Agha Okpukpe na France
NA Sunday, March 1, 1562, duke nke Guise na nwanne ya nwoke bụ́ Charles, kadinal nke Lorraine—ndị ndú abụọ nke okpukpe Katọlik France—na ndị nche ha ji ngwá agha nọ na-aga Vassy, bụ́ obodo nta dị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ Paris. Ha kpebiri ịkwụsị na chọọchị dị na Vassy iji gaa Mas.
Na mberede ha nụrụ ụda abụ. Ọ bụ ọtụtụ narị ndị Protestant zukọrọ ná nnukwu ụlọ ife ofufe na-abụ abụ ahụ. Ndị agha ahụ ji ike banye. N’oge ọgba aghara nke sochirinụ, ha gwarịtara onwe ha okwu mkparị, mgbe ahụkwa malite ịtụ okwute. Ndị agha ahụ malitere ịgba égbè, na-egbu ọtụtụ ndị Protestant, na-emerụkwa ọtụtụ narị ndị ọzọ ahụ.
Olee ihe omume ndị dugara ná mgbukpọ a? Gịnị bụ mmeghachi omume ndị Protestant?
Ọnọdụ Akụkọ Ihe Mere Eme
N’akụkụ mbụ nke narị afọ nke 16, France na-eme nke ọma, bụrụkwa nke e bijupụtara nke ọma. Ihe ya na ọganihu ọnọdụ akụ̀ na ụba na nke ụba mmadụ so bụ mgbalị ikpe ụdị okpukpe Katọlik ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe na nke nwere omume ụmụnna karị. Ndị mmadụ chọrọ chọọchị na-agaghị enwe oké ego ma dị nsọ karị. Ụfọdụ ndị so n’òtù ndị ụkọchukwu na ndị na-achọ ọdịmma ụmụ mmadụ bụ́ ndị gụrụ oké akwụkwọ chọrọ mgbanwe okpukpe iji busoo omume ọjọọ nke ndị ụkọchukwu nọ n’ọkwá dị elu na erughị eru nke ndị ụkọchukwu nọ n’ọkwá dị ala agha. Otu onye ụkọchukwu nke gbalịrị ka e nwee mmezigharị bụ bishọp ndị Katọlik bụ́ Guillaume Briçonnet.
Na dayọsis ya nke Meaux, Briçonnet gbara mmadụ nile ume ịgụ Akwụkwọ Nsọ. Ọbụna na o ji ego kwadoo otu nsụgharị ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst gaa n’asụsụ French. N’oge na-adịghị anya oké iwe nke Mahadum Nkà Mmụta Okpukpe nke Sorbonne dị na Paris, bụ́ ndị nchekwa nke ọdịnala Katọlik, dakwasịrị ya, na-akpaghasị mgbalị ya. Ma bishọp ahụ nwetara nchebe nke Francis nke Mbụ, bụ́ eze France site na 1515 ruo 1547. N’oge ahụ, eze ahụ kwadoro ime mgbanwe.
Otú ọ dị, Francis nke Mbụ gbachiri nkatọ nke chọọchị ahụ nkịtị nanị ruo n’ókè ọ na-eyighị ịdị n’usoro nke ọha na eze na ịdị n’otu mba ahụ egwu. Na 1534, ndị Protestant na-emebiga ihe ókè mapawanyere akwụkwọ ịma ọkwa ndị katọrọ ụka Mas ndị Katọlik dị ka ikpere arụsị, ọbụna jiri ntu kụnye otu akwụkwọ ịma ọkwa n’ọnụ ụzọ ụlọ ihi ụra nke eze. N’ihi ya, Francis nke Mbụ gbanwere obi ya ma buo agha kpụ ọkụ n’ọnụ nke mbịachi ọnụ.
Mbịachi Ọnụ Obi Ọjọọ
N’oge na-adịghị anya a malitere ịgba ndị Protestant ọkụ n’elu osisi. Ọtụtụ ndị na-achọ ọdịmma mmadụ, ndị na-emere ha ebere, na ndị na-eso ụzọ okpukpe Protestant ọhụrụ ahụ gbapụrụ ná mba ahụ. Ndị isi malitere inyocha akwụkwọ dị iche iche na ịchịkwa ndị nkụzi, ndị na-ebipụta akwụkwọ, na ndị na-ebi akwụkwọ.
Ndị òtù Waldo nwetara mmegide zuru ezu site n’aka ndị isi. Ha bụ ìgwè dị nta nke ndị ji Bible kpọrọ ihe, ndị biri n’obodo nta ndị dara ogbenye na ndịda ọwụwa anyanwụ mba ahụ. A gbara ụfọdụ ọkụ n’elu osisi, e gburu ọtụtụ narị, e bibisịkwara ihe dị ka 20 n’ime obodo nta ha.—Lee igbe dị na peji nke 6.
N’ịmara mkpa e nwere maka mgbanwe n’ime chọọchị, otu kansụl ndị bishọp nke Katọlik zukọrọ na December 1545, na Trent, Itali. Mgbe nzukọ ahụ mechiri na 1563, dị ka akwụkwọ bụ́ The Cambridge Modern History si kwuo, “ihe si na ya pụta . . . bụ ime ka obi ndị ahụ kpebisiri ike iwepụ okpukpe Protestant sie ike.”
Ihe Bu Agha Ụzọ
N’ịbụ ndị ike ichere maka mgbanwe gwụrụ, ọtụtụ ndị so n’òtù mgbanwe n’ime Chọọchị Katọlik dụnyeere okpukpe Protestant úkwù. N’ihe dị ka 1560, ọtụtụ ndị France selitere isi n’ọkwá na ndị nkwado ha sonyeere ndị òtù Hugues, dị ka e mesịrị kpọwa ndị Protestant. Ndị òtù Hugues malitere inwe nkwuwa okwu n’ụzọ na-arị elu. Mgbe ụfọdụ nzukọ ihu ọha ha na-aghọ ihe mkpasu iwe na oké mmegide. Dị ka ihe atụ, na 1558, ọtụtụ puku n’ime ha zukọrọ na Paris ruo ụbọchị anọ sochiri onwe ha iji bụọ abụ.
Ihe ndị a nile kpasuru ma ndị nwere ikike nọ n’ọkwá dị elu na Chọọchị Katọlik ma ìgwè ndị Katọlik iwe. N’ịbụ onye Kadinal Charles nke Lorraine kpaliri, Eze Henry nke Abụọ, onye nọchiworo nna ya, bụ́ Francis nke Mbụ, tiri Iwu nke Écouen, na June 1559. Nzube ya e kwupụtara n’ezoghị ọnụ bụ “ikpochapụ ajọ okpukpe Luther arụrụala.” Nke a dugara n’ibu agha na-atụ ụjọ na Paris megide ndị òtù Hugues.
Henry nke Abụọ nwụrụ n’izu ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị n’ihi mmerụ ahụ ndị o nwetara n’asọmpi. Nwa ya nwoke, bụ́ Eze Francis nke Abụọ, n’ịbụ onye ezinụlọ Guise kwaliri, meghachiri iwu ahụ na-ekwu na ndị Protestant gbara isi akwara ga-eche amamikpe ọnwụ ihu. N’afọ sochirinụ, Francis nke Abụọ nwụrụ, nne ya, bụ́ Catherine de Médicis, chịkwara n’ọnọdụ nwanne ya nwoke dị afọ iri, bụ́ Charles nke Itoolu. Ụkpụrụ ime ka a dịghachi n’otu nke Catherine amasịghị ndị Guise, bụ́ ndị kpebisiri ike ikpochapụ okpukpe Protestant.
Na 1561, Catherine haziri otu semina na Poissy, na nso Paris, bụ́ ebe ndị ọkà mmụta okpukpe Katọlik na Protestant zutere. N’iwu e tiri na January 1562, Catherine nyere ndị Protestant nnwere onwe izukọ maka ofufe n’èzí obodo ukwu dị iche iche. Oké iwe were ndị Katọlik! Nke a doziri ụzọ maka ihe mere n’ọnwa abụọ n’ihu—mgbukpọ nke ndị Protestant ná nnukwu ụlọ dị n’obodo nta Vassy, dị ka a kọwara na mbụ.
