Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 8/8 p. 31
  • Kpachara Anya n’Ịhọrọ Ntụrụndụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kpachara Anya n’Ịhọrọ Ntụrụndụ
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Anyị Ga-esi Na-ahọrọ Ntụrụndụ Dị Mma
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Ị Pụrụ Inweta Ntụrụndụ Dị Mma
    Teta!—1997
  • Jiri Ihe Ga-amasị Jehova Na-eme Onwe Gị Obi Ụtọ
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Lezie Anya Mgbe Ị Na-ahọrọ Ihe Ndị I Ji Atụrụ Ndụ
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 8/8 p. 31

Kpachara Anya n’Ịhọrọ Ntụrụndụ

Mmetụta dị aṅaa ka ntụrụndụ na-enwe n’ahụ ụmụaka? Alvin Poussaint, bụ́ onye ọkà nkụzi na dọkịta nke rụworo ọrụ n’etiti ụmụaka ruo ihe dị ka afọ 30, kwenyesiri ike na ile ihe nkiri ndị na-egosi mmekọahụ na ime ihe ike na-akụziri ndị ntorobịa na akparamàgwà dị otú ahụ dị otú o kwesịrị. Ọ na-akọwapụtakwa ihe ize ndụ ọzọ: “Ahụwo m ka ụmụaka si n’ile ihe nkiri sịnịma ndị dị otú ahụ lọta wee ghọọ ndị na-atụ ụjọ—ma ọ bụ ndị na-ese okwu nke ukwuu. Ahụwo m ndị ọzọ ka ha laghachiri azụ n’ịrapara mmadụ n’ahụ ma ọ bụ ịmị mkpịsị aka ma ọ bụ ịnyụ mamịrị n’àkwà.” Dị ka dọkịta a si kwuo, ndị ọkachamara edetuwo ihe omume ndị ọzọ pụrụ ịkpata ụdị akparamàgwà ndị ahụ—iti ihe ma ọ bụ mmetọ n’ụzọ mmekọahụ ma ọ bụ ibi n’ógbè a na-alụ agha, ka anyị kpọọ nanị ole na ole. “Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị ga-ama ụma tinye nwatakịrị n’ọnọdụ ndị ahụ,” ka ọ na-akọwa, “ma anyị adịghị egbochi ha ile ihe nkiri sịnịma ndị na-egosi ihe ndị ga-atụ anyị ụjọ ikwe ka ha kirie n’ìhè.”

Ndị Kraịst nwere ezi ihe mere ha ga-eji na-eme nhọrọ ma jide n’aka na ntụrụndụ ha na-ahọrọ adịghị emebi ụkpụrụ Bible. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 11:5 na-ekwu, sị: “Jehova na-anwa onye ezi omume: ma onye na-emebi iwu na onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi Ya na-akpọ asị.” Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dekwara, sị: “Ya mere, meenụ ka ihe nile dị unu n’ahụ nke dị n’elu ụwa nwụọ; ịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ihe ọjọọ, na anyaukwu . . . Tụpụkwanụ ihe ndị a nile; bụ́ iwe, ọnụma, obi ọjọọ, nkwulu, ikwu okwu ihere na-esi n’ọnụ unu pụta.”—Ndị Kọlọsi 3:5, 8.

N’ihi ya, ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ilezi anya na ntụrụndụ ha na-ahọtara ụmụ ha—na onwe ha—adịghị akwalite “ọrụ nile nke anụ ahụ.” (Ndị Galetia 5:19-21) Ha kwesịrị ịdị na-eme nhọrọ, na-atụle ma ọdịdị ma otú ntụrụndụ ha haruru.—Ndị Efesọs 5:15-17.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya