Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
N’ihi Gịnị Ka O Ji Esi M n’Aka Mgbe Nile?
“Papa m nwere ihe ndị ahụ ya na-adịghị anabata, ya na ndị na-ese siga aghaghịkwa ịrụkọ ọrụ. Mgbe ọ lọtara, mgbe ụfọdụ oké iwe na-ewe ya. Ihe ụfọdụ ga-efunahụ ya, ọ ga-atakwa m ụta maka ya. Mgbe m gwara ya na ọ tụfuru ya, ọ na-ewe oké iwe ma gwa m na mụ agaraghị agbazi ya olu.”—Nwa agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma.
Ọ̀ NA-ADỊ gị mgbe ụfọdụ ka ị bụ onye na-atachitere ezinụlọ ahụhụ? Ò yiri ka a na-ata gị ụta maka ihe ọ bụla gahierenụ? Ọ dị Joy dị afọ 14 otú ahụ. O bi n’ezinụlọ nwere nanị nna, na-elekọtakarịkwa nwanne ya nwoke na nwanyị ndị ọ tọrọ. “M ga-agbada ala mgbe ha malitere ịlụ ọgụ,” ka Joy na-ekpesa. “Ha na-eme nnọọ omume nzuzu na n’ụzọ etozughị okè, ma mgbe papa m lọtara, ọ na-etikwasị m mkpu n’ihi na anọghị m n’ebe ahụ ịkwụsị ya.”
Ọ bụrụ na nne na nna gị na-akpọ gị nwa lara n’iyi, onye umengwụ, ma ọ bụ onye na-adịghị eji ihe akpọrọ ihe ma ọ bụ na-akpọ gị aha ndị ọzọ yiri ka ha na-eme ka adịghị ike gị yie ihe a na-apụghị idozi edozi, mgbe ụfọdụ ọ pụrụ ọbụna iyi ka ha na-atụ anya ka ị daa. Ezinụlọ Ramon kpọrọ ya prọfesọ uche mwagharị—utu aha na-ewute ya nke ukwuu. Utu aha ndị na-eme ka ntụpọ gị pụta ìhè, a sịgodị na e kwuo ha n’ụzọ ịhụnanya, pụkwara iwe gị iwe. Kama ịkpali gị imeziwanye, aha ahụ na-adịghị mma pụrụ nnọọ ime ka mmetụta bụ na ọ bụ gị ka ụta dịịrị mgbe nile siwanye ike.
Ịta ụta pụrụ ịdị na-afụ ụfụ karịsịa mgbe o yiri ka o sitere n’ile mmadụ anya n’ihu. “Abụ m nwa nke nọ n’etiti,” ka otu onye nọ n’afọ iri na ụma aha ya bụ Frankie na-ekwu, “m na-enwetakwa mmeso kasị njọ mgbe nile.” Ọ pụrụ iyi ka ụmụnne gị ha bụ mgbe nile ndị na-adịghị eme ihe ọjọọ ma na a na-ama gị ikpe ozugbo a hụrụ ihe àmà nsogbu.
Ihe Mere Ndị Nne na Nna Ji Ata Ụta
N’ezie, ọ bụ nnọọ ihe dị otú o kwesịrị ka ndị nne na nna gbazie ụmụ ha olu mgbe ha mejọrọ. Leenụ, inye mgbazi olu ziri ezi, nke dị mma bụ otu n’ime ụzọ ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke si azụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ọbụna ndị nne na nna kasị mma pụrụ imeghachi omume n’ụzọ gabigara ókè ma ọ bụ ọbụna ịmaga ná nkwubi okwu ndị na-ezighị ezi. Cheta otu ihe mere mgbe Jisọs bụ nwata. Jisọs na-efu efu n’oge a. O mesịrị bụrụ na ọ nọ n’ụlọ ukwu Chineke, na-enwe nkwurịta okwu Bible. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ndị mụrụ ya hụrụ ya, nne ya jụrụ, sị: “Nwa m, Gịnị mere I meso anyị otú a? lee, nna Gị na mụ onwe m na-achọ Gị n’obi ụfụ.”—Luk 2:48.
Ebe Jisọs zuru okè, e nweghị ihe mere a ga-eji tụọ ụjọ na ọ ga-etinye aka n’akparamàgwà nnupụisi. Ma dị ka ndị nne na nna nile na-ahụ n’anya, nne ya nwere mmetụta nke ibu ọrụ n’ebe nwa ya nọ ma meghachi omume n’ụzọ siri ike, ikekwe na-atụ egwu na a na-eyi ọdịmma ya kasị mma egwu. N’otu aka ahụ, ndị mụrụ gị pụrụ imeghachi omume n’ụzọ gabigara ókè mgbe ụfọdụ, ọ bụghị n’ihi na ha na-achọ inye gị nsogbu ma ọ bụ ịdị obi ọjọọ, kama nanị n’ihi na ha na-eche banyere gị n’ezie.
Matakwa na anyị na-ebi ‘n’oge dị oké egwu.’ (2 Timoti 3:1) N’ịbụ ndị na-arụ ọrụ ma na-elekọta ebe obibi unu, ndị mụrụ gị nwere nrụgide dị ukwuu, nke a pụkwara imetụta ụzọ ha si emeso gị. (Tụlee Eklisiastis 7:7.) Otu onye ọrụ ahụ ike uche kwuru, sị: “N’ezinụlọ ụfọdụ, mgbe e nwere nsogbu dịnụ, ndị nne na nna pụrụ iwe iwe ma mee mkpebi ọkụ ọkụ ọ bụ ezie na ha bụ ndị na-emekarị ihe n’ụzọ ziri ezi.”
Ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ nwa pụrụ igosi obi nkoropụ ha karịsịa n’ahụ ụmụ ha, nanị n’ihi na e nweghị onye òtù ọlụlụ ha ga-eso na-ekwurịta ihe. N’ụzọ a pụrụ ikweta, ịta ahụhụ obi nkoropụ onwe onye nke nne ma ọ bụ nna adịghị atọ ụtọ. Lucy dị afọ 17 na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ọ dị ihe m mere, kwesịkwa ka a taa m ahụhụ, nsogbu adịghị. Ma mgbe a tara m ahụhụ n’ihi na obi adịghị nne m mma, n’ezie nke ahụ ezighị ezi.”
Ile mmadụ anya n’ihu bụ ihe ọzọ. Ọ bụ ezie na nne ma ọ bụ nna na-ahụkarị ụmụ ya nile n’anya, ọ bụghị ihe a na-adịghị ahụkebe ya inwe mmasị karịsịa n’ebe otu nwatakịrị nọ.a (Tụlee Jenesis 37:3.) Ịdị na-eche na ị bụ nwatakịrị a hụrụ n’anya n’ụzọ ka ala na-afụ ụfụ n’onwe ya. Ma ọ bụrụ na o yie ka a na-eleghara mkpa gị anya ma ọ bụ na a na-atakarị gị ụta maka ihe ụmụnne gị meworo, o doro anya na iwe ga-esochi. “Enwere m nwanne nwoke, bụ́ Darren,” ka Roxanne na-eto eto na-ekwu. “Ọ bụ nwa ọma nye mama m. . . . Ọ na-ata m ụta mgbe nile, ọ dịghị atatụ Darren.”
Ezinụlọ Ndị Nọ ná Nsogbu
N’ezinụlọ ndị dị mma, ịta mmadụ ụta n’ụzọ na-ezighị ezi pụrụ iwere ọnọdụ mgbe ụfọdụ. Ma n’ezinụlọ ndị nọ ná nsogbu a pụrụ inwe usoro na-aga n’ihu nke ndị nne na nna ịta ụta, imenye ihere, na iweda n’ala. Mgbe ụfọdụ ọbụna “ihe ilu na ọnụma na iwe na iti mkpu na nkwulu” na-esochi ịta ụta ahụ.—Ndị Efesọs 4:31.
À pụrụ ịta onye ntorobịa ụta maka ntiwapụ iwe dị otú ahụ nke nne ma ọ bụ nna? Ọ bụ eziokwu na nwa nwoke ma ọ bụ nwanyị na-enupụ isi pụrụ ịbụrụ nne ma ọ bụ nna ‘ihe na-akpasu iwe.’ (Ilu 17:25) Otú ọ dị, ọ bụ ndị nne na nna ka Bible na-agwa, sị: “Akpasukwala ụmụ unu iwe [n’ụzọ nkịtị, “ịkpasu ọnụma”].” (Ndị Efesọs 6:4) Dị ka ọ dị banyere ndị Kraịst nile, nne ma ọ bụ nna aghaghị inwe njide onwe onye, “na-anagide ihe ọjọọ.” (2 Timoti 2:24) Ya mere mgbe nne ma ọ bụ nna na-enweghị njide onwe onye, ọ pụghị ibo ya adịghị ike nke nwa ya.
Okwu mkparị pụrụ ịbụ ihe àmà na nne ma ọ bụ nna na-enwe nsogbu mmetụta uche, ịda mbà n’obi, ma ọ bụ ùgwù onwe onye dị ala. Ọ pụkwara ịbụ ihe àmà nke nsogbu dị ka nsogbu alụmdi na nwunye ma ọ bụ aṅụrụma. Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, ụmụaka nke ndị nne na nna ihe riri ahụ na-aghọkarị ndị na-ata ahụhụ ya. “Ọ dịghị ihe ha mere na-ezi ezi. A pụrụ ịkpọ ha ‘ndị nzuzu,’ ‘ndị ọjọọ,’ ‘ndị na-achọ ọdịmma onwe ha,’ na ihe ndị ọzọ. Ndị òtù ezinụlọ na-elekwasịzi nwa (ma ọ bụ ụmụaka) ahụ anya dị ka ‘nsogbu’ a ma ama, a na-adọpụkwa uche ha ná mmetụta ahụ erughị ala na nsogbu nke ha.”
Ịnagide Ụta Na-ezighị Ezi
Dr. Kathleen McCoy na-ekwu, sị: “Ịkpọ aha, iweda ala na ịkatọ ụdị onye nwatakịrị bụ . . . pụrụ iso na-akpata ùgwù onwe onye dị ala, ịda mbà n’obi na ekwurịtaghị okwu nke onye nọ n’afọ iri na ụma.” Ma ọ bụ dị ka Bible n’onwe ya si tinye ya, mmeso ọjọọ pụrụ ‘ịkpasu ụmụaka iwe’ ma mee ka ‘obi fuo’ ha. (Ndị Kọlọsi 3:21) Ị pụrụ ịmalite ile onwe gị anya dị ka onye dara ada, nke na-abaghị n’ihe. Ị pụkwara ịzụlite echiche na-adịghị mma n’ebe ndị mụrụ gị nọ. Ị pụrụ ikwubi na e nwekebeghị ihe ị pụrụ ime iji meta ha mma nakwa na ọ baghị uru ịgbalịwa. Iwe na ọnụma pụrụ ịmalite, na-eme ka ị jụ ịdọ aka ná ntị ọ bụla—ọbụna nkatọ na-ewuli elu.—Tụlee Ilu 5:12.
Olee otú ị pụrụ isi nagide? Ihe dị ukwuu ga-adabere n’ọnọdụ gị kpọmkwem. Gịnị ma ị kwụsịtụ ma jiri ezi uche tụlee ya? Dị ka ihe atụ, ọ̀ bụ eziokwu n’ezie na ọ bụ gị ka a ga-ata ụta mgbe nile? Ka ọ̀ pụrụ ịbụ nanị na ndị mụrụ gị yiri ka ha na-eme nkatọ gabigatụrụ ókè mgbe ụfọdụ ma kwuo ihe na-adịghị mma? “Anyị nile na-asụ ngọngọ n’ọtụtụ ihe,” ka Bible na-ekwu, nke ahụ na-agụnyekwa ndị nne na nna. (Jemes 3:2) Ya mere ọ bụrụgodị na ndị mụrụ gị na-emeghachitụ omume n’ụzọ gabigara ókè mgbe ụfọdụ, ọ̀ dị mkpa gị imeghachi omume n’ụzọ gabigara ókè n’otu aka ahụ? Ndụmọdụ Bible dị ná Ndị Kọlọsi 3:13 pụrụ nnọọ inwe mmetụta: “Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a.”
Inwe mmetụta ọmịiko maka ndị mụrụ gị pụrụ inyere gị aka ime nke a. Ilu 19:11 na-ekwu, sị: “Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ; ọ bụkwa ịma mma ya ịgabiga njehie.” Ọ bụrụ na papa gị yiri ka ọ na-ewekarị iwe ngwa ngwa mgbe o si ọrụ lọta otú ọ na-adịghị emebu ma na-ata gị ụta maka ihe ị na-emeghị, ọ̀ dị mkpa isewere ya okwu? Ịmata na obi adịghị ya mma ma eleghi anya nakwa na ike gwụrụ ya pụrụ nnọọ inyere gị aka “ịgabiga njehie” ya.
Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ịta gị ụta n’ụzọ na-ezighị ezi abụghị mkpasu iwe na-eme mgbe ụfọdụ kama mgbe nile na nke na-adịghị ebelata ebelata? Isiokwu ga-abịa n’ọdịnihu ga-atụle ụzọ isi mee ka ọnọdụ gị ka mma.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . N’ihi Gịnị Ka O Ji Esi Oké Ike Mụ na Ụmụnne M Ịdị ná Mma?” ná mbipụta anyị nke July 22, 1987 (Bekee).
[Foto dị na peeji nke 27]
Ọ bụghị ihe ọjọọ bụ nne ma ọ bụ nna inye ndụmọdụ mgbazi olu mgbe ọ dị mkpa