Agha Atọ Mbụ
Ogbugbu ahụ na Vassy kpalitere nke mbụ n’usoro agha okpukpe asatọ nke mikpuru France n’ime oké egwu nke mgburịta site na 1562 ruo etiti afọ ndị 1590. Ọ bụ ezie na o metụtakwara okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke ọha na eze, ihe bụ isi kpalitere oké mgbukpọ ahụ bụ okpukpe.
Mgbe Agha Dreux ahụ gasịrị na December 1562, bụ́ nke lara ndụ 6,000 n’iyi, agha okpukpe mbụ ahụ kwụsịrị. Udo nke Amboise ahụ, nke a bịanyere aka na ya na March 1563, nyere ndị a maara aha ha so n’òtù Hugues nnwere onwe a kpaara ókè ife ofufe n’ebe ụfọdụ.
“Ihe kpaliri agha nke abụọ ahụ bụ egwu ndị òtù Hugues tụrụ banyere atụmatụ ndị Katọlik nke metụtara mba dị iche iche,” ka akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-ekwu. N’oge ahụ, ndị majie Katọlik na-akwụgbukarị ụmụ amaala nanị n’ihi ịbụ ndị òtù Hugues. Na 1567, mgbalị onye òtù Hugues mere ijide Eze Charles nke Itoolu na nne ya, bụ́ Catherine, kpalitere agha nke abụọ.
Mgbe ha kọsịrị banyere ọgụ a wụfuru ọbara na ya karịsịa na St.-Denis, n’èzí Paris, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Will na Ariel Durant dere, sị: “France nwere mgbagwoju anya ọzọ banyere ụdị okpukpe nke a nke na-eduga ndị mmadụ n’ụdị ogbugbu dị otú ahụ.” Oge na-adịghị anya ka e mesịrị, na March 1568, Udo nke Longjumeau nyere ndị òtù Hugues nnagide kwesịrị ekwesị nke ha nweburu n’okpuru Udo nke Amboise.
Otú ọ dị, ndị Katọlik were iwe ma jụ imezu ọnọdụ ndị e nyere maka udo ahụ. N’ihi ya, na September 1568, agha okpukpe nke atọ tiwapụrụ. Nkwekọrịta udo nke sochirinụ nyere ndị òtù Hugues ọbụna ikike ka ukwuu. E kenyere ha obodo ndị e wusiri ike, tinyere ọdụ ụgbọ mmiri nke La Rochelle. Ọzọ, a họpụtara otu nwa eze onye Protestant a ma ama, bụ́ Admiral de Coligny, iso n’òtù kansụl eze. Ọzọkwa iwe were ndị Katọlik.
Mgbukpọ n’Ụbọchị “Senti” Bartholomew
Ihe dị ka otu afọ n’ihu, n’August 22, 1572, Coligny lanarịrị otu mwakpo igbu ya na Paris, nke weere ọnọdụ ka o si n’Obí Eze dị na Louvre na-ala n’ụlọ ya. N’ịbụ ndị iwe ji, ndị Protestant yiri egwu ime ihe ndị siri ike iji bọọrọ onwe ha ọ́bọ̀ ma ọ bụrụ na e kpeghị ikpe ziri ezi ọsọ ọsọ. Ná nzukọ nzuzo, Eze Charles nke Itoolu bụ onye ntorobịa, nne ya bụ́ Catherine de Médicis, na ọtụtụ ndị isi kpebiri imemila Coligny. Iji zere mmegwara ọ bụla, ha nyekwara iwu ka e gbuo ndị Protestant nile bịaworo Paris maka agbamakwụkwọ onye Protestant bụ́ Henry nke Navarre na ada Catherine bụ́ Margaret nke Valois.
N’abalị nke August 24, a kụrụ mgbịrịgba chọọchị Saint-Germain-l’Auxerrois, dị n’ihu Louvre, iji nye ihe àmà ka a malite ogbugbu ahụ. Duke nke Guise na ndị òtù ya ji ọsọ gbaga n’ụlọ ebe Coligny nọ na-ehi ụra. E gburu Coligny n’ebe ahụ ma si na window tụpụ ya, e bekasịkwara ozu ya. Duke ndị Katọlik gbasara okwu bụ́: “Gbuo ha nile. Ọ bụ iwu eze.”
Site n’August 24 ruo 29, ọnọdụ ndị na-eyi egwu metọrọ okporo ámá ndị dị na Paris. Ụfọdụ ndị kwuru na osimiri Seine na-acha ọbara ọbara n’ihi ọbara nke ọtụtụ puku ndị òtù Hugues e gburu egbu. Obodo ndị ọzọ nwekwara oké mgbukpọ nke ha. Atụmatụ ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ bụ malite na 10,000 ruo 100,000; otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ kwetara n’ọnụ ọgụgụ nke 30,000 ma ọ dịkarịa ala.
“Otu eziokwu, dịruru oké njọ ka ogbugbu ahụ n’onwe ya,” ka otu ọkọ akụkọ ihe mere eme kọrọ, “bụ nṅụrị ọṅụ ọ kpalitere.” Ozugbo ọ nụrụ banyere ogbugbu ahụ, Popu Gregory nke Iri na Atọ nyere iwu ka e nwee ememe ịtụ mma mma ma zigara Catherine de Médicis ozi ịja mma ya. O nyekwara iwu ka a kpụọ medal pụrụ iche iji cheta ogbugbu e gburu ndị òtù Hugues, nyekwa ikike ka e see ihe osise nke ogbugbu ahụ, nke nwere okwu ndị a: “Popu kwadoro ogbugbu e gburu Coligny.”
Dị ka e si kọọ ya, mgbe ogbugbu ahụ gasịrị, Charles nke Itoolu hụrụ ọhụụ nke ndị o gburu, ọ na-ejikwa ákwá na-agwa nọọsụ ya, sị: “Lee ndụmọdụ ọjọọ m gbasoworo! Oo Chineke m, gbaghara m!” Ọ nwụrụ na 1574 mgbe ọ dị afọ 23, nwanne ya nwoke bụ́ Henry nke Atọ nọchikwara ya.
Agha Okpukpe Gara n’Ihu
Ka ọ dị mgbe ahụ, ndị ndú Katọlik kpaliri ndị òtù ya imegide ndị òtù Hugues. Na Toulouse, ndị ụkọchukwu Katọlik gbara ụmụazụ ha ume, sị: “Gbuo ha nile, kwakọrọ ihe; anyị bụ ndị nna unu. Anyị ga-echebe unu.” Site ná mbịachi ọnụ ime ihe ike, eze ahụ, nzukọ ndị isi, ndị gọvanọ, na ndị isi agha setịpụrụ ihe nlereanya, ìgwè ndị Katọlik sochikwara.
Otú ọ dị, ndị òtù Hugues lụgwaara ọgụ. N’ime ọnwa abụọ mgbe mgbukpọ n’Ụbọchị “Senti” Bartholomew gasịrị, ha malitere agha okpukpe nke anọ. N’ebe ọnụ ọgụgụ ha karịrị nke ndị Katọlik, ha bibisịrị ihe oyiyi, obe, na ọlta ndị dị na chọọchị Katọlik, ọbụna gbuokwa mmadụ. “Chineke achọghị ka a hapụ ma obodo ma ndị mmadụ,” ka John Calvin, bụ́ onye ndú nke okpukpe Protestant nke France, kwuru ná mpempe akwụkwọ ya bụ́ Declaration to Maintain the True Faith.
Agha okpukpe anọ ndị ọzọ sochiri. Nke ise biri na 1576 mgbe Eze Henry nke Atọ bịanyere aka n’udo nke nyere ndị òtù Hugues nnwere onwe zuru ezu ife ofufe n’ebe ọ bụla na France. Obodo Paris ahụ jupụtara ná ndị Katọlik mesịrị nupụ isi ma chụpụ Henry nke Atọ, bụ́ onye e lere anya dị ka onye ya na ndị òtù Hugues dị ná mma karị. Ndị Katọlik guzobere ọchịchị mmegide, bụ́ Òtù Nsọ Katọlik, nke Henry nke Guise bụ onye ndú ya.
N’ikpeazụ, agha nke asatọ, ma ọ bụ Agha nke Henry Atọ ahụ, mere ka Henry nke Atọ (Katọlik) na onye ga-anọchi ya n’ọdịnihu, bụ́ Henry nke Navarre (Protestant), jikọta ọnụ megide Henry nke Guise (Katọlik). Henry nke Atọ jisiri ike hụ na e gburu Henry nke Guise, ma n’August 1589, onye mọnk so n’òtù Dominic gburu Henry nke Atọ. N’ihi ya, Henry nke Navarre, onye a hapụworo n’afọ 17 tupu mgbe ahụ n’oge mgbukpọ n’Ụbọchị “Senti” Bartholomew, ghọrọ Eze Henry nke Anọ.
Ebe Henry nke Anọ bụ onye òtù Hugues, Paris jụrụ ido onwe ya n’okpuru ya. Òtù Nsọ Katọlik haziri òtù ndị agha imegide ya n’ebe nile ná mba ahụ. Henry meriri n’ọtụtụ agha, ma mgbe usuu ndị agha Spain rutere inyere ndị Katọlik aka, o mesịrị kpebie ịjụ okpukpe Protestant ma nakwere okpukpe Katọlik. N’ịbụ onye e kpubere okpueze na February 27, 1594, Henry banyere Paris, ebe ndị mmadụ, n’ịbụ ndị agha ndị ahụ gwụworo ike kpam kpam, toro ya dị ka eze.
N’ụzọ dị otú a Agha Okpukpe nke ndị France bịara ná njedebe mgbe ihe karịrị afọ 30 gasịrị nke ndị Katọlik na ndị Protestant gburịtara onwe ha site na mgbe ruo na mgbe. N’April 13, 1598, Henry nke Anọ nyere Iwu nke Nantes ahụ a ma ama, nke nyere ndị Protestant ikike nnwere onwe akọ na uche na nke ofufe. Dị ka popu si kwuo, iwu ahụ bụ “ihe kasị njọ a pụrụ ichetụ n’echiche n’ihi na o nyere mmadụ nile nnwere onwe akọ na uche, nke bụ ihe kasị njọ n’ụwa.”
Na France dum, ndị Katọlik chere na iwu ahụ bụ mmebi nke nkwa Henry kwere ịkwado ụkpụrụ okwukwe ha. Chọọchị ezughị ike ruo mgbe, n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị afọ n’ihu, Louis nke Iri na Anọ kwụsịrị Iwu nke Nantes ahụ, na-akpalite ọbụna mkpagbu ka sie ike nke ndị òtù Hugues.
Mkpụrụ nke Agha Ndị Ahụ
Ka ọ na-erule ngwụsị nke narị afọ nke 16, ọganihu nke France apụwo n’anya. A gbawo ọkara alaeze ya gburugburu, kwakọrọ ihe, jiri ya nye ihe mgbapụta, ma ọ bụ bibisịa ya. Ndị agha ahụ naara ihe ndị gabigara ókè n’aka ndị mmadụ, nke kpatara nnupụisi nke ndị nọ n’ọkwá dị ala. Ndị Protestant, nke amamikpe ọnwụ, mgbukpọ, nchụpụ, na ikwugharị ihe ha kwuru belataworo ọnụ ọgụgụ ha, banyere na narị afọ nke 17 na-enwe ọnụ ọgụgụ dalatara adalata.
Dị ka o yiri, ndị Katọlik emeriwo n’Agha Okpukpe nke France. Ma Chineke ọ̀ gọziri mmeri ha? O doro anya na ọ gọzighị. N’ịbụ ndị ogbugbu a nile n’aha Chineke gwụrụ ike, ọtụtụ ndị France ghọrọ ndị na-enweghị mmasị n’okpukpe. Ha bụ ndị obu ụzọ nke ihe ahụ a kpọworo echiche na-emegide ndị Kraịst nke narị afọ nke 18.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]
“Chineke achọghị ka a hapụ ma obodo ma ndị mmadụ.”
Otú a ka onye ndú okpukpe Protestant nke France kwuru
[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]
Ndị Òtù Waldo Guzosiri Ike—Na-arụpụta Gịnị?
PIERRE VALDES, ma ọ bụ Peter Waldo, bụ onye azụmahịa bara ọgaranya na France nke narị afọ nke 12. N’oge a mgbe ndị Chọọchị Roman Katọlik mara ụma mee ka ndị mmadụ ghara ịma ihe dị na Bible, Waldo jiri ego kwadoo nsụgharị nke Oziọma na akwụkwọ Bible ndị ọzọ gaa n’asụsụ ndị ndịda ọwụwa anyanwụ France na-asụkarị. Mgbe ahụ ọ kwụsịrị achụmnta ego ya ma rara onwe ya nye n’ikwusa Oziọma ahụ. N’oge na-adịghị anya ọtụtụ ndị sonyeere ya, na 1184 kwa, Popu Lucius nke Atọ chụpụrụ ya na ndị òtù ya na chọọchị.
Ka oge na-aga, òtù ndị nkwusa a ji Bible kpọrọ ihe ghọrọ ndị a maara dị ka ndị òtù Waldo. Ha kwadoro nlaghachi gaa ná nkwenkwe na omume nke Iso Ụzọ Kraịst oge mbụ. Ha jụrụ omume na nkwenkwe nke Katọlik ọdịnala, gụnyere mgbaghara mmehie, ekpere maka ndị nwụrụ anwụ, pọgatrị, ofufe Meri, ekpere nye “ndị senti,” baptism ụmụ ọhụrụ, ịkpọ isiala nye obe, na imepụta ahụ na ọbara Kraịst. N’ihi ya, ndị òtù Waldo tara ahụhụ nke ukwuu ọtụtụ mgbe n’aka Chọọchị Katọlik. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Will Durant kọwara ọnọdụ dịnụ mgbe Eze Francis nke Mbụ malitere ibu agha megide ndị na-abụghị ndị Katọlik:
“Cardinal de Tournon, n’ikwu na ndị òtù Waldo na-agba izu mgba okpuru megide ọchịchị, rụgidere Eze ahụ ahụ na-adịghị, nke nwere obi abụọ ịbịanye aka n’otu iwu (January 1, 1545) ka e gbuo ndị òtù Waldo nile ikpe ịjụ okwukwe mara. . . . N’ime otu izu (April 12-18) a gbara ọtụtụ obodo nta ọkụ; n’otu n’ime ha e gburu ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka 800; n’ime ọnwa abụọ e gburu 3,000, a gbara obodo nta iri abụọ na abụọ ọkụ, e zigara ndị ikom 700 ịdọkpụgharị ụgbọ mmiri. Ndị inyom iri abụọ na ise ụjọ ji, ndị na-achọ ebe mgbaba n’ọ́gbà, bụ ndị ọkụ a mụnyere n’ọnụ ya mere ka ha kubie ume.”
Banyere ihe ndị dị otú ahụ mere n’akụkọ ihe mere eme, Durant kwuru, sị: “Mkpagbu ndị a bụ oké ọdịda nke ọchịchị Francis.” Ma gịnị bụ mmetụta o nwere n’ahụ ndị ahụ hụrụ nguzosi ike nke ndị òtù Waldo n’ime oge mkpagbu ahụ nke eze nyere ikike ya? Durant dere, sị: “Obi ike nke ndị ahụ nwụrụ n’ihi okwukwe ha mere ka nzube ha dị ùgwù na ebube; ọ ghaghị ịbụ na o metụrụ ọtụtụ puku ndị na-ekiri ihe na-emenụ n’obi, nyekwa ha nsogbu n’uche, bụ́ ndị, ma e wezụga ogbugbu ndị a pụrụ iche, nwere ike ha agaghị echegbuworị onwe ha mgbe ọ bụla ịgbanwe okwukwe ha ketara.”
[Foto dị na peeji nke 5]
Ogbugbu ahụ weere ọnọdụ na Vassy kpalitere agha dị iche iche nke okpukpe
[Ebe E Si Nweta Foto]
Bibliothèque Nationale, Paris
[Foto dị na peeji nke 7]
Mgbukpọ n’Ụbọchị “Senti” Bartholomew, mgbe ndị Katọlik gburu ọtụtụ puku ndị Protestant
[Ebe E Si Nweta Foto]
Photo Musée cantonal des Beaux-Arts, Lausanne
[Foto ndị dị na peeji nke 8]
Ndị Protestant gburu ndị Katọlik ma bibie ihe onwunwe chọọchị (n’elu na n’okpuru)
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Bibliothèque Nationale, Paris
Bibliothèque Nationale, Paris