Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g01 12/8 p. 3-4
  • Ọrịa Ogbu na Nkwonkwo—Ọrịa Na-akpata Nkwarụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọrịa Ogbu na Nkwonkwo—Ọrịa Na-akpata Nkwarụ
  • Teta!—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olileanya Dịịrị Ndị Na-arịa Ọrịa Ogbu na Nkwonkwo
    Teta!—2001
  • Isiokwu Ndị dị n’Akwụkwọ a
    Teta!—2001
  • Ịghọta Ọrịa Ogbu na Nkwonkwo
    Teta!—2001
  • Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2001
g01 12/8 p. 3-4

Ọrịa Ogbu na Nkwonkwo—Ọrịa Na-akpata Nkwarụ

“Ị GAGHỊ AMA OTÚ Ọ NA-EGBURU MGBU RUO MGBE Ị RỊARA YA. ECHERE M NA NANỊ ỤZỌ Ị GA-ESI NWERE ONWE GỊ N’IHE MGBU AHỤ BỤ ỊNWỤ ANWỤ.”—SETSUKO, JAPAN.

“N’ỊBỤ ONYE RỊAWORO YA KEMGBE M DỊ AFỌ 16, Ọ DỊ M KA ỌRỊA A Ọ̀ NAPỤRỤ M OGE UTO M.”—DARREN, GREAT BRITAIN.

“AFỌ ABỤỌ NKE NDỤ M FUNAHỤRỤ M N’IHI ỊBỤ ONYE NA-ADỊGHỊ ESI N’ÀKWÀ EBILI.”—KATIA, ITALI.

“OZUGBO NKWONKWO M NILE MALITERE IGBU M MGBU, AHỤ M NILE NA-ABỤ IHE MGBU IHE MGBU.”—JOYCE, SOUTH AFRICA.

NDỊ a bụ arịrị ndị na-arịa ọrịa a na-akpọ ogbu na nkwonkwo kwara. Ọrịa ogbu na nkwonkwo na-eme ka ọtụtụ nde ndị na-arịa ya gaa hụ dọkịta ha kwa afọ, na-achọ inwere onwe ha pụọ n’ihe mgbu, agalighị ije, na nkwarụ ndị ọ pụrụ ịkpata.

Na United States nanị, ọrịa ogbu na nkwonkwo na-emetụta ihe karịrị nde mmadụ 42, na-akpatara 1 onye n’ime mmadụ 6 na-arịa ya nkwarụ. N’ezie, ọrịa ogbu na nkwonkwo bụ ọrịa bụ́ isi na-akpata nkwarụ ná mba ahụ. Ebe ọ bụ na ọrịa a na-efu ndị America ihe karịrị nde dollar 64 kwa afọ iji nweta ọgwụgwọ ya nakwa n’ihi arụpụtaghị ihe nke ọma, mmetụta ọjọọ ọ na-enwe n’ebe akụ̀ na ụba dị “fọrọ nke nta ka ọ haruo ka nke oge e nwetụrụ ndalata akụ̀ na ụba,” ka Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Mgbochi Ọrịa nke Mba ahụ na-ekwu. Dị ka Òtù Ahụ Ike Ụwa si kwuo, nnyocha ndị e mere ná mba ndị ka na-emepe emepe, dị ka Brazil, Chile, China, India, Indonesia, Malaysia, Mexico, Pakistan, Philippines, na Thailand, gosiri na ọ fọrọ nke nta ka nsogbu nke ọrịa ogbu na nkwonkwo na ọrịa ndị ọzọ yiri ajụ oyi na-akpata n’ala ndị dị otú ahụ “haruo ka nke ha na-akpata n’akụkụ ụwa ndị mepere emepe.”

Ọ bụghị eziokwu na ọrịa ogbu na nkwonkwo bụ ọrịa nanị ndị agadi na-arịa. N’eziokwu, ọ na-emetụta ndị mmadụ n’ụzọ dị njọ karị ka ha na-emewanye agadi. Ma otu n’ime ụdị ya kasị arịa ọtụtụ ndị, bụ́ ọrịa ogbu na nkwonkwo yiri ajụ oyi, na-emetụtakarị ndị nọ n’agbata afọ 25 na 50. Na United States, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 3 n’ime mmadụ 5 ọ bụla na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo erubeghị afọ 65. N’otu aka ahụ, na Great Britain, n’ime nde mmadụ 8 na-arịa ọrịa a, nde mmadụ 1.2 erubeghị afọ 45. Ihe karịrị 14,500 bụ ụmụaka.

Kwa afọ, ọnụ ọgụgụ ndị na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo na-arịwanye elu n’ike n’ike. Na Canada, n’ime iri afọ na-abịanụ, ọnụ ọgụgụ ndị na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo ga-eji otu nde rịa elu. Ọ bụ ezie na ọrịa ogbu na nkwonkwo jupụtara na Europe karịa n’Africa na Esia, ọrịa a na-amụbakwa ná mba ndị nke ọzọ a. Mmụba dị ukwuu nke ọrịa ogbu na nkwonkwo emewo ka Òtù Ahụ Ike Ụwa kpọọ afọ 2000-2010 Iri Afọ nke Ọkpụkpụ na Nkwonkwo. N’oge a, ndị dọkịta na ndị ọkachamara n’ilekọta ahụ ike gburugburu ụwa ga-agbakọta aka ná mgbalị imeziwanye ọdịdị nke ndụ ndị na-arịa ụdị ọrịa ndị na-emetụta uru ahụ na ọkpụkpụ, dị ka ọrịa ogbu na nkwonkwo.

Gịnị ka a maara banyere ọrịa a na-egbu mgbu? Olee ndị pụrụ ịrịa ya? Olee otú ndị na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo pụrụ isi nagide nkwarụ ọ na-akpata? Ọ̀ ga-akwụsị n’ọdịnihu? Isiokwu anyị ndị na-esonụ ga-atụle ihe ndị a.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Foto X ray: E ji ya mee ihe site n’ikike Òtù Na-eme Nnyocha Banyere Ọrịa Ogbu na Nkwonkwo, nke United Kingdom ji obi ọma nye (www.arc.org.uk)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya