Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche Nov. 15
“Anyị anụwo okwu ahụ bụ́ ‘Jisọs nwụrụ n’ihi anyị.’ [Hota ihe e kwuru na Jọn 3:16.] Ì chetụwo echiche otú ọnwụ otu nwoke pụrụ isi zọpụta anyị nile? [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible na-enye azịza doro anya. Isiokwu a, bụ́ ‘Jisọs Na-azọpụta—n’Ụzọ Dị Aṅaa?,’ na-akọwa ya n’ụzọ doro anya.”
Ụlọ Nche Dec. 1
“N’oge a n’afọ, ọtụtụ ndị na-emikpu onwe ha n’inye onyinye na n’ịrụ ụdị ọrụ obiọma ndị ọzọ. Nke ahụ na-eme ka anyị cheta ụkpụrụ ọma ahụ. [Gụọ Matiu 7:12.] Ì chere na ọ pụrụ ikwe omume ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ahụ n’oge nile n’afọ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Magazin a na-enye ihe dị mkpa a ga-echebara echiche n’isiokwu bụ́ ‘Ụkpụrụ Ọma Ahụ—Ọ̀ Ka Dị Irè?’”
Teta! Dec. 8
“Bible na-ekwe nkwa na otu ụbọchị ọ dịghị onye ga-asị, ‘Ana m arịa ọrịa.’ [Gụọ Aịsaịa 33:24.] N’ikwekọ ná nkwa ahụ, mbipụta a nke Teta! na-elekwasị anya n’otu nrịanrịa na-enye ọtụtụ nde mmadụ nsogbu, ma nwata ma okenye. Isiokwu ya bụ ‘Olileanya Dịịrị Ndị Na-arịa Ọrịa Ogbu na Nkwonkwo.’ E ji m n’aka na ị ga-enweta ihe ọmụma n’isiokwu ndị a.”