Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 8/1 p. 4-6
  • Ahaghị Nhata—Chineke Ò Zubere Ka Ọ Dị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ahaghị Nhata—Chineke Ò Zubere Ka Ọ Dị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mkpọrọgwụ nke Ahaghị Nhata
  • Ọ̀ Dị Mgbe Ihe Ga-agbanwe?
  • Ihe Otiti Dị Ugbu A nke Ahaghị Nhata
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ibelata Ihe Otiti nke Ahaghị Nhata
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ihe Alaeze Chineke Ga-eme Gbasara Ihe Isi Ike
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Ò Kwere Omume n’Ezie Inwe Ọha Mmadụ Ebe Ịkpa Ókè Na-adịghị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 8/1 p. 4-6

Ahaghị Nhata—Chineke Ò Zubere Ka Ọ Dị?

Azịza ya n’okwu abụọ bụ ee e. Ka anyị hụ ihe mere o ji bụrụ otú ahụ.

CHINEKE zubere ka mmadụ nile nwee ohere ha nhata ịnụ ụtọ ndụ na inwe obi ụtọ. Anyị na-agụ banyere okike mmadụ, sị: “Chineke wee sị, Ka anyị kpụọ mmadụ n’onyinyo anyị, dị ka oyiyi anyị si dị: ka ha nweekwa ike n’ahụ azụ̀ nke oké osimiri, na n’ahụ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ anụ ụlọ, na n’ahụ ụwa nile, na n’ahụ ihe nile ọ bụla na-akpụ akpụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.” Mgbe o kesịrị ihe n’elu ụwa, “Chineke wee hụ ihe nile ọ bụla O mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.”—Jenesis 1:26, 31.

Chineke ọ̀ pụrụ ikwu na ọnọdụ dị mwute nke ahaghị nhata nke dị taa “dị mma nke ukwuu”? Ọ dịghị ma ọlị, n’ihi na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) E kwuru banyere ya na ọ bụ onye “na-ahụghị mmadụ ihu ọma n’ikpe” nakwa na “ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ: n’ihi na ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume, onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ.” (Deuterọnọmi 10:17; 32:4; tụlee Job 34:19.) Pita onyeozi kwubikwara, sị: “N’ezie ana m aghọta na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.

Ebe ọ bụ na Chineke bụ onye na-ahụ n’anya, onye na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu, onye ziri ezi, na onye ezi omume, olee otú ọ ga-esiwo kee ndị mmadụ ịbụ ndị na-ahaghị nhata n’ihe banyere oruru o ruuru ha inwe obi ụtọ? Ikwe ka ịkpa ókè dịrị n’etiti ndị mmadụ na idebe ha n’usoro ihe nke ahaghị nhata ga-abụ nnọọ ihe megidere àgwà ya. O zubere ka ha nile ‘nwere onwe ha site n’ọmụmụ, harakwa nhata n’ùgwù na n’ihe ndị ruuru ha.’ Ma, o doro anya na ihe adịghị otú ahụ taa. N’ihi gịnị?

Mkpọrọgwụ nke Ahaghị Nhata

Na Chineke kere ụmụ mmadụ ịha nhata apụtaghị na o zubere ka ha nile hara nhata n’akụkụ ọ bụla. Ha pụrụ ịdịrịta iche na nkà, ihe ndị na-amasị ha, na n’àgwà. Ha pụkwara ịdịrịta iche n’ọkwá ma ọ bụ n’ikike ha. Dị ka ihe atụ, nwoke na nwanyị ahaghị nhata n’ụzọ nile, ma Chineke kere nwanyị dị ka “onye inye aka” nke nwoke. (Jenesis 2:18) O doro anya na ikike ndị nne na nna na nke ụmụaka abụghị otu. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ọdịiche ndị a, mmadụ nile—ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka—gaara enwe ohere ha nhata iji nweta ihe ndị bụ́ isi dị mkpa maka obi ụtọ, dị ka ihe ruuru ha nke Chineke nyere. Ha nile gaara enwe ùgwù na nguzo ha nhata n’ihu Chineke.

N’otu aka ahụ, e nyere ụmụ Chineke ndị bụ́ mmụọ, bụ́ ndị e kere tupu e kee ụmụ mmadụ, ọrụ na ibu ọrụ ndị dị iche. (Jenesis 3:24; 16:7-11; Aịsaịa 6:6; Jud 9) Ka o sina dị, n’ime ọrụ ndị e nyeworo ha, ha nile na-anụ ụtọ ndokwa Chineke mere maka ndụ na obi ụtọ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ha nhata. Ha si otú a gosipụta eleghị mmadụ anya n’ihu nke Chineke n’ụzọ dị egwu.

N’ụzọ dị mwute, otu mmụọ e kere eke enweghị afọ ojuju ná ndokwa Chineke mere n’eleghị mmadụ anya n’ihu. Ọ chọrọ inweta ihe karịrị ihe Chineke nyeworo ya, na-achọsi ike inweta ọkwá ka elu, nke e bulikwuru elu. Site n’ịzụlite ọchịchọ ọjọọ a, ọ malitere ịma Jehova aka, bụ́ onye, dị ka Onye Okike, nọ n’ọkwá nke onye kasịnụ n’ụzọ ziri ezi. Nwa Chineke a bụ́ mmụọ nke na-enupụ isi mesịrị duga ụmụ mmadụ n’ịchọ ihe n’aka Chineke karịa ka O nyeworo ha. (Jenesis 3:1-6; tụlee Aịsaịa 14:12-14.) N’ihi ya, ndokwa Jehova mere maka ụmụ mmadụ ịnụ ụtọ ndụ na inwe obi ụtọ yiri ka ọ bụrụwo nke na-ezighịzi nnọọ ezi. Onye nnupụisi a bụ́ mmụọ, nke a kọwara ná Mkpughe 20:2 dị ka “Ekwensu na Setan,” ghọrọ ajọ onye na-akpalite ahaghị nhata nke mmadụ.

Ọ̀ Dị Mgbe Ihe Ga-agbanwe?

Azịza ya n’otu okwu bụ ee!

Ma ònye ga-eweta mgbanwe ahụ a na-achọsi ike? Obi abụọ adịghị ya na ụfọdụ ndị ndú bụ́ mmadụ ejiriwo ezi obi nile gbaa mbọ ruo ọtụtụ narị afọ iji mee otú ahụ. Ihe ịga nke ọma ha nwere abụrụwọ nke a kpaara ókè, na-eduga ọtụtụ ndị ikwubi na ọ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ịtụ anya na ọ dị mgbe a ga-agwọta nsogbu nke ahaghị nhata nke ụmụ mmadụ. Otú ọ dị, e dekọrọ echiche Chineke n’Aịsaịa 55:10, 11: “Dị ka oké mmiri ozuzo na snow si esi n’eluigwe ezo, ma ọ bụghị n’ebe ahụ ka ọ na-alaghachi, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ desịa ala, wee mee ka o mee ihe omume, ka o puokwa ihe opupu; o wee were mkpụrụ nye ọgha mkpụrụ, werekwa nri nye onye na-eri ihe; otú a ka okwu m dị nke na-esi n’ọnụ m pụta: ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.”

Lee ka o si bụrụ ihe na-akasi obi ịmara na Jehova Chineke ekwupụtawo na ọ ga-emezu nzube mbụ ya bụ́ inye mmadụ nile ohere ha nhata maka ndụ na obi ụtọ! Dị ka Chineke nke eziokwu, ọ gbawo onwe ya n’iyi imezu ihe o kwere ná nkwa. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, o nwere ma ọchịchọ ma ikike ime otú ahụ. Olee otú ọ ga-esi mezuo nke a?

Azịza ya dabeere n’Alaeze ahụ Jisọs Kraịst kụziiri ụmụazụ ya nile ikpe ekpere maka ya: “Nna anyị Nke bi n’eluigwe, . . . Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:9, 10) Ee, Alaeze Chineke bụ ihe Jehova ga-eji ‘tipịa alaeze ndị a nile [dị ugbu a] mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.’—Daniel 2:44.

N’okpuru ọchịchị Alaeze eluigwe ahụ, a ga-enwe ọha mmadụ ọhụrụ. Banyere nke a, Jọn onyeozi dere n’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, bụ́ Mkpughe, sị: “M wee hụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: n’ihi na eluigwe mbụ ahụ na ụwa mbụ ahụ gabigararịị.” (Mkpughe 21:1) Akụkụ nile jọrọ njọ nke ahaghị nhata—ịda ogbenye, ọrịa, amaghị nke a na-akọ, ịkpa ókè, na nsogbu ndị ọzọ nke mmadụ—ga-apụ n’anya.a

Eri ihe karịrị otu narị afọ, Ndịàmà Jehova anọwo na-adọrọ uche ndị mmadụ aga n’Alaeze ahụ. (Matiu 24:14) Site n’akwụkwọ ndị e biri ebi nakwa enyemaka nke ha na-enye n’onwe ha, ha adọgbuwo onwe ha n’ọrụ n’inyere ndị mmadụ aka inweta ihe ọmụma banyere nzube Chineke dị ka e dekọrọ ya na Bible. Otú ọ dị, ọrụ izi ihe ha zuru ụwa ọnụ enyewo ndị mmadụ ọ bụghị nanị olileanya nke ịdị ndụ n’ọdịnihu n’ịha nhata nakwa n’obi ụtọ kama o wetawokwa abamuru dị iche iche ugbu a n’ibelata ihe otiti nke ahaghị nhata. Ka anyị hụ otú o si mee otú ahụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Iji nweta ntụle ka zuo ezu banyere otú Alaeze Chineke ga-esi mee ka mmadụ nile hara nhata n’isi nso, biko lee isi nke 10 na 11 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Chineke zubere ka mmadụ nile nwee ohere ha nhata maka ndụ na obi ụtọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya