Ihe Ndị A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Nov. 15
“Anyị nile chọrọ ibi ndụ obi ụtọ na nke bara uru. Ì kweere na ihe Jizọs kwuru ebe a bụ isi ihe na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ? [Gụọ Matiu 5:3. Ị gụchaa, chere ka ọ zaa.] Magazin a kọwara otú igbo mkpa gbara ọkpụrụkpụ anyị bu pụta ụwa, nke bụ́ ife Chineke, si eme ka ndụ anyị baa uru.”
Ụlọ Nche Dec. 1
“Olee otú ị ga-esi zaa ajụjụ a? [Gụpụta ajụjụ dị n’ihu magazin ahụ. Ị gụpụtachaa ya, chere ka ọ zaa.] Nzube Chineke bụ ime ka ụmụ mmadụ dị n’otu. [Gụọ Abụ Ọma 46:8, 9.] Magazin a gosiri ihe Bible kwuru banyere otú mmadụ nile ga-esi adị n’otu.”
Teta! Oct.–Dec.
“Ì chere na ụmụaka nọ n’ihe ize ndụ ugbu a karịa ka ha nọ n’oge gara aga? [Chere ka ọ zaa.] Ụfọdụ chere na oge a anyị bi na ya bụ oge ahụ a kọwara ebe a. [Gụọ 2 Timoti 3:1-5.] Magazin a tụrụ arọ ụfọdụ dị ire banyere otú ndị nne na nna nwere ike isi chebe ụmụ ha ka ha ghara ịdaba n’aka ndị na-achọ ụmụaka ha ga-emetọ.”
“Ọ dịghị onye n’ime anyị mmadụ na-anwụnahụtụbeghị. Ì chere na ndị anyị nwụrụ anwụ nọ n’eluigwe na-ele anyị? [Chere ka ọ zaa.] Lee ihe Jizọs kwuru mgbe Lazarọs nwụrụ. [Gụọ Jọn 11:11.] Isiokwu a na-akọwa ma ndị nwụrụ anwụ hà ka dị ndụ ka ọ̀ bụ na ha nọ n’ụra na-eche mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 30.