Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ihe Banyere Imelara Otu Onye Ihe?
“Eji m afọ abụọ tọọ nwanne m nwanyị, ọ na-enwetakwa nlebara anya nile. . . . O yighị ka ọ dị mma.”—Rebecca.a
KA NWANNE gị nwoke ma ọ bụ nwanyị na-enwetakwu nlebara anya, otú ahụ ka ị na-enwekwu mmetụta nke ịbụ onye a hapụrụ. Ọ bụrụ na i nwere nwanne nke nwere ikike ndị pụtara ìhè, na-enwe nsogbu siri ike, ma ọ bụ nwee mmasị ma ọ bụ àgwà njimara yiri nke ndị mụrụ gị, ị pụrụ ịgba mgba n’ezie iji nwetatụ nlebara anya ọ bụla! Ka ị na-echekwu echiche banyere ya, otú ahụ ka ọ pụrụ ịdị na-ewutekwu ma na-ewe gị iwe.b
Otú ọ dị, Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Maanụ jijiji, emehiekwala: sịnụ otú a n’obi unu n’elu ihe ndina unu, wee dere duu.” (Abụ Ọma 4:4) Mgbe iwe ji gị, o yikarịrị ka ị ga-ekwu ma ọ bụ mee ihe ị ga-emesịa kwaa ụta maka ya. Cheta otú Ken si wee iwe banyere ọnọdụ ihu ọma nke nwanne ya nwoke, bụ́ Ebel, nwetara n’ebe Chineke nọ. Chineke dọrọ ya aka ná ntị, sị: “N’ọnụ ụzọ ka mmehie na-amakpu dị ka anụ ọhịa: ọ bụkwa n’ebe ị nọ ka ọchịchọ ya dị, ma o kwesịrị ka gị onwe gị chịa ya.” (Jenesis 4:3-16) Ken achịkwaghị mmetụta ya, ihe sikwa na ya pụta bibiri ihe!
N’eziokwu, ị naghị aga ịghọ ogbu mmadụ dị ka Ken. Ya bụrụgodị otú ahụ, imelara otu onye ihe pụrụ ịkpali mmetụta ndị na-adịghị mma. Ya mere ihe ize ndụ nwere ike ịdị na-amakpu n’ọnụ ụzọ gị! Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ha? Oleekwa otú ị pụrụ isi chịa ọnọdụ a?
Chịkwaa Ire Gị!
Mgbe Beth dị afọ 13, o chere na ndị mụrụ ya nwere mmasị karị n’ebe nwanne ya nwoke nọ ma mesoo ya n’ụzọ na-adịghị mma. Ọ na-echeta, sị: “Mụ na mama m na-abarịtara onwe anyị mba nke ukwuu, ma ọ dịghị ezi ihe ọ bụla ọ rụzuru. Adịghị m ege ntị n’ihe ọ na-ekwu, ọ dịghịkwa ege ntị n’ihe m na-ekwu, ya mere o nweghị ihe a rụzuru.” Ikekwe ị chọpụtawokwa na ịba mba na-eme nanị ka ọnọdụ ka njọ. Ndị Efesọs 4:31 na-asị: “Ka e wepụ ihe ilu na ọnụma na iwe na iti mkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọọ nile, n’etiti unu.”
Ọ dịghị gị mkpa iti mkpu iji kwupụta echiche gị. Njekwu dị nwayọọ na-arụkarị ọrụ n’ọnọdụ ọ bụla. Ilu 25:15 na-asị: “Site n’eweghị iwe ọsọ ọsọ ka a na-aranye onyeisi, ire nro na-anyajikwa ọkpụkpụ.” Ya mere ọ bụrụ na o yiri ka ikpe imelara otu onye ihe ọ mara ndị mụrụ gị, abala mba ma boo ha ebubo. Chere maka oge kwesịrị ekwesị, mgbe ahụ gwa ha okwu n’ụzọ dị nwayọọ, nke nkwanye ùgwù.—Tụlee Ilu 15:23.
Ọ bụrụ na i lekwasị anya n’emezighị emezi nke ndị mụrụ gị ma ọ bụ na-akọcha ha n’ihi otú ha si eme ihe n’ụzọ “na-adịghị mma,” ihe ị na-eme bụ nanị ikewapụ ha ma ọ bụ itinye ha n’ọnọdụ ịgọchitere onwe ha. Kama nke ahụ lekwasị anya n’otú omume ha siworo metụta gị. (‘Ọ na-ewute m n’ezie mgbe unu leghaara m anya.’) O yikarịrị ka a ga-akwali ha iji gị kpọrọ ihe. Ọzọ, “bụrụ onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ.” (Jemes 1:19) Ọ pụrụ ịbụ n’ezie na ndị mụrụ gị nwere ezi ihe mere ha ji elebakwuru nwanne gị anya. Ikekwe o nwere nsogbu ndị ị na-amaghị.
Ma gịnị ma ọ bụrụ na ị na-ewekarị iwe ọkụ ma na-ekwu okwu n’echezighị echiche mgbe iwe ji gị? Ilu 25:28 na-eji “onye ọ bụla nke na-adịghị egbochi mmụọ ya” atụnyere obodo “nke mgbidi na-adịghị”; o yikarịrị ka mkpali ya ndị na-ezughị okè ọ ga-erikpu ya. N’aka nke ọzọ, ikike ịchịkwa mmetụta gị bụ akara nke inwe ume n’ezie! (Ilu 16:32) Mgbe ahụ, gịnị ma i chere ruo mgbe ị dajụrụ tupu i kwupụta mmetụta gị, ikekwe ọbụna ichere ruo ụbọchị na-eso ya? Ị pụkwara ịhụ na ọ na-enye aka isi n’ọnọdụ ahụ pụọ, eleghị anya ime mkpapụ ma ọ bụ mmega ahụ ụfọdụ. (Ilu 17:14) Site n’ịchịkwa egbugbere ọnụ gị, ị pụrụ izere ikwu ihe na-akpasu iwe ma ọ bụ ihe nzuzu.—Ilu 10:19; 13:3; 17:27.
Nnupụisi Aghụghọ
Ọnyà ọzọ a ga-ezere bụ nnupụisi. Marie dị afọ 16 chọpụtara na a gaghị ata nwanne ya nwoke nke nta ahụhụ mgbe ọ kpaghasịrị ọmụmụ Bible ezinụlọ. N’ịbụ onye iwe were n’ihi ihe a yiri ile mmadụ anya n’ihu, ọ “gbara abụbụ ọrụ,” na-ajụ ikere òkè n’ọmụmụ ihe ahụ. Ì jitụwo omume ịgbachi nkịtị mee ihe ma ọ bụ gosipụta ekwenyeghị ekwenye mgbe i chere na ihe adịghị mma?
Ya bụrụ otú ahụ, ghọta na atụmatụ aghụghọ dị otú ahụ na-emegide iwu Bible nke ịsọpụrụ na irubere ndị mụrụ gị isi. (Ndị Efesọs 6:1, 2) Ọzọkwa, nnupụisi na-emebi mmekọrịta gị na ndị mụrụ gị. Ọ ka mma iso ndị mụrụ gị kwurịta nsogbu gị. Ilu 24:26 na-egosi na onye “na-aza okwu ziri ezi” na-enweta nkwanye ùgwù nke ndị ọzọ. Mgbe Marie sooro nne ya kwurịta okwu ahụ, ha bịara ná nkwekọrịta, ihe malitekwara ịka mma.
Ihe Ize Ndụ nke Nkewapụ
Ụzọ ọzọ na-adịghị mma isi mee ihe banyere imelara otu onye ihe bụ ikewapụ site n’ezinụlọ gị ma ọ bụ ilegara ndị na-ekweghị ekwe anya maka nlebara anya. Nke a bụ ihe mere Cassandra: “Ekewapụrụ m onwe m site n’ezinụlọ m ma chigharịkwuru ndị enyi m metara n’ụlọ akwụkwọ bụ́ ndị ụwa. Enwedịrị m ndị enyi nwoke, ndị mụrụ m amaghịkwa banyere ya. Enweziri m ịda mbà n’obi, nweekwa obi amamikpe n’ihi na amatara m na anaghị m eme ihe ziri ezi. Achọrọ m isi n’ọnọdụ ahụ pụta, ma apụghị m nnọọ ịhụ ụzọ isi kọọrọ ndị mụrụ m.”
Ọ dị ize ndụ ikewapụ onwe gị site n’ezinụlọ gị na site n’ebe ndị kwere ekwe ibe gị nọ—karịsịa mgbe iwe ji gị na mgbe anya na-edoghị gị. Ilu 18:1 na-adọ aka ná ntị, sị: “Ọchịchọ nke ya onwe ya na-achọsi ike ka onye na-ekewapụ onwe ya na-achọ, ọ bụ ezi nzube ihe nile ka ọ na-alụsosi ọgụ ike.” Ọ bụrụ na o siiri gị ike ijekwuru ndị mụrụ gị n’oge a, chọọ enyi onye Kraịst dị ka nke a kọwara n’Ilu 17:17: “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.” Dị ka ọ na-adịkarị, ọ na-adị mfe ịhụ “enyi” dị otú ahụ n’etiti ndị tozuru okè nọ n’ọgbakọ.
Cassandra chọtara “enyi” n’oge ọ nọ ná mkpa: “Mgbe onye nlekọta sekit [onye ozi na-ejegharị ejegharị] letara ọgbakọ anyị, ndị mụrụ m gbara m ume iso ya rụọ ọrụ. Anya ruru ya na nwunye ya ala, ha nwekwara ezi mmasị n’ebe m nọ. Apụrụ m ịgwa ha okwu n’ezie. Echeghị m na ha ga-akatọ m. Ha ghọtara na nanị n’ihi na a zụlitere gị dị ka onye Kraịst apụtaghị na i zuru okè.” Agbamume na ndụmọdụ ha tozuru okè bụ nnọọ ihe dị Cassandra mkpa!—Ilu 13:20.
Ihe Ize Ndụ nke Anyaụfụ
Ilu 27:4 na-adọ aka ná ntị, sị: “Ihe na-enweghị obi ebere ka ọnụma bụ, iju mmiri ka iwe bụkwa; ma ònye ga-eguzo n’ihu ekworo?” Anyaụfụ na ekworo maka nwanne nwetara ihu ọma akpaliwo ụfọdụ ndị ntorobịa ime omume n’echezighị echiche. Otu nwanyị kwupụtara, sị: “Mgbe m bụ nwata, enwere m ntutu dị gịrị gịrị, na-etojughị etoju, na-acha nchara nchara ma nwanne m nwanyị nwere ntutu buru ibu na-acha ka ọlaedo na-egbukepụ egbukepụ nke na-eru ya n’úkwù. Papa m na-eto ntutu ya mgbe nile. Ọ na-akpọ ya ‘Rapunzel’ ya. Otu abalị mgbe ọ na-ehi ụra, eweere m mkpà ịkwa ákwà mama m, here ehere gaa n’àkwà ya ma chapụ ókè ntutu m nwere ike.”—Siblings Without Rivalry, nke Adele Faber na Elaine Mazlish dere.
Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere na a kọwara anyaụfụ na Bible dị ka otu n’ime ajọ “ọrụ nile nke anụ ahụ.” (Ndị Galetia 5:19-21; Ndị Rom 1:28-32) Otú ọ dị, ‘mmụọ ekworo’ dị n’ime anyị nile. (Jemes 4:5) Ya mere ọ bụrụ na ị hụ onwe gị ka ị na-eme atụmatụ itinye nwanne gị ná nsogbu, mee ka o yie onye ọjọọ, ma ọ bụ n’ụzọ ụfọdụ ọzọ weda ya n’ọnọdụ kwesịrị ya, anyaụfụ nwere nnọọ ike ‘ịmakpu n’ọnụ ụzọ,’ na-anwa ịchị gị!
Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị hụ na ị na-ebu mmetụta ndị dị otú ahụ na-emerụ ahụ n’obi? Nke mbụ, nwaa ịrịọ Chineke maka mmụọ ya. Ndị Galetia 5:16 na-asị: “Na-ejegharịnụ site ná Mmụọ Nsọ, unu agaghị emezukwa agụụ nke anụ ahụ ma ọlị.” (Tụlee Taịtọs 3:3-5.) Ịtụgharị uche n’ezi mmetụta gị maka nwanne gị pụkwara inye aka. Ị̀ pụrụ ikwu n’ezie na i nweghị ịhụnanya ụfọdụ maka onye ahụ—n’agbanyeghị mkpasu iwe gị? Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị na “ịhụnanya adịghị ekwo ekworo.” (1 Ndị Kọrint 13:4) Ya mere jụ ịnọgide na-eche echiche ndị na-adịghị mma, ndị na-akpalite anyaụfụ. Gbalịa isoro onye ahụ ṅụrịa ma ọ bụrụ na ọ na-enweta nlebara anya pụrụ iche site n’aka ndị mụrụ gị.—Tụlee Ndị Rom 12:15.
Mkparịta ụka gị na ndị mụrụ gị pụkwara inye aka n’akụkụ nke a. Ọ bụrụ na mkpa nke ilebakwuru gị anya edoo ha anya, nke a ga-enyere gị aka nke ukwuu imeri mmetụta nke anyaụfụ n’ebe ụmụnne gị nọ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ihe akaghị mma n’ụlọ, imelara otu onye ihe adịgidekwa? Ewela iwe, abala mba, ma ọ bụ nupụ isi megide ndị mụrụ gị. Gbalịa ijigide omume nrubeisi, nke inye aka. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, chọọ nkwado site n’aka ndị tozuru okè nọ n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. Karịsịa, bịaruo Jehova Chineke nso. Cheta okwu ọbụ abụ ahụ: “N’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.”—Abụ Ọma 27:10.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ụfọdụ.
b Lee isiokwu bụ́ “Gịnị Mere Nwanne M Nwoke Ji Enweta Nlebara Anya Nile?,” ná mbipụta Teta! nke November 8, 1997.
[Foto dị na peeji nke 15]
Ịkọwa na i chere na e leghaara gị anya pụrụ idozi nsogbu ahụ