Osisi Dogon Yaro Dị Ịtụnanya
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA NIGERIA
“EBE obodo na-enweta ọgwụ”—nke ahụ bụ ihe ndị mmadụ na-akpọ osisi dogon yaro n’India. Ruo ọtụtụ narị afọ ndị mmadụ nọ ná mba ahụ e legaworo osisi dogon yaro anya ịgwọ ahụ mgbu, ahụ ọkụ, na ọrịa na-efe efe. N’ikwere na osisi dogon yaro pụrụ inye aka ime ka ọbara ha dị ọcha, ọtụtụ ndị Hindu na-amalite afọ ọ bụla site n’ịta akwụkwọ dogon yaro ole na ole. Ụmụ mmadụ na-ejikwa osisi dogon yaro ekwocha ezé ha, ete mmiri akwụkwọ dogon yaro n’ọrịa akpụkpọ ahụ, na-aṅụkwa tii dogon yaro dị ka ọgwụ na-enye ume.
N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ndị ọkà mmụta sayensị egosiwo mmasị na-arị elu n’osisi dogon yaro. Otú ọ dị, otu akụkọ sayensị a kpọrọ Neem—A Tree for Solving Global Problems na-adọ aka ná ntị, sị: “Ọ bụ ezie na o yiri ka a pụghị ịgụta ihe ndị ọ pụrụ ime ọnụ, ọ dịbeghị ihe ọ bụla doro anya kpọmkwem banyere osisi dogon yaro. Ndị ọkà mmụta sayensị kasị nwee mmasị n’osisi ahụ na ihe ọ pụrụ ịrụ, kweere na ihe àmà e nwere ugbu a iji kwadoo ihe ndị ha na-atụ anya ha bụ ihe ndị a na-ejibeghị n’aka.” Ka o sina dị, akụkọ ahụ kwukwara, sị: “Iri afọ abụọ nke nnyocha ekpughewo ihe ndị na-enye olileanya a rụpụtara n’ọtụtụ akụkụ mmụta nke na osisi a a na-amachabeghị pụrụ ịbara ma mba ndị bara ọgaranya ma ndị dara ogbenye uru dị ukwuu. Ọbụna ndị ụfọdụ na-eme nnyocha kasị elezi anya na-ekwu na ‘e kwesịrị ịkpọ dogon yaro osisi na-eme irè.’”
Ọrụ Ya Dị Ka Osisi
N’ịbụ nke a na-ahụ n’ebe okpomọkụ, dogon yaro so n’ezinụlọ nke osisi mahọganị. Ọ na-etoru mita 30 n’ogologo, ọ pụkwara iburu ihe karịrị mita 2.5 n’ibu. Ebe ọ bụ na ọ na-esi ike ka ọ ghara inwe akwụkwọ, ọ na-enye ndo n’oge nile n’afọ. Ọ na-eto ngwa ngwa, na-achọ obere nlekọta, na-etokwa nke ọma n’ala na-adịghị eme nri.
E webatara ya n’Ọdịda Anyanwụ Africa ná mmalite nke narị afọ a inye ndo na ịkwụsị Ọzara Sahara ịgbasaru ebe ndịda. Ndị nlekọta ọhịa akụwokwa osisi ahụ na Fiji, Mauritius, Saudi Arabia, Etiti na Ndịda America, na àgwàetiti ndị dị na Caribbean. Na United States, e nwere ibe ala nnwale ndị dị n’ebe ndịda Arizona, California, na Florida.
Tụkwasị n’inye ndo n’oge nile n’afọ n’oge okpomọkụ, a pụrụ iji osisi dogon yaro mee nkụ. Ọzọkwa, osisi ya nke àkị́kà na-adịghị ata bara uru maka ihe owuwu na ọrụ kapịnta. Ya mere, ile ya anya nanị ná ndabere nke abamuru ya dị ka osisi, dogon yaro bara nnọọ uru. Ma nke ahụ bụ nanị mmalite.
Ahụhụ Kpọrọ Ya Asị
N’ihi na ndị India amatawo ogologo oge dị anya na akwụkwọ dogon yaro na-achụ ahụhụ ndị na-enye nsogbu, ha na-achịsa akwụkwọ ya n’àkwà, akwụkwọ, ebe mkponye ihe, kọbọd, na n’ebe a na-ekowe ákwà. Na 1959 otu onye Germany bụ́ ọkachamara banyere ahụhụ na ụmụ akwụkwọ ya tinyere aka n’inyocha osisi dogon yaro mgbe ha hụsịrị oké ihe otiti nke igurube na Sudan mgbe ọtụtụ ijeri igurube tapịara akwụkwọ osisi ọ bụla ma e wezụga dogon yaro.
Kemgbe ahụ, ndị ọkà mmụta sayensị amụtawo na ngwá ọgụ nke mmiri ọgwụ dị mgbagwoju anya nke osisi dogon yaro dị irè megide ihe karịrị ụdị ahụhụ 200 tinyere ọtụtụ àkị́kà, okpo, nje fungus, nje bacteria, ọbụnakwa nje virus dị iche iche. N’otu nnwale, ndị na-eme nnyocha chịnyere akwụkwọ soybean n’ime otu igbe e tinyere ébé sitere Japan. A gbasawo ọkara akwụkwọ ọ bụla mmiri a pịpụtara site n’osisi dogon yaro. Ébé ndị ahụ tachapụrụ ọkara a na-agbasaghị ọgwụ nke akwụkwọ ọ bụla ma ha akpaghị akụkụ ndị a gbasara ọgwụ aka. N’ezie, ha nwụrụ n’ihi agụụ kama iri ọbụna ntakịrị site n’akụkụ akwụkwọ ahụ a gbasara ọgwụ.
Nnwale ndị dị otú ahụ na-atụ aro na a pụrụ imepụta ọgwụ na-adịghị ọnụ, nke na-adịghị egbu egbu, nke dị mfe ịkwadebe ga-anọchị ọgwụ ahụhụ ụfọdụ mmadụ rụpụtara. Dị ka ihe atụ, na Nicaragua, ndị ọrụ ubi na-agwakọta mkpụrụ dogon yaro a sụrụ asụ na mmiri—mkpụrụ osisi dị gram 80 n’otu lita mmiri. Ha na-edenye mkpụrụ ya ahụ a sụrụ asụ na mmiri ruo hour 12, zachapụ mkpụrụ ya, wee gbasazie mmiri ya n’elu ihe ọkụkụ.
Ihe ndị e ji dogon yaro mee adịghị egbu ihe ka n’ọtụtụ ahụhụ ozugbo. Ọgwụ dogon yaro na-agbanwe usoro ndụ nke ahụhụ, nke mere na mgbe oge na-aga, ọ gazighị enwe ike iri nri, ịmụ ụmụ, ma ọ bụ inwogha. Ma ọ bụ ezie na ihe ndị e ji dogon yaro mee na-emerụ ahụhụ ahụ, ha eyighị ka ha na-emerụ nnụnụ, anụ ndị ọbara ha na-ekpo ọkụ, ma ọ bụ mmadụ ahụ.
“Ebe Obodo Na-enweta Ọgwụ”
E nwekwara uru ndị ọzọ ọ na-abara mmadụ. Mkpụrụ ya na akwụkwọ ya nwere ihe ndị na-egosi ịrụ ọrụ nke mgbochi nje, nje virus, na nje fungus. A na-eche na dogon yaro nwere ike ịgwọta ahụ ọzịza, ọbara mgbali elu, na ọnyá. Ọgwụ ndị a pịpụtara site na dogon yaro ka e kwuru na ha na-alụ agha megide ọrịa shuga na ịba. Abamuru ndị ọzọ a pụrụ inweta gụnyere ihe ndị na-esonụ:
Ọgwụ ndị na-achụ ahụhụ. Otu ihe dị na dogon yaro, nke a na-akpọ salannin, na-achụfu nnọọ ahụhụ ụfọdụ na-ata ata. Ọgwụ na-achụ ijiji na anwụnta e ji mmanụ dogon yaro mee adịlarịị n’ahịa.
Idebe ezé ọcha. Ọtụtụ nde ndị India na-agbajiri osisi dogon yaro kwa ụtụtụ, tajaa ọnụ ọnụ ya, mgbe ahụkwa were ya chichaa ezé na agbụ̀ ha. Nnyocha egosiwo na nke a bara uru, ebe ọ bụ na ihe ndị dị ná mkpo ya na-egbochi nje.
Ihe ndị na-egbochi ime. Mmanụ dogon yaro bụ ọgwụ dị ike na-egbu ọbara ọcha, ọ dịwokwa irè n’ibelata ọ̀tụ̀tụ̀ ọmụmụ n’ụmụ anụmanụ e ji eme nnyocha. Nnwale ndị e ji enwe mee na-egositụ na ihe ndị dị na dogon yaro pụkwara ime ka o kwe mee imepụta ọgwụ nchịkwa ọmụmụ a na-aṅụ aṅụ maka ụmụ nwoke.
N’ụzọ doro anya, dogon yaro abụghị osisi nkịtị. Ọ bụ ezie na a machabeghị ihe nile banyere ya, osisi dogon yaro yiri ka ọ ga-aba oké uru—n’ịchịkwa ụmụ ahụhụ, ịkwalite ahụ ike, inye aka mee ka ọhịa toghachi, na, ikekwe, ibelata oké ụba mmadụ. Ka a sịkwa ihe mere ndị mmadụ jiworo kpọọ osisi dogon yaro dị ịtụnanya “Onyinye Chineke nyere ihe a kpọrọ mmadụ.”
[Foto ndị dị na peeji nke 25]
Osisi dogon yaro na foto nke akwụkwọ dogon yaro