Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 8/1 p. 3-4
  • Ihe Otiti Dị Ugbu A nke Ahaghị Nhata

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Otiti Dị Ugbu A nke Ahaghị Nhata
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ahaghị Nhata—Chineke Ò Zubere Ka Ọ Dị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Agbụrụ Niile Hà Ga-emecha Hara?—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Ibelata Ihe Otiti nke Ahaghị Nhata
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ọ̀ Bụ Ikike n’Eburughị Ibu Ọrụ So Ya?
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 8/1 p. 3-4

Ihe Otiti Dị Ugbu A nke Ahaghị Nhata

“Anyị na-ekwu na eziokwu ndị a na-agbara onwe ha akaebe, na e kere mmadụ nile dị ka ndị ha nhata, na Onye Okike ha nyekwara ha ụfọdụ Ihe Ndị Ruuru ha ndị a na-apụghị ịnapụ ha anapụ, na ụfọdụ n’ime ndị a bụ Ndụ, Nnwere Onwe na nchụso nke Obi Ụtọ.”—Nkwupụta nke Nnwere Onwe, nke United States nakweere na 1776.

“Mmadụ nile nweere onwe ha site n’ọmụmụ, ihe ndị ruuru ha hakwa nhata.”—Nkwupụta nke Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na nke Nwa Amaala, nke Nzukọ Mba nke France nakweere na 1789.

“Ihe nile bụ́ mmadụ nweere onwe ha site n’ọmụmụ, harakwa nhata n’ùgwù na n’ihe ndị ruuru ha.”—Nkwupụta Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ, nke Nzukọ Ezumezu nke Mba Ndị Dị n’Otu nakweere na 1948.

OBI abụọ ọ bụla adịghị ya. N’etiti ụmụ mmadụ, ọchịchọ nke ịha nhata juru ebe nile. Ma n’ụzọ dị mwute, eziokwu ahụ bụ́ na echiche ịha nhata nke ụmụ mmadụ abụrụwo nke a na-aghaghị iwepụta nnọọ ugboro ugboro na-egosi na ruo ugbu a, ihe a kpọrọ mmadụ ahabeghị nhata.

Ọ̀ dị onye pụrụ ikwusi nnọọ okwu ike na ugbu a, ná ngwụsị nke narị afọ nke 20, ihe agbanwewo n’ụzọ ka mma? Ụmụ amaala nile nke United States na France, ma ọ bụ nke ndị òtù 185 nke Mba Ndị Dị n’Otu, hà ha nhata n’ezie n’ihe ruuru ha bụ́ nke e kweere na ha nwere site n’ọmụmụ?

Ọ bụ ezie na echiche nke ịha nhata n’etiti ụmụ mmadụ pụrụ ịdị “na-agbara onwe [ya] akaebe,” ihe ndị ruuru mmadụ nke inwe “Ndụ, Nnwere Onwe na nchụso nke Obi Ụtọ” ahatụghị nhata nye mmadụ nile. Dị ka ihe atụ, ịha nhata dị aṅaa n’oruru o ruuru mmadụ ịdị ndụ ka anyị pụrụ ikwu banyere ya mgbe otu nwatakịrị n’Africa na-aghaghị isoro mmadụ 2,569 ndị ọzọ nwee otu dọkịta, ebe otu nwatakịrị na Europe na-eso nanị mmadụ 289 enwe? Ma ọ bụ ịha nhata dị aṅaa n’oruru o ruuru mmadụ inwere onwe ya na ịchụso obi ụtọ ka e nwere mgbe otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụmụ okoro na ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke ụmụ agbọghọ n’India ga-etolite na-abụ iti, ebe ọ bụ na n’ebe ndị dị ka Japan, Germany, na Great Britain, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nwatakịrị ọ bụla na-eji n’aka na ọ ga-agụ akwụkwọ?

Ndị nọ ná mba ndị dị n’Etiti America bụ́ ebe nkezi nke ego otu onye na-akpata n’afọ bụ $1,380 hà ga-enwe ‘ùgwù na ihe ndị ruuru mmadụ’ ná ndụ ka ndị nọ na France, bụ́ ebe nkezi nke ego otu onye na-akpata n’afọ bụ $24,990? Ịha nhata dị aṅaa ka nwata nwanyị a mụrụ ọhụrụ n’Africa nke afọ ndụ o nwere ike iru bụ afọ 56 nwere ma e were ya tụnyere nwata nwanyị a mụrụ ọhụrụ n’Ebe Ugwu America nke afọ ndụ o nwere ike iru bụ afọ 79?

Ahaghị nhata nwere ọtụtụ akụkụ, ha nile jọchara njọ. Ahaghị nhata n’ọnọdụ ibi ndụ na n’ohere ndị e nwere maka nlekọta ahụ ike na agụmakwụkwọ bụ nanị ụfọdụ n’ime ha. Mgbe ụfọdụ, ndịrịta iche ọchịchị, agbụrụ, ma ọ bụ nke okpukpe na-ekere òkè pụtara ìhè n’ịnapụ ndị mmadụ ùgwù na nnwere onwe ha. N’agbanyeghị okwu nile a na-ekwu banyere ịha nhata, anyị bi n’ụwa nke ahaghị nhata. Dị ka ihe otiti—“ihe na-akpata mmekpa ahụ zuru ebe nile ma ọ bụ nke dị ukwuu,” dị ka e si akọwa okwu ahụ—ahaghị nhata ruru n’akụkụ nile nke ọha mmadụ. Ihe mgbu ọ na-akpata n’ụdị nke ịda ogbenye, ọrịa, amaghị nke a na-akọ, enweghị ọrụ, na ịkpa ókè na-egbu oké mgbu.

“E kere mmadụ nile dị ka ndị ha nhata.” Lee echiche dị mma ọ bụ! Ọ dị mwute na ihe na-emenụ dị nnọọ iche!

[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 3]

UN PHOTO 152113/SHELLEY ROTNER

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya