Chineke Ọ̀ Dị Adị?—Ụfọdụ Ndị Ọkà Mmụta Sayensị Azaa
PRỌFESỌ mmụta physics bụ́ Ulrich J. Becker, nke Ụlọ Akwụkwọ Nkà na Ụzụ nke Massachusetts, kwuru mgbe ọ na-ekwu okwu banyere ịdị adị nke Chineke, sị: “Olee otú m pụrụ isi dịrị n’enweghị onye okike? Amaghị m azịza ọ bụla na-eju afọ nke e nyetụworo.”
Nke a ò megidere echiche nkà mmụta sayensị o nwere? Azịza na-akpali echiche nke prọfesọ ahụ bụ, “Ọ bụrụ na ị chọpụta otú otu wiil dị n’ime ‘klọọkụ’ si na-agagharị—ị pụrụ ịkọ otú ndị ọzọ si na-agagharị, ma i kwesịghị ịkpọ nke a ihe kwekọrọ na nkà mmụta sayensị, ọ kakwaara gị mma ịhapụ okwu banyere onye hịọchiri spring ya.”
N’ụzọ dị iche n’echiche nke ụfọdụ, ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị a na-akwanyere ùgwù akagbughị echiche ahụ bụ́ na e nwere Chineke—Onye Nchepụta Ukwu nke kere eluigwe na ala na mmadụ.
Tụlee ihe atụ abụọ ọzọ banyere nke a. Mgbe a jụrụ prọfesọ mgbakọ na mwepụ bụ́ John E. Fornaess, nke Mahadum Princeton echiche ya banyere ịdị adị nke Chineke, ọ zara, sị: “Ekwere m na e nwere Chineke nakwa na ọ bụ Chineke na-ahazi eluigwe na ala n’ọ̀tụ̀tụ̀ nile, site n’ụmụ irighiri ihe ndị dị nta ruo n’ihe ndị dị ndụ ruo ná nnukwute ụyọkọ kpakpando dị iche iche.”
Prọfesọ mmụta physics bụ́ Henry Margenau, nke Mahadum Yale, kwuru na ya kwenyesiri ike na ọ bụ Chineke mere iwu nke okike, na-ekwukwasị: “Chineke kere eluigwe na ala site n’ihe na-abụghị ihe n’ihe omume nke mekwara ka oge malite ịdị.” O kwuziri na ndị ọkà mmụta sayensị atọ na-akọwa n’ime akwụkwọ bụ́ The Mystery of Life’s Origin na Onye Okike bụ nkọwa ezi uche dị na ya banyere mmalite nke ndụ. N’ịkwado echiche a, onye na-enyocha mbara eluigwe bụ́ Fred Hoyle ekwuwo na ikwere na mkpụrụ ndụ mbụ malitere na mberede yiri ikwere na oké ifufe na-ebibi ihe nke feere gabiga n’ogige ebe a na-edebe ihe ndị mebiri emebi nke jupụtara n’akụkụ ahụ tụkasịrị atụkasị nke ụgbọelu Boeing 747, nke a na-ahazighịkwa ahazi pụrụ imepụta ụgbọelu Boeing 747.
A pụrụ ịgbakwụnye okwu nke onye so dee Bible bụ́ Pọl n’azịza ndị a, bụ́: “Ihe [Chineke] anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke, bụ́ ike ebighị ebi Ya na ụdị Chineke Ya.”—Ndị Rom 1:20.
Ee, Chineke dị adị n’ezie! Ma gịnị mere o ji kwere ka ụwa nọrọ n’ọnọdụ ya ugbu a dị mwute? Gịnị bụ nzube ya maka ụwa? Ànyị pụrụ ịmata kpọmkwem onye ezi Chineke ahụ bụ?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]
“Ọ bụrụ na ị chọpụta otú otu wiil dị n’ime ‘klọọkụ’ si na-agagharị—ị pụrụ ịkọ otú ndị ọzọ si na-agagharị, ma . . . ọ kakwaara gị mma ịhapụ okwu banyere onye hịọchiri ‘spring’ ya”