Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 6/8 p. 14-16
  • Ụzọ Ise Isi Mee Ka Ndụ Ị Na-adị Ka Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Ise Isi Mee Ka Ndụ Ị Na-adị Ka Mma
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nke 1: Kọọ Ubi
  • Nke 2: Zụọ Ihe n’Ọ̀tụ̀tụ̀ Hiri Nne
  • Nke 3: Mụta Nkà nke Ichekwa Ihe Oriri
  • Nke 4: Nwalee Ịkpa Anụ n’Ọ̀tụ̀tụ̀ Dị Nta
  • Nke 5: Nọgide Na-adị Ọcha Otú Kwesịrị Ekwesị
  • Gịnị Mere Ịdị Ọcha Ji Dị Mkpa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ihe Oriri Sitere n’Ubi nke Gị
    Teta!—2003
  • Olee Otú Ị Pụrụ Isi Lekọta Ezinụlọ?
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ihe Ndị Ị Ga Na-eme Ka Ahụ́ Na-adị Gị Mma
    Teta!—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 6/8 p. 14-16

Ụzọ Ise Isi Mee Ka Ndụ Ị Na-adị Ka Mma

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA CENTRAL AFRICAN REPUBLIC

ỊRỊ elu nke ọnụ ahịa, ọrịa, erighị ihe na-edozi ahụ, ịda ogbenye—nsogbu ndị a bụ ihe gbasazuru ebe nile ná mba ndị ka na-emepe emepe. E nweghịkwa ihe ngwọta na-abịa ozugbo n’isi nso, ma ọ dịghị ihe ọzọ site n’ụzọ mmadụ si ele ihe anya. Ọ bụrụ na i bi ná mba ka na-emepe emepe, ọ̀ dị ihe ọ bụla ị pụrụ ime iji mee ka ndụ ị na-adị ka mma? Ee, ọ dị! Ihe ndị na-esonụ bụ aro ise nwere ike inyere gị aka ma dị irè.

Nke 1: Kọọ Ubi

“Onye na-arụ ala ubi ya, afọ ga-eju ya ná nri,” ka Bible na-ekwu n’Ilu 28:19. N’ezie, ọ pụrụ ịtụ gị n’anya ịhụ otú ihe a pụrụ imepụta n’otu obere ibé ala ga-aha. N’akwụkwọ ya bụ́ Le jardin potager sous les tropiques (Ubi Akwụkwọ Nri n’Ebe Okpomọkụ), onye na-ede akwụkwọ bụ́ Henk Waayenberg na-azọrọ na ibé ala dị square mita 50 ruo 100 pụrụ imepụta akwụkwọ nri ga-ezu ịzụ ezinụlọ dị mmadụ isii!

N’ihi gịnị ka ị ga-eji jiri ego gị na-azụrụ ihe ndị ị pụrụ ịkọ n’onwe gị? Na-adabere n’ala na ihu igwe, ọ pụrụ ikwe omume ịkọ ihe ndị dị ka ọkwụrụ, ose, spinach, parsley, achara tii, yabasị, akpụ, anyụ, ji nwannu, okpete, tomato, cucumber, na ọka n’akụkụ ụlọ gị. Ma ọ dịghị nnọọ ihe ọzọ, ubi dị otú ahụ pụrụ ịtụkwasị ihe n’ihe oriri ezinụlọ gị, ị pụkwara ọbụna inwe ihe ụfọdụ mapụtara n’ihe i nwetara n’ubi ndị ị pụrụ ire ere.

Ọ bụrụ na i nwere ala zuru ezu, ị pụkwara ịtụle ịkụ ụdị osisi dịgasị iche iche na-amị mkpụrụ. N’ọnọdụ ụfọdụ, nanị otu osisi pụrụ ịmị mkpụrụ karịrị nke gị na ezinụlọ gị pụrụ iricha. Ịmụ banyere ikpokọba ihe ka o ree ure—usoro nke imegharị ihe ndị nwụrụ anwụ na iji ya mere fatịlaịza—ga-enyere gị aka ịdị na-emepụtakwu nri. Osisi pụrụ ime ihe karịrị ịmịpụta ihe oriri na inye ezinụlọ gị ego. Osisi ndị a kụrụ n’ebe dị mma pụkwara inye ndo, mee ka ikuku dị ọcha, meekwa ka gburugburu ebe obibi gị maa mma ma dị ụtọ karị.

Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ị machaghị banyere ịkọ ubi? Ì nwere ndị enyi, ndị agbata obi, ma ọ bụ ndị ị maara nwere ahụmahụ n’ihe banyere nke a? Mgbe ahụ gịnị ma ị rịọ ha maka enyemaka ma ọ bụ ndụmọdụ? Ọ pụkwara ikwe gị omume ịzụta ma ọ bụ ịgbaziri ụfọdụ akwụkwọ na-ekwu banyere ịkọ ubi.—Lee isiokwu bụ́ “Gịnị Ma Ị Kọọ Ubi Akwụkwọ Nrị?” ná mbipụta Teta! nke May 22, 1974 (Bekee).

Nke 2: Zụọ Ihe n’Ọ̀tụ̀tụ̀ Hiri Nne

Ị̀ na-azụ ihe ndị dị mkpa dị ka ntụ ọka, osikapa, na mmanụ nri n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta? Ọ bụrụ otú ahụ, ị pụrụ ịdị na-emebi akụkụ dị ukwuu nke ego gị. Kama nke ahụ, ọ bụrụ na ọ ga-ekwetụ mee, gbalịa ịdị na-azụ ihe oriri ndị dị otú ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ hiri nne, na-esoro ezinụlọ abụọ, atọ, ma ọ bụ karịa na-ekerịta ego ya. Ịzụ ihe n’ọ̀tụ̀tụ̀ hiri nne pụkwara ime ka ị ghara imefu ego buru ibu mgbe mkpụrụ osisi ma ọ bụ akwụkwọ nri ụfọdụ nọ n’oge ha. N’ọnọdụ ụfọdụ, ị pụrụ ọbụna inwe ike ịzụkọta ihe ọnụ.

Nke 3: Mụta Nkà nke Ichekwa Ihe Oriri

Ịzụ ihe n’ọ̀tụ̀tụ̀ hiri nne na-ewelite okwu banyere ụzọ a pụrụ isi chekwaa ihe ndị na-emebi emebi. Ịmịkpọ ihe oriri bụ otu usoro ime ihe nke a na-emekarị na nke dị irè. Ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị inyom n’Africa na-akpata ego site n’ịmịkpọ mkpụrụ osisi, ọkwụrụ, àgwà, squash, mkpụrụ anyụ, na mkpá akwụkwọ. Ịmịkpọ ihe adịghị achọ ngwá ọrụ pụrụ iche. A pụrụ ịtụkwasị ihe ahụ n’elu ihe dị ọcha ma ọ bụ kowe ya n’elu, ikekwe jiri ákwà dị fere fere kpuchie ya iji gbochie ijiji. Ikuku na anwụ ga-eme nke fọdụrụnụ.—Lee isiokwu bụ́ “Ị̀ Pụrụ Iji Ntakịrị Ego Na-adị Ndụ?” ná mbipụta Teta! nke August 8, 1975 (Bekee)

Nke 4: Nwalee Ịkpa Anụ n’Ọ̀tụ̀tụ̀ Dị Nta

Ọ̀ pụrụ ikwe gị mee ịkpa ọkụkọ, ewu, kpalakwukwu, ma ọ bụ ụmụ anụ ndị ọzọ nke gị? N’ọtụtụ ebe anụ aghọwo ihe okomoko. Ma site n’obere enyemaka nke ndị ọzọ, ị pụrụ ịmụta otú e si akpa ìgwè anụmanụ dị nta. Ọ̀ na-amasị gị iri azụ̀? Ị pụrụ ịnwale ịmụ otú e si arụ ntakịrị iyiala azụ̀. Anụ, àkwá, na azụ̀ nwere iron, calcium, vitamin, mineral, na protein—dị mkpa maka ahụ ike ezinụlọ gị.

