Teta!—“Ngwá Ọrụ Bara Oké Uru, nke Dịkwa Oké Mkpa”
“UNU EMEELA maka isiokwu unu bụ́ ‘RSD—Ọrịa Siri Ike Nghọta, nke Na-egbu Mgbu,’ dị ná mbipụta nke September 8, 1997 (Bekee). Dị ka onye ndekọ ihe n’ụlọikpe, a na-akpọkarị m idetu akaebe a gbara n’ọtụtụ esemokwu dịgasị iche iche, na-agbagwojukwa anya. N’oge na-adịbeghị anya, akọrọ m banyere akaebe nke otu dibịa na-ahụ maka ịkụnwụ ahụ nke bụ ọkachamara n’ịchịkwa ihe mgbu. Isiokwu bụ́ isi n’akaebe ahụ bụ RSD [Ọrịa Oké Ahụ Mgbu]. N’ihi ịgụ Teta! mgbe nile, n’egbughị oge amatara m okwu ahụ na usoro ọgwụgwọ ya, bụ́ ndị a kọwara n’ụzọ doro anya ná mbipụta nke September ahụ. Mgbe e mesịrị enwere m ike isoro ụfọdụ n’ime ndị ọkàiwu so n’ikpe ahụ kerịta isiokwu a.
“M na-ewere Teta! ịbụ ngwá ọrụ bara oké uru, nke dịkwa oké mkpa n’agụmakwụkwọ m na-aga n’ihu. Ọ na-eme ka m mara banyere ọtụtụ isiokwu.—G. M. A.”
Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu Teta! ọhụrụ, nke a na-ebipụta ugbu a n’asụsụ 81, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu ma ọ bụ dega akwụkwọ n’adres kasị gị nso e gosipụtara na peji nke 5.