Echiche Nke Bible
Olee Otú Ị Pụrụ Isi Tụọ Chineke nke Ịhụnanya Egwu?
“ONYE IHE NA-AGARA NKE ỌMA KA NWOKE AHỤ BỤ NKE NA-ATỤ EGWU JEHOVA.”—Abụ Ọma 112:1.
Ọ BỤRỤ na “Chineke bụ ịhụnanya,” dị ka Bible na-akọwa ya, gịnị mere o kwesịrị iji dị mkpa ịtụ ya egwu? (1 Jọn 4:16) N’ozuzu ya, a na-ewere ịhụnanya dị ka ihe ya na egwu na-adịghị agakọ. Ya mere, olee ọrụ egwu kwesịrị ịrụ ná mmekọrịta anyị na Chineke? Gịnị mere a ga-eji tụọ Chineke nke ịhụnanya egwu? Ilebakwu anya n’otú e si jiri okwu ahụ bụ “egwu” mee ihe na Bible pụrụ inye anyị nghọta ka mma nke okwu a.
N’ihe ka n’ọnụ ọgụgụ asụsụ otu okwu pụrụ inwe ọtụtụ ihe ọ pụtara, na-adabere n’ihe a na-ekwu. N’otu aka ahụ, Bible na-ekwu banyere ụdị egwu dị iche iche. Mgbe o ji okwu ahụ mee ihe n’ihe metụtara ife Chineke ofufe, ọ dịghị ezo aka n’ụjọ, oké egwu, ma ọ bụ echiche nke ntaramahụhụ na-abịanụ. Kama nke ahụ, egwu Chineke na-enye echiche ndị ziri ezi—ụjọ, nsọpụrụ ofufe, na nkwanye ùgwù dị omimi. E jikọtara ọmarịcha mmetụta uche ndị a na ịhụnanya na ndọrọ n’ebe Chineke nọ, ọ bụghị amamihe ebumpụta ụwa nke ịgbapụ ma ọ bụ izopụ n’ebe ọ nọ.
Egwu Chineke na-ewepụ egwu ọjọọ, nke ịma jijiji. Banyere onye na-atụ egwu Chineke, ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ọ gaghị esite n’ihe ọjọọ a nụworo tụọ egwu: e doziwo obi ya, ebe ọ na-atụkwasị Jehova obi.” (Abụ Ọma 112:7) Ọ dịghị iyi egwu sitere n’aka ndị ajọ mmadụ ma ọ bụ n’aka Setan n’onwe ya nke pụrụ imeri nkwanye ùgwù na nsọpụrụ ofufe anyị dị omimi maka Jehova. (Luk 12:4, 5) Anyị agaghịkwa atụ egwu ma ọlị ijekwuru Chineke n’ekpere. Kama nke ahụ, n’echiche a, ‘ịhụnanya na-achụpụ egwu n’èzí.’—1 Jọn 4:18.
Eluigwe na Ịdị Ukwuu nke Chineke
Eze Devid oge ochie bụ nwoke tụrụ egwu Chineke. Ụjọ tụrụ ya mgbe ọ na-atụgharị uche n’ịma mma na ịdị mgbagwoju anya nke ihe okike. O tiri mkpu, sị: “M ga-ekele Gị; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ: oké ọrụ ka ọrụ Gị nile dị; mkpụrụ obi m makwaara ya nke ọma.” (Abụ Ọma 139:14) N’ile anya na mbara igwe n’abalị, o tiri mkpu, sị: “Eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke.” (Abụ Ọma 19:1) Ì chere na ihe a Devid hụrụ yiri ya egwu? N’ụzọ dị iche, ọ kpaliri ya ịbụ abụ otuto nye Jehova.
Mmụba nke ihe ọmụma nke oge a banyere eluigwe na-enye anyị ọbụna ihe ka ike mere anyị ga-eji tụọ ụjọ. Na nso nso a, ndị na-enyocha mbara igwe ji Teliskop Mbara Igwe nke Hubble eme ihe nyobara anya n’ime eluigwe karịa mmadụ ọ bụla bu ha ụzọ. Ha họọrọ otu akụkụ mbara igwe yiri ka ọ tọgbọ chakoo nye teliskop ndị dị n’ala ma chee Hubble ahụ ihu n’ebe há nanị ka otu mkpụrụ ájá e ji n’aka gbatịpụrụ agbatịpụ. Ihe e setere jupụtara, ọ bụghị na kpakpando ndị dị otu otu, kama n’ọtụtụ ụyọkọ kpakpando—usoro sara mbara nke ọtụtụ ijeri kpakpando mejupụtara—nke mmadụ na-ahụtụbeghị!
Ịdị ukwuu, ịdị omimi, na ijuanya nke eluigwe na ala na-akụnye ụjọ n’onye ji ezi mmasị na-ekiri ya. Otú ọ dị, ụdị ijuanya ndị ahụ bụ nanị ngosipụta nke ebube na ike nke Onye Okike. Bible na-akpọ Jehova Chineke “Nna nke ìhè,” na-agwakwa anyị na ọ “na-agụta ọnụ ọgụgụ kpakpando; ha nile ka Ọ na-akpọ aha.”—Jemes 1:17; Abụ Ọma 147:4.
A na-ahụkwa ịdị ukwuu nke eluigwe na ala n’oge ọ na-ewe ihe omume dị iche iche n’eluigwe. Ìhè sitere n’ụyọkọ kpakpando ndị e setere na Teliskop Mbara Igwe nke Hubble anọwo na-eme njem na mbara igwe eri ọtụtụ ijeri afọ! Ọ̀ bụ na ịdị ọhụrụ na ịdị nta anyị ma e jiri ya tụnyere ịdịgide adịgide nke eluigwe ekwesịghị ime ka anyị tụọ ụjọ ma nwee nsọpụrụ ofufe dị omimi maka Onye ahụ mere kpakpando? (Aịsaịa 40:22, 26) Ịmata na Chineke onye kere ihe ndị a nile ‘na-echetakwa mmadụ na-anwụ anwụ ma na-elekọta ya’ na-eme ka mmasị anyị n’Onye Okike anyị mikwuo emi, na-emekwa ka anyị chọọ ịmata ya na ime ihe na-atọ ya ụtọ. (Abụ Ọma 8:3, 4) Ụdị oké nkwanye ùgwù na ekele dị otú ahụ bụ ihe Bible na-akpọ egwu Chineke.
Chineke nke Na-agbaghara
Anyị nile bụ ndị na-ezughị okè. Ọbụna mgbe anyị na-agbalị ime ihe ziri ezi, anyị na-emehie n’amaghị ụma. Mgbe nke ahụ mere, ànyị kwesịrị ịtụ egwu ihu ọma Chineke ifunahụ anyị? Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Ja, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo? Ma n’aka Gị ka mgbaghara dị, ka e wee tụọ egwu Gị.” (Abụ Ọma 130:3, 4) Na ‘Onye Ukwu Mere Ihe’ nwere obiọma ma na-agbaghara mmehie na-akpali ekele na nsọpụrụ ofufe dị omimi n’ime ndị na-efe ya ofufe.—Aịsaịa 54:5-8.
Egwu Chineke na-akwali anyị ime ihe dị mma nakwa izere ime ihe Chineke sị na ọ dị njọ. A pụrụ iji mmekọrịta anyị na Nna anyị nke eluigwe tụnyere nke ezigbo nna bụ́ mmadụ na ụmụ ya na-enwe. Mgbe ụfọdụ, ụmụaka apụghị icheta ihe mere nna ha ji egbochi ha igwuri egwu n’okporo ámá. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ha nwere ọchịchọ ịchụso bọl gaa n’ụzọ ụgbọala, icheta iwu nna ha na-egbochi ha—ikekwe na-azọpụta ha n’ọnwụ. N’otu aka ahụ, egwu onye toworo eto na-atụ Jehova pụrụ igbochi ya ime omume pụrụ ibibi ndụ—nke ya nakwa nke ndị ọzọ.—Ilu 14:27.
Ịtụ Ikpe Chineke Egwu
N’ụzọ dị iche, onye akọ na uche ya na-adịghị egbochi ime ihe na-adịghị atọ Chineke ụtọ nwere ihe mere ọ ga-eji tụọ egwu n’ụzọ dị nnọọ iche. Dị nnọọ ka ọchịchị mmadụ na-ata ndị omempụ ahụhụ, Chineke nwere ikike ime ihe megide ndị na-elezi anya eme mmehie, na-enweghị nchegharị. Nkwere Chineke kwere ka ajọ omume dịruo nwa oge emewo ka ụfọdụ ndị bụrụ ndị obi kpọrọ nkụ n’ụzọ ọjọọ. Ma Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na n’otu ụbọchị n’isi nso ọ ga-ewepụ ndị ọjọọ nile n’ụwa. (Abụ Ọma 37:9, 10; Eklisiastis 8:11; 1 Timoti 5:24) Ndị ajọ omume n’enweghị nchegharị nwere ihe mere ha ga-eji tụọ ntaramahụhụ sitere n’aka Chineke egwu. Ma, egwu dị otú a abụghị ụdị egwu nke Bible na-ekwu ka e nwee.
Kama nke ahụ, Bible na-ejikọta egwu Jehova na ihe ndị mara mma ná ndụ—ịbụ abụ, ọṅụ, ntụkwasị obi, amamihe, ogologo ndụ, obi ike, ọganihu, olileanya, na udo, n’ịkpọtụ nanị ole na ole aha.a Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eje ije n’egwu Jehova, anyị ga-anụ ụtọ ọtụtụ ngọzi ndị dị otú ahụ ruo ebighị ebi.—Deuterọnọmi 10:12-14.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 20]
Site n’ikike nke Anglo-Australian Observatory, foto nke David Malin sere