Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Ichegbubiga Onwe M Ókè Banyere Ibu M?
“Ihe kasị enye m nsogbu ná ndụ m bụ ma m ga-etinye bọta na bred m ka ọ bụ na m gaghị etinye. Olee otú m ga-esi tinye uche m n’ihe ọ bụla ebe m na-echegbubiga onwe m ókè banyere bọta? Olee ihe bụ mkpebi m? Agaghị m etinye ya bọta—calorie dị na ya nke ukwuu. Ọrịa ịtụ nri ụjọ ejituola m ọzọ. Arịawala m ya ọzọ.”—Jaimee.
ỌTỤTỤ nde ndị ntorobịa na-arịa ọrịa iri nri.a Ihe ka ọtụtụ n’ime ha amaliteghị n’ebumnobi nke ịkwụwa onwe ha agụụ (ọrịa ịtụ nri ụjọ) ma ọ bụ nke ịmalite omume iribiga nri ókè na iwepụ ya (ọrịa oké agụụ nri). Kama nke ahụ, ọtụtụ malitere n’ebumnobi na-adịghị njọ nke ifelatatụ. Otú ọ dị, tupu ha amara ihe na-aganụ ha abanyewo n’ajọ usoro nke ịkwụ agụụ ma ọ bụ iribiga nri ókè. “Amalitere m omume a na-adịghị njọ nke ịhọ nrị iji chịkwaa ibu m, ma ugbu a ọ na-achịkwa m,” ka Jaimee na-ekwu.
Ọ bụrụ na ị chọpụta na ị na-echegbubiga onwe gị ókè banyere nri na mmetụta ọ na-enwe n’ibu gị, gịnị ka ị pụrụ ime? Nke mbụ, ghọta na ọtụtụ ndị ntorobịa ndị ọzọ alụsowo ọrịa iri nri ọgụ, ha emeriwokwa! Ma ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?
Ile Onwe Onye n’Enyo
Ihe bụ́ isi ị ga-eme iji merie n’ọgụ ị na-alụso ọrịa iri nri bụ iwere ọdịdị gị otú ị hụrụ ya. “Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-arịa ọrịa iri nri nwere echiche na-ezighị ezi banyere onwe ha,” ka akwụkwọ bụ́ Changing Bodies, Changing Lives na-ekwu. “Ha adịghị ewere ahụ ha otú ha hụrụ ya, ha na-akatọbigakwa onwe ha ókè, nke ka nke ọdịdị ha.”
N’ezie, ọdịdị ahụ nke ụfọdụ ndị nọ n’afọ iri na ụma na-emetụta echiche ha na-enwe banyere onwe ha; ha na-ele ntụpọ ọ bụla anya dị ka ihe na-emebi ihe. “Eburu m nnọọ ibu nke na apụghị m ịnagide ya,” ka Vicki dị afọ 17 na-ekwu. “Úkwù m buru nnọọ ibu nke na ọ dịghị uwe m m pụrụ ịfọnye n’ime.” Ọbụna mgbe o wepụrụ kilogram 10 n’ịdị arọ ya, Vicki enweghị afọ ojuju. Ọ bụrụ na ọ jụghị iri nri o ribiga ya ókè ma gbọzie ihe o riri.
N’ezie ọ dịghị njọ na i nwetụrụ nchegbu banyere ọdịdị gị. N’ihe banyere nke a, ọ dị mma ịmara na Bible kwuru ihe dị mma banyere ọdịdị ahụ nke ọtụtụ ndị inyom na ndị ikom, gụnyere Sera, Rechel, Josef, Devid, na Abigail.b Ọbụna Bible kwuru na nọọsụ Devid bụ́ Abishag “mara mma nke ukwuu.”—1 Ndị Eze 1:4.
Ịkọwa Ezi Ịma Mma
Ka o sina dị, Bible ekwusighị okwu ike banyere otú mmadụ dị n’ile anya ma ọ bụ ọdịdị ahụ ya dị ka nke kasị mkpa. Kama nke ahụ, ọ na-eto “mmadụ zoro ezo nke mkpụrụ obi.” (1 Pita 3:4) Ọ bụ ihe mmadụ bụ n’ime na-eme ka mmadụ maa mma ma ọ bụ jọọ njọ n’ezie n’anya Chineke na mmadụ.—Ilu 11:20, 22.
Tụlee nwa Eze Devid bụ́ Absalọm. Bible na-ekwu, sị: “N’Israel nile ọ dịghị nwoke mara mma dị ka Absalọm a na-eto nke ukwuu: site n’ọbụ ụkwụ ya wee ruo opu n’isi ya ọrụ adịghị n’ahụ ya.” (2 Samuel 14:25) Ma, nwa okorobịa a dị aghụghọ. Nganga na oké ọchịchọ kpaliri ya ịnwa iji ike nara eze Jehova họpụtara ọnọdụ ya. Otú ọ dị, Bible ekwughị ihe dị mma banyere Absalọm kama ọ kọwara ya dị ka nwoke na-ekwesịghị ntụkwasị obi nke ihere na-adịghị n’anya na onye na-akpọ asị ọjọọ.
Ezi ịma mma mmadụ adabereghị n’ọdịdị ahụ ya. Bible nwere ezi ihe mere o ji na-ekwu, sị: “Nweta amamihe: ee, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta. Ọ ga-enye isi gị okpu amara: okpueze mara mma ka ọ ga-enye gị n’aka.”—Ilu 4:7, 9.
Otú ọ dị, n’eziokwu, ọ bụghị nanị enweghị afọ ojuju n’ọdịdị mmadụ na-akpalikarị ọrịa iri nri. Otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu, sị: “Ndị nile na-echegbubiga onwe ha ókè banyere nri ma rịawa ọrịa iri nri ndị dị ka ọrịa ịtụ nri ụjọ, ọrịa oké agụụ nri, na iribiga nri ókè, nwechara ùgwù onwe onye dị ala—ha na-eche na ha abaghị uru, ha na-echekwa na ndị ọzọ adịghịkwa eji ha akpọrọ ihe.”
E nwere ọtụtụ ihe ndị pụrụ iso kpata mmetụta nke ùgwù onwe onye dị ala. Dị ka ihe atụ, mmalite nke oge uto pụrụ ịkpatara gị oké mgbagwoju anya—nke ka nke ma ọ bụrụ na i tojuola tupu ndị ọgbọ gị etojuo. Ọzọkwa, a na-azụlite ụfọdụ ndị ntorobịa n’ebe obibi ndị na-enwe ọgba aghara mgbe nile, ikekwe ọbụna itirụ ahụ ma ọ bụ mmetọ n’ụzọ mmekọahụ. N’agbanyeghị ihe kpatara ya, mgbake na-agụnyekarị ịghọta ihe na-akpalite echiche nke abaghị uru. Nke a pụtara ịghọta na ị bara uru n’ezie dị ka mmadụ. N’ezie, ma ọ dịghị ihe ọzọ onye ọ bụla nwere àgwà ụfọdụ kwesịrị ịja mma. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 12:14-18.) N’eziokwu, o nwere ike ị gaghị ahụ ihe ndị a n’ahụ gị, ma enyi gị tozuru okè pụrụ inwe ike ime ka ị mara ihe ndị a.
Ma gịnị ma ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa n’ezie ifelata n’ihi ihe ndị ziri ezi metụtara ahụ ike gị? Bible na-agwa anyị ka anyị “meruo ihe n’ókè.” (1 Timoti 3:11, NW ) N’ihi ya, ọ kasị mma izere ịhọbiga nri ókè ma ọ bụ ịdaba n’atụmatụ ifelata ngwa ngwa. Ikekwe ụzọ kasị mma isi felata bụ iri ihe oriri na-akwalite ahụ ike ma megaa ahụ n’ókè kwesịrị ekwesị. “Dị ka ọ dị n’ihe ka n’ihe nile ọzọ,” ka magazin bụ́ FDA Consumer na-ekwu, “e nwere ụzọ ziri ezi na ụzọ na-ezighị ezi nke isi felata. Ụzọ na-ezighị ezi bụ ịghara iri nri mgbe ụfọdụ, ikpebi ịghara iri ihe ọ bụla ma e wezụga obere bred na mmiri, ịṅụ ọgwụ na-eme ka agụụ ghara ịgụ mmadụ, ma ọ bụ ịmanye onwe gị ịgbọ agbọ.”
Ike nke Ịkọrọ Ya Mmadụ
Onye ọrụ ebere bụ́ Nancy Kolodny ji ịrịa ọrịa iri nri tụnyere “ịbanye n’okporo ụzọ nwere ọtụtụ agalaba nanị gị, n’enweghị map ma ọ bụ ihe e ji achọta ụzọ, n’amaghị kpọmkwem ebe ị ga-esi laa, n’amaghịkwa kpọmkwem mgbe ma ọ bụ ma ị̀ ga-achọta ụzọ ị ga-esi laa. . . . Ka ị na-anọtekwu aka n’ebe ahụ, otú ahụ ka ọ na-agbagwojukwu gị anya, na-emekwa ka i nwee nkụda mmụọ ka ị na-agbalị ịpụta n’ebe ahụ.” N’ihi ya, ọ bụrụ na i nwere mgbaàmà ọrịa ịtụ nri ụjọ ma ọ bụ ọrịa oké agụụ nri, ọ dị gị mkpa inweta enyemaka. Ị pụghị ịpụtali ‘n’okporo ụzọ ahụ nwere ọtụtụ agalaba’ n’onwe gị. N’ihi ya kọọrọ ya nne ma ọ bụ nna gị ma ọ bụ onye ọzọ toworo eto ị tụkwasịrị obi. Otu ilu Bible na-ekwu, sị: “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.”—Ilu 17:17.
Ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova enwetawo ndị enyi dị otú ahụ a pụrụ ịtụkwasị obi n’etiti ndị okenye nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst. Otú ọ dị, ndị okenye abụghị ndị dibịa bekee, enyemaka ha agaghịkwa egbochi mkpa nke enyemaka dọkịta. Otú ọ dị, ndị nlekọta bụ́ ndị Kraịst agaghị eleghara ‘iti mkpu nke onye na-enweghị ike’ anya, ndụmọdụ na ekpere ha pụkwara inye aka ‘zọpụta onye ahụ ahụ na-adịghị ike’ n’ụzọ ime mmụọ.—Ilu 21:13; Jemes 5:13-15.
Ọ bụrụ na ọ ga-esiri gị ike ịkọrọ ya mmadụ ihu na ihu, dee ihe i bu n’uche n’akwụkwọ ozi, kwuo na ị chọrọ nzaghachi. Ihe dị mkpa bụ ime ka mmadụ mara banyere ya. “Site n’ịghọta eziokwu ahụ bụ́ na ị pụghị ime ihe banyere ya nanị gị,” ka Nancy Kolodny dere, “ị na-ahọrọ kpọmkwem ikwe ka onye ọzọ nyere gị aka site ugbu a gawa.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Ndị a pụrụ ịbụ ihe ndị ga-esiri gị ike ichebara echiche na ime, ma ha pụrụ ịba uru, ụdị ndị ga-eche gị ihu n’ebe kwesịrị ekwesị iji pụta n’okporo ụzọ ahụ nwere ọtụtụ agalaba.”
Ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst nwere ihe ọzọ dị mma pụrụ inye aka—ekpere. Ikpegara Chineke ekpere abụghị ụzọ e si eme ka uche dajụọ. Ọ bụ ezi nkwurịta okwu nke dị mkpa n’etiti gị na Onye Okike, bụ́ onye ma gị nke ọma karịa ka ị maara onwe gị! (1 Jọn 3:19, 20) N’ihi ya, ọ bụ ezie na ugbu a abụghị oge Jehova kara aka iji kwụsị ọrịa nile, Chineke anyị na-ahụ n’anya pụrụ iduzi nzọụkwụ gị ka a ghara iwezụga gị n’ọnọdụ gị. (Abụ Ọma 55:22) Site n’ahụmahụ ya, ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid dere, sị: “Achọrọ m Jehova, Ọ zakwara m, wee napụta m n’ụjọ m nile. Onye a e wedara n’ala kpọrọ òkù, Jehova wee nụrụ ya, wee si ná mkpagbu ya nile zọpụta ya.”—Abụ Ọma 34:4, 6.
Mgbe ahụ, gbalịsie ike ịgwa Jehova Chineke mmetụta gị ndị kasị mie emi. ‘Na-atụkwasị Ya nchegbu nile ị na-echegbu onwe gị,’ ka Pita onyeozi dere, ‘n’ihi na ihe nile banyere gị na-emetụ Ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) Iji wulite obi ekele maka ebere ịhụnanya Jehova, gịnị ma i jiri nlezianya gụọ Abụ Ọma 34, 77, 86, 103, na 139? Ịtụgharị uche n’abụ ọma ndị a ga-ewusi nkweta i nwere na Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, ike, na ọ na-achọ ka i nwee ihe ịga nke ọma. Site n’ịgụ Okwu ya, ị ga-enwe ụdị mmetụta Devid nwere, bụ́ onye dere, sị: “Mgbe ọ bụla m na-echegbu onwe m, ị na-akasi m obi ma mee ka m nwee obi ụtọ.”—Abụ Ọma 94:19, Today’s English Version.
Nwee Ndidi—A Na-eji Nwayọọ Nwayọọ Agbake
Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-enweta enyemaka maka ọrịa iri nri adịghị agbake n’otu ntabi anya. Tụlee Jaimee, e hotara ná mmalite. Ọbụna mgbe ọ malitesịrị inweta enyemaka, o siiri ya ike iri ihe na-ebughị ibu dị ka otu efere akamụ. “Aghaghị m ịnọgide na-agwa onwe m na ihe a ga-adị m mma n’ahụ, nri dịkwa m mkpa iji dịrị ndụ,” ka ọ na-ekwu. “Otu ngaji ọ bụla m na-ekuru na-adị m ka ọ ga-eme ka m bukwuo ibu.”
Ọ bụ ezie na otu oge Jaimee anwụchaala anwụọ, o kpebiri ịkwụsị ichegbubiga onwe ya ókè banyere nri. “Agaghị m anwụ,” ka o kwuru. “Aga m alụso ihe a ọgụ ma merie. Aga m agbake n’ọrịa ịtụ nri ụjọ. Ọ ga-esi ike, ma aga m eme ya.” Ị pụkwara ime ya!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
[Foto dị na peeji nke 21]
Nri na-edozi ahụ na mmega ahụ ruru ókè kwesịrị ekwesị pụrụ inyere gị aka chịkwaa ibu gị