Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 12/8 p. 3
  • Ònye Bụ Jisọs Kraịst?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Bụ Jisọs Kraịst?
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú Jisọs Dị n’Ile Anya?
    Teta!—1998
  • Olee Otú Jizọs Dị n’Eziokwu?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Olee Otú Jizọs Dị?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 12/8 p. 3

Ònye Bụ Jisọs Kraịst?

N’ọtụtụ ala n’ụwa nile, a na-eme ememe Krismas n’oge a n’afọ. Ọtụtụ narị nde mmadụ kwenyere na a mụrụ Jisọs Kraịst na December 25 n’ihe dị ka afọ 2,000 gara aga. N’ihe osise na n’ihe ndị a kpụrụ akpụ, a na-egosi ya n’ụzọ dị iche iche dị ka nwa ọhụrụ dina n’ime ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri. Ma, n’ezie, o toro ghọọ dimkpa ma bie ndụ n’elu ụwa ruo afọ 33 1/2.

Ì CHETỤWO echiche banyere ọdịdị elu ahụ Jisọs mgbe ọ bụ dimkpa? Gịnị bụ ụcha akpụkpọ ahụ ya? Ọ̀ gbara agba ma maa mma, ka ọ̀ bụ onye na-adịghị ike ma yitetụ onye na-arịa ọrịa, dị ka ndị dị iche iche na-ese ihe seworo ya kemgbe ọtụtụ narị afọ? Ò nwere afụ ọnụ ka ọ̀ bụ na o nweghị? Ò nwere ogologo ntutu?

Ọzọkwa, Jisọs ò nwere ìhè na-egosipụta ịdị nsọ, dị ka ìhè dị gburugburu n’isi ya dị ka ụfọdụ ndị na-ese ihe seworo? Ka ihe bụ eziokwu ọ̀ dị iche—na o nweghị ihe ndị dị otú ahụ mere ka ọ dị iche kama na ọ pụrụ isoro ìgwè mmadụ kpakọrịta?

Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị na-ese ihe bụ́ ndị ụwa enyewo echiche ndị na-emegiderịta ibe ha banyere ọdịdị Jisọs kemgbe ọtụtụ narị afọ. Tụkwasị na nke a, e nwewo ihe ọmụma ndị a pụrụ ịdabere na ha n’akụkọ nke ndị hụrụ ya n’onwe ha deturu, bụ́ nke ndị so dee Bible ndị biri ndụ na narị afọ mbụ, ndị ha na ya kpakọrịtakwara.

Otú ọ dị, ajụjụ ndị na-esonụ dị mkpa karịa otú ọ dị n’ile anya: Ònye n’ezie bụ Jisọs Kraịst? Olee òkè ọ na-ekere ná nzube Chineke? Ò mezuwo òkè ahụ? Gịnị ka ọ bụ taa, ebeekwa ka ọ nọ? Ò nwere ọkwá dị oké mkpa nke na ọ ga-emetụta ihe nile a kpọrọ mmadụ, ọbụna ọtụtụ ndị nwụworonụ?

Nke mbụ, ka anyị nyochaa ihe àmà e nwere banyere ọdịdị elu ahụ Jisọs. Ọ̀ dị aṅaa n’ile anya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya