Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche Nov. 15
“Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị mmadụ na-achọ ogologo ndụ na ahụ́ ike. Ma, ọ bụrụ na ịdị ndụ ebighị ebi ga-ekwe omume, ọ̀ ga-amasị gị? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ gụọ Jọn 17:3.] Magazin a na-atụle nkwa Bible maka ndụ ebighị ebi. Ọ na-atụlekwa ihe ndụ ga-adị ka ya mgbe nkwa ahụ mezuru.”
Ụlọ Nche Dec. 1
“Otu àgwà nke na-eme ka mmadụ dị iche n’ebe anụmanụ nọ bụ ikike nke ịmata ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ. N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị na-eme ihe ọjọọ. Olee ihe i chere mere o ji dị otú ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ gụọ Jeremaịa 17:9 ma ọ bụ Mkpughe 12:9.] Magazin a na-atụle ihe pụrụ inyere anyị aka ịma ihe bụ́ ezi ihe na ime ya.”
Teta! Dec. 8
“N’ime afọ 20 gafeworonụ, e nwewo ọganihu dị ukwuu n’ịghọta nakwa n’ịgwọ ọrịa AIDS. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị ka na-enweta ihe ọmụma na-ezighị ezi. [Gosi igbe bụ́ “Echiche Ụgha Ndị E Nwere Banyere Ọrịa AIDS,” ma nye ohere maka nzaghachi.] Magazin a na-atụle otú ndị nne na nna pụrụ isi chebe ụmụ ha.” Gụọ Deuterọnọmi 6:6, 7.
“Ọganihu ndị e nwere na nkà na ụzụ agbanwebeghị mkpa bụ́ isi mmadụ nwere maka inweta ndị enyi. Ma ị̀ chọpụtawo na mgbanwe ndị e nwere n’ọha mmadụ pụrụ ime ka ọ bụrụ ihe ịma aka taa ịzụlite ezi ọbụbụenyi? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ gụọ Ilu 18:24.] Magazin a na-atụle otú anyị pụrụ isi meta ezi ndị enyi na otú anyị na ha pụrụ isi nọgide bụrụ enyi.”