E Wepụ Ndịàmà Jehova n’Ụta na Gris
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA!
ONYE ụkọchukwu Orthodox nọ n’obodo nta Krit bụ́ Gazi kwuru n’oge ọ na-ekwu otu n’ime okwuchukwu ya, sị: “Ndịàmà Jehova nwere ụlọ nzukọ kpọmkwem n’ebe a n’obodo anyị. Achọrọ m nkwado unu iji chụpụ ha.” Otu uhuruchi n’ụbọchị ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, ndị a na-amaghị ndị ha bụ tikasịrị window Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, gbaakwa ya mgbọ. N’ụzọ dị otú a e welitere okwu nnwere onwe okpukpe ọzọ na Gris.
Ihe omume ndị a kpaliri Ndịàmà anọ si n’ógbè ahụ, bụ́ Kyriakos Baxevanis, Vassilis Hatzakis, Kostas Makridakis, na Titos Manoussakis, idegara Mịnịsta Okwu Mmụta na Ihe Ndị Metụtara Okpukpe Dị n’Aka akwụkwọ mkpesa ikwe ka ha na-enwe nzukọ okpukpe. Ha tụrụ anya na inweta ikike ga-emesịa mee ka ha nweta nchebe ndị uwe ojii. Otú ọ dị, ọ gajeghị ịdịcha mfe otú ahụ.
Onye ụkọchukwu ahụ zigaara isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii na-ahụ maka nchebe na Heraklion akwụkwọ ozi, na-adọrọ uche ndị isi gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị na parish ya, na-arịọ ka a tụkwasị ihe mgbochi ụfọdụ ma machibido nzukọ ha iwu. Nke a kpatara ndị uwe ojii ime nchọpụta na ịgba ajụjụ ọnụ. N’ikpeazụ, onye ikpe ọha ahụ gbara Ndịàmà akwụkwọ ịbụ ndị omekome, e wetakwara okwu ahụ n’ụlọikpe.
N’October 6, 1987, Ụlọikpe Mpụ na Heraklion tọhapụrụ mmadụ anọ ahụ na-azara ọnụ ha, na-ekwu na “ha emeghị ihe ahụ e boro ha ebubo ya, n’ihi na ndị òtù okpukpe nweere onwe ha inwe nzukọ . . . , inweta ikike adịghị mkpa.” Otú o sina dị, onye ikpe ọha ahụ tinyere akwụkwọ maka mkpegharị ikpe ụbọchị abụọ nke ahụ gasịrị, e wetakwara okwu ahụ n’ụlọikpe ka elu. Na February 15, 1990, ụlọikpe a tụrụ Ndịàmà ahụ mkpọrọ ọnwa abụọ na nhá nke ihe dị ka $100. Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị ahụ na-azara ọnụ ha tinyere akwụkwọ mkpegharị ikpe n’Ụlọikpe Kasị Elu nke Gris.
Na March 19, 1991, Ụlọikpe Kasị Elu kagburu akwụkwọ mkpegharị ikpe ahụ ma kwadoo ọmụma ikpe ahụ. Ihe karịrị afọ abụọ n’ihu, na September 20, 1993, mgbe e kwupụtara mkpebi ikpe nke Ụlọikpe Kasị Elu, ndị uwe ojii kpọchiri Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Dị ka otu akwụkwọ ndị uwe ojii kpughere, ọ bụ Chọọchị Orthodox nke Krit kpatara ihe a merenụ.
Ọnọdụ a bilitere n’ihi na iwu ụfọdụ, e tiri na 1938 n’ebumnuche nke igbochi nnwere onwe okpukpe, ka na-arụ ọrụ na Gris. Ha kwupụtara na ọ bụrụ na mmadụ achọọ inwe ebe a na-anọ efe ofufe, a ghaghị inweta ikike site n’aka Mịnịsta Okwu Mmụta na Ihe Ndị Metụtara Okpukpe Dị n’Aka, nakwa site n’aka bishọp Chọọchị Orthodox dị n’ógbè ahụ. Ruo ọtụtụ afọ iri, iwu aka ike a akpataworo Ndịàmà Jehova ọtụtụ ihe isi ike.
Nnwere Onwe Ikpe Okpukpe, na Ihe Ndị Ruuru Mmadụ
Mgbe ha matara na Ụlọikpe Kasị Elu akwadowo ikpe a mara ha, Ndịàmà anọ ahụ tinyere akwụkwọ n’aka Òtù Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ nke Europe, dị na Strasbourg, France, n’August 7, 1991. Ndị tinyere akwụkwọ ahụ zọọrọ na ikpe a mara ha mebiri Iwu nke 9 nke Nkwekọrịta Europe, nke na-echebe nnwere onwe iche echiche, akọ na uche, na okpukpe, tinyekwara ikike mmadụ nwere ikpe okpukpe ya nanị ya ma ọ bụ n’ìgwè ya na ndị ọzọ na n’ihu ọha ma ọ bụ na nanị n’onwe ya.
Na May 25, 1995, ndị Òtù ahụ dị mmadụ 25 kwekọrịtara na n’ikpe a, Gris emebiwo Iwu nke 9 nke Nkwekọrịta Europe. Nkwupụta ha bụ na ikpe ọmụma ahụ a na-ekwu okwu ya ekwekọghị ná mmụọ nke nnwere onwe okpukpe, na ọ dịghịkwa mkpa n’ọha mmadụ nke ọchịchị onye kwuo uche ya. Mkpebi a banyere okwu ikpe ahụ ịbụ nke a pụrụ ịnabata kwukwara, sị: “Ndị ahụ tinyere akwụkwọ . . . so n’òtù a maara nkwenkwe na ememe okpukpe ha nke ọma ma bụrụkwa ndị e nyere ikike n’ọtụtụ mba Europe.” N’ikpeazụ, Òtù ahụ nyefere Ụlọikpe Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ nke Europe okwu ikpe ahụ.
A Pụghị Ịkwụsị Ndịàmà Jehova
E tinyere nnụrụ okwu ikpe ahụ na May 20, 1996. E nwere ihe karịrị mmadụ 200 n’ọnụ ụlọikpe ahụ, gụnyere ụmụ akwụkwọ na ndị prọfesọ si na mahadum dị n’ógbè ahụ, ndị odeakụkọ, na ọtụtụ Ndịàmà Jehova si Gris, Germany, Belgium, na France.
Mazi Phédon Vegleris, bụ́ prọfesọ laworo ezumike nká na Mahadum nke Atens na ọkàiwu na-ekwuchitere Ndịàmà ahụ ọnụ ha, kwusiri ike na ụkpụrụ e ji mee ihe na mkpebi ikpe nke ndị isi mba ahụ mebiri ọ bụghị nanị Nkwekọrịta Europe kamakwa Ụkpụrụ Iwu Gris. “Ya mere ọ bụ iwu mba ahụ na ụzọ e si eji ya eme ihe bụ ihe Ụlọikpe ahụ na-elebara anya.”
Ọkàiwu gọọmenti Gris bụbu ọkàikpe si na Kansụl Ọchịchị, onye, kama ikwurịta ihe mere eme, rụtụrụ aka n’ọkwá Chọọchị Orthodox dị na Gris weere, ná njikọ siri ike ya na Ọchịchị na ndị mmadụ nwere, nakwa mkpa e kwuru na e nwere ịkpara okpukpe ndị ọzọ ókè. Ọzọkwa, o kwuru na site na 1960 gaa n’ihu, Ndịàmà Jehova enwewo ihe ịga nke ọma n’ịmụba ọnụ ọgụgụ ha n’ụzọ dị ukwuu. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, a mawo inwe nanị chọọchị Orthodox aka n’ụzọ gara nke ọma!
A Kwadoo Nnwere Onwe Okpukpe
A ga-ebi ikpe na September 26. Atụmanya rịrị elu, karịsịa nye Ndịàmà Jehova. President Òtù Ikpe ahụ, bụ́ Mazi Rudolf Bernhardt, gụpụtara mkpebi ikpe ahụ: Ụlọikpe ahụ, nke ndị ọkàikpe itoolu mejupụtara, kwekọrịtara na Gris emebiwo Iwu nke 9 nke Nkwekọrịta Europe. O nyekwara ndị ahụ tinyere akwụkwọ ihe dị ka $17,000 maka mmefu ha. Nke kasị mkpa, mkpebi ikpe ahụ gụnyere ọtụtụ arụmụka dị mma n’ikwuchitere nnwere onwe okpukpe.
Ụlọikpe ahụ kwuru na iwu Gris na-enye ohere maka “ntinye aka dị ukwuu nke ndị ọchịchị, ndị omeiwu na ndị isi chọọchị n’inwe nnwere onwe okpukpe.” Ọ gbakwụnyere na Ọchịchị ji ịgbaso ụkpụrụ ahụ chọrọ ka e nweta ikike mee ihe “iji hiwe ọnọdụ ndị na-adịghị agbanwe agbanwe, ma ọ bụ n’ezie na-egbochi egbochi, nye òtù ụfọdụ na-abụghị ndị nke chọọchị orthodox, Ndịàmà Jehova kpọmkwem, ikpe okpukpe.” Ụlọikpe mba nile a gbara ụzọ obi ọjọọ Chọọchị Orthodox jiworo mee ihe ruo ọtụtụ iri afọ ọtọ.
Ụlọikpe ahụ mesiri ya ike na “ikike nnwere onwe ikpe okpukpe dị ka e nyere ikike ya n’okpuru Nkwekọrịta ahụ na-agụpụ ikike ọ bụla Ọchịchị nwere ikpebi ma iwu ọ̀ kwadoro nkwenkwe okpukpe ma ọ bụ ụzọ e si egosipụta nkwenkwe dị otú ahụ.” O kwukwara na “Ndịàmà Jehova kwekọrọ ná nkọwa ‘okpukpe a ma ama’ dị ka e kwuru n’okpuru iwu Gris . . . Ọzọkwa, Gọọmenti kwere nke a.”
Ọ Bụghị Egwuregwu Nkịtị
N’ime ụbọchị ole na ole sochirinụ, ihe ka ukwuu n’akwụkwọ akụkọ ndị bụ isi na Gris bipụtara okwu ikpe a. Na September 29, 1996, mbipụta Sunday nke Kathimerini kwuru, sị: “N’agbanyeghị otú Ọchịchị Gris si na-agbalịsi ike ileghara ya anya ‘dị ka egwuregwu nkịtị,’ ‘nkatọ’ ahụ o nwetara site n’aka Ụlọikpe Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ nke Europe, dị na Strasbourg bụ eziokwu, eziokwu nke e dekọworo n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru mba nile ọnụ. Ụlọikpe ahụ chetaara ndị Gris banyere Iwu nke 9 nke Nkwekọrịta Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ, o jikwa otu olu katọọ usoro ime iwu nke Gris.”
Akwụkwọ akụkọ kwa ụbọchị Atens bụ́ Ethnos dere na September 28, 1996, na Ụlọikpe Europe “katọrọ Gris, na-enye ya iwu ka ọ kwụọ ụmụ amaala ya ndị na-ata ahụhụ ihe ndabara ọjọọ nke ịbụ Ndịàmà Jehova ụgwọ.”
A gbara otu n’ime ndị ọkàiwu nke ndị ahụ tinyere akwụkwọ ahụ, bụ́ Mazi Panos Bitsaxis, ajụjụ ọnụ n’ihe omume redio, o kwukwara, sị: “Anyị na-ebi n’afọ 1996, n’ọnụ ọnụ narị afọ nke 21, o dokwara anya na e kwesịghị inwe ịkpa ókè, iyi egwu, ma ọ bụ ntinye aka n’akụkụ nke ndị ọchịchị n’ihe banyere iji ikike bụ isi mmadụ nwere n’ebe nnwere onwe okpukpe dị mee ihe. . . . Nke a bụ ohere dị mma nye gọọmenti inyochagharị ụkpụrụ ya na ịkwụsị ịkpa ókè a echiche na-adịghị n’ime ha, nke na-abaghị uru ọ bụla n’oge a.”
Mkpebi e mere n’okwu ikpe Manoussakis na Ndị Ọzọ Megide Gris na-akpalite olileanya na Ọchịchị Gris ga-eme ka iwu ya kwekọọ ná mkpebi ikpe nke Ụlọikpe Europe, ka Ndịàmà Jehova nọ na Gris wee nwee ike ịnụ ụtọ nnwere onwe okpukpe n’enweghị ntinye aka nke ndị ọchịchị, ndị uwe ojii, ma ọ bụ chọọchị. Ọzọkwa, nke a bụ ikpe nke abụọ Ụlọikpe Europe kpebiworo megide òtù ndị omeiwu Gris n’okwu metụtara nnwere onwe okpukpe.a
Ọ bụ ihe a mazuru ebe nile na Ndịàmà Jehova na-erubere ndị gọọmenti “na-achị isi” isi n’okwu nile na-adịghị emegide Okwu Chineke. (Ndị Rom 13:1, 7) Ha abụghị ihe iyi egwu ma ọlị nye ịdị n’usoro nke ọha na eze. N’ụzọ megidere nke ahụ, mbipụta ha na ozi ihu ọha ha na-agba mmadụ nile ume ịbụ ụmụ amaala na-edebe iwu, na ibi ndụ dị n’udo. Ha bụ okpukpe na-akwụwa aka ọtọ na nke guzosiri ike, ndị òtù ha atụnyewokwa ụtụ dị ukwuu n’ọdịmma nke gburugburu ebe obibi ha. Nkwụrụsi ike ha n’ijigide ụkpụrụ omume dị elu nke Bible na ịhụnanya ha nwere n’ebe ndị agbata obi ha nọ, dị ka a na-egosipụta ya karịsịa n’ọrụ nkụzi Bible ha, enwewo mmetụta dị mma n’ihe karịrị ala 200 ebe e nwere ha.
E nwere olileanya na mkpebi ndị ahụ Ụlọikpe Europe nyefeworo ga-ewetara Ndịàmà Jehova na okpukpe nile ọzọ dị nta na Gris nnwere onwe okpukpe ka ukwuu.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Mkpebi ikpe nke mbụ, e wepụtara na 1993, bụ okwu ikpe Kokkinakis Megide Gris.—Lee Ụlọ Nche, September 1, 1993, peji nke 27.
[Foto dị na peeji nke 17]
Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ ahụ ndị uwe ojii kpọchiri na September 20, 1993
[Foto dị na peeji nke 17]
Ụlọikpe Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ nke Europe, Strasbourg
[Foto dị na peeji nke 18]
Ndịàmà o metụtara: T. Manoussakis, V. Hatzakis, K. Makridakis, K. Baxevanis