Ọ̀ Bụ Ikike n’Eburughị Ibu Ọrụ So Ya?
“ỊGHỌTA ùgwù e ketara eketa na ikike hà nhata, nke a na-ekwesịghị ịnapụ mmadụ nke ndị òtù nile nke ezinụlọ mmadụ nwere, bụ ntọala nke nnwere onwe, ikpe ziri ezi na udo n’ụwa.” Otú a ka okwu mmalite nke Nkwupụta Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ si kwuo, nke e ji mee ememe mgbaafọ 50 ya na December 1998. Otú ọ dị, na nso nso a mmadụ 24 bụbu ndị president na ndị praịm minista, ndị na-anọchite anya kọntinent nile, atụwo aro na tinyere nkwupụta ahụ na òtù Mba Ndị Dị n’Otu kwesịrị iwebata nkwupụta ụwa nile maka ibu ọrụ dịịrị mmadụ. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ji chee na atụmatụ dị otú ahụ dị mkpa?
“Ikike na ibu ọrụ bụ ụmụ ejima nyakọdoro ọnụ. N’ụzọ dị mwute, ka ọkara narị afọ gasịrị, e chezọwo eziokwu a ma ọ bụ ọ ghọwo ihe na-adabaghịkwa adaba. Ọtụtụ ndị na-achọ inweta ihe ndị ruuru ha n’achọpụtaghị mkpa ọ dị iburu ibu ọrụ ndị ha na ya so,” ka Prọfesọ Jean-Claude Soyer, bụ́ onye so n’Òtù Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe, na-akọwa. Nleghara anya a nke e leghaara ibu ọrụ na-emetụta ọtụtụ ndị. “E nwere ọchịchọ pụtara ìhè, karịsịa n’etiti ndị na-eto eto, maka ụdị ụfọdụ nke ime atụmatụ ga-eme ka a dị n’otu, echiche ndị doro anya a ga-eji gwọta ma belata mmetụta nke anyaukwu, nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, nke enweghị mmụọ mkpakọrịta, bụ́ ndị yiri ka ha na-ejupụta ụwa nile. . . . Arụmụka a na-arị elu banyere mkpa ọ dị inwe ụkpụrụ omume zuru ụwa ọnụ bụ ịnakwere na e nwere ihe a na-emebeghị,” ka akwụkwọ akụkọ Paris na-apụta kwa ụbọchị bụ́ International Herald Tribune na-ekwu. N’ihi ya, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị ọkà mmụta okpukpe, na ndị ọkà ihe ọmụma anọwo na-enwe mkparịta ụka banyere “atụmatụ ụkpụrụ omume zuru ụwa ọnụ,” dị ka Òtù Mmụta, Sayensị, na Ọdịbendị nke Mba Ndị Dị n’Otu na-akpọ ya, iji mechie oghere ahụ ma kpebie ihe bụ ibu ọrụ mmadụ. Otú ọ dị, ha ezutewo ihe isi ike ụfọdụ.
Ọ bụ ezie na ọ dịtụ mfe ikpebi ihe ndị ruuru mmadụ ndị e kwesịrị ichebe, ọ naghị adị mfe mgbe nile ikwu kpọmkwem ibu ọrụ dịịrị mmadụ ndị e kwesịrị ịnakwere n’ụwa nile. Otú ọ dị, ọ bụ Ụkpụrụ Ọma ahụ nke oge ya na-adịghị agafe agafe, nke zukwara ụwa nile, nke Jisọs kwupụtara n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga bụ́: “Ya mere ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a, unu onwe unu,” kpaliri ụfọdụ n’ime ụkpụrụ ndị dị ná Nkwupụta nke Ibu Ọrụ ahụ e mere atụmatụ ya.—Matiu 7:12
Ọ bụ ezie na Bible abụwo ihe na-akpali iwu ndị na-echebe ihe ndị ruuru mmadụ ọtụtụ mgbe, ọ na-emesi echiche nke ibu ọrụ dịịrị mmadụ ike. “Onye matara ime ihe ọma, ma o meghị ya, ọ bụụrụ onye ahụ mmehie,” ka Jemes onye na-eso ụzọ kwupụtara. (Jemes 4:17) Dị nnọọ ka Jisọs chọgasịrị ụzọ isi meere ndị ọzọ ihe ọma, ezi ndị Kraịst na-agbalịkwa imere mmadụ ibe ha ihe ọma. N’abụghị ndị nwere afọ ojuju nanị ịnakwere ihe ndị ruuru ha, ha ghọtara na ihe ndị ruuru mmadụ na ibu ọrụ na-eso ụkwụ na ụkwụ nakwa na onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ banyere omume ya.