Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 6/8 p. 3
  • Nwa Aha Ya Bụ Ogbenye

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nwa Aha Ya Bụ Ogbenye
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Ịda Ogbenye Ji Eji
    Teta!—1998
  • Mgbalị Ndị E merela Ka Ịda Ogbenye Kwụsị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • N’isi Nso, Ọ Dịghị Onye Ga-abụ Ogbenye!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Gbasoo Ihe Nlereanya Jizọs Ma Gosi Nchegbu Maka Ndị Ogbenye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 6/8 p. 3

Nwa Aha Ya Bụ Ogbenye

N’OTU obodo nta dị n’Africa, otu nwoke aha ya bụ Okot na nwunye ya, bụ́ Matina, ṅụrịrị ọṅụ mgbe ha mụrụ nwa mbụ ha, bụ́ nwa nwanyị. Ndị ikwu na ndị enyi gara n’obodo ahụ inye ha onyinye na ikwupụta olileanya ha na nwa ahụ ga-ebi ogologo ndụ na nke obi ụtọ.

Di na nwunye ahụ biri ndụ nke ihe isi ike na nke dị ala. Ha kọrọ ugbo n’otu obere ibé ala, ụlọ ha kwa, bụ́ ebe Matina nọ mụọ nwa, bụ ụlọ ájá nke e ji akịrịka mee elu ya. Ha kpebisiri ike ịrụsi ọrụ ike iji mee ka ihe dịrị nwa mbụ ha mfe karịa ka ọ dịịrị ha. Iji na-echetara onwe ha ihe mgbaru ọsọ a, ha gụrụ nwa ha nwanyị Acan, nke pụtara “Adara M Ogbenye.”

Gịnị ka ọdịnihu ga-abụrụ Acan? Ọ bụrụ na ndụ ya adị ka nke ọtụtụ ndị n’obodo ya, o nwere ike ọ gaghị amụta ịgụ na ide ihe ma ọlị. Mgbe o toruru ogo mmadụ, ọ bụrụ na o nwee ike ịchọta ọrụ, o nwere ike ịkpata nanị ihe dị ka $190 kwa afọ. N’obodo ya kwa, afọ ndụ a na-adịru bụ nanị afọ 42.

Ọnọdụ Acan abụghị ọpụrụiche. N’etiti ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ijeri mmadụ 6 bi n’ụwa, ihe dị ka ijeri 1.3 na-akpata ihe na-erughị $370 kwa afọ. Nkezi ya ná mba ndị bara ọgaranya bụ $21,598. Kwa ụbọchị, 67,000 ndị ọzọ na-esonyere ìgwè bara ụba nke ndị dara ogbenye, ihe dị ka nde 25 kwa afọ. Ihe ka ọtụtụ bi ná mba ndị ka na-emepe emepe—n’Africa, Esia, na Latin America. Ma ọbụna ná mba ndị bara ọgaranya, a ga-ahụtụ ịda ogbenye. Mmadụ 7 n’ime 10 dara ogbenye n’ụwa bụkwa ndị inyom.

Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ adịghị agbanarị ogbenye ọnụ ntụ ma ọlị. Ọ na-anapụ ha ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị bụ isi dị ha mkpa—ihe oriri, uwe, na ebe obibi. Ọ pụrụ ịnapụ ha nnwere onwe, ùgwù, mmụta, na ezi ahụ ike. Òtù Ahụ Ike Ụwa na-ekwu, sị: “Ịda ogbenye na-enwe mmetụta na-ebibi ihe n’akụkụ ọ bụla nke ndụ mmadụ, site na mgbe a tụụrụ ime ruo n’ili. Ọ na-eso ọrịa ndị kasị egbu egbu, ndị kasịkwa na-egbu mgbu ewetara ndị nile dara ogbenye ọnọdụ dị njọ.”

Ma ọ̀ bụ na ọnọdụ ibi ndụ ná mba ndị ka na-emepe emepe adịghị aka mma? N’ebe ụfọdụ, ee. N’ọtụtụ ebe ndị ọzọ, ee e. Magazin na-akọ banyere ọganihu ụmụ mmadụ bụ́ Choices na-akọwa echiche ahụ bụ́ na “ndị ogbenye na-agbagote” dị ka ‘echiche ụgha dị ize ndụ.’ Kama nke ahụ, ọ na-ekwu, sị: “Anyị na-ebi n’ezie n’ụwa nke e kewakwuru ekewa n’ụzọ akụ̀ na ụba, ma n’etiti mba na mba ma n’etiti onwe ha.”

Ịda ogbenye ọ̀ ga-anọgide na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti ruo mgbe ebighị ebi? N’isiokwu abụọ na-esochi, Teta! na-enyocha isiokwu a dị mgbagwoju anya ma na-egosi ihe ngwọta ya ga-abụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya