Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
N’ihi Gịnị Ka M Ji Echegbubiga Onwe M Ókè Banyere Ibu M?
“E nwere ọgụ a na-apụghị ịkwụsị akwụsị na-aga n’ihu n’uche m. Otu akụkụ m na-achọ iri nri, ma akụkụ nke ọzọ na-ajụ iri nri n’ihi na m na atụ egwu na m ga-ebu oké ibu.”—Jaimee.
GỊNỊ ka ị na-atụ egwu karịa ihe ọ bụla ọzọ? N’egbughị oge, ọtụtụ ụmụ agbọghọ ga-aza: ibu ibu. N’ezie, otu njụta echiche e mere na-egosi na ụmụ agbọghọ nke oge a na-atụ ibu ibu egwu karịa otú ha na-atụ agha nuklia, ọrịa cancer, ma ọ bụ ọbụna ndị nne na nna ha ịnwụnahụ ha!
N’ụzọ na-eju anya, mgbe ụfọdụ mmadụ ichegbu onwe ya banyere ibu ya na-amalite n’oge ọ bụ nwata. Ọbụna tupu ha eruo afọ iri na ụma, ka Dr. Catherine Steiner-Adair na-ekwu, ọtụtụ ụmụ agbọghọ na-anọkọ ọnụ iji kwurịta “okwu ibu”—mkparịta ụka ha ji ekwupụta mmasị ha na-enweghị n’otú ahụ ha dị. Ihe àmà na-egosi na ọ karịrị nanị mkparịta ụka. N’otu nnyocha e mere ụmụ agbọghọ 2,379, pasent 40 nọ na-agbalị ka ha felata n’ezie. Ndị a jụtakwara echiche ha dị site nanị afọ itoolu ruo iri!
Ka oge na-aga, ọtụtụ n’ime ndị ntorobịa ndị a pụrụ ịbụ ndị ịhọ ihe oriri ga-amata n’ọnyà. Nke ka njọ, ụfọdụ pụrụ imesị dị ka Jenna dị afọ 20. Nwa agbọghọ a dị sentimita 160 n’ogologo dị nanị kilogram 40 n’arọ! “Achọghị m nnọọ iri nri,” ka Jenna na-ekwu. “Nchegbu bụ́ isi m nwere bụ na mgbe m nọsịrị afọ atọ na-agbalị ifelata, sitekwa n’iri nri aga m ebuchi ibu ahụ n’otu ọnwa.”
Ikekwe ị pụrụ ịghọta mmetụta Jenna. Ọ pụrụ ịbụ na gị onwe gị achọwokwa ifelatatụkwu iji nwee ọdịdị kasị mma. N’ezie, ọ dịghị njọ iche echiche banyere ọdịdị gị. Otú ọ dị, nye Jenna, ọchịchọ ịdị gịrịgịrị fọrọ nke nta ka o gbuo ya. N’ụzọ dị aṅaa?
Ịnọgbu Onwe Onye n’Agụụ
Jenna na-alụso ajọ ọrịa iri nri nke a na-akpọ ịtụ nri ụjọ ọgụ. Otú ahụkwa ka Jaimee, e hotara ná mmalite na-eme. Ruo oge ụfọdụ, ụmụ agbọghọ ndị a nọ na-anọgbu onwe ha n’agụụ, ọ bụghịkwa nanị ha. E mere atụmatụ na 1 n’ime 100 ụmụ agbọghọ na-arịa ọrịa ịtụ nri ụjọ. Nke ahụ pụtara na ọ na-emetụta ọtụtụ nde ụmụ agbọghọ—ikekwe ọbụna onye ị maara!a
Ọrịa ịtụ nri ụjọ pụrụ ịmalite nnọọ n’ụzọ na-adịghị emerụ ahụ. Nwa agbọghọ pụrụ ịmalite usoro iri nri yiri ka ọ dịghị emerụ ahụ, ikekwe iji felata. Otú ọ dị, mgbe o ruru ihe mgbaru ọsọ ya, afọ agaghị eju ya. “M ka buru oké ibu!” ka ọ ga-ekwu ka o ji iwe na-ele anya n’enyo. N’ihi ya o kpebie ifelatatụkwu. Mgbe ahụ o felatatụkwuo. O felatatụkwuokwa. A malitela usoro ahụ, kụọkwa mkpụrụ nke ọrịa ịtụ nri ụjọ.
Otú ọ dị, ọ bụghị ndị nile na-ahọ nri na-arịa ọrịa ịtụ nri ụjọ. Ụfọdụ nwere nchegbu ziri ezi banyere ibu ibu, nye ha, ifelatatụ pụkwara ịba uru. Ma ọtụtụ ụmụ agbọghọ nwere echiche na-ezighị ezi banyere ahụ ha. Magazin bụ́ FDA Consumer na-eji ile anya n’enyo na-eme ka mmadụ buo ibu atụnyere inwe echiche na-ezighị ezi banyere ahụ mmadụ. “Ị na-ahụ onwe gị ịbụ onye buru ibu karịa otú ị hà,” ka magazin ahụ na-ekwu.
Ya mere, onye na-arịa ọrịa ịtụ nri ụjọ na-atụ ibu ibu egwu n’ụzọ na-enweghị isi—ọbụna ma ọ bụrụ na ọ dịworị gịrịgịrị dị ka azịza. Ọ pụrụ ịdị na-emega ahụ n’esepụghị aka iji mee ka ọ ghara ibu ibu, ọ ga na-atụkwa onwe ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ọtụtụ ugboro n’ụbọchị iji jide n’aka na ọ dịghị “alaghachi azụ.” Mgbe ọ ga-eri nri, ọ ga-eri nanị ntakịrị. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịhapụ iri ihe ọ bụla. “Kwa ụbọchị m na-eji nri ehihie nne m siiri m aga ụlọ akwụkwọ, aga m atụfu ya n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụbọchị nile,” ka Heather na-ekwu. “N’oge na-adịghị anya erighị nri maara m nnọọ ahụ nke na ọ bụrụgodị na m chọrọ iri nri, apụghị m iri ya. Agụụ adịghị agụ m.”
Na mbụ, ndị na-arịa ọrịa ịtụ nri ụjọ dị ka Heather na-enwe obi ụtọ ịhụ ka ha na-efelata. Ma erighị ezigbo nri na-edozi ahụ na-emesị kpaa ha aka ọjọọ. Onye ahụ na-arịa ọrịa ịtụ nri ụjọ na-aghọ onye na-ero ụra. Ọrụ ụlọ akwụkwọ ya amalite ịla azụ. Ọ pụrụ ịkwụsị ịhụ nsọ ya.b Ka oge na-aga, obi otiti ya na ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ya ji erugharị pụrụ ịdị ala nke ọjọọ ya. Ma, onye ahụ na-arịa ọrịa ịtụ nri ụjọ adịghị ama na ọ nọ n’ihe ize ndụ ọ bụla. N’ezie, nanị ihe ize ndụ ọ na-ahụ bụ ibuchi ibu—ọbụna nke nta.
Otú ọ dị, ọrịa ịtụ nri ụjọ abụghị nanị nsogbu iri nri dịnụ, ọ bụghịkwa nke a kasị enwe. Ọrịa oké agụụ nri bụ ihe otiti na-emetụta ụmụ agbọghọ ji ihe ruru okpukpu atọ karịa ndị ọrịa ịtụ ụjọ nri na-emetụta. Mgbe ahụ e nwere iribiga nri ókè ịma mmadụ ahụ, bụ́ nke yiri nnọọ ọrịa oké agụụ nri. Ka anyị lerukwuo ọrịa ndị a anya nke ọma.
Ihe Otiti Nzuzo
“Otu enyi m kwupụtara na nso nso a na ya na-ezo nri ma rie ya na nzuzo. Mgbe ahụ ọ ga-eme ihe iji gbọọ agbọ. O kwuru na ya anọwo na-eme ya eri afọ abụọ.” Otu onye ntorobịa ji okwu ndị a na-akọwa mgbaàmà ndị e ji mara nsogbu iri nri a maara dị ka ọrịa oké agụụ nri mgbe o dere edemede e denyere na kọlụm e ji enye ndumọdụ n’otu magazin.
Onye na-arịa ọrịa oké agụụ nri na-eri nri gabiga ókè, ma ọ bụ na-eri nri dị ukwuu ná mkpirikpi oge. Ọ ga-ewepụzi nri ahụ o riri mgbe mgbe site n’ịgbọ agbọ ọ kpataara onwe ya.c N’eziokwu, echiche nke isi otú a wepụ nri dị n’afọ pụrụ iyi ihe na-asọ oyi. Ma, onye ọrụ ebere bụ́ Nancy J. Kolodny na-ede, sị: “Ka ị na-eri oké nri karị ma na-ewepụ ya, otú a ka ọ na-adịrị gị mfe karị. Mkpọrọmasị ma ọ bụ ọbụna egwu i nwere na mbụ na-abụzi mkpali nke imeghachi usoro nke ọrịa oké agụụ nri a n’egbughị oge.”
A kpọwo ọrịa ịtụ nri ụjọ na nke oké agụụ nri “nsogbu ndị nwere mgbaàmà dịgasị iche bụ́ ndị otu ihe na-akpata.” Ọ bụ ezie na ha nwere mgbaàmà dịgasị iche, ọ bụ inwe nchegbu banyere nri na-akwalite nsogbu abụọ ahụ.d Otú ọ dị, n’adịghị ka ọrịa ịtụ nri ụjọ, ọ ka nnọọ mfe izochi ọrịa oké agụụ nri. E kwuwerị, iribiga nri ókè na-eme ka mmadụ ghara ịta ahụ, iwepụ nri dị ya n’afọ na-eme ka ọ ghara ibu ibu. Ya mere, o yiri ka onye na-arịa ọrịa oké agụụ nri agaghị ebu oké ibu ma ọ bụ dị gịrịgịrị, otú o si eri nri n’ihu ọha pụkwara ịdị nnọọ mma. “Ruo afọ itoolu,” ka otu nwanyị aha ya bụ Lindsey na-ekwu, “eribigara m nri ókè ma gbọọkwa agbọ ruo ihe ruru ugboro anọ ma ọ bụ ise kwa ụbọchị. . . . Ọ dịghị onye maara na m na-arịa ọrịa oké agụụ nri, n’ihi na eji m mgbasi ike, obi ụtọ, na ibu hà otú o kwesịri zochie ya.”
Otú ọ dị, ọ dịtụ iche n’ihe banyere onye iribiga nri ókè riri ahụ. Dị ka onye na-arịa ọrịa oké agụụ nri, onye a ga-eri nri dị ukwuu n’otu mgbe. Akwụkwọ bụ́ The New Teenage Body Book na-ekwu, sị: “Ebe ọ na-eribiga nri ókè n’ewepụghị ya n’afọ ya, onye iribiga nri ókè riri ahụ pụrụ ibu ibu ruo n’ókè nke ibu oké ibu.”
Ihe Ize Ndụ Ahụ Ike
Ụdị nsogbu iri nri atọ a pụrụ iyi ahụ ike mmadụ egwu n’ụzọ siri ike. Ọrịa ịtụ nri ụjọ pụrụ ịkpata nsogbu siri ike nke erighị ihe na-edozi ahụ, n’ọtụtụ ọnọdụ—ụfọdụ ndị na-eme atụmatụ ihe ruru pasent 15—ọ pụkwara ịkpata ọnwụ. Iribiga nri ókè, ma è wepụrụ ya ma é wepụghị ya mgbe e risịrị ya, dị ize ndụ nye ahụ ike. Ka oge na-aga, oké ibu pụrụ ime ka e nwee ọrịa obi na-eyi ndụ egwu, ọrịa shuga, ọbụnakwa ụdị ụfọdụ nke ọrịa cancer. Ịgbọ agbọ mmadụ kpataara onwe ya pụrụ ịgbabi okpo akpịrị, ijikwa ọgwụ na-asa afọ na nke na-eme ka a nyụọ mamịrị n’ụzọ dị ukwuu eme ihe n’ụzọ na-adịghị mma pụrụ ịkpata nkuchi obi n’ọnọdụ ndị siri ike.
Otú ọ dị, e nwere akụkụ ọzọ nke nsogbu iri nri dị mkpa ka a tụlee. Ndị na-arịa ọrịa ịtụ nri ụjọ, nke oké agụụ nri, na ndị iribiga nri ókè maara ahụ adịghị enwe obi ụtọ n’ozuzu ha. Ha na-enwe ntakịrị ùgwù onwe onye, o yikarịkwara ka ha ga-enwe nchegbu na ịda mbà n’obi. N’ụzọ doro anya, enyemaka dị ha mkpa. Ma olee otú a pụrụ isi nyere ndị nwere nsogbu iri nri aka ka ha hapụ ichegbubiga onwe ha ókè banyere ibu ha? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu a ga-enwe n’ọdịnihu n’usoro isiokwu a.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọrịa ịtụ nri ụjọ na-emetụtakwa ndị ikom. Otú ọ dị, ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị na-arịa ọrịa ịtụ nri ụjọ bụ ụmụ agbọghọ, anyị ga-ezo aka n’ebe ndị o ji nọ dị ka ndị inyom.
b N’ụlọ ọgwụ, a na-ekwu na nwanyị na-arịa ọrịa ịtụ nri ụjọ mgbe ibu ya ji ma ọ dịkarịa ala pasent 15 dị ala karịa otú o kwesịrị ịdị ma bụrụ onye na-ahụbeghị nsọ ya ruo ọnwa atọ ma ọ bụ karị.
c Ụzọ ndị ọzọ e si ewepụ nri n’afọ na-agụnye iji ọgwụ ndị na-asa afọ ma ọ bụ ndị na-eme ka a nyụọ mamịrị n’ụzọ dị ukwuu eme ihe.
d Ọtụtụ ndị na-abụ ha rịakata ọrịa ịtụ nri ụjọ ha arịawa ọrịa oké agụụ nri.
[Igbe dị na peeji nke 14]
Echiche Na-ezighị Ezi Banyere Ahụ Mmadụ
Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ agbọghọ na-echegbu onwe ha banyere ibu ha enweghị ihe mere ha ga-eji mee otú ahụ. N’otu nnyocha e mere, pasent 58 nke ụmụ agbọghọ dị site n’afọ 5 ruo 17 kwenyere na ha buru oké ibu, mgbe ọ bụ nanị pasent 17 buru oké ibu n’ezie. Ná nnyocha ọzọ e mere, pasent 45 nke ndị inyom bụ́ ndị tadịrị ahụ chere na ha buru oké ibu! Otu nnyocha e mere na Canada chọpụtara na pasent 70 nke ndị inyom nọ ná mba ahụ bụ ndị ibu ha na-echu ụra, pasent 40 na-ahọ nri iji mee ka ha taa ahụ n’otu oge ma buo ibu na nke ọzọ—usoro nke ịta ahụ ma buchie.
N’ụzọ doro anya, echiche na-ezighị ezi banyere ibu pụru ime ka ụmụ agbọghọ ụfọdụ chegbuwe onwe ha n’ụzọ dị ukwuu banyere ihe na-abụghị nsogbu n’ezie. “Enwere m otu enyi na-aṅụ ọtụtụ ọgwụ ndị na-eme ka a na-ahọ nri, amakwaara m ụmụ agbọghọ ole na ole na-arịa ọrịa ịtụ nri ụjọ,” ka Kristin dị afọ 16 na-ekwu. Ọ na-agbakwụnye: “Ọ dịghị onye n’ime ha buru ibu.”
Ọ bụ ezi ihe mere magazin bụ́ FDA Consumer ji na-atụ aro, sị: “Kama ịdị na-ahọ nri n’ihi na ‘mmadụ nile’ na-eme ya ma ọ bụ n’ihi na ị dịghị gịrịgịrị dị ka ị chọrọ, buru ụzọ chọpụta site n’aka onye dọkịta ma i buru oké ibu ma ọ bụ ma abụba dị gị n’ahụ ọ̀ dị ukwuu karịa ka o kwesịrị ịdị na-adabere n’afọ ndụ gị na ogo gị.”
[Foto dị na peeji nke 15]
Ọtụtụ ndị na-echegbu onwe ha banyere ibu ha enweghị ihe mere ha ga-eji mee otú ahụ