Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 8/8 p. 17-19
  • Ịgba Ndị Africa Hà Na-ekwu Okwu n’Ezie?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịgba Ndị Africa Hà Na-ekwu Okwu n’Ezie?
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Asụsụ nke Ịgba
  • Iji Ekwe Na-ekwu Okwu
  • Ịgba Ndị Kasị Ekwu Okwu
  • “Ịgbà nke Na-ada Ọtụtụ Ụda”
    Teta!—2003
Teta!—1997
g97 8/8 p. 17-19

Ịgba Ndị Africa Hà Na-ekwu Okwu n’Ezie?

Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Nigeria

MGBE ọ na-agbada Osimiri Congo na 1876-1877, onye na-eme nchọpụta bụ́ Henry Stanley nwere ntakịrị ohere ịtụgharị uche n’uru nke ịkụ ịgba n’ógbè ahụ. Nye ya na ndị njem ibe ya, ozi ịgba na-abụkarị nke a pụrụ ịchịkọta ọnụ n’otu okwu: agha. Ụda gbum gbum ha nụrụ pụtara na ndị agha obi tara mmiri bụ́ ndị ji ube gaje ịwakpo ha.

Ọ bụ nanị mgbe e mesịrị, mgbe udo dị karị ka Stanley matara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ịgba na-ekwu ma e wezụga ịkpọkọta ndị mmadụ maka agha. N’ịkọwa otu agbụrụ nke biri n’ụsọ Congo, Stanley dere, sị: “[Ha] amalitebeghị iji usoro nzipụ ozi eletrik eme ihe kama ha nwere, otú ọ dị, usoro nzirịta ozi dịkwa irè. Nnukwute ịgba ha a na-akụ n’akụkụ dị iche iche na-asụ asụsụ doro anya ka okwu ọnụ nye ndị maara ya.” Stanley matara na ndị ọkụ ịgba ahụ zipụrụ ozi karịrị nke opi ma ọ bụ nke ọja; ịgba pụrụ izipụ ozi ndị doro anya.

A pụrụ izi ozi ndị dị otú ahụ site n’otu obodo nta gaa n’obodo nta ọzọ. A nụrụ ụda ịgba ụfọdụ n’ebe ruru kilomita 8 ruo 11 n’ịdị anya, karịsịa ma ọ bụrụ na a nọ n’elu osisi sere n’elu mmiri ma ọ bụ n’elu ugwu kụọ ha. Ndị ọkụ ịgba nọ ebe dị anya gere ntị, ghọta, ma zigara ndị ọzọ ozi ndị ahụ. Onye England na-eme njem bụ́ A. B. Lloyd dere na 1899, sị: “A gwara m na site n’otu obodo nta gaa n’ọzọ, ihe karịrị mile 100 [160 km] n’ịdị anya, a pụrụ iziga ozi n’ihe na-erughị hour abụọ, ekwetakwara m nnọọ na ọ ga-ekwe omume ime ya n’ime oge dị nnọọ ala karị.”

Bamiekwa nnọọ na narị afọ nke 20, ịgba nọgidere na-arụ ọrụ dị mkpa n’izipụ ozi. Akwụkwọ bụ́ Musical Instruments of Africa, nke e bipụtara na 1965, kwuru, sị: “A na-eji ịgba na-ekwu okwu eme ihe dị ka telifon na teligraf. A na-ezipụ ụdị ozi nile—ịma ọkwa ọmụmụ nwa, ọnwụ, na alụmdi na nwunye; ememe egwuregwu, ite egwú, na ememe ịbanye n’òtù; ozi gọọmenti, na agha. Mgbe ụfọdụ ịgba ndị ahụ na-ebu asịrị ma ọ bụ okwu ịkpa ọchị.”

Ma olee otú ịgba ndị ahụ si ezi ozi? Na Europe na n’ebe ndị ọzọ, e zipụrụ ozi site n’ike eletrik n’eriri teligraf. E kenyere mkpụrụ akwụkwọ ọ bụla nke mkpụrụ okwu akara nke ya ka e wee nwee ike ịkpọpụta okwu na ahịrịokwu ọ bụla ná mkpụrụ akwụkwọ ná mkpụrụ akwụkwọ. Otú ọ dị, ndị Etiti Africa enweghị asụsụ e dere ede, ya mere ịgba adịghị akpọpụta okwu. Ndị ọkụ ịgba n’Africa na-eji usoro dị iche eme ihe.

Asụsụ nke Ịgba

Isi ihe dị n’ịghọta nzirịta ozi nke ịgba bụ ịghọta asụsụ Africa n’onwe ha. Ọtụtụ asụsụ nke Etiti na Ọdịda Anyanwụ Africa bụ n’ụzọ bụ isi nke nwere ụda abụọ—nkeji nke okwu ọ bụla e kwuru nwere otu n’ime ụda olu abụọ bụ isi, nke dị elu ma ọ bụ nke dị ala. Mgbanwe nke ụda olu na-agbanwe okwu ahụ. Tụlee, dị ka ihe atụ, okwu bụ lisaka, nke sitere n’asụsụ Kele nke Zaire. Mgbe a kpọpụtara nkeji okwu atọ ahụ n’ụda olu dị ala, okwu ahụ na-apụta “pọtọpọtọ ma ọ bụ apịtị”; mkpọpụta nkeji okwu abụọ mbụ n’ụda olu dị ala na nke atọ n’ụda olu dị elu pụtara “nkwa”; ụda olu dị ala ná nkeji nke mbụ ma dị elu na nke abụọ na nke atọ pụtara “nsí.”

Ekwe ndị Africa ndị e ji ezipụ ozi nwekwara ụda olu abụọ, nke dị elu na nke dị ala. N’otu aka ahụ, mgbe ịgba e ji akpụkpọ kwee isi ya na-ezipụ ozi, a na-eji ha abụọ eme ihe, otu ịgba ga-enwe ụda olu dị elu nke ọzọ ga-enwe ụda olu dị ala. Otú a, onye ọkụ ịgba nwere nkà na-ezipụ ozi site n’iṅomi ụda nke okwu ndị mejupụtara okwu a na-ekwu ekwu. Akwụkwọ bụ́ Talking Drums of Africa na-ekwu: “Ihe a a sị na ọ bụ asụsụ ịgba bụ n’ụzọ bụ isi otu ihe ahụ ya na asụsụ nke agbụrụ ahụ na-asụ.”

N’ezie, asụsụ nke nwere ụda olu abụọ na-enwekarị ọtụtụ okwu ndị nwere ụda olu na nkeji okwu yiri ibe ha. Dị ka ihe atụ, n’asụsụ Kele, ihe dị ka mkpọaha 130 nwere otu ụdị ụda (elu elu) dị ka sango (nna). Ihe karịrị 200 nwere otu ụda (ala elu) dị ka nyango (nne). Iji zere nghọtahie, ndị ọkụ ịgba na-enye ihe ndị gbara ụdị okwu ndị ahụ gburugburu, na-etinye ha ná mkpirikpi nkebi ahịrị okwu a ma ama nke nwere mgbanwe zuru ezu iji mee ka onye na-ege ntị nwee ike ịghọta ihe a na-ekwu.

Iji Ekwe Na-ekwu Okwu

Otu ụdị ịgba na-ekwu okwu bụ ekwe osisi. (Lee foto dị na peji 19.) A na-emepụta ekwe ndị ahụ site n’ịkpọpu oghere n’otu akụkụ nke osisi. E nweghị ebe a na-akụ akụ nke e ji akpụkpọ anụ kwee n’isi ya abụọ. Ọ bụ ezie na ekwe dị na foto ahụ nwere oghere abụọ, ọtụtụ na-enwe nanị otu ogologo oghere. Ịkụ ihe n’otu akụkụ nke oghere ahụ na-ewepụta ụda olu dị elu; ịkụ ihe n’akụkụ nke ọzọ na-ewepụta ụda olu dị ala. Ekwe na-adịkarị ihe dị ka otu mita n’ogologo, ọ bụ ezie na ha pụrụ ịdị mkpụmkpụ ruo ihe dị ka ọkara otu mita ma ọ bụ toruo mita abụọ n’ogologo. Ibu ya pụrụ ịdị malite na sentimita 20 ruo ihe ruru otu mita.

E ji ekwe mee ihe ọ bụghị nanị iji zipụ ozi site n’obodo nta gaa n’obodo nta. Onye Cameroon na-ede akwụkwọ bụ́ Francis Bebey kọwara ọrụ ekwe ndị a na-arụ n’asọmpi ịgba mgba. Ka òtù abụọ ahụ na-emegiderịta ibe ha na-ejikere izute n’ámá obodo, ndị ọkaibe ahụ na-agba egwú n’ikwekọ n’ụda ekwe ahụ ka ekwe ahụ na-eto ha. Ekwe nke otu akụkụ pụrụ ịkpọsa, sị: “Ọkaibe, ì zutetụla onye gị na ya hà? Ònye pụrụ ịma gị aka, gwa anyị onye ọ bụ? Ndị a na-enweghị ihe ha bụ . . . na-eche na ha ga-eji [onye] na-enweghị ihe ọ bụ ha kpọrọ ọkaibe merie gị . . . , ma ọ dịghị onye pụrụ imeri gị mgbe ọ bụla.” Ndị egwú nọ n’òtù na-ama ya aka ga-aghọta ịkwa emo ndị a e ji obi ọcha mee ma jiri ekwe zaghachi ngwa ngwa n’ilu, sị: “Obere enwe . . . obere enwe . . . ọ chọrọ ịrị elu osisi ma onye ọ bụla chere na ọ ga-ada. Ma obere enwe ahụ adịghị ekwe ekwe, ọ gaghị esi n’elu osisi ahụ dapụ, ọ ga-arịru n’ọnụ ọnụ ya, obere enwe a.” Ekwe ndị ahụ ga-anọgide na-enye ntụrụndụ n’oge ahụ nile a na-agba mgba.

Ịgba Ndị Kasị Ekwu Okwu

Ịgba ndị e kwere ekwe na-eme karị. A na-akpọ ịgba ahụ ị na-ahụ na foto dị n’aka nri dundun; ọ bụ ịgba na-ekwu okwu a ma ama nke ndị Yoruba, si Nigeria. N’ịbụ nke nwere ọdịdị hourglass, ịgba a nwere ebe a na-akụ akụ n’isi ya abụọ, bụ́ nke e ji akpụkpọ ewu e wepụrụ ájị́ na ya, nke dị mpekere, kwee. E ji eriri akpụkpọ anụ jikọta isi abụọ ahụ. Mgbe a bịadoro eriri ndị ahụ aka, isi ebe ahụ a na-akụ akụ na-esiwanye ike nke na ọ na-ewepụta ụda ruru asatọ ma ọ bụ karị. Site n’iji osisi ịgba gbagọrọ agbagọ eme ihe na ịgbanwe ịdị elu na ịdị ala na usoro nke ụda ahụ, onye ọkụ ịgba nwere nkà pụrụ iṅomi ịla elu na ịda ala nke olu mmadụ. Ndị ọkụ ịgba pụrụ isi otú a soro ndị ọkụ ịgba ndị ọzọ bụ́ ndị nwere ike ịkọwa na ịsụ asụsụ ịgba nwee “mkparịta ụka.”

Na May 1976 ndị na-akụrụ otu chiifu onye Yoruba egwú gosipụtara ikike dị ịrịba ama nke ndị ọkụ ịgba nwere izirịta ozi. Ndị wepụtara onwe ha site n’etiti ndị na-ege ntị takwunyeere onye isi ndị ọkụ ịgba ọtụtụ ntụziaka, bụ́ onye, n’aka nke ya, kụrụ ntụziaka ndị ahụ gwa onye oti egwú ọzọ nọ n’ebe dị anya site n’ogige ahụ. N’ịzaghachi ná ntụziaka ndị ahụ e ji ịgba kụọ, onye oti egwú ahụ si otu ebe gaa n’ebe ọzọ ma mee ihe ọ bụla a gwara ya ka o mee.

Ọ dịghị mfe ịmụta iji ịgba na-ezipụ ozi. Onye edemede bụ́ I. Laoye kwuru, sị: “Ịkụ ịgba ndị Yoruba bụ nkà dị mgbagwoju anya ma sie ike nke chọrọ ọtụtụ afọ nke ọmụmụ ihe. Ọ bụghị nanị na a chọrọ ka onye ọkụ ịgba ahụ nwee nkà ọkpụkpụ aka na echiche nke usoro ụda, kamakwa ezi ikike ncheta ihe maka abụ uri na akụkọ ihe mere eme nke obodo ahụ.”

N’iri afọ ndị a ịgba ndị Africa adịghị ekwukwa okwu dị ka ha na-ekwubu, ọ bụ ezie na ha ka nwere ọrụ dị mkpa n’egwú. Akwụkwọ bụ́ Musical Instruments of Africa na-ekwu, sị: “Ịmụta iji ịgba ezipụ ozi sibigara ike ókè; ya mere, nkà a ji ọsọ ọsọ na-apụ n’anya n’Africa.” Ọkachamara n’usoro mgbasa ozi bụ́ Robert Nicholls na-ekwukwasị: “Nnukwute ịgba nke oge ndị gara aga, ndị olu ha garuru ọtụtụ mile na ndị ọrụ ha bụ nanị izipụ ozi, bụ ndị a na-achọ ikpochapụ.” Ọ na-adịrị ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ mfe taa karị iji telifon mee ihe.

[Foto dị na peeji nke 19]

Ekwe

[Foto dị na peeji nke 19]

Ịgba na-ekwu okwu nke ndị Yoruba

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya