Olee Otú Jisọs Dị n’Ile Anya?
ỌTỤTỤ ihe na-emetụta ihe àmà sitere n’akụkọ ihe mere eme ụwa banyere otú Jisọs dị n’ile anya n’ụzọ siri ike. Ọ bụ ihe ndị a kpatara nnukwute ọdịiche ndị e nwere n’otú e siworo see ya n’ihe osise.
Ihe abụọ kpatara ya bụ ọdịbendị mba na oge e sere ihe ahụ. Tụkwasị na nke a, nkwenkwe okpukpe nke ndị na-ese ihe na nke ndị nyere ikike ka e see ha nwere mmetụta n’otú e si see Jisọs.
Eri ọtụtụ narị afọ, ndị a ma ama n’ise ihe, dị ka Michelangelo, Rembrandt, na Rubens, lekwasịrị nnọọ anya n’ise ọdịdị elu ahụ Kraịst. N’ịbụ nke jupụtara ọtụtụ mgbe n’ihe atụ na ihe omimi, ọrụ ha enwewo mmetụta dị ukwuu n’echiche e nwere n’ọha banyere otú Jisọs dị n’ile anya. Ma, na gịnị ka nkọwa ha gbadoro ụkwụ?
Ihe Akụkọ Ihe Mere Eme Ụwa Na-ekwu
Ọrụ nkà ndị dị laa azụ tupu oge Eze Ukwu Constantine nke Rom, bụ́ onye biri ndụ malite n’ihe dị ka na 280 ruo 337 O.A., gosiri Jisọs ọtụtụ mgbe dị ka nwa okorobịa bụ́ “Ezi Onye Ọzụzụ Atụrụ” nke nwere ntutu a kpụtulatara akpụtulata ma ọ bụ ntutu dị ogologo, nke hịkọrọ ahịkọ. Ma banyere nke a akwụkwọ bụ́ Art Through the Ages na-ekwu, sị: “Ihe osise nke Ezi Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ dị laa azụ n’ihe osise Oge Ochie nke Ndị Gris [na-ekpere arụsị] ruo na nke ndị Ijipt, ma n’ebe a ọ ghọrọ ihe nnọchiteanya nke onye nchebe na-eguzosi ike n’ihe nke ìgwè atụrụ ndị Kraịst.”
Ka oge na-aga, mmetụta a nke ikpere arụsị pụtawanyere ìhè. Akwụkwọ ahụ na-ekwukwasị na “n’ụzọ dị mfe, a pụrụ iwere Jisọs na chi ndị a maara nke ọma na gburugburu Mediterranean dị ka otu ihe ahụ, karịsịa Helios (Apollo), bụ́ chi anyanwụ [onye e mesịrị were ìhè di gburugburu isi ya nye Jisọs, mesịakwa nye ndị “senti”], ma ọ bụ ogbo ya nke ebe ọwụwa anyanwụ e mere ka ọ ghọọ nke Rom, bụ́ Sol Invictus (Anyanwụ A Na-emerighị Emeri).” N’otu nnukwute ili a chọpụtara n’okpuru St. Peter’s dị na Rom, e sere Jisọs n’ezie dị ka Apollo “ji ịnyịnya nke ụgbọ ịnyịnya anyanwụ na-agafere n’eluigwe.”
Otú ọ dị, ụdị nke a bụ́ onye ntorobịa karị anọteghị aka. Adolphe Didron, n’akwụkwọ ya bụ́ Christian Iconography, na-ekwu ihe merenụ: “Ihe osise Kraịst, nke a na-esebu dị ka onye ntorobịa, na-emewanye okenye site n’otu narị afọ ruo n’ọzọ . . . ka Iso Ụzọ Kraịst na-emewanye okenye n’onwe ya.”
Otu ihe odide e dere na narị afọ nke 13, nke e dere dị ka a ga-asị na ọ bụ akwụkwọ ozi nke otu onye a kpọrọ Publius Lentulus degaara Òtù Kansụl Kasị Elu nke Rom kọwara ọdịdị elu ahụ Jisọs, na-ekwu na o nwere “ntutu na-achatatụ nchara nchara, nke dịkwa yọrị yọrị ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ná ntị ya, ma hịkọọ ahịkọọ, dịtụkwa ojii karị ma na-egbuke egbuke karị malite ná ntị ya gbadaa na-emetụ n’ubu ya; bụrụ nke a kpọwara n’etiti isi . . . , ya enwee afụ ọnụ juru eju nke na-acha ka ntutu ya, o toghị ogologo, kama o kewara ụzọ abụọ n’àgbà ya; . . . anya ya na-acha ntụ ntụ . . . ma na-enwupụ enwupụ.” Nkọwa a na-ezighị ezi mesịrị nwee mmetụta n’ahụ ọtụtụ ndị na-ese ihe. “Oge nke ọ bụla,” ka New Catholic Encyclopedia na-ekwu, “chepụtara ụdị Kraịst ọ chọrọ.”
Ihe bụ eziokwu banyere oge nke ọ bụla bụkwa eziokwu banyere agbụrụ na okpukpe dị iche iche. Ihe osise okpukpe ndị sitere n’ebe e nwere ndị ozi ala ọzọ n’Africa, kọntinent ndị dị n’America, na Esia na-egosi Kraịst nwere ogologo ntutu nke Ebe Ọdịda Anyanwụ; ma mgbe ụfọdụ a gbakwụnyewo “ihe e ji mara ndị obodo” n’ọdịdị elu ahụ ya, ka akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ na-ekwu.
Ndị Protestant enwewokwa ndị na-ese ihe nke ha, ndị a kọwakwara ọdịdị elu ahụ Kraịst n’ụzọ nke ha. F. M. Godfrey, na-ekwu n’akwụkwọ ya bụ́ Christ and the Apostles—The Changing Forms of Religious Imagery, sị: “Kraịst ahụ gbarụrụ ihu nke Rembrandt sere bụ ihe sitere n’echiche ndị Protestant, nke onye na-eru újú, nke tara ahụ, nke ihu na-adịghị atọ ọchị, . . . onyinyo nke onye Protestant nọ na-eche echiche banyere onwe ya, nke na-anapụ onwe ya ihe.” Nke a na-apụta ìhè, ka ọ na-ekwu, ‘n’ịdị tịga tịga nke ahụ Ya, ịnapụ anụ ahụ ihe ụtọ, “ịdị nwayọọ n’obi, ịdị imere ebere na ime nsọ nsọ” nke bụ́ otú [Rembrandt] si ghọta nkweta ndị Kraịst.’
Otú ọ dị, dị ka anyị ga-ahụ ugbu a, Kraịst ahụ na-enweghị ume, nke ìhè dị gburugburu n’isi ya, nke na-agbaghị dimkpa, nke nwere ihu gbarụrụ agbarụ, nke nwere ogologo ntutu, bụ́ nke na-apụtakarị n’ihe osise nke Krisendọm, ezighị ezi. N’ezie, ọ dị nnọọ iche na Jisọs e kwuru maka ya na Bible.
Bible na Ọdịdị Jisọs
Dị ka “Nwa atụrụ Chineke,” Jisọs enweghị nkwarụ ọ bụla, ya mere ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ nwoke mara mma. (Jọn 1:29; Ndị Hibru 7:26) N’ezie, ọ gaghịkwa enweworị ihu ahụ gbarụrụ agbarụ nke ihe osise ndị a ma ama na-esenyere ya mgbe nile. N’eziokwu, o nwetara ọtụtụ ihe na-akpata obi erughị ala ná ndụ ya, ma o ṅomiri Nna ya, bụ́ “Chineke obi ụtọ” n’ụzọ zuru okè n’otú obi dị ya mgbe nile.—1 Timoti 1:11, NW; Luk 10:21; Ndị Hibru 1:3.
Ntutu Jisọs ò toro ogologo? Ọ bụ nanị ndị Naziraịt bụ ndị na-agaghị akpụ isi ha ma ọ bụ ṅụọ mmanya, Jisọs abụghịkwa onye Naziraịt. Ya mere obi abụọ adịghị ya na ọ kpụrụ isi ya nke ọma dị ka nwoke ọ bụla ọzọ bụ́ onye Juu. (Ọnụ Ọgụgụ 6:2-7) Ọ ṅụkwara mmanya ruo n’ókè kwesịrị ekwesị mgbe ya na ndị ọzọ nọ, nke a na-emesikwa echiche bụ na ọ bụghị onye ihu na-adịghị atọ ọchị ike. (Luk 7:34) N’ezie, o mere mmanya site n’ịrụ otu ọrụ ebube n’otu oriri agbamakwụkwọ e nwere na Kena nke Galili. (Jọn 2:1-11) Dị ka ihe àmà gosikwara, o nwere afụ ọnụ, bụ́ nke a gbara akaebe ya n’otu amụma banyere ịta ahụhụ ya.—Aịsaịa 50:6.
Gịnị banyere ụcha akpụkpọ ahụ Jisọs na ọdịdị ya? O yiri ka ha dị ka nke ụmụ Shem. Ọ ghaghị iketaworị ọdịdị ndị a site n’aka nne ya, bụ́ Meri, bụ́ onye Juu. Ndị nna nna ya bụ ndị Juu, n’usoro ọmụmụ ndị Hibru. Ya mere ma eleghị anya ọ ga-abụ na Jisọs nwere ụcha akpụkpọ ahụ na ọdịdị nke ndị Juu na-enwekarị.
Ọbụna n’etiti ndị ozi ya, o doro anya na Jisọs adịghị nnọọ iche n’anụ ahụ, n’ihi na Judas aghaghị iji nsutu ọnụ ga-eme ka a mata onye ọ bụ rara ya nye n’aka ndị iro ya. Ya mere, Jisọs pụrụ iso ìgwè mmadụ kpakọrịta n’enweghị nsogbu ọ bụla. O mekwara otú ahụ, n’ihi na ma ọ dịghị ihe ọzọ n’otu oge, o mere njem si Galili gaa Jerusalem n’enweghị onye matara ya.—Mak 14:44; Jọn 7:10, 11.
Otú ọ dị, ụfọdụ na-ekwubi na Jisọs aghaghị ịbụworị onye na-enweghị ume. Gịnị mere ha ji na-ekwu nke a? Otu ihe bụ na e nyeere ya aka iburu osisi ịta ahụhụ ya. Ọzọkwa, ọ bụ onye mbụ nwụrụ n’ime ndị ikom atọ ahụ a kpọgburu.—Luk 23:26; Jọn 19:17, 32, 33.
Jisọs Abụghị Onye Na-enweghị Ume
N’ụzọ dị iche n’echiche e nwere, Bible adịghị akọwa Jisọs dị ka onye na-enweghị ume ma ọ bụ onye na-agbaghị agba. Kama nke ahụ, ọ na-ekwu na ọbụna mgbe ọ bụ onye ntorobịa, ọ “na-aga n’ihu n’amamihe na ogologo, na-agakwa n’amara n’ebe Chineke na mmadụ nọ.” (Luk 2:52) Ruo ihe karịrị ọkara nke afọ 30, ọ bụ onye ọkwa nkà. Nke ahụ eyighị ka ọ bụ ọrụ nke onye na-enweghị ume ma ọ bụ onye na-agbaghị agba ga-arụ, karịsịa n’oge ahụ, mgbe a na-enweghị ígwè ọrụ ọgbara ọhụrụ, ndị na-ebelata ndọlị. (Mak 6:3) Ọzọkwa, Jisọs chụpụrụ ehi, atụrụ, na ndị na-agbanwe ego n’ụlọukwu ahụ, ma kpuo tebụl nke ndị ahụ na-agbanwe ego ihu. (Jọn 2:14, 15) Nke a kwa na-enye echiche nke onye bụ dimkpa, nke nwere ike ọkpụkpụ aka.
N’ime afọ atọ na ọkara ikpeazụ nke ndụ ya n’elu ala, Jisọs ji ụkwụ gaa ọtụtụ narị kilomita na njem ime nkwusa ya. Ma, ndị na-eso ụzọ ya adịghị mgbe ha kwutetụrụ na o “zuru ike nke nta.” Kama nke ahụ, Jisọs sịrị ha, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ọkụ azụ̀ siri ike: “Unu onwe unu bịa iche n’ebe bụ́ ọhịa, ka unu zuru ike nke nta.”—Mak 6:31.
N’ezie, “ihe ndekọ nile nke oziọma ahụ,” ka Cyclopædia nke M’Clintock na Strong dere na-ekwu, “na-egosi [na Jisọs nwere] ahụ ike bụ ịgba.” Ya bụrụ otú ahụ, gịnị mere o ji dị mkpa ka e nyere ya aka iburu osisi ịta ahụhụ ya, n’ihi gịnịkwa ka o ji buru ndị ọzọ a kpọgbukọtara ya na ha ụzọ nwụọ?
Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ kpatara ya bụ oké obi erughị ala. Ka oge a ga-eji gbuo Jisọs na-eru nso, ọ sịrị: “Ma enwere m baptism a ga-eji mee m baptism; ọ na-egbukwa m mgbu n’obi nke ukwuu ruo mgbe a ga-emezu ya.” (Luk 12:50) Obi erughị ala a kara njọ wee ghọọ ‘ihe igbu mgbu n’obi’ n’abalị ikpeazụ ya: “Ebe ọ na-egbu Ya mgbu n’obi hie nne O kpee ekpere sie ike karịa: ọsụsọ Ya wee ghọọ ihe dị ka oké ọkpụrụkpụ ọbara na-ada n’ala.” (Luk 22:44) Jisọs maara na olileanya nke ihe a kpọrọ mmadụ ịdị ndụ ebighị ebi dabeere n’iguzosi ike n’ezi ihe ya ruo ọnwụ. Lee oké ibu arọ ọ bụ! (Matiu 20:18, 19, 28) Ọ makwaara na ndị nke Chineke ga-egbu ya dị ka onye omekome ‘a bụrụ ọnụ.’ N’ihi ya, o nwere nchegbu na nke a pụrụ iwetara Nna ya nkọcha.—Ndị Galetia 3:13; Abụ Ọma 40:6, 7; Ọrụ 8:32.
Mgbe a rarasịịrị ya nye, e mekpọrọ ya ọnụ nke ukwuu. N’ikpe mmezu iwu e kpegidere ya ruo ndeeri, ndị kasị gbagote n’ọkwá n’ala ahụ kwara ya emo, gbụọ ya asọ mmiri, ma kụọ ya ọkpọ. Iji mee ka ikpe nke abalị ahụ yie nke iwu kwadoro, e kpekwara ya ikpe ọzọ n’isi ụtụtụ echi ya. N’ebe ahụ Paịlet gbara Jisọs ajụjụ ọnụ; e mesịa Herọd gbara ya, bụ́ onye ya na ndị agha ya mere ya akaje; e mesịzie Paịlet gbaakwa ya ọzọ. N’ikpeazụ, Paịlet mere ka a pịa ya ihe. Nke a abụghịkwa ịpịa ihe nkịtị. Akwụkwọ bụ́ The Journal of the American Medical Association kwuru banyere omume ịpịa ihe nke ndị Rom, sị:
“Ihe a na-ejikarị eme ihe bụ ụtarị dị mkpirikpi . . . nke nwere ọtụtụ eriri akpụkpọ anụ nọ otu otu ma ọ bụ a kpara akpa nke ịdị ogologo ha dị iche iche, bụ́ ndị e kenyesịrị mkpụrụ ihe ígwè ma ọ bụ iberibe ọkpụkpụ atụrụ ndị dị nkọ n’ebe dị iche iche. . . . Ka ndị agha Rom na-eji ike ha nile na-apịa mmadụ ihe ahụ n’azụ ugboro ugboro, mkpụrụ ihe ígwè ndị ahụ na-akpata mmerụahụ dịgasị omimi, eriri akpụkpọ anụ ahụ na ọkpụkpụ atụrụ ndị ahụ ga-akawasịkwa akpụkpọ ahụ onye ahụ ma kabanye n’ime ahụ. Mgbe ahụ, ka ịpịa ụtarị ahụ na-aga n’ihu, mmerụahụ ndị ahụ ga-abanye n’ime uru ahụ ndị dị n’okpuru akpụkpọ ahụ wee na-adọkapụtasị iberibe anụ ahụ ndị na-agba ọbara.”
N’ụzọ doro anya, ume Jisọs ga-anọworị na-adalata adalata eri oge tupu ọ daa n’ihi ịdị arọ nke osisi ahụ o bu. N’ezie, The Journal of the American Medical Association kwuru, sị: “Ntiru ahụ na okwu na-egbu mmụọ nke ndị Juu na ndị Rom gwara ya, tinyere erighị nri, aṅụghị mmiri, na ehighị ụra, sochakwa kpata enweghị ume ya. N’ihi ya, ọbụna tupu a kpọgbuo ya, ọnọdụ elu ahụ Jisọs ma ọ dịghị ihe ọzọ dị njọ, ikekwe dị oké njọ.”
Ọdịdị Ya Ọ̀ Dị Mkpa?
Malite ná nkọwa na-abụghị eziokwu nke Lentulus dere ruo n’ihe osise nke ndị ọkà a ma ama n’ise ihe ruo na windo enyo e tejiri eteji nke oge a, Krisendọm yiri ka o nwere oké mmasị n’ihe ndị na-adọrọ anya. “E kwesịrị ichebe ikike mkpali pụrụ iche nke onyinyo Jisọs Kraịst nwere,” ka achịbishọp nke Turin, bụ́ onye na-elekọta Ákwà Ozu nke Turin ahụ na-akpata oké arụmụka, kwuru.
Ma, Okwu Chineke leziri anya zere nkọwa dị otú ahụ sara mbara nke ‘na-akpali akpali’ banyere ọdịdị Jisọs. N’ihi gịnị? Ma eleghị anya ha ga-adọpụ uche n’ihe ahụ bụ́ ndụ ebighị ebi—ihe ọmụma Bible. (Jọn 17:3) Jisọs n’onwe ya—onye nlereanya anyị kpọmkwem—‘adịghị elekwasị anya,’ ma ọ bụ na-ewere ‘ọdịdị elu ahụ mmadụ’ dị ka ihe dị mkpa. (Matiu 22:16; tụlee Ndị Galetia 2:6, NW.) Ikwusi okwu ike banyere ọdịdị elu ahụ Jisọs ebe a na-ekwutatụghị okwu ihe dị otú ahụ n’Oziọma ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ bụ imebi nzube e ji dee ha. N’ezie, Jisọs, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ, ọbụna eyikwaghị mmadụ ma ọlị.a
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Otú ọ dị, n’ịmụ Bible, ọ dịghị ihe ọjọọ dị n’iji ihe osise ndị gụnyere Jisọs na-eme ihe. Ha na-apụtakarị ná mbipụta dị iche iche nke Watch Tower Society. Otú ọ dị, a dịghị eme mgbalị ọ bụla ịkpali ihe omimi, imenye onye na-ekiri ya ụjọ, ma ọ bụ ịkwalite echiche, akara, ma ọ bụ ofufe ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị.
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Kraịst ahụ na-enweghị ume, nke yiri onye na-arịa ọrịa, nke ndị na-ese ihe na Krisendọm na-ese nke dị iche n’ụzọ e si kọwaa Jisọs dabere n’ihe ndekọ Bible
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 7]
Jisọs Na-eme Nkwusa n’Osimiri Galili, bụ́ nke Gustave Doré sere