Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 10/1 p. 16
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Ịda Ogbenye Ji Eji
    Teta!—1998
  • Mgbalị Ndị E merela Ka Ịda Ogbenye Kwụsị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Njedebe nke Ịda Ogbenye Dị Nso
    Teta!—1998
  • Ozi Ọma Maka Ndị Ogbenye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 10/1 p. 16

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Ò nwere mgbe mmadụ na-agaghịzi ada ogbenye n’ụwa a?

Ebe otu nwaanyị ji efere nri nri na-adịghị, jidekwa nwatakịrị nwaanyị aka

Olee otú Chineke ga-esi mee ka ndị mmadụ kwụsị ịda ogbenye?​—Matiu 6:9, 10.

N’afọ ọ bụla, ọtụtụ nde ndị ogbenye ọnụ ntụ na-anwụ n’ihi ọrịa na agụụ. Ọ bụ eziokwu na e nwere ebe ụfọdụ n’ụwa anyị a ọtụtụ ndị bara ọgaranya, ma, imirikitimi ndị mmadụ n’ụwa ka bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ. Baịbụl kwuru na e nwere ndị ogbenye kemgbe ụwa.—Gụọ Jọn 12:8.

A ga-enwerịrị otu ọchịchị ga na-achị ụwa niile tupu a gharazie inwe onye dara ogbenye. Ọchịchị ga-eme ya ga-abụrịrị ọchịchị ga-enwe ike ịhụ na akụ̀ ndị dị n’ụwa na-erute ma onye ukwu ma onye nta aka, hụkwa na a kwụsịrị ịlụ agha, bụ́ ihe kacha eme ka ndị mmadụ daa ogbenye. Chineke ekwela nkwa ime ka e nwee ọchịchị ga-eme ihe ndị a n’ụwa.—Gụọ Daniel 2:44.

Ònye ga-emeli ka ndị mmadụ kwụsị ịda ogbenye?

Chineke ahọpụtala Ọkpara ya bụ́ Jizọs ka ọ chịwa ụmụ mmadụ. (Abụ Ọma 2:4-8) Jizọs ga-anapụta ndị ogbenye ma mee ka mmegbu na ime ihe ike kwụsị.—Gụọ Abụ Ọma 72:8, 12-14.

Jizọs, bụ́ “Onyeisi Udo,” ga-eme ka udo dị n’ụwa niile, meekwa ka obi ruo onye ọ bụla ala. Onye ọ bụla nọ́ n’ụwa n’oge ahụ ga-enwe ụlọ nke ya, nwee ọrụ na-eme ya obi ụtọ, nweekwa ọtụtụ ihe oriri.—Gụọ Aịzaya 9:6, 7; 65:21-23.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 8 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya