Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Nov. 15
“N’ihi otú omume rụrụ arụ si jupụta n’ụwa taa, ụfọdụ na-ajụ onwe ha, sị, ‘Oleedị ihe mere m ga-eji na-agbasi mbọ ike iji na-eme ihe ọma?’ Ò nwetụla mgbe ị jụrụ onwe gị ụdị ajụjụ a? [Chere ka ọ zaa.] Lee agbamume Bible na-enye. [Gụọ Ilu 2:21, 22.] Magazin a kọwara ihe kachasị mkpa mere mmadụ ga-eji na-eme ihe ọma.”
Teta! Dec. 1
“Ì chere na amụma a e buru na Bible na-emezu taa? [Gụọ Matiu 24:11. Ị gụsịa ya, i chere ka ọ zaa.] Magazin a na-ekwu banyere ụfọdụ ozizi ndị a na-ezi ebe nile taa. O kwukwara ihe anyị ga-eme ka ndị ozizi ụgha ghara iduhie anyị.”
Teta! Oct.-Dec.
“Ọtụtụ n’ime anyị enweela ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ ha. Ì chere na o nwere ihe anyị pụrụ ime iji nyere ha aka n’agbanyeghị na ha anwụọla? [Chere ka ọ zaa.] Isiokwu a kwuru otú Bible si zaa ajụjụ a. O kwukwara banyere nkwa a na-akasi obi.” Gụọ Jọn 5:28, 29. Ị gụsịa ya, i gosi ya isiokwu ahụ malitere na peeji nke 24.