Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 6/8 p. 4-7
  • Ndị Ịda Ogbenye Ji Eji

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Ịda Ogbenye Ji Eji
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Agụụ na Erighị Ihe Na-edozi Ahụ
  • Ahụ Esighị Ike
  • Enweghị Ọrụ na Ụgwọ Ọnwa Dị Ala
  • Mbibi nke Gburugburu Ebe Obibi
  • Agụmakwụkwọ
  • Ebe Obibi
  • Ụba Mmadụ
  • Mgbalị Ndị E merela Ka Ịda Ogbenye Kwụsị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Njedebe nke Ịda Ogbenye Dị Nso
    Teta!—1998
  • N’isi Nso, Ọ Dịghị Onye Ga-abụ Ogbenye!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 6/8 p. 4-7

Ndị Ịda Ogbenye Ji Eji

N’AFỌ 33 O.A., Jisọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu nwere ndị ogbenye n’etiti unu mgbe nile.” (Matiu 26:11) Kedụ nnọọ ihe Jisọs bu n’uche? Ọ̀ na-ekwu na ọ dịghị mgbe a ga-emeri ịda ogbenye?

James Speth, bụ́ onye nlekọta nke Usoro Mmepe nke Mba Ndị Dị n’Otu, kwuru, sị: “Anyị apụghị ịnakwere na anyị na [ịda ogbenye] ga-anọ mgbe nile. Ụwa nke oge a nwere ego, amamihe na nkà iji hichapụ ịda ogbenye n’akụkọ ihe mere eme.” Ma ụwa nke oge a ọ̀ pụrụ ikpochapụ ịda ogbenye?

Ihe àmà na-egosi na Nzukọ Ezumezu nke Mba Ndị Dị n’Otu na-ele anya na mgbalị ụmụ mmadụ pụrụ iwepụ ịda ogbenye, ebe ọ kpọsara afọ 1997 ruo 2006 dị ka “Afọ Iri nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka Ikpochapụ Ịda Ogbenye” nke mbụ. Òtù UN zubere isoro gọọmenti, ndị mmadụ, na ụlọ akwụkwọ rụkọọ ọrụ iji kwalite mmepe akụ̀ na ụba, meziwanye ikike inweta ihe ndị dị mkpa, mee ka ọnọdụ ndị inyom ka mma, ma wepụta ego na ọrụ.

Ihe mgbaru ọsọ ndị dị elu! Ma ọ̀ dị mgbe ndị bi n’ụwa pụrụ inweta ha? Tụlee ụfọdụ n’ime ihe mgbochi ndị na-akwụsị mkpochapụ nke ịda ogbenye site ná mgbalị mmadụ.

Agụụ na Erighị Ihe Na-edozi Ahụ

Ayembe, bụ́ onye bi na Zaire, nwere mmadụ 15 nọ n’ezinụlọ ya bụ́ ndị dabeere na ya. Mgbe ụfọdụ ezinụlọ ahụ na-enwe ike rie ihe otu ugboro n’ụbọchị—ọka a gwọrọ agwọ e tinyere akwụkwọ akpụ, nnu, na shuga. Mgbe ụfọdụ ha adịghị enwe ihe ha ga-eri ruo ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ. “Ana m echere ruo mgbe ụmụaka bewere ákwá ihe oriri tupu m sie nri,” ka Ayembe na-ekwu.

Ọnọdụ ha abụghị nke a na-adịghị ahụkarị. Ná mba ndị ka na-emepe emepe, otu onye n’ime mmadụ ise na-ebu agụụ alakpu kwa anyasị. Gburugburu ụwa, ihe dị ka nde mmadụ 800—nde 200 n’ime ha bụ ụmụaka—adịghị nnọọ eri ihe na-edozi ahụ. Ụmụaka ndị a adịghị etolite nke ọma; ha na-ada ọrịa ọtụtụ mgbe. Ha adịghị eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Dị ka ndị toworo eto, ha na-ata ahụhụ ihe ndị na-esi n’ihe ndị a apụta. N’ihi ya, ịda ogbenye na-edugakarị n’erijughị afọ, nke so na-akpata ịda ogbenye n’aka nke ya.

Ịda ogbenye, agụụ, na erighị ihe na-edozi ahụ dị n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu otú a nke na ha na-aghasa mgbalị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, akụ̀ na ụba, na nke ọha na eze na-eme iji wepụ ha. N’ezie, ọnọdụ ahụ adịghị aka mma kama ọ na-aka njọ.

Ahụ Esighị Ike

Dị ka Òtù Ahụ Ike Ụwa si kwuo, ịda ogbenye bụ “ọrịa kasị egbu egbu n’ụwa” na “otu ihe kasị ukwuu na-akpata ọnwụ, ọrịa na nhụjuanya.”

Akwụkwọ bụ́ An Urbanizing World: Global Report on Human Settlements, 1996 kwuru na ma ọ dịkarịa ala nde mmadụ 600 na Latin America, Esia, na Africa na-ebi n’ebe obibi ndị na-adịghị nnọọ mma—n’enweghị mmiri, ịdị ọcha, na usoro ikpofu nsị zuru ezu—nke na a na-eyi ndụ na ahụ ike ha egwu mgbe nile. Gburugburu ụwa, ihe karịrị otu ijeri mmadụ enweghị mmiri dị ọcha. Ọtụtụ narị nde apụghị inweta ihe oriri na-edozi ahụ. Ihe ndị a nile na-eme ka o siere ndị ogbenye ike igbochi ọrịa.

Ọtụtụ mgbe ndị dara ogbenye adịghịkwa enwe ike ịgwọ ọrịa. Mgbe ndị ogbenye dara ọrịa, ha nwere ike ghara inwetali ọgwụ ma ọ bụ ọgwụgwọ kwesịrị ekwesị. Ndị ogbenye na-anwụ na nwata; ndị lanarịrịnụ nwere ike inwe ọrịa ndị na-adịghị ala ala.

Zahida, bụ́ onye na-azụ ahịa na Maldives kwuru, sị: “Ịda ogbenye na-arụpụta nrịanrịa, nke na-egbochi gị ịrụ ọrụ.” N’ezie, enweghị ọrụ na-akpalite ịda ogbenye na-akawanye njọ. Ihe ọ na-arụpụta bụ usoro obi ọjọọ na nke na-egbu egbu ebe ịda ogbenye na nrịanrịa na-akwalite ibe ha.

Enweghị Ọrụ na Ụgwọ Ọnwa Dị Ala

Akụkụ ọzọ nke ịda ogbenye bụ enweghị ọrụ. N’ụwa nile, ihe dị ka nde mmadụ 120 ndị pụrụ ịrụ ọrụ enweghị ike ịchọta ọrụ. Ka ọ dị ugbu a, ihe dị ka nde mmadụ 700 ndị ọzọ na-arụkarị ọrụ ruo ogologo hour maka ụgwọ ọrụ dị oké nta igbo mkpa ha ndị bụ isi.

Rudeen bụ onye na-anya tagzi ọgba tum tum na Cambodia. Ọ na-asị: “Nye m, ịda ogbenye pụtara ịrụ ọrụ ihe karịrị hour 18 kwa ụbọchị, ma ka ghara ịdị na-akpata ihe zuru ezu ịzụ onwe m, nwunye m na ụmụ m abụọ.”

Mbibi nke Gburugburu Ebe Obibi

Ihe e jikọtara ya na ịda ogbenye bụ mmetọ gburugburu ebe obibi. Elsa, bụ́ onye nchọpụta na Guyana, na Ndịda America, kwuru, sị: “Ịda ogbenye bụ mbibi nke ihe okike: oké ọhịa, ala, anụmanụ, osimiri na ọdọ mmiri.” Nke a bụ usoro ọzọ na-eweta ọdachi—ịda ogbenye na-eduga ná mbibi gburugburu ebe obibi nke na-eme ka ịda ogbenye na-amụba amụba na-aga n’ihu.

Ịkọgide ala ruo mgbe ọ na-enwekwaghị ike ime nri ma ọ bụ jiri ya mee ihe ọzọ bụ omume nọteworo aka. Otú ahụ ka ọ dị igbukpọsị oké ọhịa—igbutu oké ọhịa iji nweta osisi ma ọ bụ nkụ ma ọ bụ maka ịkọ ihe. N’ihi ọnụ ọgụgụ na-aba ụba nke ndị mmadụ bi n’ụwa, ọnọdụ ahụ eruwo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị oké njọ.

Dị ka Òtù Mba Nile Maka Nkwalite Ọrụ Ugbo si kwuo, n’ime afọ 30 gara aga, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 20 nke ájá dị n’elu ala ebe a na-akọ ihe nke ụwa adịkwaghị, n’ụzọ ka ukwuu n’ihi ma enweghị ego ma nkà dị mkpa iji mee ihe ndị ga-echekwa ya. N’ime otu oge ahụ, ọtụtụ nde hekta alawo n’iyi n’ihi usoro ịgba mmiri n’ala a na-arụghị nke ọma, nke a na-adịghịkwa elekọta nke ọma. A na-egbutukwa ọtụtụ nde hekta nke oké ọhịa kwa afọ iji sụchaa ala maka ihe ọkụkụ ma ọ bụ iji nweta osisi ma ọ bụ nkụ.

E jikọtara mbibi a na ịda ogbenye n’ụzọ abụọ. Nke mbụ, a na-amanyekarị ndị ogbenye iji gburugburu ebe obibi eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi n’ihi mkpa ha nwere maka ihe oriri na nkụ. Olee otú mmadụ ga-esi na-agwa ndị nọ n’agụụ na ndị ogbenye na ndị a manyere imebi ihe ndị sitere n’okike iji wee dịgide ndụ ugbu a okwu banyere usoro mmepe na-adịghị ebibi ihe ma ọ bụ ọdịmma nke ọgbọ ndị na-abịa n’ihu? Nke abụọ, ndị bara ọgaranya na-ejikarị ihe ndị na-ewetara ogbenye ego na gburugburu ebe obibi ya eme ihe iji nweta uru. Ya mere ndị bara ọgaranya na ndị ogbenye ibibi ihe ndị sitere n’okike na-amụba ịda ogbenye.

Agụmakwụkwọ

Alicia, bụ́ onye ọrụ ebere n’obodo ukwu dị na Philippines, kwuru, sị: “Ịda ogbenye bụ nwanyị izipụ ụmụ ya ịrịọ arịrịọ n’okporo ámá karịa iziga ha n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na ma ọ bụghị ya a gaghị enwe ihe a ga-eri. Nne ahụ maara na ọ na-amaliteghachi otu usoro ahụ jichiri ya, ma ọ dịghị ụzọ mgbapụ dịnụ ọ pụrụ ịhụ.”

Ihe dị ka nde ụmụaka 500 enweghị ụlọ akwụkwọ ha ga-aga. Otu ijeri ndị toworo eto abụchaghị iti. Ọ bụrụ na a gụghị akwụkwọ, ọ na-esi ike inweta ọrụ dị mma. Ya mere ịda ogbenye na-eduga n’agụghị akwụkwọ, nke na-edugakwu n’ịda ogbenye.

Ebe Obibi

E nweghị ebe obibi ná mba ndị dara ogbenye, ọbụnakwa n’ụfọdụ ndị bara ọgaranya. Otu akụkọ na-ekwu na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu nde ndị bi na New York City anọtụwo n’ihe owuwu maka ndị na-enweghị ebe obibi n’ime afọ ise gara aga. Europe kwa nwere ndị dara ogbenye nke ya. Na London e debara aha ihe dị ka 400,000 n’akwụkwọ dị ka ndị na-enweghị ebe obibi. Na France ọkara otu nde mmadụ enweghị ebe obibi.

Na mba nile ndị ka na-emepe emepe, ọnọdụ ahụ ka njọ. Ndị mmadụ na-enuga n’obodo ukwu, n’ịbụ ndị nrọ nke ihe oriri, ọrụ, na ndụ ka mma dọọrọ. N’obodo ukwu ụfọdụ, ihe karịrị pasent 60 nke ndị nọ na ya bi n’ógbè jupụtara ná nkịkara ụlọ ma ọ bụ ndị jubigara ókè. Ịda ogbenye n’ime obodo si otú a na-akpalite ịda ogbenye n’obodo ukwu.

Ụba Mmadụ

Ihe na-eme ka nsogbu a nile ka njọ bụ uto nke ụba mmadụ. Ndị bi n’ụwa amụbawo karịa okpukpu abụọ n’afọ 45 gara aga. Òtù Mba Ndị Dị n’Otu na-eme atụmatụ na ọnụ ọgụgụ ahụ ga-arị ruo ijeri 6.2 ka ọ na-erule afọ 2000 na ijeri 9.8 ka ọ na-erule afọ 2050. Ebe ndị kasị daa ogbenye n’ụwa nwere ọ̀tụ̀tụ̀ uto ụba mmadụ kasịnụ. N’ime ihe dị ka nde ụmụ ọhụrụ 90 a mụrụ na 1995, a mụrụ nde 85 ná mba ndị na-enwechaghị ike inye ha ihe ha chọrọ.

Ì kwere na ihe a kpọrọ mmadụ ga-ejikọ aka na mberede iwepụ ịda ogbenye ruo mgbe ebighị ebi site n’ịgwọta nsogbu nke agụụ, ọrịa, enweghị ọrụ, mbibi nke gburugburu ebe obibi, agụghị akwụkwọ, ebe obibi na-adịghị mma, na agha? Ikekwe i kweghị.

Nke ahụ ọ̀ pụtara na e nweghị olileanya maka ọnọdụ ahụ? Ee e, n’ihi na ngwọta ya dị nso, e jikwa n’aka na ọ ga-abịa. Ma ọ bụghị site ná mgbalị mmadụ. Mgbe ahụ olee otú ọ ga-esi mee? Gịnịkwa banyere okwu Jisọs mgbe o kwuru, sị: “Unu nwere ndị ogbenye n’etiti unu mgbe nile”?

[Igbe dị na peeji nke 7]

Ndị Ogbenye Kasị Daa Ogbenye

Na 1971 Mba Ndị Dị n’Otu chepụtara nkebi okwu ahụ bụ́ “mba ndị kasị ala ná mmepe” iji kọwaa “ndị dakarịsịrị ogbenye na ndị kasị ghara ịdị ike n’ụzọ akụ̀ na ụba n’ime mba ndị ka na-emepe emepe.” Mgbe ahụ, e nwere mba 21 ndị dị otú ahụ. Ugbu a, ha dị 48, 33 dị n’Africa.

[Foto dị na peeji nke 5]

Ọtụtụ nde mmadụ na-arụ ọrụ ruo ogologo hour maka ụgwọ ọrụ dị nta

[Ebe E Si Nweta Foto]

Godo-Foto

[Foto dị na peeji nke 6]

Ndụ okomoko na ịda ogbenye nọ n’akụkụ ibe ha

[Foto dị na peeji nke 7]

Ọtụtụ nde na-ebi n’ebe obibi na-adịchaghị mma

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya