Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 8/1 p. 6-8
  • Ibelata Ihe Otiti nke Ahaghị Nhata

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ibelata Ihe Otiti nke Ahaghị Nhata
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Ihe I Nwere Mee Ihe Kasị Mma!
  • Ịha Nhata n’Etiti Ụmụnna
  • Ahaghị Nhata—Chineke Ò Zubere Ka Ọ Dị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ihe Otiti Dị Ugbu A nke Ahaghị Nhata
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Agbụrụ Niile Hà Ga-emecha Hara?—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Ihe Alaeze Chineke Ga-eme Gbasara Ihe Isi Ike
    Isiokwu Ndị Ọzọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 8/1 p. 6-8

Ibelata Ihe Otiti nke Ahaghị Nhata

N’oge na-adịghị anya Onye Okike ga-eweta ịha nhata ahụ ụmụ mmadụ na-achọsi ike. Tupu mgbe ahụ, anyị pụrụ ime ihe ụfọdụ ma ọ dịghị ihe ọzọ iji belata ihe otiti nke ahaghị nhata nke na-emetụta anyị na ezinụlọ anyị. Dị ka Nelson Mandela, onye bụbu president nke South Africa, si kwuo, “ọ bụ ihe anyị mepụtara site n’ihe anyị nwere, ọ bụghị ihe e nyere anyị, na-eme ka mmadụ dị iche n’ebe ibe ya nọ.”

AKỤKỌ ihe mere eme na-akwado okwu ya. E nwere ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị nwetara ihe dị nta site n’ọmụmụ ma bụrụ ndị, site n’iji ihe ha nwere mee ihe, nwetara ihe ịga nke ọma bụ́ nke mere ka ha pụọ iche n’ebe ọbụna ndị ọgbọ ha nwere nkà karịa ha nọ. N’ụzọ dị iche, ndị ọzọ bụ́ ndị e ji akụ̀ na ụba gọzie site n’ọmụmụ rikpọrọ ihe ndị ha nwere ma hapụ iji ikike ha mee ihe n’ụzọ zuru ezu.

Jiri Ihe I Nwere Mee Ihe Kasị Mma!

Ndịàmà Jehova nwere nnọọ mmasị n’inyere ndị mmadụ aka inweta ezi ihe ọmụma banyere nzube Chineke site n’ọmụmụ Bible. Otú ọ dị, ha na-aghọta na iji rite uru zuru ezu site n’ihe ọmụma Bible, ndị mmadụ aghaghị ịma akwụkwọ. N’ihi nke ahụ, Ndịàmà Jehova akụziworo ọtụtụ iri puku ndị mmadụ ịgụ na ide ihe, gụnyere mmadụ 23,000 (ka ọ na-erule etiti afọ ndị 1990) n’otu mba Ọdịda Anyanwụ Africa nanị. N’izo aka n’ozi ọha na eze pụtara ìhè nke Ndịàmà Jehova na-eje, San Francisco Examiner kwuru, sị: “I nwere ike ile ha anya dị ka ụmụ amaala kwesịrị nṅomi. Ha na-atụchi ụtụ isi ha anya, na-elekọta ndị ọrịa, na-alụso amaghị akwụkwọ ọgụ.”

Tụkwasị na nke a, site n’ọzụzụ na-aga n’ihu n’ikwu okwu n’ihu ọha, Ndịàmà Jehova azụwo ọtụtụ narị puku ndị mmadụ ịghọ ndị ọkà okwu ruru eru, ndị nwere ike ikwu okwu n’ihu ọha n’ụzọ na-aga were were. N’ime ọtụtụ puku a ka e nwere ụfọdụ ndị nwetụworo nsogbu ikwu okwu. Tụlee banyere nwoke si South Africa, bụ́ onye dere, sị: “Ịsụ nsụ m dị nnọọ oké njọ nke na m ghọrọ onye nanị ya na-anọ, na-adabere n’ebe ndị ọzọ nọ ikwuchitere m okwu. . . . Mgbe m sonyere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ma nwee ọgụgụ Bible n’ihu ìgwè nta nke ndị na-ege ntị . . . , asụrụ m nsụ nke ọjọọ ya nke na enweghị m ike imecha ihe omume ahụ n’oge e nyere m. Mgbe nzukọ mechiri [onye na-enye ndụmọdụ] ji obi ọma nye m ndụmọdụ bara uru. Ọ tụrụ aro ka m na-amụgharị ịgụrụ onwe m ihe n’olu dara ụda. Emere m nke a, na-etinye oge kwa ụbọchị, na-agụ Bible na magazin Ụlọ Nche n’olu dara ụda.” Nwoke a nwere nnọọ ọganihu dị mma nke na ọ na-ekwu okwu ihu ọha ugbu a nye ndị na-ege ntị ruru ọtụtụ narị, ọbụna ọtụtụ puku.

Ịha Nhata n’Etiti Ụmụnna

N’ihe banyere agụmakwụkwọ, nlekọta ahụ ike, na ọnọdụ akụ̀ na ụba na ọkwá, ọnọdụ ndị dị n’etiti Ndịàmà Jehova dịgasị nnọọ iche. Ọdịiche ndị a na-egosipụta nanị ọnọdụ ụwa na-ezughị okè nke ha bi n’ime ya. Ma n’ụzọ dị iche n’ebe òtù okpukpe ndị ọzọ dị, ọ fọwo nke nta ka ha wepụchaa ajọ mbunobi agbụrụ, nke ọkwá, na nke ọnọdụ akụ̀ n’ụba n’etiti onwe ha.

Ha emezuwo nke a site n’ime ihe nile ha pụrụ ime n’itinye ihe ha mụtara na Bible n’ọrụ. Ha na-eji obi dum anabata ụkpụrụ Bible ndị dị ka: “Jehova adịghị ahụ dị ka mmadụ si ahụ; n’ihi na mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ele obi.” (1 Samuel 16:7) “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) “Unu enyeghachila onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ. Burunụ ụzọ na-eche ihe ọma n’ihu mmadụ nile. A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe nke dịịrị unu onwe unu hà, unu na mmadụ nile na-adị n’udo.”—Ndị Rom 12:17, 18; leekwa 1 Timoti 6:17-19; Jemes 2:5, 9.

N’ịgbasochi ụkpụrụ Bible ndị a na-akwalite ịdị n’otu anya, Ndịàmà Jehova adịghị ekwe ka e gosipụta ahaghị nhata ndị dabeere ná ndịrịta iche nke agbụrụ, ọkwá, ma ọ bụ ọnọdụ akụ̀ na ụba n’etiti ha. Dị ka ihe atụ, a dịghị adabere n’ihe ndị a ekpebi ndị a ga-enye ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ ndị Kraịst. A na-adabere nanị n’iru eru ime mmụọ enye ọnọdụ ibu ọrụ ndị dị ka izi ihe na nlekọta.—1 Timoti 3:1-13; Taịtọs 1:5-9.

Nye ndị hụjuworo anya n’okpuru ahaghị nhata dị iche iche nke ụwa nke gbagọrọ agbagọ, lee ka o si bụrụ ihe na-enye ume ọhụrụ ndị ọzọ imeso ha ihe dị ka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ha na ha nwere ọnọdụ hà nhata n’ihu Onye Okike ha! Martina pụrụ ịgba akaebe na nke a. Mgbe nna ya gbahapụsịrị ezinụlọ ha, a zụlitere ya n’ezinụlọ dara ogbenye nke ọ bụ nanị nne na-azụ ụmụ. E mesoro ya ihe mgbe mgbe dị ka osu, o nwere obi ike onwe onye dị nta, o sikwaara ya ike iso ndị ọzọ na-emekọ ihe. Ọ zụlitere omume ọ gbasaghị m. Otú ọ dị, ihe gbanwere mgbe ọ malitesịrị ịmụ Bible ma ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. O kwuru, sị: “Aghaghị m ịnọgide na-alụso echiche na-ezighị ezi ọgụ, ma enwere m ike ịnagide nsogbu ahụ ugbu a karị. Enweela m ùgwù onwe onye ka mma, ana m ejizi obi ike ka ukwuu ekwu okwu. Eziokwu ahụ enyewo m echiche nke inwe ibu ọrụ. Amazi m na Jehova hụrụ m n’anya nakwa na ndụ dị ụtọ obibi.”

Dị ka òtù ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ, Ndịàmà Jehova nọ n’ihe karịrị mba 230 na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịha nhata bụ́ nke pụrụ nnọọ iche n’ụwa taa. Òtù okpukpe ọ bụla ọzọ ọ̀ pụrụ ime nzọrọ yiri nke ahụ ma jiri ihe ndị mere eme n’ezie kwado ya?

N’ezie, Ndịàmà Jehova nwere echiche ziri ezi. Ha na-adị njikere ịnabata na n’ịbụ ndị a mụrụ na gburugburu ebe na-ezughị okè, ha enweghị ike ikpochapụ ahaghị nhata nke mmadụ dị nnọọ ka ndị ọzọ nwaworo ime otú ahụ eri ọtụtụ narị afọ—ma daa. Ka o sina dị, ha na-enwe ọṅụ na n’etiti ha, ha emewo ihe dị ukwuu iji belata ihe otiti a na-akpata ọnwụ. N’inwekwa okwukwe siri ike ná nkwa Chineke, ha na-elepụ anya n’ihu n’ụwa ọhụrụ nke ezi omume bụ́ ebe ahaghị nhata na-agaghị adịkwa ruo mgbe ebighị ebi.

Ee, n’oge na-adịghị anya, a ga-eweghachi ụmụ mmadụ nile gaa n’ịha nhata “n’ùgwù na ihe ndị ruuru ha” nke Onye Okike ha zubere ka ha nwee na mbụ. Lee echiche mara mma ọ bụ! Na nke ugbu a kwa, ọ ga-eme eme!

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndịàmà Jehova na-alụso amaghị akwụkwọ ọgụ site n’ịkụziri ọtụtụ iri puku ndị mmadụ ịgụ na ide ihe

[Foto dị na peeji nke 8]

Eziokwu Bible na-enye aka ikpochapụ ajọ mbunobi agbụrụ, ọkwá, na nke ọnọdụ akụ̀ na ụba

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya