Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g01 6/8 p. 16-29
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Teta!—2001
  • Isiokwu Nta
  • Aziza Nye Ajụjụ
Teta!—2001
g01 6/8 p. 16-29

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e depụtara, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 29. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Ndịàmà Jehova, bipụtara.)

1. Iji kpuchie mmehie ya na Bath-sheba, gịnị ka Devid mere n’ikpeazụ? (2 Samuel 11:15-17)

2. Gịnị ka e si na ya mee nwanyị mbụ? (Jenesis 2:22)

3. Omume anụmanụ dịgasị aṅaa ka Pita ji tụnyere omume nke ndị hapụrụ “ụzọ ezi omume”? (2 Pita 2:21, 22)

4. N’oge ònye ka a malitere “ịkpọku aha Jehova”? (Jenesis 4:26)

5. Ònye bụ eze mbụ nke Israel, gịnịkwa bụ aha nna ya? (Ọrụ 13:21)

6. N’okpuru Iwu Mosis, ndị àmà ole ma ọ dịkarịa ala ka a chọrọ iji maa mmadụ ikpe ọnwụ? (Deuterọnọmi 17:6)

7. Ònye ka Pọl kwuru na “e sitere na Ya gụọ eriri nna nile ọ bụla n’eluigwe na n’elu ụwa aha”? (Ndị Efesọs 3:14, 15)

8. Gịnị ka e ji mara ụmụ ndị ikom Lemek bụ́ Jebel na Jubal? (Jenesis 4:20, 21)

9. Dị ka Jemes na Pita gbara akaebe ya, ole ndị ka Chineke na-enye “amara”? (Jemes 4:6; 1 Pita 5:5)

10. N’ihe atụ ya banyere ọkpụite na ụrọ ya, okwu dịgasị aṅaa ka Pọl ji mee ihe iji gosi ndị ajọ omume na ndị ezi omume? (Ndị Rom 9:22-24)

11. Olee Siza nke Pọl kpọkuru? (Ọrụ 25:11, 21)

12. N’okpuru Iwu Mosis, olee ihe abụọ na-aghaghị ịbụ eziokwu banyere anụmanụ iji bụrụ nke a gụrụ n’anụ dị ọcha nke dịkwa mma oriri? (Levitikọs 11:2, 3)

13. Olee mkpụrụ akwụkwọ mbụ dị n’usoro mkpụrụ akwụkwọ ndị Hibru (Abụ Ọma 119, NW ihe e dekwasịrị n’elu)

14. Gịnị ka ụmụ Israel nile ga-eme ụsọ uwe ha iji chetara ha na e doro ha iche dị ka ndị dị nsọ nye Jehova? (Ọnụ Ọgụgụ 15:38-41)

15. N’ịgbaso ntụziaka Jehova, olee obodo Abram hapụrụ gawa ala Keanan? (Jenesis 15:7)

16. N’ihi gịnị ka Saịmọn bụ́ onye Farisii ji wee iwe mgbe otu nwanyị sutụrụ ụkwụ Jisọs ọnụ nke ukwuu, werekwa manụ otite tee ha? (Luk 7:37-39)

Aziza Nye Ajụjụ

1. O mere ndokwa ka e gbuo Uraịa n’agha

2. Ọgịrịga e si n’ahụ Adam were

3. Nkịta na nne ezì

4. Enọsh

5. Sọl, Kish

6. Abụọ

7. “Nna anyị,” bụ́ Jehova Chineke

8. Ha ghọrọ nna ndị na-awagharị awagharị na-azụ anụ ụlọ na ndị egwú

9. “Ndị dị umeala n’obi”

10. “Ihe iwe” na “ihe dịịrị ebere”

11. Nero

12. Ọ ghaghị ịbụ nke na-atagharị ọnụ ma bụrụ nke ụkwụ ya wara njakpa

13. Aleph

14. Ha ga-eji eriri mma ogho anụnụ anụnụ mee ajịrịja n’ọnụ ọnụ uwe ha

15. Ua nke ndị Kaldea

16. Nwanyị ahụ bụ onye mmehie a ma ama, na-ebi ndụ rụrụ arụ, n’agbanyeghịkwa nke ahụ Jisọs kwere ka o metụ ya aka

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya