Ụwa Mpụ Na-adịghị Ga-abịa n’Isi Nso!
MGBE anyị lere ọnọdụ ụwa anya taa, ọ na-edo anya na o siri nnọọ ike izere ịbụ onye a kwaliri ime ihe dị njọ. N’ezie, a mụrụ anyị nile n’ezughị okè, ndị pụrụ ime ihe ọjọọ. (1 Ndị Eze 8:46; Job 14:4; Abụ Ọma 51:5) Ebe ọ bụkwa na a chụpụwo Setan bụ́ Ekwensu n’eluigwe, ọ na-eme mgbalị ka ukwuu karịa mgbe ọ bụla ọzọ ịkpata nsogbu.—Mkpughe 12:7-12.
Ihe ndị ọ rụpụtara adịwo oké njọ. Dị ka ihe atụ, otu nnyocha e mere ụmụaka 4,000 na Scotland kpughere na ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ndị nọ n’agbata afọ 11 na 15 emeworị mpụ. Otu nnyocha e mere na Britain dum gosiri na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ndị nọ n’afọ iri na ụma enweghị nsogbu akọ na uche n’ihe banyere ntụtụaka n’ụlọ ahịa. Ihe karịrị ọkara kwetakwara na ọ bụrụ na e nyefee ha ụfọ ego, ha ga-ewere ya.
Akwụkwọ Itali bụ́ Lʹoccasione e lʹuomo ladro (Ohere na Onye Ohi) na-eme ka a ghọta ihe mere ndị mmadụ ji ezu ohi. Akwụkwọ ahụ na-ekwu na ndị ohi nwere “ọ̀tụ̀tụ̀ njide onwe onye dị ala” nakwa na ha “enweghị ike ịhapụ imeju ọchịchọ” ha. Akwụkwọ ahụ na-agbakwụnye na ihe ka ọtụtụ ná ndị ohi ejighị ya mere aka ọrụ kama ha bụ nanị “ndị dị njikere iji ọnọdụ dapụtaranụ mee ihe.”
N’ụzọ na-akpali mmasị, akwụkwọ ahụ na-ekwukwa ihe mere ọtụtụ ndị mmadụ ji “ezere imebi iwu.” Ọ na-ekwubi na ihe kpatara ya abụghị na ha “na-atụ ụjọ ihe mgbochi iwu kama ọ bụ n’ihi na ha nwere ụkpụrụ omume ndị na-egbochi ha ime otú ahụ.” Olee ebe ndị mmadụ pụrụ ịmụta ụkpụrụ omume ndị kwesịrị ekwesị dị otú ahụ?
Agụmakwụkwọ nke Dị Mkpa
Tụlee ihe a na-amụta site n’ọtụtụ ebe e si enweta ozi. Dị ka ihe atụ, ozi ihe nkiri sịnịma na telivishọn na-ezikarị bụ na ime ihe ike, ịkwa iko nke ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, na àgwà rụrụ arụ bụ nke a na-anakwere. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na ndị mmadụ nwere nnọọ ntakịrị njide onwe onye. N’aka nke ọzọ, Bible na-ezi n’ụzọ amamihe, sị: “Ọ dị mma, bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, karịa dike: ọ dịkwa mma, bụ onye na-achị mmụọ ya, karịa onye na-ewere obodo n’agha.”—Ilu 16:32.
N’ịtụle mgbasa echiche nke taa, o kwesịghị ịbụ ihe ijuanya na ọtụtụ ndị “enweghị ike ịhapụ imeju ọchịchọ” ha. Ugboro ugboro, ndị mmadụ na-anụ: “Zụrụ ya ugbu a ma kwụọ ụgwọ mgbe e mesịrị.” “Meere onwe gị ihe dị mma.” “I kwesịrị inweta ihe kasị mma.” “Lekọta ọdịmma onwe gị anya.” A na-egosi imeju ọchịchọ onwe onye dị ka ihe dị otú o kwesịrị na ihe kwesịrị ekwesị. Ma echiche dị otú ahụ nke iche banyere onwe onye nanị na-emegide ozizi Bible bụ́ “elela ihe nke aka unu anya, kama unu nile n’otu n’otu leekwa ihe nke mmadụ ibe unu anya.”—Ndị Filipaị 2:4.
Ọ̀ bụ na ị gaghị ekwere na ihe ka ọtụtụ ná ndị na-adịghị eme ihe n’eziokwu bụ ndị na-eji ohere dapụtaranụ erigbu ndị ọzọ? N’ụzọ dị mwute, e nwere ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị mmadụ ndị dị njikere iji ọnọdụ dapụtaranụ eme ihe maka ọdịmma nke onwe ha. Ha adịghị ajụ ma otu omume ò ziri ezi n’ụzọ omume ọma. Nchegbu ha nanị bụ, ‘M̀ pụrụ ime ya ma lanarị?’
Gịnị dị mkpa? Dị ka a rịbara ama n’elu, ụkpụrụ omume ọma dị mkpa. Nke a ga-egbochi ndị mmadụ ime mpụ, ilelị ịdị nsọ nke ndụ, imebi ịdị nsọ nke alụmdi na nwunye, ịgabiga ịkpa ókè nke akparamàgwà kwesịrị ekwesị, na itinye aka n’ihe ruuru ndị ọzọ n’ụzọ ndị ọzọ. Ndị na-amụtaghị ụkpụrụ ndị dị otú ahụ, dị ka Bible na-ekwu, ‘bụ ndị mmehie ha adịghị ewute ha ọzọ.’ (Ndị Efesọs 4:19) Àgwà ime mpụ nke ndị dị otú ahụ na-adịghị asọpụrụ Chineke bụ ihe na-egbochi anyị inwe ụwa nke mpụ na-adịghị.
Otú Ụwa Ọhụrụ Ga-esi Bịa
N’ezie, ọtụtụ ndị mmadụ na-agbalị ike ha ime ihe n’eziokwu, iji nkwanye ùgwù na nchebara echiche na-emeso mmadụ ibe ha, na izere omume ndị na-ezighị ezi n’iwu. Ma ọ ga-abụ ihe amamihe na-adịghị na ya iche na onye ọ bụla nọ n’ụwa ga-eme mgbalị a. Ọtụtụ agaghị eme, ọbụna dị ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị biri ndụ n’ụbọchị onye ezi omume bụ́ Noa na-adịghị njikere ime ihe ziri ezi. N’ụwa ahụ nke ime ihe ike jupụtara, nanị Noa na ezinụlọ ya bụ ndị jụrụ àgwà asọpụrụghị Chineke, wee si otú ahụ nweta nnwapụta Chineke. Site n’ikpochapụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ, Onye Okike anyị wetara ụwa nke mpụ na-adịghị ruo nwa oge.
Ọ dị mkpa icheta na ihe ndekọ Bible banyere Iju Mmiri ahụ na mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke abụghị nanị akụkọ na-adọrọ mmasị. Jisọs Kraịst kọwara, sị: “Dị ka e mere n’ụbọchị Noa, otú a ka ọ ga-adịkwa n’ụbọchị Nwa nke mmadụ.” (Luk 17:26; 2 Pita 2:5; 3:5-7) Dị nnọọ ka Chineke bibiri ụwa ahụ na-eme ihe ike dị tupu Iju Mmiri ahụ, ọ ga-ebibikwa ụwa nke a jupụtara na mpụ.
Anyị nwere eziokwu na-esonụ site n’isi iyi kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka onyeozi nke Jisọs hụrụ n’anya, bụ́ Jọn, si kwuo: “Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) Ọgwụgwụ ụwa nke a ga-emeghe ụzọ maka ụwa ọhụrụ nke Bible na-ekwu na n’ime ya: “[Chineke] ga-ebinyekwara [ihe a kpọrọ mmadụ], ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.”—Mkpughe 21:3, 4.
N’ịkọwa otú ụwa ọhụrụ ahụ ga-esi bịa, Bible na-ekwukwa, sị: “Ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.” (Ilu 2:22) N’inwe nanị ndị ziri ezi ga-afọdụ n’ụwa, a ga-emezu amụma a nke Bible: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:11.
N’ime ụwa ọhụrụ Chineke, ọbụna ụmụ anụmanụ agaghị eme ihe ike. Bible na-ebu amụma, sị: “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkwa, agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa; nwa ehi na nwa ọdụm na nwa anụ e mere ka ọ maa abụba ga-adịkwa n’otu ebe; nwatakịrị ga na-edukwa ha. . . . Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Aịsaịa 11:6-9; 65:17; 2 Pita 3:13.
Ụwa Ọhụrụ Chineke Dị Nso
Ozi ọma bụ na n’isi nso a ga-enweta ọnọdụ udo dị otú ahụ n’ụwa nile. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ nnọọ iji jide ya n’aka? N’ihi ihe Jisọs buru n’amụma nke ga-eme kpọmkwem tupu ọgwụgwụ ụwa. Tinyere ihe ndị ọzọ, o buru amụma, sị: “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: oké ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” Ọ gbakwụnyere, sị: “N’ihi na ihe na-emebi iwu ga-aba ụba, ịhụnanya nke ndị ka n’etiti mmadụ ga-ajụkwa oyi.”—Matiu 24:7, 12.
Otu onyeozi Jisọs bukwara amụma, sị: “Oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ [nke ụwa a]. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, . . . ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, . . . ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:1-5) N’ezie, anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ” nke ụwa a! N’ihi ya, n’oge na-adịghị anya, ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke ga-anọchi ya!
Ọmụmụ Bible emewo ka ọtụtụ nde kweta na ụwa mpụ na-adịghị bụ ihe kwere omume, ha na-azaghachikwa n’ọkpụkpọ òkù ịbụ ndị e ziri ihe n’ụzọ nile nke Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke. (Aịsaịa 2:3) Ọ̀ ga-amasị gị isonyere ha? Ị̀ dị njikere ime mgbalị iji nweta ndụ n’ụwa ọhụrụ nke mpụ na-adịghị?
Jisọs gosiri ihe kasị mkpa. Ọ kọwara, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” N’ihi ya, ọdịmma ebighị ebi gị na-adabere na gị ịmụ Okwu Chineke na ime ihe ị na-amụta.—Jọn 17:3.
[Foto dị na peeji nke 8, 9]
Bible na-akọwa ụwa ọhụrụ nke mpụ na-adịghị, na-akọkwa otú anyị pụrụ isi nweta ya