Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 7/8 p. 31
  • Mgbe Ọnwụ Pụtara Ọnwụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Ọnwụ Pụtara Ọnwụ
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Na-eme Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ?
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Ì Kwesịrị Ịtụ Ndị Nwụrụ Anwụ Ụjọ?
    Teta!—2009
  • Gosipụta Okwukwe maka Ndụ Ebighị Ebi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Olileanya Dị Aṅaa Dịịrị Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ?
    Olileanya Dị Aṅaa Dịịrị Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 7/8 p. 31

Mgbe Ọnwụ Pụtara Ọnwụ

“Ọ dịịrị nkịta dị ndụ mma karịa ọdụm nwụrụ anwụ. N’ihi na ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ ha nwere ọzọ; n’ihi na e chezọwo ncheta ha.”—Eklisiastis 9:4, 5.

ỌTỤTỤ ndị nwere nkwenkwe na-edoghị anya banyere mkpụrụ obi ịdịgide ndụ mgbe a nwụsịrị ma ọ bụ na-alọ ụwa ọtụtụ ugboro. Ụfọdụ kwenyedịrị na mmadụ pụrụ ịdịghachị ndụ ọzọ mgbe ọ nwụsịrị. Na nso nso a, a jụrụ Thomas Lynch, bụ́ onye ndozi ozu, echiche ya banyere okwu ịdị ndụ mgbe a nwụsịrị. O kwuru, sị: “Ndị ahụ na-amụ anya na-arọ nrọ etetaghị n’ọnwụ—ọ bụ nanị na ikike anyị erughị ịtụ ihe ndị na-agba ama na ha dị ndụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. N’ihi na ‘ị nwụọla’ mgbe ị na-alọghachiteghị.”—The New York Times Magazine.

Bible ekwuwo eziokwu banyere ya kemgbe ọtụtụ narị afọ iri. “Ọ dịịrị nkịta dị ndụ mma karịa ọdụm nwụrụ anwụ. N’ihi na ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ ha nwere ọzọ; n’ihi na e chezọwo ncheta ha.” (Eklisiastis 9:4, 5) Nleta dị mkpirikpi n’ebe ọ bụla a na-eli ozu n’oge ochie ga-akwado eziokwu ahụ ngwa ngwa.

Nke ahụ ọ̀ pụtara na ọ dịtụdịghị olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ? N’ezie Bible adịghị enye ihe ndabere maka ikwenye ná mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke na-adịgide ndụ mgbe a nwụsịrị. (Jenesis 2:7; Ezikiel 18:4, 20) Otú ọ dị, Jisọs Kraịst kwusara banyere mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ n’ụwa paradaịs e weghachiri eweghachi. Onye Juu na-eso ụzọ ya bụ́ Mata, onye nwanne ya nwoke, bụ́ Lazarọs, nwụrụ n’oge na-adịbeghị anya, kwere ná mbilite n’ọnwụ, n’ihi na o kwuru banyere Lazarọs, sị: “Amatara m na ọ ga-esi n’ọnwụ bilie ná mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” (Jọn 11:24) Maka nke a, Jisọs zara, sị: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na Mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ: ọzọ, onye ọ bụla nke na-adị ndụ, nke na-ekwerekwa na Mụ, ọ gaghị anwụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi. Ì kwere nke a?” (Jọn 11:25, 26) Tupu mgbe ahụ, o kwuwo, sị: “Ka ihe a ghara iju unu anya: n’ihi na oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa; ndị mere ezi ihe ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ndụ; ma ndị mere ihe na-adịghị mma ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” Ma rịba ama, Jisọs ekwughị banyere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ!—Jọn 5:28, 29; Luk 23:43.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 31]

“N’ihi na ‘ị nwụọla’ mgbe ị na-alọghachiteghị.”—Thomas Lynch, bụ́ onye ndozi ozu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya