndị na-ahụghị Chineke n’anya kwụsị ikwu eziokwu.—Matiu 13:54.
Ụbọchị ọzọ, n’ụbọchị izu ike, Jizọs nọ n’otu ebe, ebe otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọ. Jizọs nwere ike sitere n’aka Chineke iji gwọọ nwoke ahụ. Ma ụfọdụ n’ime ndị nọ n’ebe ahụ na-agbalị inye Jizọs nsogbu. Olee ihe Onye Ozizi Ukwu ahụ ga-eme?— O bu ụzọ jụọ, sị: ‘Ọ bụrụ na i nwere atụrụ nke dabara n’ime otu nnukwute olulu n’Ụbọchị Izu Ike, ị̀ ga-adọpụta ya?’
Ee, ha ga-adọpụta atụrụ ha, ọ bụrụgodị na ọ bụ n’Ụbọchị Izu Ike, bụ́ ụbọchị ha kwesịrị iji zuo ike. Ya mere Jizọs sịrị: ‘Ọ dị mma ọbụna karị inyere mmadụ aka n’Ụbọchị Izu Ike, ebe ọ bụ na mmadụ dị mkpa karịa atụrụ!’ Lee otú o si doo anya na Jizọs kwesịrị inyere nwoke a aka site n’ịgwọ ya!
Jizọs gwara nwoke ahụ ka ọ gbatịa aka ya. Ozugbo, aka ahụ dịrị mma. Lee obi ụtọ nwoke ahụ nwere! Ma gịnị banyere ndị nke ọzọ ahụ? Obi ọ̀ dị ha ụtọ?— Ee e. Ha kpọrọ Jizọs asị ọbụna karị. Ha pụrụ gaa gbaa izu igbu ya!—Matiu 12:9-14.
Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ihe ọ sọkwara anyị mee, anyị enweghị ike ime ihe ga-atọ mmadụ nile ụtọ. Ya mere, anyị aghaghị ikpebi onye anyị ga-achọ ime ihe ga-atọ ya ụtọ n’ezie. Ọ bụrụ na ọ bụ Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, mgbe ahụ anyị aghaghị ịdị na-eme mgbe nile ihe ha na-akụziri anyị. Ma ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, ònye ga-akpọ anyị asị? Ònye ga-eme ka o siere anyị ike ime ihe ọma?—
Ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu. Olee ndị ọzọkwa?— Ọ bụ ndị Ekwensu ghọgbuworo ikweta ihe ndị na-ezighị ezi. Jizọs gwara ndị ndú okpukpe nke oge ya, sị: “Unu sitere ná nna unu bụ́ Ekwensu, unu na-achọkwa ime ọchịchọ nke nna unu.”—Jọn 8:44.
E nwere ọtụtụ ndị Ekwensu nwere mmasị n’ebe ha nọ. Jizọs kpọrọ ha “ụwa.” Gịnị ka i chere “ụwa” ahụ Jizọs kwuru banyere ya bụ?— Ọ dị mma, ka anyị gụọ Jọn isi 15, amaokwu 19, lee ihe o kwuru. N’ebe ahụ, anyị na-agụ ihe a Jizọs kwuru: “A sị na unu bụ akụkụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ ihe bụ́ nke ya n’anya. Ma n’ihi na unu abụghị akụkụ nke ụwa, kama ahọpụtawo m unu n’ụwa, n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị.”
Ya mere, ihe mejupụtara ụwa ahụ nke kpọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs asị bụ ndị nile na-abụghị ụmụazụ ya. Gịnị mere ụwa ji kpọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs asị?— Cheedị echiche banyere ya. Ònye na-achị ụwa?— Bible na-ekwu, sị: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” Ajọ onye ahụ bụ Setan bụ́ Ekwensu.—1 Jọn 5:19.
Ị̀ hụla ihe mere o ji esi nnọọ ike ime ihe ọma?— Setan na ụwa ya na-eme ka o sie ike. Ma e nwere ihe ọzọ mere o ji esi ike. Ì chetara ihe ọ bụ?— N’Isi nke 23 nke akwụkwọ a, anyị mụtara na anyị nile ketara mmehie mgbe a mụrụ anyị. Ọ́ gaghị abụ ihe magburu onwe ya mgbe mmehie, Ekwensu, na ụwa ya na-agaghị adịkwa?—
Mgbe ụwa a ga-agabiga, gịnị ga-eme ndị na-eme ihe ọma?
Bible na-ekwe nkwa, sị: “Ụwa na-agabiga.” Nke a pụtara na a ga-ebibi ndị nile na-abụghị ụmụazụ nke Onye Ozizi Ukwu ahụ. A gaghị ekwe ka ha dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ị̀ ma ndị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?— Bible gara n’ihu ikwu, sị: “Onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) Ee, ọ bụ nanị ndị na-eme ezi ihe, ndị na-eme “uche Chineke,” ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. Ya mere, ọ bụrụgodị na o siri ike, anyị chọrọ ịdị na-eme ihe ọma, ọ́ bụghị ya?—
Ka anyị gụkọọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a ọnụ bụ́ ndị na-egosi ihe mere ọ na-ejighị adị mfe ime ihe ọma: Matiu 7:13, 14; Luk 13:23, 24; nakwa Ọrụ 14:21, 22.