Nke 5: Nọgide Na-adị Ọcha Otú Kwesịrị Ekwesị

Ịdị ọcha dịkwa mkpa nye ahụ ike ezinụlọ gị. Ebe ndị na-adịghị ọcha na-akpọta òké, ijiji, na ọchịcha—bụ́ ihe ndị na-akpata ụdị ọrịa dị iche iche. Ịnọgide na-adị ọcha otú kwesịrị ekwesị ga-ewe gị oge na mgbalị. Ma ihe ịdị ọcha na-ewe dị ala karịa ihe ọgwụ na ụgwọ a na-akwụ dọkịta na-ewe. Ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị ọcha pụrụ ịdị iche ruo n’ókè ụfọdụ n’ebe onye nke ọ bụla nọ na ná mba ọ bụla. Otú ọ dị, e nwere ụkpụrụ ole na ole zuru ọnụ ndị a ga-etinye n’ọrụ n’ebe nile.

Were dị ka ihe atụ, ụlọ mposi. N’ime ime obodo a na-ahapụkarị ihe ndị a ka ha ruo unyi ma dị mkpakara, bụrụkwa ebe bụ isi e si enweta nrịanrịa na ọrịa. Ndị ọrụ ahụ ike nke obodo pụrụ inwe ike inye gị ntụziaka banyere ụzọ isi wuo ụlọ mposi dị ọcha n’ọnụ ego dị ala.

Gịnị banyere ebe obibi gị n’onwe ya? Ọ̀ dị ọcha, dịkwa ezigbo mma n’anya? Ọ̀ na-esi ísì ihe dị ọcha? Gịnị banyere kichin gị? Ọ̀ bụ nke a kpakọrọ ọnụ ma dị ọcha? Iji nwee ahụ ike, ihe oriri aghaghị ịdị ọcha ma bụrụ nke e siri nke ọma. Nje na-ejupụta na mmiri e metọrọ emetọ. N’ihi ya zaa mmiri azaa ma ọ bụ sie ya n’ọkụ tupu iji ya eme ihe. Jiri mmiri gbọrọ agbọ ṅachaa arịa ndị e ji eri nri, kwọọkwa aka gị nke ọma tupu i bitụ ihe oriri aka. Debe mmiri n’arịa ndị dị ọcha, e kwuchiri ekwuchi.

E kwesịghị ịhapụ nkịta, nwamba, ọkụkọ, na ewu ka ha na-agagharị n’ime kichin—ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịnọgide na-edebe ihe ọcha. E kwesịghịkwa ikwe ka òké si n’elu ite na efere na-agbafe, na-emetọ ihe oriri gị. Ọnyà òké dị mfe pụrụ ịgwọta nsogbu ahụ.—Lee “Imeri Ihe Ịma Aka nke Ịdị Ọcha,” dị ná mbipụta Teta! nke February 8, 1990.

Mee elu mee ala, nanị Alaeze Chineke ga-agwọta nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ zuru ezu. (Matiu 6:9, 10) Otú ọ dị, ka ọ dị ugbu a, aro ndị a dị mfe pụrụ inyere gị aka ime ka ndụ ị na-adị ka mma.

[Foto ndị dị na peeji nke 14]

Kọọ ubi

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Zụọ ihe n’ọ̀tụ̀tụ̀ hiri nne

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Mụta nkà nke ichekwa ihe oriri

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Nwalee ịkpa anụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Nọgide na-adị ọcha otú kwesịrị ekwesị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya