Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche Dec. 15
“N’oge a n’afọ, ọtụtụ mmadụ na-ekwu banyere ọmụmụ Jizọs. Ì chetụwo echiche banyere ụdị ezinụlọ o tolitere na ya? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ gụọ Luk 2:51, 52.] Mbipụta Ụlọ Nche a na-ekwu banyere ihe ndị bara uru anyị pụrụ ịmụta n’ihe ndekọ Bible banyere nzụlite Jizọs.”
Teta! Jan. 8
“Anyị nile chọrọ ịhụ ka ụmụ anyị na-ebi ndụ obi ụtọ na nke na-aga nke ọma. Gịnị ka i chere kasị dị ụmụaka mkpa iji nagide nrụgide nke ụwa taa? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ gụọ Ilu 22:6.] Mbipụta Teta! a na-ekwu banyere ihe dị ụmụaka mkpa na otú ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi gboo mkpa ndị ahụ.”
Ụlọ Nche Jan. 1
“Udo ụwa na-agụsi ọtụtụ mmadụ agụụ ike. Ì chere na ọ dị mgbe okwu ndị a ga-emezu? [Gụọ Abụ Ọma 46:9. Mgbe ahụ nye ohere maka nzaghachi.] Mbipụta Ụlọ Nche a na-ekwu banyere otú a ga-esi mezuo nke a na ihe mere anyị ga-eji tụkwasị obi ná nkwa Chineke banyere ụwa nke agha na-agaghị adị na ya.”
Teta! Jan. 8
“N’ụwa nile, ọtụtụ nde mmadụ na-enwe ịda mbà n’obi ma na-arịa ọrịa uche na-emetụta ụbụrụ. Ihe banyere ndị dị otú ahụ na-emetụta Onye Okike anyị n’ahụ́ nke ukwuu. [Gụọ Abụ Ọma 34:18.] Magazin a na-atụle otú a pụrụ isi nyere ndị na-arịa ọrịa a aka. Ọ na-ekwukwa banyere nkwa Bible bụ́ na n’isi nso, a ga-ewepụ ọrịa nile.”