Mgbalị Ndị E merela Ka Ịda Ogbenye Kwụsị
NDỊ ọgaranya akpakọọrọla onwe ha akụ̀. Ma mgbalị ndị a na-eme ka a ghara inwekwa ndị ogbenye n’ụwa anaghị enwe isi. Gịnị kpatara ya? Ọ bụ n’ihi na ndị ọgaranya achọghị ka ha na ndị ọzọ hara. Eze Sọlọmọn nke Izrel oge ochie si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Lee! anya mmiri nke ndị a na-emegbu emegbu, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere; ọ bụkwa ndị na-emegbu ha ka ike dị n’aka.”—Ekliziastis 4:1.
Ndị ọnụ na-eru n’okwu na ndị ọchịchị hà nwere ike ime ka a ghara inwekwa ndị ogbenye n’ụwa? Sọlọmọn dekwara, sị: “Lee! ihe niile bụ ihe efu, bụrụkwa ịchụso ifufe. A pụghị ime ka ihe gbagọrọ agbagọ kwụrụ ọtọ.” (Ekliziastis 1:14, 15) Ọ bụrụ na anyị eleba anya ná mgbalị ndị e merela n’oge a ka a ghara inwekwa ndị ogbenye, anyị ga-ahụ na ihe a Sọlọmọn kwuru bụ eziokwu.
Ihe Ndị A Sị na Ọ Bụ Ha Ga-eme Ka Mmadụ Niile Baa Ọgaranya
N’ihe dị ka narị afọ abụọ gara aga, mgbe mba ole na ole bịara nwee ezigbo ego n’ihi ahịa ha na-azụ na ihe ndị ha na-emepụta, ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n’okwu bịara lebawa anya n’ihe a ga-eme ka a ghara inwekwa ndị ogbenye. Ò nwere otú a ga-esi kee akụ̀ ndị dị n’ụwa otú mba ọ bụla ga na-enweta ihe ibe ya na-enweta?
Ọtụtụ ndị chere na ọ bụ ọchịchị Kọmụnist ga-eme ka mmadụ niile hara. Ihe mere ha ji chee otú a bụ na ọchịchị Kọmụnist na-ekwu na e kwesịrị ike akụnụba obodo ka onye ọ bụla na-enweta otú ibe ya na-enweta. Ime ka mmadụ niile hara adịghị ọtụtụ ndị ọgaranya mma. Ma ọtụtụ ndị chọrọ ka e mee ya n’ihi na ha weere na ọ ga-eme ka onye ọ bụla na-enweta ihe ndị na-akpa ya. Ha chere na ọ bụrụ na mba niile emewe ya, ụwa niile nwere ike ịdị ka paradaịs. Gọọmenti ụfọdụ mba ndị bara ọgaranya malitere ime ụfọdụ n’ime ihe ndị ọchịchị Kọmụnist kwuru ma mee ndokwa imere ụmụ amaala ha ihe niile ha chọrọ, “malite mgbe ha bụ ụmụaka ruo mgbe ha nwụrụ.” Ha kwuru na ihe a ha mere ga-eme ka a ghara inwekwa ndị ogbenye ọnụ ntụ ná mba ha.
Ma ebumnobi ha, nke bụ́ na ụmụ amaala ha ga na-arụrụ obodo ha ọrụ kama ịrụrụ onwe ha, kụrụ afọ n’ala. Ụfọdụ ndị achọghị ka e jiri ihe ha kpatara na-enyere ndị ogbenye aka. Ha kwuru na ụfọdụ ndị ogbenye achọkwaghị ịrụ ọrụ n’ihi ihe ndị a na-enye ha. Ihe a Baịbụl kwuru bụ nnọọ eziokwu: “E nweghị onye ezi omume n’ụwa nke na-eme naanị ezi ihe, nke na-adịghịkwa emehie. . . . Ụmụ mmadụ ziri ezi mgbe ezi Chineke kere ha, ma ha onwe ha echepụtawo ọtụtụ atụmatụ.”—Ekliziastis 7:20, 29.
Ihe ọzọ e chere na ọ bụ ya ga-eme ka a ghara inwekwa ndị ogbenye n’ụwa bụ ihe mba Amerịka bidoro. Ha kwuru na onye ọ bụla dị ike ọrụ ga-enwe ike ịbụ ọgaranya ma ọ rụsie ọrụ ike. Ọtụtụ mba n’ụwa mewere ihe mba Amerịka na-eme, nke bụ́ ikwe ka ndị mmadụ zụọ ahịa otú ha si chọọ, ikwe ka e si mba ndị ọzọ na-atụbata ngwá ahịa, na inwe ọchịchị onye kwuo uche ya. Ha chere na ọ bụ ihe ndị a mere ka mba Amerịka baa ọgaranya. Ma, ọ bụghị mba niile nwere ike ime ihe a mba Amerịka mere n’ihi na ọ bụghị naanị ọchịchị onye kwuo uche ya mere ka ha baa ọgaranya. Ihe ndị ọzọ mere ya bụ na ha nwere ọtụtụ akụ̀ ndị dị n’ala, nweekwa ọtụtụ ebe ha na ndị mba ọzọ nwere ike isi na-azụkọrịta ahịa. Ihe ọzọ mere ka mba ndị ahụ ghara ịba ọgaranya ka mba Amerịka bụ na n’ahịa mba dị iche iche na-azụrịta, mba ọ bụla na-agbalị ịkarị ibe ya. Nke a na-eme ka mba ụfọdụ bakwuo ọgaranya, ndị ọzọ adakwuo ogbenye. Ọ̀ dị ihe e nwere ike ime ka mba ndị bara ọgaranya nyere ndị nke dara ogbenye aka?
Ndị Amerịka Hà Mere Ka A Ghara Inwekwa Ndị Ogbenye?
Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ kwụsịrị, ihe niile ghasasịrị aghasasị n’ọtụtụ mba ndị dị na Yurop, agụụ chọkwara igbusị ndị bi na ha. N’oge ahụ, ọtụtụ mba ndị dị na Yurop chọrọ ịgbanwe ọchịchị ha ka ọ bụrụ ọchịchị Kọmụnist, ma Amerịka achọghị ka ọ dịrị otú ahụ. N’ihi ya, ruo afọ anọ, gọọmenti Amerịka nyere mba ndị ga-eme ihe ha kwuru nnukwute ego ha ga-etinye n’ọrụ ugbo ma jirikwa ya maliteghachi ọrụ n’ụlọ ọrụ ndị e nwere ná mba ha. E weere na ihe ahụ mba Amerịka mere rụpụtara ihe a chọrọ. Mba Amerịka nyekwuuru mba Briten, Frans na mba ndị ọzọ dị na Yurop aka nke na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole bụzi ogbenye ọnụ ntụ ná mba ndị ahụ. Ihe a ọ̀ bụ otú a ga-esi mee ka a ghara inwekwa ndị ogbenye n’ụwa niile?
Ebe ọ bụ na ihe a mba Amerịka meere mba ndị dị na Yurop rụpụtara ihe dị mma, gọọmenti Amerịka kpebiri inyere mba ndị ọzọ dara ogbenye n’ụwa aka. Ha chọrọ inyere ha aka n’ọrụ ugbo, n’ihe banyere ahụ́ ike, n’agụmakwụkwọ nakwa n’ime ka ha nwee ụgbọ njem. Mba Amerịka kwuru hoo haa na ihe mere ha ji enyere ha aka bụ n’ihi uru ha ga-erite na ya. Mba ndị ọzọ bara ọgaranya gbalịkwara inyere mba ndị dara ogbenye aka iji mee ka mba ndị ahụ na-eme ihe ha kwuru. Mgbe afọ iri isii gafere, mba Amerịka emefuola ego karịrị nnọọ nke ha mefuru mgbe ha nyeere mba ndị dị na Yurop aka, ma o nweghị ezigbo ihe ọ rụpụtara. N’eziokwu, e nwere ụfọdụ mba ndị bụ́bu ogbenye, dị ka Chaịna na Japan, ma ugbu a ha abaala nnọọ ọgaranya. Ma, a ka nwekwara ọtụtụ mba ndị dara ogbenye n’agbanyeghị na aka e nyeere ha emeela ka ọtụtụ ụmụaka ndị bi na ha malite ịga akwụkwọ, meekwa ka ọtụtụ ụmụaka ghara ịnwụzi.
Gịnị Mere na Aka E Nyeere Mba Ndị Dara Ogbenye Emebeghị Ka Ịda Ogbenye Kwụsị?
Inyere mba ndị dara ogbenye aka bịara sie ike karịa aka e nyeere mba ndị ahụ agha ụwa nke abụọ kpara aka ọjọọ. Tupu agha ahụ, mba ndị ahụ dị na Yurop enweela ọtụtụ ụlọ ọrụ, nwee ahịa ha na-azụ, ma nwee ụgbọ njem dị iche iche. Naanị ihe dị mkpa bụ inye ha ego ha ga-eji akwalite akụnụba mba ha. Ma ná mba ndị dara ogbenye, a ka nwere ọtụtụ ndị ogbenye ọnụ ntụ n’agbanyeghị na a rụọrọla ha okporo ụzọ, ụlọ akwụkwọ, na ụlọ ọgwụ. Ihe kpatara ya bụ na mba ndị ahụ dara ogbenye enweghị ihe ha ga-eji na-akpata ego, ha enweghị akụ̀ ndị dị n’ala, e nweghịkwa okporo ụzọ ndị ha ga-esi na-ebuga ngwá ahịa ná mba ndị ọzọ.
Ime ka ndị mmadụ ghara ịdakwa ogbenye adịghị mfe n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe na-akpata ya, nweekwa ọtụtụ ihe ọ na-akpata. Dị ka ihe atụ, ọrịa na-eme ka mmadụ daa ogbenye, ịda ogbenye na-akpatakwa ọrịa. Ọ bụrụ na ụmụaka anaghị eri nri na-edozi ahụ́, o nwere ike ime ka ha ghara ịgbasi ike nakwa ka ha ghara ịna-eche echiche nke ọma mgbe ha toro. Nke a ga-eme ka o siere ha ike ilekọta ụmụ nke ha. Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụrụ na mba ndị bara ọgaranya na-ebutere mba ndị dara ogbenye nri karịrị akarị, ọ ga-eme ka o siere ndị ọrụ ugbo nọ ná mba ndị ahụ dara ogbenye ike irepụ obere ihe ndị ha kọpụtara, mee ka ha dakwuo ogbenye. Inye gọọmenti mba ndị dara ogbenye ego nwere ike ịkpata nsogbu ọzọ. Ọ na-adị mfe izu ihe ndị e zitere ka e jiri nyere ndị mmadụ aka, ohi a ha na-ezu nwekwara ike ime ka ọtụtụ ndị ọzọ daa ogbenye. Ihe mere a ka ji nwee ndị ogbenye n’agbanyeghị ihe niile a na-eme bụ na ihe ndị ahụ a na-eme anaghị akwụsị isi ihe na-akpata ịda ogbenye.
Ihe Na-akpata Ịda Ogbenye
Ihe mere e ji nwee ọtụtụ ndị ogbenye ọnụ ntụ bụ na mba dị iche iche, gọọmenti mba dị iche iche, nakwa ọtụtụ mmadụ na-achọ naanị ọdịmma onwe ha. Dị ka ihe atụ, ịkwụsị ịda ogbenye anaghị echu gọọmenti mba ndị bara ọgaranya ụra n’ihi na ihe bụ́ mkpa ha bụ ime ihe ndị tinyere ha n’ọchịchị chọrọ. Ọ bụ nke a mere na ha anaghị ekwe ka ndị ọrụ ugbo si mba ndị dara ogbenye resị mba ndị bara ọgaranya ihe ndị ha kọpụtara, ka ahịa ghara ịsụ ndị ọrụ ugbo nọ ná mba ndị bara ọgaranya. Ihe ọzọkwa bụ na gọọmenti mba ndị bara ọgaranya na-enye ndị ọrụ ugbo nọ ná mba ha ezigbo ego ha ga-etinye n’ọrụ ugbo ka ha nwee ike na-erepụ ahịa ha karịa ndị ọrụ ugbo nọ ná mba ndị dara ogbenye.
Ebe ọ bụ na ndị mmadụ na gọọmenti mba dị iche iche na-achọ naanị ọdịmma onwe ha, o doro anya na ọ bụ ụmụ mmadụ ka ịda ogbenye si n’aka. Sọlọmọn, bụ́ onye so dee Baịbụl, si otú a kwuo ya: ‘Mmadụ achịwo mmadụ ibe ya ọchịchị nchigbu.’—Ekliziastis 8:9.
Ajụjụ bụzi, ò nwere mgbe ndị mmadụ na-agaghị adakwa ogbenye? Ò nwere ọchịchị nwere ike ime ka ndị mmadụ gbanwee otú ha si akpa àgwà?
[Igbe dị na peeji nke 6]
Iwu nke Ga-eme Ka A Ghara Inwe Ndị Ogbenye
Jehova Chineke nyere mba Izrel oge ochie iwu ga-eme ka ha ghara inwe ndị ogbenye ma ọ bụrụ na ha erube isi na ya. Iwu ahụ kwuru ka e kenye ezinụlọ ọ bụla ala, ma e wezụga ebo Livaị, bụ́ ebo ndị nchụàjà. Ala ezinụlọ ọ bụla ketara enweghị ike ịgara ezinụlọ ọzọ n’ihi na e nweghị ike iresị onye ọzọ ala, ya aghọzie nke onye ahụ kpamkpam. Afọ iri ise ọ bụla, ala ọ bụla e rere ere na-alaghachiri onye ma ọ bụ ezinụlọ nwe ya. (Levitikọs 25:10, 23) Ọ bụrụ na ihe isi ike, ọrịa ma ọ bụ umengwụ emee ka mmadụ ree ala ya, n’afọ Jubili, a ga-enyeghachi ya onye ahụ n’anaghị ya ego ọ bula. Nke a ga-eme ka a ghara inwe onye ga-aghọ ogbenye ma bufeere ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya ogbenye.
Ihe ọzọ Chineke kwuru n’Iwu ahụ nke gosiri obiọma ya bụ na ọ bụrụ na ihe esiere mmadụ ike, onye ahụ nwere ike iresị onye ọzọ onwe ya. Ọ ga-ebu ụzọ nata ego o rere onwe ya ma were ya kwụọ ụgwọ ndị o ji tupu ya amalite ịgbara onye o resịrị onwe ya ohu. Ọ bụrụ na ọ gbapụtaghị onwe ya tupu afọ nke asaa ọ malitere ịgba ohu, onye ọ na-agbara ohu ga-ahapụ ya ka ọ lawa ma nye ya mkpụrụ akụ́kụ́ ndị ọ ga-eji malite ịrụ ọrụ ugbo, nyekwa ya anụ ụlọ. Iwu ahụ kwukwara na ọ bụrụ na onye dara ogbenye agaa gbaziri onye Izrel ibe ya ego, onye o bitere ego agaghị ana ya ọmụrụ nwa. Iwu ahụ gwakwara ụmụ Izrel ka ha ghara iwerecha ihe niile dị n’ubi ha mgbe ha na-ewe ihe ubi ka ndị ogbenye hụ ihe ha ga-ewere. Nke a ga-eme ka a ghara inwe onye Izrel nke ga-arịọ arịrịọ.—Diuterọnọmi 15:1-14; Levitikọs 23:22.
Ma, akụkọ ụmụ Izrel gosiri na ụfọdụ n’ime ha dara ogbenye. Gịnị kpatara ya? Ụmụ Izrel erubeghị isi n’Iwu Jehova. Dị ka ọ dị n’ọtụtụ mba ndị ọzọ, ụfọdụ ndị ghọziri ndị aka ji akụ̀ ma nwee ọtụtụ ala, ebe ndị ọzọ ghọrọ ndị ogbenye ndị na-enweghị ala. Ihe mere ụfọdụ ụmụ Izrel ji daa ogbenye bụ na e nwere ndị leghaara Iwu Chineke anya ma na-achọ ọdịmma onwe ha naanị kama ịchọ ọdịmma nke ndị ọzọ.—Matiu 22:37-40.