Ị̀ Na-ata Ikekere Ezé?
ERI oge ochie ndị mmadụ anọwo na-ata ikekere ezé mgbe ha nọ n’okpuru nrụgide. Bible na-ejikarị ịta ikekere ezé egosi ọnụma ma ọ bụ nhụjuanya. (Job 16:9; Matiu 13:42, 50) N’ụwa taa nke jupụtara n’iwe na nrụgide, ọtụtụ nde mmadụ na-ata ikekere ezé n’ụzọ nkịtị, ihe ka ọtụtụ amaghịkwa na ha na-eme ya. Ha pụrụ ịdị na-erichapụ ezé ha.
N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị ji ata ikekere ezé? Ihe ndị na-akpata ya dị mgbagwoju anya ma bụrụ nke a na-aghọtachabeghị. Ma n’ọnọdụ ụfọdụ nrụgide mmetụta uche na-apụta ìhè dị ka ihe yiri ka ọ bụ ya na-akpata ya. UC Berkeley Wellness Letter na-ekwu, sị: “Ndị na-ata ikekere ezé na-akọkarị na ha na-enwe ihe isi ike alụmdi na nwunye ma ọ bụ nke ego, na-ele ule ikpeazụ, na-atụ egwu ọrụ ha ifunahụ ha, ma ọ bụ nọrọ ná nrụgide n’ụzọ ụfọdụ.” Ihe ndị ọzọ pụrụ ịkpata ma tụnye ụtụ na ya na-agụnye enweghị nkwekọ nke ezé elu na nke ala, nsogbu ehighị ụra nke ọma, ma ọ bụ ịṅụ mmanya na-aba n’anya. Ya mere, Wellness Letter ahụ na-atụ aro ka ndị na-enwe nsogbu ahụ gbalịa ibelata aka ná mmanya na-aba n’anya; mee ihe ndị dị mfe iji tụsara ahụ tupu ha alakpuo, dị ka iji mmiri dị ṅara ṅara saa ahụ; ma ọ bụ isoro enyi ma ọ bụ onye ndụmọdụ a tụkwasịrị obi kwurịta nsogbu ndị na-akpata nchegbu.
N’ehihie ị pụrụ ịchọpụta na ị na-ata ikekere ezé ma ọ bụ na-echikọta ha ọnụ. Ma olee otú ị pụrụ isi mara ma ị na-eme nke a mgbe ị na-ehi ụra? Mgbe ụfọdụ ịta ikekere ezé na-adịghị akwụsị akwụsị, nke a maara dị ka àgwà ịta ikekere ezé n’amaghị ama, na-ewepụta ụda buru ibu ruo n’ókè nke ịkpọte onye ọzọ na-ehi ụra n’otu ọnụ ụlọ ahụ. Ị pụrụ iteta na-enwe isi ọwụwa n’akụkụ egedege ihu gị, ma ọ bụ agbà gị pụrụ ịgba kịm kịm.a Dọkịta ezé gị pụrụ ọbụna ịchọpụta nrichapụ karịrị akarị n’ezé gị. Ọ pụrụ ịtụ aro ihe ndị a pụrụ ime iji nwetatụ ahụ efe, dị ka ihe ị ga-etinye n’elu ezé gị n’anyasị. Ọ bụ ezie na e meghị ihe nchekwa ọnụ dị otú a iji kwụsị gị ịta ikekere ezé, ọ pụrụ ichebe ezé gị pụọ n’imebikwu. Ka o sina dị, ahụ ruo gị ala! Ka nchegbu gị na-adị ala, otú ahụ ka ịta ikekere ezé gị pụrụ ịdị ala.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji nwetakwuo ihe ọmụma, biko lee mbipụta Teta! nke June 22, 1991 (Bekee), peji nke 20-22.