Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 5/8 p. 32
  • Teta! Nyeere Otu Onye Nkụzi na Moscow Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Teta! Nyeere Otu Onye Nkụzi na Moscow Aka
  • Teta!—1998
Teta!—1998
g98 5/8 p. 32

Teta! Nyeere Otu Onye Nkụzi na Moscow Aka

Otu onye nkụzi degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Russia akwụkwọ iji kwuo na ọ na-eme atụmatụ iji isiokwu ndị sitere na Teta! eme ihe na klas ụlọ akwụkwọ ya. Ọ kọwara, sị:

“Echere m na Teta! na-enyere mụ aka inweta ike ọhụrụ iji dịrị ndụ, na-eweghachi mmụọ m, na-atọhapụkwa m n’echiche ndị na-akụda mmụọ. Ana m ekele unu maka isiokwu ndị magburu onwe ha banyere ọgụ mmadụ na-alụso ụmụ nje [mbipụta nke February 22, 1996 (Bekee)]. Eji m n’aka na magazin unu na-abara ebe obibi ọ bụla nwere ya uru.” O kwukwasịrị: “Ọ ga-amasị m nke ukwuu inweta Teta! . . . Obi abụọ adịghị ya na magazin unu pụrụ inyere m aka.”

Akwụkwọ ozi yiri nke ahụ, nke e nwetara site na Stavropol, bụ́ obodo ukwu nke ndị bi n’ime ya karịrị otu ụzọ n’ime ụzọ anọ nke otu nde, nke dị ihe karịrị kilomita 1,000 n’akụkụ ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Moscow, na-agụ, sị: “Achọrọ m ịtụ ọda Teta! N’oge na-adịbeghị anya enwetara m abụọ n’ime magazin a. Isiokwu ndị ahụ ghọtara nsogbu ndị mmadụ na-eche ihu. Ụfọdụ kọwara eziokwu ndị bụ ihe ọhụrụ nye m. Nke a bụ mbụ m chọtara nkọwa ziri ezi otú a nke ihe dị iche iche.”

Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị inweta otu Teta! ọzọ ma ọ bụ chọọ ka mmadụ kpọtụrụ gị n’ebe obibi gị iji soro gị kwurịta banyere Bible, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị dị na peji nke 5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya