Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 6/8 p. 8-11
  • Njedebe nke Ịda Ogbenye Dị Nso

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Njedebe nke Ịda Ogbenye Dị Nso
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịda Ogbenye na Iwu Mosis
  • Jisọs Chebaara Ndị Ogbenye Echiche
  • Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Ugbu A
  • Anyị na Ya Agaghị Anọ Ruo Ebighị Ebi
  • Gbasoo Ihe Nlereanya Jizọs Ma Gosi Nchegbu Maka Ndị Ogbenye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • N’isi Nso, Ọ Dịghị Onye Ga-abụ Ogbenye!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ụwa nke Ịda Ogbenye Na-adịghị na Ya Dị Nso
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ndị Ịda Ogbenye Ji Eji
    Teta!—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 6/8 p. 8-11

Njedebe nke Ịda Ogbenye Dị Nso

GỊNỊ ka Jisọs bu n’uche mgbe o kwuru, sị: “Unu nwere ndị ogbenye n’etiti unu mgbe nile”? (Matiu 26:11) Ò bu n’uche na ịda ogbenye ga-adị ruo mgbe ebighị ebi, n’enweghị ihe ngwọta ọ bụla?

Jisọs maara na ọ bụrụhaala na usoro ihe dị ugbu a nke mmadụ na-achị adịgide, a ga-enwe ịda ogbenye. Ọ maara na ụdị ọ bụla nke ọchịchị mmadụ ma ọ bụ usoro akụ̀ na ụba ma ọ bụ nke ọha na eze apụghị iwepụ ya kpam kpam. Ihe ndekọ nke akụkọ ihe mere eme na-akwadokwa nke a.

N’ime ọtụtụ puku afọ nke akụkọ ihe mere eme mmadụ, a nwalewo ụdị gọọmenti ọ bụla na ụdị ọ bụla nke usoro akụ̀ na ụba na nke ọha na eze, ma anyị na ịda ogbenye ka nọ. N’ezie, n’agbanyeghị ọganihu e nwere n’akụkụ ndị dị ka sayensị, ụlọ ọrụ mmepụta ihe, na nkà ọgwụ, eziokwu a na-apụghị ịgbagha agbagha bụ na gburugburu ụwa ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ ịda ogbenye jichiri nọgidere na-arị elu.

Jisọs maara ọtụtụ ihe ndị na-akpata ịda ogbenye nke ọma, dị ka ụnwụ nri, oké ọkọchị, mwakpo nke usuu ndị agha nke ndị iro, gọọmenti ọjọọ, akụ̀ na ụba a na-ejizighị nke ọma, ndị ọgaranya na ndị dị ike imegbu ndị ogbenye na ndị na-adịghị ike, ihe ọghọm na ọrịa, na ọnwụ nke ndị di bụ́ ndị na-ahapụ ụmụ mgbei na ajadu ndị ihe na-esiri ike. Ọzọkwa, ọ maara na ndị mmadụ pụrụ iwetara onwe ha na ezinụlọ ha ịda ogbenye site n’àgwà ọjọọ ndị dị ka umengwụ, ịṅụbiga mmanya ókè, ịgba chaa chaa, na ọgwụ iri ahụ.

Ya mere mgbe Jisọs kwuru na “unu nwere ndị ogbenye n’etiti unu mgbe nile,” ihe o bu n’uche bụ na ọ karịrị òtù ọ bụla nke ụwa a iwepụ ịda ogbenye. O bu n’uche na ọ bụrụhaala na usoro ihe dị ugbu a nke ịchịisi mmadụ dị, a ga-enwe ndị dara ogbenye.

Ọ bụ ezie na nsogbu ịda ogbenye bụ nke sitere n’oge ochie, anyị ekwesịghị ikwubi na Jisọs ma ọ bụ Nna ya nke eluigwe adịghị enwe mmetụta maka ndị ogbenye. Anyị ekwesịghịkwa ikwubi site n’okwu Jisọs na ịda ogbenye adịghị mgbe ọ ga-ejedebe. Nke a na-edo anya site n’ihe Bible na-ekwu banyere okwu ahụ.

Ịda Ogbenye na Iwu Mosis

Dị ka ihe atụ, tụlee Iwu Chineke nyere mba Israel oge ochie site n’aka Mosis. Otu n’ime ihe Iwu ahụ kwuru bụ na e nyere ezinụlọ ọ bụla n’Israel ihe nketa nke ala na Kenean. (Deuterọnọmi 11:8-15; 19:14) Nanị ndị a gụpụrụ bụ ndị Livaị, bụ́ ndị a na-ekenyeghị ókè. Kama nke ahụ, n’ihi ọrụ pụrụ iche ha na-arụ n’ụlọ nsọ, a kwadoro ha site n’ịnata otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe a na-enweta n’ala ahụ.—Ọnụ Ọgụgụ 18:20, 21, 24.

Ọzọkwa, iwu nke ihe nketa n’okpuru Iwu Mosis mere ka e jide n’aka na ala ga-anọgide na-adị n’aka ezinụlọ ma ọ bụ ebo e nyeworo ya. (Ọnụ Ọgụgụ 27:8-11) Ọ bụrụgodị na mmadụ eree ala ya, ọ pụrụ ịbụ nke onye ọhụrụ ahụ nwe ya nanị ruo nwa oge. Ka oge na-aga a ga-eweghachiri ezinụlọ nke onye ahụ rere ya ala ahụ.

Nye ndị ghọrọ ogbenye n’ihi ihe dị iche iche, dị ka ejizighị ala ha nke ọma ma ọ bụ irikpọsị ego ha, Iwu ahụ nyere ikike ịchịkọta ihe oriri n’ubi, ubi mkpụrụ osisi, na n’ubi vine nke ndị ọzọ. (Levitikọs 23:22) Ọzọkwa, onye Israel nọ ná mkpa pụrụ ibiri ego n’akwụghị ọmụrụ nwa. N’ezie, e kwesịrị igosi ndị dara ogbenye mmụọ nke mmesapụ aka.—Ọpụpụ 22:25.

Jisọs Chebaara Ndị Ogbenye Echiche

Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị mgbe Jisọs bịara n’elu ala, ọ nọgidere na-egosi mmụọ nke mmesapụ aka nke ọ mụtaworo n’aka Nna ya, bụ́ Jehova. Jisọs nwere mmasị onwe onye n’ebe ndị na-enweghị ego nọ. Ya na ndị na-eso ụzọ ya nwere ego ha nwekọrọ ọnụ bụ́ ebe ha si enye ndị Israel nọ ná mkpa ihe.—Jọn 12:5-8.

Mgbe e gbusịrị Jisọs, ndị Kraịst gosiri otu ụdị nchegbu ahụ maka ndị ogbenye mgbe ha nyere enyemaka ihe onwunwe karịsịa nye ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ ha bụ́ ndị dara ogbenye karị. (Ndị Rom 15:26) Ezi ndị Kraịst taa na-egosi otu ụdị nchebara echiche ịhụnanya ahụ maka ibe ha.

N’ezie, Bible, ka ọ na-egosi ọmịiko maka ndị ọnọdụ ọjọọ dakwasịrị, na-abara ndị ‘na-eri anụ ahụ onwe ha’ n’ihi umengwụ mba. (Eklisiastis 4:1, 5) Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọghị ịrụ ọrụ, ya gharakwa iri ihe.” (2 Ndị Tesalọnaịka 3:10) N’otu aka ahụ, ndị na-emefusị ego n’àgwà ndị dị ka iri ahụ nke ọgwụ ọjọọ, ụtaba, ma ọ bụ mmanya na-aba n’anya pụrụ ịhụ onwe ha n’ịda ogbenye. Nke a bụ ihe si n’omume ha dị njọ pụta; n’ezie ha ‘na-eweta ihe ha ghara n’ubi.’—Ndị Galetia 6:7.

Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Ugbu A

Bible na-egosi na Chineke na-enwe mmasị pụrụ iche n’ọnọdụ nke ndị na-agbalị ime uche ya. Dị ka ihe atụ, n’Abụ Ọma 37:25, Devid na-ekwu, sị: “Nwata ka m bụworo, aghọwokwa m okenye; ma ahụghị m onye ezi omume ka a hapụrụ ya, ahụghịkwa m mkpụrụ ya ka ha na-arịọ nri.” E kweghị ndị nwere obi ezi omume nkwa akụ̀ na ụba, kama ihe a na-egosi n’ebe a bụ na Chineke ga-ahụ na ha nwere ihe oriri zuru ezu iji dịgide ndụ. Amaokwu nke 28 nke otu abụ ọma ahụ na-ekwukwa, sị: “Jehova na-ahụ ezi ikpe n’anya, ọ dịghị ahapụkwa ndị ebere Ya.”

Jisọs mere ihe karịrị igosi nchegbu maka ndị ogbenye site n’inyere ha aka n’ụzọ ego n’oge o biri ndụ n’elu ala. O mesiri ha obi ike na ọ bụrụhaala na ha na-agbalị ime uche Chineke, Chineke ga-ahụ na ma ọ dịghị ihe ọzọ na a ga-egbo mkpa ha ndị kasị nta, ma ugbu a ma n’ọdịnihu. Jisọs kwuru ihe na-esonụ:

“Leenụ anụ ufe nke eluigwe, na ha adịghị agha mkpụrụ, ha adịghị ewekwa ihe ubi, ha adịghị ekpokọtakwa ihe baa n’ọba; ma Nna unu nke eluigwe na-azụ ha. Ùnu onwe unu abụghị ihe oké ahịa karịa ha? . . . Gịnị mere unu na-echegbukwa onwe unu nye uwe oyiyi? Rịbanụ urodi nke ubi ama, otú ha na-eto eto; ha adọgbughị onwe ha n’ọrụ, ha atụghịkwa ogho: ma asị m unu, na ọbụna Solomọn n’ebube ya nile, e gbokwasịghị ya ákwà dị ka otu n’ime ndị a. Ma ọ bụrụ na Chineke eyikwasị ahịhịa nke ubi uwe otú a, nke dị taa, echi a tụba ya n’ite ọkụ, Ọ̀ gaghị eyikwasị karị unu uwe nke ukwuu, unu ndị okwukwe nta? Ya mere, unu echegbula onwe unu, sị, Gịnị ka anyị ga-eri? ma ọ bụ, Gịnị ka anyị ga-aṅụ? ma ọ bụ, Gịnị ka a ga-eji gbokwasị anyị? . . . N’ihi na Nna unu nke eluigwe na-amata na ihe ndị a nile dị unu mkpa.”—Matiu 6:26-32.

Jisọs kwubiri okwu site n’ịgba ụmụazụ ya ume, sị: “Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya [nke Chineke], na ezi omume Ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.” (Matiu 6:33) Lee agbamume dị mma nke a bụ nye ndị dara ogbenye ma bụrụ ndị na-achọ ime uche Chineke! Rịbakwa ama, na Jisọs gosiri na Alaeze Chineke ga-abụ ihe kasị mkpa ná ndụ nke ụmụazụ ya. Jisọs maara na mgbe Alaeze eluigwe nke Chineke ga-eweghara nchịkwa zuru ezu nke elu ụwa dum, mgbe ahụ—ọ bụkwa nanị mgbe ahụ—ka a ga-ewepụ ịda ogbenye.

Anyị na Ya Agaghị Anọ Ruo Ebighị Ebi

N’ihi ya, Jisọs nyere olileanya dị ebube maka ọdịnihu. Ya mere mgbe ọ sịrị “unu nwere ndị ogbenye n’etiti unu mgbe nile,” ọ na-ezo aka ná ndụ a na-adị n’okpuru usoro ihe dị ugbu a nke ịchịisi mmadụ. Ọ dịghị ezo aka ná ndụ n’ọdịnihu n’okpuru ịchịisi nke Alaeze eluigwe nke Chineke. Bible na-ebu amụma, sị: “Ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echezọ ogbenye, olileanya nke ndị dị umeala n’obi agaghị ala n’iyi ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 9:18) Dịkwa ka Eze nke Alaeze Chineke, Kraịst Jisọs agaghị anabata onye ọ bụla na-agbalị irigbu ndị ọzọ ma ọ bụ imegbu ha.

Jisọs mere ịchịisi nke Alaeze eluigwe Chineke isiokwu bụ isi nke ozizi ya. (Matiu 4:17) N’okpuru ịchịisi Alaeze ahụ, ọnọdụ ndị dị n’ụwa ga-eyi ọnọdụ ndị dị n’eluigwe. Ọ bụ ya mere o ji kụziere ụmụazụ ya ikpegara Chineke ekpere, sị: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.”—Matiu 6:10.

Olee otú nke ahụ ga-esi mee? Ọ bụ nzube Chineke iwepụ usoro ihe nile dị ugbu a nke ịchịisi mmadụ site n’ụwa na iji ịchịisi nke Alaeze eluigwe ya dochie anya ya. Amụma dị na Daniel 2:44 na-ekwu, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a [ndị dị ugbu a], ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ [a gaghị enwekwa ịchịisi mmadụ]; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile [dị ugbu a] mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”

Mgbe ahụ, n’ime ụwa ọhụrụ n’okpuru ịchịisi nke Alaeze Chineke, a ga-eme ka ụwa dum ghọọ paradaịs nke ihe jupụtara na ya, n’enwetụghị ihe àmà nke ịda ogbenye. Rịba ama ụfọdụ amụma Bible banyere ọnọdụ ndị ga-adị n’oge ahụ:

“Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-emere ndị nile dị iche iche . . . oké oriri nke ezi mmanya vine doro edo, nke ihe mara abụba jupụtara n’ụmị.” (Aịsaịa 25:6) “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” (Abụ Ọma 72:16) “Oké mmiri ozuzo nke ngọzi ga-adị. Osisi ọhịa ga-amịkwa mkpụrụ ya, ala ga-emekwa ihe omume ya, ha ga-anọkwa n’elu ala ha ná ntụkwasị obi.” (Ezikiel 34:26, 27) “Ala emewo ihe omume ya: Chineke, bụ́ Chineke anyị, ga-agọzi anyị.” (Abụ Ọma 67:6) “Obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe na-adịghị ga-etegharịkwa egwú ọṅụ, gbawaa okooko ọhịa, dị ka rose.”—Aịsaịa 35:1.

Ọzọkwa, Maịka 4:4 na-ekwe nkwa, sị: “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.” Mmadụ nile ga-enwe ebe obibi nke aka ha: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha . . . Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie.” (Aịsaịa 65:21, 22) Ka a sịkwa ihe mere Jisọs pụrụ iji kwe ndị kweere n’ozizi ya nkwa, sị: “Mụ na [unu] ga-anọ na Paradaịs”!—Luk 23:43.

Ee, Okwu Chineke n’onwe ya sitere n’ike mmụọ nsọ na-akụzi n’ụzọ doro anya na a ga-enwe njedebe kpam kpam nke ịda ogbenye. Oge ahụ dịkwa nso, n’ihi na amụma Bible na-egosi na ụwa a nọ ugbu a na “mgbe ikpeazụ” ya, na-enwe “oge dị oké egwu.” (2 Timoti 3:1-5, 13) N’isi nso a ga-ewepụ usoro ihe dị ugbu a ruo mgbe ebighị ebi, a ga-ewepụkwa ịda ogbenye kpam kpam—ọ bụghị site ná mgbalị ụmụ mmadụ kama site ná ntinye aka nke Chineke. Eze bụ́ Jisọs Kraịst “ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta.”—Abụ Ọma 72:12, 13.

[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

N’ụwa ọhụrụ Chineke, a ga-enwe ezigbo ebe obibi na ihe oriri bara ụba maka mmadụ nile

[Foto dị na peeji nke 10]

N’ime ụwa ọhụrụ, a gaghị enwe ụmụaka agụụ ji ma ọlị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya