A Pụrụ Ịnagide Nrụgide!
“A ga na-enwe nrụgide ná ndụ mgbe ọ bụla, n’ezie ihe anyị kwesịkwara ilebara anya bụ mmeghachi omume anyị n’ebe ọ dị karịa ịgbalị ime ka nrụgide ahụ pụọ.”—Leon Chaitow, onye a ma ama n’edemede ahụ ike.
BIBLE buru amụma na na “mgbe ikpeazụ,” a ga-enwe “oge dị oké egwu.” Ihe àmà na-egosi n’ụzọ doro anya na anyị na-ebi n’oge ahụ, n’ihi na ụmụ mmadụ bụ—n’imezu amụma ahụ—“ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu.”—2 Timoti 3:1-5.
Ọ bụghị ihe ijuanya na ịnọgide na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịdị jụụ siri oké ike! Ọ pụrụ imetụta ọbụna ndị na-agbalị ibi n’udo. “Ha dị ọtụtụ, bụ́ ihe ọjọọ nke na-adakwasị onye ezi omume,” ka ọbụ abụ bụ́ Devid dere. (Abụ Ọma 34:19; tụlee 2 Timoti 3:12.) Ma, e nwere ihe dị ukwuu ị pụrụ ime iji belata nrụgide ka o wee ghara irikpu gị. Tụlee aro ndị na-esonụ.
Lekọta Onwe Gị
Lezie anya n’ihe ị na-eri. Ihe oriri na-akwalite ahụ ike na-agụnye protein, mkpụrụ osisi, akwụkwọ nri, ọka na mkpụrụ akụ́kụ́ ndị ọzọ, na ihe ndị sitere ná mmiri ara ehi. Kpachara anya banyere ntụ ọka na-acha ọcha a yọrọ ayọ na abụba ọjọọ. Lezie anya maka nnu ị na-eri, shuga, mmanya na-aba n’anya, na caffeine. Mee ka ihe oriri gị dịkwuo mma, ikekwe ị ga-enwe ohere dị nta ịbụ onye nrụgide metụtara.
Mmega ahụ. “Ọnwụnwa nke ahụ bara uru,” ka Bible na-adụ ọdụ. (1 Timoti 4:8) N’ezie, mmega ahụ ruru n’ókè kwesịrị ekwesị, nke a na-emechi anya—ụfọdụ ndị na-atụ aro ugboro atọ n’otu izu—na-ewusi obi ike, na-eme ka nrugharị ọbara ka mma, na-ebelata cholesterol, na-emekwa ka ohere i nwere ịrịa nkụchi obi dị ala. Karịa nke ahụ, mmega ahụ na-akwalite echiche nke ahụ ịdị mma, ikekwe n’ihi mmiri ọgwụ endorphins a na-ewepụta mgbe a na-arụsi ọrụ ike.
Hie ụra nke ọma. Ehighị ụra na-eduga n’ike ọgwụgwụ ma na-ebelata ikike gị ịnagide nrụgide. Ọ bụrụ na i nwere nsogbu ihi ụra, gbalịa inwe otu oge kwesịrị ekwesị maka ịlakpu ụra na ibili. Ụfọdụ na-atụ aro ka ụra ehihie ghara ịkarị minit 30 ka ha wee ghara igbochi gị ihi ụra nke ọma n’abalị.
Nwee nhazi. Ndị ji oge ha eme ihe nke ọma na-enwekarị ike ịnagide nrụgide nke ọma karị. Iji nwee nhazi, buru ụzọ kpebie ọrụ ndị e kwesịrị ibute ụzọ. Ọzọ, hazie usoro ihe omume gị ka e wee ghara ilefuru ihe ndị a anya.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 14:33, 40 na Ndị Filipaị 1:10.
Nọgide Na-enwe Mkpakọrịta Dị Mma
Nweta nkwado. N’oge nrụgide, ndị nwere ọtụtụ ndị enyi na-enweta ma ọ dịghị ihe ọzọ ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nchebe pụọ n’ịbụ ndị o rikpuru. Ịchọta nanị otu enyi ị tụkwasịrị obi onye ị ga-akọrọ ihe nzuzo pụrụ ime ka e nwee ọdịiche. Otu ilu Bible na-asị: “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.”—Ilu 17:17.
Dozie esemokwu. “Ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu,” ka Pọl onyeozi dere. (Ndị Efesọs 4:26) E gosiri amamihe nke idozi esemokwu ngwa ngwa karịa iburu iwe n’obi n’otu ihe ọmụmụ e mere 929 ndị lanarịrị nkụchi obi. Ndị nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke enweghị omume enyi ji okpukpu atọ yikarịa ka ha ga-anwụ ná nkụchi obi mberede n’ime afọ iri mgbe nkụchi obi mbụ ha gasịrị karịa ndị ibe ha dị obi umeala. Ndị dere ihe ọmụmụ ahụ sịrị na ọ bụ ezie na iwe yiri ka ọ bụ ihe kasị na-akpata ya, ajọ mmetụta uche ọ bụla siri ike nke na-akpalite nrugharị siri ike nke mmiri ọgwụ ahụ bụ́ hormone na-akpata nrụgide n’ime ahụ pụkwara inwe otu mmetụta ahụ. “Ire ure nke ọkpụkpụ nile ka ekworo bụ,” ka Ilu 14:30 na-ekwu.
Wepụta oge maka ezinụlọ. E nyere ndị Israel bụ nne na nna iwu iwepụta oge isoro ụmụ ha na-anọkọ, na-akụnye ụkpụrụ ziri ezi n’ime obi ha. (Deuterọnọmi 6:6, 7) Ihe nkekọ si n’ime ya pụta kwalitere ịdị n’otu nke ezinụlọ—ihe dị ụkọ taa n’ụzọ dị mwute. Otu ihe ọmụmụ kpughere na di na nwunye ụfọdụ na-arụ ọrụ ego na-etinye nkezi nke nanị minit 3.5 n’isoro ụmụ ha gwurie egwu kwa ụbọchị. Ma, ezinụlọ gị pụrụ ịbụ isi iyi dị ukwuu nke enyemaka mgbe ị na-eche nrụgide ihu. “Ezinụlọ na-enye gị ihe ùgwù a na-akparaghị ókè nke isonye n’ìgwè na-enye nkwado mmetụta uche nke maara onye ị bụ n’ezie ma nwee mmasị n’ebe ị nọ n’agbanyeghị nke ahụ,” ka otu akwụkwọ banyere nrụgide kwuru. “Ijikọ aka na-arụ ọrụ dị ka ezinụlọ bụ otu n’ime ụzọ kasị mma nke isi belata nrụgide.”
Nwee Nguzozi ná Ndụ Gị
Nwee ezi uche. Onye na-adọlịgbu onwe ya mgbe nile n’ụzọ anụ ahụ na n’ụzọ mmetụta uche bụ onye mbụ ga-enwe oké ike ọgwụgwụ na ma eleghị anya ịda mbà n’obi. Inwe nguzozi bụ isi ihe dị mkpa. ‘Amamihe ahụ nke si n’elu bịa . . . nwere [ezi uche, NW],’ ka Jemes onye na-eso ụzọ dere. (Jemes 3:17; tụlee Eklisiastis 7:16, 17 na Ndị Filipaị 4:5.) Mụta ịjụ ọchịchọ ndị gabigara ihe ị pụrụ ịnagide n’ụzọ ezi uche dị na ya.
Ejila onwe gị tụnyere onye ọzọ. Ndị Galetia 6:4 na-asị: “Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ nke aka ya, mgbe ahụ ka ọ ga-enwekwa ihe ọ ga-anyara isi n’ebe nanị ya onwe ya nọ, ọ bụghịkwa n’ebe ibe ya nọ.” Ee, ọbụna n’ihe banyere ofufe, Chineke adịghị eme ntụnyere ndị na-adịghị mma, na-achọ ihe karịrị ihe ọnọdụ anyị nyere ohere ya. Ọ na-anara onyinye na àjà anyị ‘dị ka ihe anyị nwere si dị, ọ bụghị dị ka ihe anyị na-enweghị.’—2 Ndị Kọrint 8:12.
Wepụta oge maka ntụsara ahụ. Ọbụna Jisọs, n’agbanyeghị na ọ na-arụsi ọrụ ike, wepụtara oge maka ya na ndị na-eso ụzọ ya inwe ezumike. (Mak 6:30-32) Onye e nyere ike mmụọ nsọ nke dere Eklisiastis matara na inwe ntụsara ahụ dị mma bara uru. O dere, sị: “Mụ onwe m wee jaa ọṅụ, n’ihi na ọ dịghị ezi ihe mmadụ nwere n’okpuru anyanwụ ma ọ bụghị iri ihe, na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, na ịṅụrị ọṅụ: n’ihi na nke ahụ ga-arapara n’ahụ ya n’ime ndọgbu ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ ụbọchị nile nke ndụ ya nke Chineke nyeworo ya n’okpuru anyanwụ.” (Eklisiastis 8:15) Ihe ụtọ kwesịrị ekwesị pụrụ ime ka ahụ nwetaghachi ume ọhụrụ ma na-enye aka ịnagide nrụgide.
Jiri Ezi Uche Na-ele Nrụgide Anya
Mgbe ị na-eche ọnọdụ na-akpata nrụgide ihu:
Ekwubila na Chineke anwapụtaghị gị. Bible na-agwa anyị na Hana, bụ́ nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi, nwere ‘ihe dị ya ilu n’obi’ (“obi erughị ala miri emi,” Revised Standard Version) ruo ọtụtụ afọ. (1 Samuel 1:4-11) Na Masedonia, Pọl nwere “obi erughị ala n’akụkụ ọ bụla.” (2 Ndị Kọrint 7:5, Byington) Tupu ọnwụ ya, Jisọs “[na-abanye n’oké ihe mgbu, NW],” nrụgide ya dịkwa ukwuu nke na “ọsụsọ Ya wee ghọọ ihe dị ka oké ọkpụrụkpụ ọbara na-ada n’ala.”a (Luk 22:44) Ndị a bụ ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi. Ya mere, mgbe ị na-eche nrụgide ihu, ọ dịghị ihe mere ị ga-eji kwubie na Chineke agbahapụwo gị.
Mụta ihe site n’ọnọdụ obi erughị ala gị. Pọl dere na ya aghaghị idi “ogwu n’anụ ahụ,” nke obi abụọ na-adịghị ya na ọ bụ nsogbu ahụ ike nke kpataara ya obi erughị ala dị ukwuu. (2 Ndị Kọrint 12:7) Ma, ihe dị ka afọ ise n’ihu, o nwere ike ikwu, sị: “N’ihe ọ bụla na n’ihe nile e ziwo m ihe omimi a, bụ́ ịnọ n’afọ ojuju na ịnọkwa n’agụụ, ịbabiga ókè na ịnọkwa ná mkpa. Enwere m ike n’ihe nile n’ime Onye ahụ Nke na-eme m ka m dị ike.” (Ndị Filipaị 4:12, 13) “Ogwu n’anụ ahụ” ya atọghị Pọl ụtọ, ma site n’idi ya, ọ mụtara ụzọ isi daberekwuo na Chineke maka ume.—Abụ Ọma 55:22.
Zụlite Ọnọdụ Ime Mmụọ
Gụọ ma tụgharịa uche n’Okwu Chineke. “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha,” ka Jisọs kwuru. (Matiu 5:3, NW) Ịgụ na ịtụgharị uche n’Okwu Chineke dị mkpa. Ọtụtụ mgbe, site n’iji ịdị uchu nyochaa Akwụkwọ Nsọ, anyị na-achọta kpọmkwem okwu agbamume kwesịrị ekwesị dị anyị mkpa iji lafere n’ụbọchị. (Ilu 2:1-6) “Mgbe nchegbu m na-aba ụba n’ime m,” ka ọbụ abụ ahụ dere, “nkasi obi Gị [nke Chineke] nile na-agụgụ mkpụrụ obi m.”—Abụ Ọma 94:19.
Na-ekpechi ekpere anya. Pọl dere, sị: “Meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ee, “udo nke Chineke” pụrụ ịkarị nchekasị anyị ma mee ka ha dajụọ, ọbụna mgbe a chọrọ “ọkịka nke ike.”—2 Ndị Kọrint 4:7.
Na-eje nzukọ ndị Kraịst. Ọgbakọ ndị Kraịst na-enye usoro nkwado bara uru, n’ihi na a na-agba ndị nọ na ya ume ka “anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; . . . na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike.” E nwere ezi ihe mere Pọl ji gwa ndị Hibru narị afọ mbụ bụ́ ndị Kraịst ka ha ghara ‘ịhapụ nzụkọ nke onwe ha.’—Ndị Hibru 10:24, 25.
Olileanya E Ji n’Aka
N’eziokwu, ibelata nrụgide na-abụkarị ihe karịrị ịgbaso otu ụkpụrụ dị mfe. Ọtụtụ mgbe, a chọrọ mgbanwe gbara ọkpụrụkpụ n’iche echiche. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịdị mmadụ mkpa ịmụta ụzọ ndị ọhụrụ ọ ga-esi na-emeghachi omume n’ebe ọnọdụ ya dị ka ha wee ghara ịkarị ya ike. N’ọnọdụ ụfọdụ mbịaghachi ma ọ bụ isi ike nke nrụgide ahụ pụrụ ime ka ọ dị mkpa ịchọ enyemaka nke onye ma nke a na-akọ n’ọrụ ahụ ike.
N’ezie, e nweghị onye ọ bụla taa nke na-adị ndụ na-enweghị nrụgide ọjọọ ma ọlị. Otú ọ dị, Bible na-emesi anyị obi ike na n’oge na-adịghị anya Chineke ga-echigharị ihu ya n’ebe ụmụ mmadụ nọ ma wepụ ọnọdụ ndị na-akpatara ha nrụgide ọjọọ dị ukwuu. Ná Mkpughe 21:4, anyị na-agụ na Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.” E mesịa, ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-ebi ná ntụkwasị obi. Maịka onye amụma buru amụma, sị: “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.”—Maịka 4:4.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A kọwo na ọsụsọ ya na ọbara gwakọtara emewo n’ọnọdụ ụfọdụ nke nrụgide uche gabigara ókè. Dị ka ihe atụ, n’ọnọdụ nke hematidrosis a na-enwe mgbapụta nke ọsụsọ nwetụrụ ọbara ma ọ bụ ọbara ma ọ bụ mmiri ahụ nke ya na ọbara gwakọtara. Otú ọ dị, a pụghị ikwu kpọmkwem ihe mere n’ọnọdụ nke Jisọs.
[Igbe dị na peeji nke 28]
Nrụgide na Ịwa Ahụ
Ụfọdụ ndị dọkịta na-atụle ọ̀tụ̀tụ̀ nrụgide nke ndị ọrịa ha tupu a kpọba ha n’ọnụ ụlọ ịwa ahụ. Dị ka ihe atụ, Dr. Camran Nezhat, bụ́ onye na-awa ahụ, na-ekwu, sị:
“Ọ bụrụ na onye e dokwara ịwa ahụ asị m na ahụ na-ama ya jijiji n’ụbọchị ahụ, na ya agaghịkwa achọ ka a waa ya ahụ, m na-akagbu ịwa ahụ ahụ.” N’ihi gịnị? Nezhat na-akọwa, sị: “Dọkịta ọ bụla na-awa ahụ maara na ndị oké egwu ji na-enwe nsogbu n’ịwa ahụ. Ọbara na-agba ha nke ukwuu, ha na-ebute ọrịa, na-enwekwa nsogbu karị. Ọ na-esikarịrị ha ike ịgbake. Ọ na-akasị mma ma ahụ dị ha jụụ.”
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
Ịzụlite ọnọdụ ime mmụọ pụrụ ime ka ị nọrọ jụụ
[Foto ndị dị na peeji nke 27]
Ilekọta ahụ ike gị na-ebelata nrụgide
Ezumike
Ihe oriri dị mma
Mmega ahụ