Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Hibru
1 Ogologo oge gara aga, Chineke si n’ọnụ ndị amụma gwa nna nna anyị hà okwu ọtụtụ mgbe, o sikwa n’ọtụtụ ụzọ gwa ha ya.+ 2 Ma n’ọgwụgwụ oge ndị a, o si n’ọnụ Ọkpara ya gwa anyị okwu,+ onye ọ họpụtara ka o keta ihe niile,+ onye o sikwa n’aka ya kee ihe ndị dị n’eluigwe na n’ụwa.*+ 3 Ọ bụ onyinyo ebube Chineke.+ O yikwara nnọọ Chineke,+ ọ na-ejikwa okwu ya dị ike eme ka ihe niile na-adị. Mgbe ọ sachapụchara mmehie anyị,+ ọ nọdụrụ ala n’aka nri Onye Ukwu ahụ, n’ebe dị elu.+ 4 N’ihi ya, ọ kala ndị mmụọ ozi mma,+ ebe ọ bụ na o nwetala* aha ka nke ha mma.+
5 Dị ka ihe atụ, ònye n’ime ndị mmụọ ozi ka Chineke gwatụrụla, sị: “Ị bụ ọkpara m. Abụrụla m nna gị taa”?+ ma ọ bụ “M ga-abụ nna ya, ọ ga-abụkwa ọkpara m”?+ 6 Ma gbasara oge Chineke ga-ezite Nwa Mbụ ya+ ọzọ n’ụwa,* ọ sịrị: “Ka ndị mmụọ ozi niile nke Chineke kpọọrọ ya isiala.”
7 O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi, sị: “Ọ na-eme ka ndị mmụọ ozi ya sie ike, na-emekwa ka ndị ozi ya*+ bụrụ ire ọkụ.”+ 8 Ma o kwuru banyere Ọkpara ya, sị: “Ọ bụ Chineke nyere gị ikike ịchị*+ ruo mgbe niile ebighị ebi, mkpanaka Alaeze gị bụkwa mkpanaka ezi omume.* 9 Ị hụrụ ezi omume n’anya, ị kpọkwara mmebi iwu asị. Ọ bụ ya mere Chineke, bụ́ Chineke gị, ji tee gị mmanụ+ ma mee ka ị na-aṅụrị ọṅụ karịa ndị ibe gị.”+ 10 E kwukwara, sị: “Onyenwe anyị, ị tọrọ ntọala ụwa ná mmalite, ọ bụkwa gị kere eluigwe. 11 Ha ga-ala n’iyi, ma ị ga na-adị ndụ. Ha niile ga-aka nká ka uwe. 12 Ị ga-afụkọtakwa ha ka ákwà mgbokwasị, a ga-agbanwekwa ha ka uwe. Ma ị ka bụ onye ị bụ, e nweghịkwa mgbe ị ga-akwụsị ịdị ndụ.”+
13 Ma ònye n’ime ndị mmụọ ozi ka ọ gwatụrụla, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m ruo mgbe m ga-eme ka ndị iro gị bụrụ ihe i ji agbakwasị ụkwụ”?+ 14 Ọ̀ bụ na ha niile abụghị ndị mmụọ na-eje ozi dị nsọ,*+ ndị e zipụrụ ka ha jeere ndị a ga-azọpụta ozi?